< Engero 22 >

1 Erinnya eddungi lyagalibwa okusinga eby’obugagga ebingi, n’okuganja kusinga ffeeza oba zaabu.
Ihe nhọrọ dị ezi mma ka aha ọma bụ karịa ọtụtụ akụ, ịnata amara ihuọma ka mma karịa ọlaọcha na ọlaedo.
2 Abagagga n’abaavu balina kimu ekibagatta, Mukama ye Mutonzi waabwe bonna.
Ma ogbenye ma ọgaranya bụ otu nʼihu Onyenwe anyị onye kere ha niile.
3 Omuntu omutegeevu bw’alaba akabi yeekweka, naye abatalina magezi bagenda bugenzi mu maaso ne balumizibwa.
Onye nwere uche na-ahụ nsogbu nke na-abịa nʼihu ma zobe onwe ya, ma onye na-enweghị uche anaghị ele anya, ọ na-adaba nʼime nsogbu ahụ taa ahụhụ so ya.
4 Obugagga n’ekitiibwa n’obulamu y’empeera ey’okwetoowazanga n’okutyanga Mukama.
Obi umeala bụ egwu Onyenwe anyị, ụgwọ ọ na-akwụ bụ akụnụba, na nsọpụrụ na ndụ ogologo.
5 Amaggwa n’emitego biri mu kkubo ly’omubambaavu; naye oyo akuuma emmeeme ye anaabyewalanga.
Ogwu na igbudu dị nʼụzọ onye na-emebi iwu; ma onye kpọrọ ndụ ya ihe na-asọ ya asọ.
6 Manyiiriza omwana mu kkubo erimugwanira okutambulirangamu, ne bw’alikula talirivaamu.
Kuziere nwantakịrị ka ọ họrọ ụzọ ziri ezi, mgbe o tolitere ọ ga-anọgide nʼime ya.
7 Omugagga afuga abaavu, naye eyeewola aba muddu w’oyo amuwola.
Dịka ọgaranya si achị ogbenye, otu a kwa ka onye na-ebi ego si bụrụ ohu onye na-ebinye ya ego.
8 Asiga obutali butuukirivu akungula mitawaana, n’oluga olw’obusungu bwe lulizikirizibwa.
Onye na-agha ikpe na-ezighị ezi dịka mkpụrụ, ga-ewe ajọ ihe dịka ihe ubi, mkpanaka nke ikike iwe ha ga-agbajikwa.
9 Omuntu omugabi anaabanga n’omukisa, kubanga emmere ye agirya n’abaavu.
Onye na-agbasapụ aka enye onyinye ga-abụ onye a gọziri agọzi, nʼihi na ha na ekenyetụ ndị ogbenye nri.
10 Goba omunyoomi, entalo zinaagenda, ennyombo n’okuvumagana binaakoma.
Chụpụ onye na-akwa emo, ise okwu ga-akwụsị, e, ịlụ ọgụ na nlelị ga-akwụsịkwa.
11 Omuntu eyeegomba omutima omulongoofu era ayogera n’eggonjebwa, talirema kuganja ewa kabaka.
Onye na-ahụ ịdị ọcha nke obi nʼanya, onye okwu ya jupụtara nʼamara ga-abụ enyi eze.
12 Amaaso ga Mukama galabirira amazima, era adibya entegeka z’abatali beesigwa.
Anya Onyenwe anyị na-echebe ihe ọmụma, ma ọ na-emebi atụmatụ niile nke ndị aghụghọ.
13 Omugayaavu ayogera nti, “Ebweru eriyo empologoma,” oba nti, “Nnyinza okutemulirwa mu kkubo.”
Onye umengwụ na-asị, “Ọdụm nọ nʼezi! A ga-egbu m nʼama ọha mmadụ!”
14 Malaaya mutego gwa kabi, akolimiddwa Mukama mw’afiira.
Ọnụ nwanyị na-akwa iko bụ oke olulu, nwoke nọ nʼokpuru oke iwe Onyenwe anyị na-adaba nʼime ya.
