< Zabbuli 46 >

1 Ya Mukulu wa Bayimbi: Zabbuli ya Batabani ba Koola. Katonda kye kiddukiro kyaffe, era ge maanyi gaffe; omubeezi ddala atabulawo mu kulaba ennaku.
Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ ụmụ Kora. Nʼusoro olu abụ alamot. Otu Abụ. Chineke bụ ebe mgbaba anyị, na ike anyị, onye inyeaka anyị ka ọ bụ nʼoge nsogbu.
2 Kyetunaavanga tulema okutya, ensi ne bw’eneeyuuguumanga, ensozi ne bwe zinaasiguulukukanga ne zigwa mu buziba bw’ennyanja;
Nʼihi ya, anyị agaghị atụ egwu, ọ bụladị mgbe ụwa niile na-emebi, maọbụ mgbe a na-ewezuga ugwu nʼọnọdụ ha, mee ka ha daba nʼoke osimiri.
3 amazzi g’ennyanja ne bwe ganaayiranga ne gabimba ejjovu ensozi ne zikankana olw’okwetabula kwago.
Nʼagbanyeghị na mmiri ya na-agba aghara, na-asụkwa ụfụfụ, maọbụ na ugwu niile na-eme mkpọtụ site nʼoke mbili elu ha. (Sela)
4 Waliwo omugga, emyala gyagwo gisanyusa ekibuga kya Katonda, kye kifo ekitukuvu ekya Katonda Ali Waggulu Ennyo.
Otu iyi dị nke na-asọbata na-eweta ọṅụ nʼime obodo Chineke, nʼime ebe obibi dị nsọ nke Onye kachasị ihe niile elu.
5 Tekirigwa kubanga Katonda mw’abeera. Katonda anaakirwaniriranga ng’obudde bunaatera okukya.
Chineke bi nʼime ya, ọ gaghị ada; Chineke ga-enyere ya aka mgbe chi bọrọ.
6 Amawanga geetabula, obwakabaka bugwa; ayimusa eddoboozi lye ensi n’esaanuuka.
Mba niile na-agba aghara, alaeze niile na-adakwa; o welitere olu ya elu, ụwa na-agbaze.
7 Mukama ow’Eggye ali naffe, Katonda wa Yakobo kye kigo kyaffe.
Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile nọnyere anyị; Chineke nke Jekọb bụ ebe mgbaba anyị e wusiri ike. (Sela)
8 Mujje, mulabe Mukama by’akola, mulabe nga bw’afaafaaganya ensi.
Bịa, hụrụ ihe ebube niile Onyenwe anyị mere, lee oke ịla nʼiyi niile o webatara nʼelu ụwa.
9 Y’akomya entalo mu nsi yonna; akutula emitego gy’obusaale, effumu alimenyaamenya; amagaali n’engabo abyokya omuliro.
Ọ na-eme ka agha kwụsị ruo nsọtụ nke elu ụwa niile. Ọ na-agbaji ụta, na-ebibi ùbe, ma na-esu ọta agha niile ọkụ.
10 Musiriikirire mutegeere nga nze Katonda. Nnaagulumizibwanga mu mawanga. Nnaagulumizibwanga mu nsi.
Ọ na-asị, “Nọọnụ juu! Maranụ na mụ onwe m bụ Chineke! A ga-ebuli m elu nʼetiti mba niile, a ga-ebulikwa m elu nʼụwa.”
11 Katonda ow’Eggye ali naffe; Katonda wa Yakobo kye kigo kyaffe.
Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile nọnyere anyị; Chineke nke Jekọb bụ ebe mgbaba anyị e wusiri ike. (Sela)

< Zabbuli 46 >