< Zabbuli 15 >
1 Zabbuli ya Dawudi. Ayi Mukama, ani anaabeeranga mu nnyumba yo? Ani anaatuulanga ku lusozi lwo olutukuvu?
Abụ Ọma Devid. Onyenwe anyị, onye pụrụ ịnọgide nʼụlọnsọ ukwu gị? Onye pụrụ ibi nʼugwu nsọ gị?
2 Oyo ataliiko kya kunenyezebwa, akola eby’obutuukirivu, era ayogera eby’amazima nga biviira ddala mu mutima gwe.
Onye na-ebi ndụ nke na-enweghị ịta ụta, onye na-arụ ọrụ ezi omume, onye na-ekwu eziokwu site nʼobi ya.
3 Olulimi lwe talwogeza bya bulimba, era mikwano gye tagiyisa bubi, so tasaasaanya ŋŋambo ku baliraanwa be.
Onye jụrụ ikwutọsị ndị ọzọ, onye na-adịghị eme onye agbataobi ya ihe ọjọọ, na onye na-adịghị ekwulu mmadụ ibe ya,
4 Anyooma ababi, naye abatya Mukama abassaamu ekitiibwa. Atuukiriza ky’asuubiza ne bwe kiba nga kimulumya.
onye na-eleda onye ajọ omume anya, ma na-asọpụrụ ndị ahụ na-atụ egwu Onyenwe anyị, onye na-adịghị agbanwe nkwa ọbụla o kwere, ọ bụladị mgbe nkwa ahụ na-emegide ya,
5 Bw’awola tasaba magoba; so takkiriza kulya nguzi ku muntu yenna. Oyo akola ebyo aliba munywevu emirembe gyonna.
onye na-agbazinye mmadụ ego na-anaghị ụma, onye na-adịghị a nara ngarị imegide onye aka ya dị ọcha. Onye na-eme ihe ndị a agaghị ama jijiji nʼọnọdụ ya, mgbe ọbụla.