< Engero 27 >

1 Teweenyumirizanga mu bya nkya, kubanga olunaku bye lunaaleeta tobimanyi.
Anyala isi banyere echi, nʼihi na ị maghị ihe echi ga-abụ.
2 Leka omulala akutenderezenga so si kamwa ko ggwe, omuntu omulala so si mimwa gyo.
Ka onye ọzọ too gị, ọ bụghị ọnụ gị. Ka onye ọzọ too gị, ka egbugbere ọnụ gị abụọ ghara ito gị.
3 Ejjinja lizitowa, n’omusenyu muzito, naye obulumbaganyi bw’omusirusiru businga byonna okuzitowa.
Nkume dị arọ, aja bụkwa ibu arọ, ma mkpasu iwe nke onye nzuzu dị arọ karịa ha abụọ.
4 Obusungu bwa ttima, n’ekiruyi kifugira ddala nnyo, naye ani ayinza okwolekera amaaso g’obuggya?
Iwe na-emebi ihe, ma ekworo jọrọ njọ karịa iwe.
5 Okunenya mu lwatu, kisinga okwagala okukisibbwa.
Mba abara nʼihe ka mma karịa ịhụnanya ezoro ezo.
6 Okunywegera kw’omulabe kwandiba okungi, naye ebiwundu by’okunenya kw’owoomukwano tebitiisa.
Ihe kwesiri ntụkwasị obi ka mmerụ ahụ nke sitere nʼaka enyi bụ, ma onye iro na-eme ka isutu ọnụ mụbaa.
7 Oyo akkuse akyawa omubisi gw’enjuki, naye eri omuyala n’ekikaawa kiba kiwoomerera.
Mmanụ aṅụ adịghị atọ onye rijuru afọ ụtọ; ma mgbe agụụ ji ya, ọ ga-eri ọ bụladị ihe dị ilu.
8 Ng’akanyonyi akadduka mu kisu kyako, bw’atyo bw’abeera omuntu abula mu maka ge.
Nwoke na-akpafu site nʼụlọ ya dị ka nnụnụ na-amakwaghị akwụ ya.
9 Ebyakaloosa bisanyusa omutima, n’obuwoomerevu bw’omukwano gw’omuntu bwe butyo bwe buvaamu okubuulirira okw’amazima.
Mmanụ isi ụtọ na ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ na-eme ka obi ṅụrịa, otu a ka ụtọ enyi dị, site na ndụmọdụ nke mkpụrụobi ha.
10 Mukwano gwo ne mukwano gwa kitaawo tobaabuuliranga, olemenga okutawaana okuswala ewa muganda wo ng’ogudde mu mitawaana. Muliraanwa wo akira muganda wo akuli ewala.
Ahapụla enyi gị maọbụ ndị enyi nna gị. Mgbe ị nọ na mkpa arịọla nwanne gị ka o nyere gị aka. Onye agbataobi nọ gị nso nwere ike inyere gị aka karịa nwanne gị nọ ebe dị anya.
11 Beeranga n’amagezi mwana wange, osanyusenga omutima gwange, ndyoke nyanukule oyo yenna ansekerera.
Nwa m, obi ga-atọ m ụtọ nke ukwuu ma a sị na ị ga-amụta ihe! Mgbe ahụ, aga m enwe ihe m ga-asa ndị na-akọcha m.
12 Omuntu omutegeevu alaba akabenje ne yeekweka, naye abatalina magezi batambula butambuzi ne bagwa mu kabi.
Onye nwere uche na-ahụ nsogbu nke na-abịa nʼihu ma zobe onwe ya. Ma onye na-enweghị uche anaghị ele anya, ọ na-adaba nʼime nsogbu ahụ taa ahụhụ so ya.
13 Twalanga ekyambalo ky’oyo eyeeyimirira gw’atamanyi, era kwatanga eky’oyo eyeeyimirira omukazi omwenzi kye yeeyamye.
Chịrị uwe onye ahụ nke naara onye mba ọzọ na mbe. E, chiri ya ma ọ bụrụ nwanyị na-abụghị nwunye ya ka o nara na mbe.
