< Zabbuli 86 >

1 Okusaba kwa Dawudi. Otege okutu kwo, Ayi Mukama, owulire okusaba kwange, onnyanukule, kubanga ndi mwavu atalina kintu.
Ekpere Devid. Gee m ntị, O Onyenwe anyị, ma zakwa m, nʼihi na abụ m ogbenye na onye nọ na mkpa.
2 Okuume obulamu bwange, kubanga nkuweereza n’obwesigwa. Katonda wange, ondokole nze omuddu wo akwesiga.
Chebe ndụ m, nʼihi na m na-erubere gị isi; zọpụta ohu gị onye nke na-atụkwasị gị obi. Ị bụ Chineke m;
3 Onsaasire, Ayi Mukama, kubanga olunaku lwonna nsiiba nkukoowoola.
meere m ebere, O Onyenwe m, nʼihi na ana m akpọku gị ogologo ụbọchị niile.
4 Osanyuse omuweereza wo Ayi Mukama; kubanga omwoyo gwange nguyimusa eyo gy’oli.
Wetara ohu gị ọṅụ, nʼihi na ọ bụ gị, O Onyenwe m, ka m na-eweliri mkpụrụobi m.
5 Ddala ddala olina ekisa era osonyiwa, Ayi Mukama; n’abo bonna abakukoowoola obaagala nnyo.
Ị bụ onye na-agbaghara ajọ omume na onye dị mma, O Onyenwe m, i jupụtara nʼịhụnanya nye ndị niile na-akpọku gị.
6 Owulire okusaba kwange, Ayi Mukama; owulirize eddoboozi erikaabirira ekisa kyo.
O Onyenwe anyị, nụrụ ekpere m; gekwaa ntị nʼakwa arịrịọ m maka ebere.
7 Bwe nnaabanga mu buzibu nnaakukoowoolanga; kubanga ononnyanukulanga.
Nʼụbọchị nsogbu m, aga m akpọku gị, nʼihi na ị ga-aza m.
8 Mu bakatonda bonna tewali ali nga ggwe, Ayi Mukama; era teriiyo akola bikolwa ng’ebibyo.
Nʼetiti chi niile, i nweghị oyiri, O Onyenwe m; ọ dịghị ọrụ ebube ọbụla a pụrụ ị sị na ọ dị ka nke ị na-arụ.
9 Ayi Mukama amawanga gonna ge watonda ganajjanga mu maaso go ne gakusinza; era ne bagulumiza erinnya lyo ery’ekitiibwa.
Mba niile i kere ga-abịa nʼihu gị, fee gị ofufe, O Onyenwe anyị; ha ga-ebutere aha gị ebube.
10 Kubanga oli mukulu, era okola ebyewunyisa; ggwe wekka ggwe Katonda.
Nʼihi na ị dị ukwuu na-arụkwa ọrụ ebube dị iche iche; ọ bụ naanị gị bụ Chineke.
11 Onjigirize ekkubo lyo, Ayi Mukama, ntambulirenga mu mazima go; ompe omutima omunywevu ogutasagaasagana, ntyenga erinnya lyo.
Kuziere m ụzọ gị, O Onyenwe anyị, ka m dabere nʼikwesị ntụkwasị obi gị; nye m obi na-adịghị agba abụọ, ka m nwee ike tụọ egwu aha gị.
12 Nnaakutenderezanga, Ayi Mukama Katonda wange, n’omutima gwange gwonna; erinnya lyo nnaaligulumizanga emirembe gyonna.
Aga m eji obi m niile too gị, O Onyenwe anyị, na Chineke m; aga m ebulikwa aha gị elu ruo mgbe niile ebighị ebi.
13 Okwagala kwo okutaggwaawo kungi nnyo gye ndi; wawonya omwoyo gwange amagombe. (Sheol h7585)
Nʼihi na ịhụnanya gị nʼebe m nọ dị ukwuu; i sitela nʼomimi nke dị ala site nʼala ndị nwụrụ anwụ dọpụta m. (Sheol h7585)
14 Ayi Katonda, ab’amalala bannumba, ekibinja ky’abantu abataliimu kusaasira bannoonya okunzita, be bantu abatakufiirako ddala.
O Chineke, ndị mpako na-emegide m; otù ndị mmadụ na-eme ihe ike na-achọ igbu m, ha bụ ndị na-ejighị gị kpọrọ ihe ọbụla.
15 Naye ggwe, Mukama Katonda oli musaasizi era ow’ekisa, olwawo okusunguwala, ojjudde okwagala n’obwesigwa.
Ma gị, Onyenwe anyị, ị bụ Chineke onye ọmịiko na onye amara, iwe adịghị ewe gị ngwangwa, i jupụtara nʼịhụnanya na ikwesi ntụkwasị obi.
16 Onkyukire, onsaasire, ompe amaanyi go nze omuweereza wo; nze omwana w’omuweereza wo omukazi ondokole.
Chee m ihu, mekwaara m amara. Nye ohu gị ike gị, zọpụtakwa nwa ohu gị nwanyị nʼihi na m na-ejere gị ozi.
17 Nkolera akabonero akalaga ebirungi byo, abalabe bange bakalabe baswale; kubanga ggwe, Ayi Mukama, onnyambye era onzizizzaamu amaanyi.
Gosi m ihe ịrịbama nke ga-egosipụta ịdị mma gị, ka ndị iro m hụ ya si otu a bụrụ ndị ihere ga-eme, nʼihi na gị, O Onyenwe anyị, nyere m aka ma kasịekwa m obi.

< Zabbuli 86 >