15 Obusirusiru busibiddwa ku mutima gw’omwana omuto, naye omuggo ogukangavvula gulimuwonyeza ddala.
Obi ụmụntakịrị jupụtara nʼenweghị uche, ma apịpịa ịdọ aka na ntị ga-achụpụ ya nʼebe dị anya.
16 Omuntu atulugunya abaavu ne yeeyongera okugaggawala, n’oyo agabira omugagga awa abagagga enguzi, enkomerero ya bombi bwavu.
Onye na-achọ uru site nʼimegbu onye na-enweghị ike, maọbụ onye na-enye ọgaranya onyinye ga-ebi nʼoke ụkọ.
17 Ossangayo omwoyo okuwuliriza ebigambo by’omugezi, n’omutima gwo eri ebyo bye njigiriza.
Lezie anya gee ntị nʼokwu niile nke ndị maara ihe, tinye uche gị nʼihe m na-akụzi.
18 Kibeera kya ssanyu bw’obikwata ku mutima gwo, n’oba mwetegefu okubiddamu byonna.
Ọ dị ụtọ ma idebe ha nʼobi gị, ma ha dịkwa nʼegbugbere ọnụ gị mgbe niile.
19 Mbikumanyisa leero ggwe, obwesige bwo bubeerenga mu Mukama.
Ọ bụ ka ntụkwasị obi gị dị nʼime Onyenwe anyị, ya ka m na-akụziri gị taa, ọbụladị gị onwe gị.
20 Kale sikuwandiikidde ebintu amakumi asatu ebikuwabula era ebikuwa okumanya?
Ọ bụ na m edepụtabereghị gị iri ndụmọdụ atọ ndị a, bụ okwu ndụmọdụ na ihe ọmụma?
21 Sikulaze ekirungi n’ekituufu, olyoke obe n’eky’okuddamu eri oyo eyakutuma?
Ha na-ezi gị ihe bụ ikwesi ntụkwasị obi na ikwu eziokwu. Mgbe ahụ ọ bụrụ na-ezie gị sị gị gaa chọta eziokwu ị ga-eji ezi ọsịsa lọghachi.
22 Tonyaganga mwavu, kubanga mwavu, oba okutulugunyanga aleeteddwa mu mbuga.
Emegbula ogbenye nʼihi na ọ bụ ogbenye. Emegidekwala ya nʼụzọ ikpe.
23 Kubanga Mukama alibawolereza, n’abo ababanyaga alibanyaga.
Nʼihi na Onyenwe anyị ga-ekwuchitere ha ọnụ ha ma bibiekwa ndị na-emegide ha.
24 Tokwananga muntu wa busungu, oba okuyitanga n’omuntu anyiiganyiiga amangu,
Gị na onye na-ewe oke iwe abụla enyi, gị na onye na-ewe iwe ọsịịsọ emekọkwala ihe,
25 oleme okuyiga amakubo ge ne weesuula mu mitawaana.
ma ọ bụghị ya, i nwere ike ịmụta ndụ ha, si otu a tinye ndụ gị na nsogbu.
26 Teweegattanga ku abo abeeyama, newaakubadde ku abo abeeyimirira ab’amabanja.
Abụla onye otu nʼime ndị na-anara ndị mmadụ akaebe maọbụ kwee nkwa ikwu ụgwọ onye ọzọ ji.
27 Bw’oliba nga tolina kya kusasula ekitanda kyo kyennyini kye kirikuggyibwako.
Nʼihi na ọ bụrụ na i nweghị ego ị ga-eji kwụọ ụgwọ ahụ, a ga-anapụ gị ọ bụladị ihe ndina gị.
28 Tojjululanga nsalo bajjajjaabo gye bassaawo edda.
Ehigharịla oke ala e tinyere site na mgbe ochie. Nke ndị nna ochie gị ha hiwere.
29 Omanyi omuntu omunyiikivu era omukugu mu mulimu gwe? Aliweereza bakabaka; taliweereza bantu batamanyiddwa.
Ị hụrụ mmadụ ahụ nke nwere ǹka nʼịrụ ọrụ ya nke ọma? Ọ ga-eguzo nʼihu ndị eze, ọ gaghị eguzo nʼihu ndị a na-amaghị aha ha.

< Engero 22 >