14 Okulamusa ku muliraanwa wo mu makya ennyo, ng’oleekaana, obanga amukolimidde.
Ọ bụrụ na onye ọbụla e jiri oke olu gọzie onye agbataobi ya nʼisi ụtụtụ a ga-agụ nke a dịka ịbụ ọnụ.
15 Omukazi omuyombi ali ng’enkuba etonnya olutata, ku lunaku olw’enkuba ennyingi.
Mmiri na-ata nʼime ụlọ mgbe mmiri na-ezo na nwanyị na-eso okwu bụ otu.
16 Okumuziyiza obanga aziyiza empewo oba ng’anyweza omuzigo mu ngalo.
Onye nwere ike ịkwụsị ya nwere ike iji aka jide ifufe, maọbụ were aka jide mmanụ.
17 Ng’ekyuma bwe kiwagala ekyuma, n’omuntu bw’abangula muntu munne.
Dịka e si eji igwe amụ igwe ọzọ ka ọ dị nkọ, otu a ka mmadụ si enyere ibe ya aka ịdị nkọ.
18 Buli alabirira omutiini alirya ku bibala byagwo, n’oyo aweereza mukama we alissibwamu ekitiibwa.
Onye na-eche osisi fiig nche ga-eri mkpụrụ ya, onye na-echebekwa nna ya ukwu ka a ga-asọpụrụ.
19 Ng’amazzi bwe galaga omuntu bw’afaanana mu maaso, bwe gutyo omutima gw’omuntu bwe gulaga omuntu bw’afaanana.
Dịka e si ahụ ihu mmadụ nʼime mmiri otu a ka obi mmadụ si egosi ihe onye ahụ bụ.
20 Amagombe ne ggeyeena tebikkuta, n’amaaso g’abantu nago bwe gatyo tegakkuta. (Sheol h7585)
Dịka afọ adịghị eju ọnwụ na mbibi, otu a ihe na-agụ anya mmadụ adịghị agwụ agwụ. (Sheol h7585)
21 Entamu erongoosa ya ffeeza n’ekikoomi kikola ku zaabu, naye omuntu ekimugezesa kutenderezebwa.
Ite eji anụcha ihe dịrị ọlaọcha, oke ọkụ dịkwara ọlaedo ma a na-anwale ndị mmadụ site nʼotuto a na-enye ha.
22 Ne bw’osekula omusirusiru mu kinu, nga bw’osekula emmere y’empeke mu kinu, obusirusiru bwe tobumuggyaamu.
Nʼagbanyeghị na ị ga-egwepịa onye nzuzu nʼime ikwe, were aka odo gwee ha dịka mkpụrụ ọka, ị pụghị isite nʼahụ ha wepụ enweghị uche ha.
23 Okakasanga nti omanyi bulungi embeera z’ekisibo kyo, ossangayo omwoyo ku ggana lyo.
Lezie ọrụ gị anya nke ọma, marakwa ọnọdụ igwe ewu na atụrụ gị na anụ ụlọ ndị ọzọ,
24 Kubanga eby’obugagga tebibeerera mirembe gyonna, n’engule tebeerera mirembe gyonna.
nʼihi na akụnụba adịghị adịgide. Ọ bụladị okpueze nke onye eze na-emesịa gabiga.
25 Ng’omuddo gw’ensolo omukulu gumaze okusalibwawo, ng’omutoototo gutandise okusibukawo, nga n’omuddo ogw’omu busozi guleeteddwa,
Mgbe e gbupụchara ahịhịa ochie, nke ọhụrụ na-epupụta, mgbe ahụ ka a na-achịkọbata ahịhịa sị nʼugwu.
26 abaana b’endiga balikuwa engoye ez’okwambala, n’embuzi ziritundibwa ne zivaamu ensimbi.
Ụmụ atụrụ ga-enye gị uwe ị ga-eyi, ụmụ ewu ga-enyekwa gị ego ọnụahịa ala ubi gị.
27 Olibeera n’amata mangi g’onoggyanga mu mbuzi, okukuliisa ggwe n’ab’omu nnyumba yo, n’okuliisa abaweereza bo abawala.
Ị ga-enwe mmiri ara ewu nke ga-ezuru gị na ndị ezinaụlọ gị nri, na nke ga-edozi ahụ ndị odibo nwanyị gị.

< Engero 27 >