< Makko 1 >

1 Entandikwa y’Enjiri ya Yesu Kristo, Omwana wa Katonda.
Mmalite oziọma maka Jisọs Kraịst, Ọkpara Chineke.
2 Kyawandiikibwa mu kitabo kya nnabbi Isaaya nti, “Laba ntuma omubaka wange akukulembere, ateeketeeke ekkubo lyo;
Dịka e dere ya rịị nʼakwụkwọ Aịzaya onye amụma sị, “Aga m ezipu onyeozi m nʼihu gị, onye ga-edozi ụzọ gị.”
3 eddoboozi ly’oyo ayogelera waggulu mu ddungu nti, ‘Muteeketeeke ekkubo lya Mukama, mutereeze amakubo ge.’”
“Otu onye na-eti mkpu nʼọzara, na-asị, ‘Dozienụ ụzọ maka Onyenwe anyị, meenụ ka okporoụzọ ya guzozie.’”
4 Yokaana yajja ng’abatiriza mu ddungu, ng’abuulira okubatiza okw’okwenenya olw’okusonyiyibwa ebibi.
Jọn omee baptizim pụtara na-eme baptizim nʼọzara, ma na-ekwusa baptizim nke nchegharị maka mgbaghara mmehie.
5 Ensi yonna ey’e Buyudaaya n’abantu bonna ab’omu Yerusaalemi, ne bagendanga gy’ali, n’ababatiza mu mugga Yoludaani nga baatula ebibi byabwe.
Ndị mmadụ si nʼakụkụ Judịa niile na ndị niile bi na Jerusalem pụrụ jekwuru ya. Ka ha na-ekwupụta mmehie ha, o mere ha baptizim nʼosimiri Jọdan.
6 Yokaana yayambalanga ekyambalo eky’obwoya bw’eŋŋamira, ne yeesibanga olukoba olw’eddiba mu kiwato kye, era yalyanga nzige na mubisi gwa njuki.
Uwe Jọn yi nʼahụ ya bụ nke e ji ajị ịnyịnya kamel mee. O kekwara ihe okike e ji akpụkpọ anụ mee nʼukwu ya. Nri ya bụ igurube na mmanụ aṅụ.
7 Yabuuliranga ng’agamba nti, “Waliwo omuntu omukulu era ansinga amaanyi ajja okujja, gwe sisaanira na kusumulula bukoba bwa ngatto ze.
O kwusara sị: “Onye dị ike karịa m na-abịa nʼazụ m. Onye m na-erughị ihudata ala tọpụ eriri akpụkpọụkwụ ya.
8 Nze mbabatiza na mazzi, naye ye alibabatiza na Mwoyo Mutukuvu.”
Eji m mmiri na-eme unu baptizim, ma ọ ga-eji Mmụọ Nsọ mee unu baptizim.”
9 Awo olwatuuka mu nnaku ezo Yesu n’ava e Nazaaleesi mu Ggaliraaya n’ajja, Yokaana n’amubatiza mu mugga Yoludaani.
Nʼoge ahụ, Jisọs sitere na Nazaret nke Galili bịa nʼosimiri Jọdan, ebe Jọn mere ya baptizim.
10 Awo Yesu bwe yali yaakava mu mazzi, n’alaba eggulu nga libikkuse, ne Mwoyo ng’ali ng’ejjiba ng’amukkako.
Ma mgbe o si nʼime mmiri ahụ na-apụta, ọ hụrụ ka eluigwe meghere. Hụkwa Mmụọ Nsọ dị ka nduru ka ọ rịdatara bekwasị ya nʼisi ya.
11 Eddoboozi ne liva mu ggulu nga ligamba nti, “Ggwe Mwana wange omwagalwa, ggwe, gwe nsanyukira ennyo.”
Otu olu si nʼeluigwe daa, “Ị bụ Ọkpara m hụrụ nʼanya, ihe gị dị m ezi mma.”
12 Amangwago Mwoyo n’amutwala mu ddungu.
Ngwangwa, Mmụọ Nsọ duuru ya baa nʼime ọzara.
13 N’amalayo ennaku amakumi ana ng’ali n’ensolo ez’omu nsiko, ng’akemebwa Setaani, kyokka nga bamalayika bamuweereza.
Ọ nọkwara nʼime ọzara ahụ iri ụbọchị anọ, ebe ekwensu nwara ya ọnwụnwa. Ya na ụmụ anụ ọhịa nọkwa. Ma ndị mmụọ ozi jeere ya ozi.
14 Oluvannyuma nga Yokaana Omubatiza amaze okusibwa mu kkomera, Yesu n’ajja mu Ggaliraaya okubuulira Enjiri ya Katonda,
Mgbe e tinyesịrị Jọn nʼụlọ mkpọrọ, Jisọs gara na Galili, na-ekwusa oziọma Chineke.
15 ng’agamba nti, “Ekiseera kituukiridde, n’obwakabaka bwa Katonda busembedde! Mwenenye mukkirize Enjiri.”
Ọ sịrị, “Oge ahụ eruola, alaeze Chineke dị nso. Chegharịanụ ma kwerekwanụ nʼoziọma.”
16 Awo Yesu yali ng’ayita ku lubalama lw’ennyanja y’e Ggaliraaya, n’alaba Simooni ne muganda we Andereya nga basuula obutimba bwabwe mu nnyanja; kubanga baali bavubi.
Mgbe Jisọs na-aga nʼakụkụ osimiri Galili, ọ hụrụ Saimọn na Andru nwanne ya, ka ha na-awụnye ụgbụ ha nʼime mmiri nʼihi na ha bụ ndị ọkụ azụ.
17 Yesu n’abagamba nti, “Mujje mungoberere nange ndibafuula abavubi b’abantu!”
Jisọs siri ha, “Bịanụ soro m, m ga-emekwa unu ndị ọkụ na-akụta mmadụ.”
18 Amangwago ne baleka obutimba bwabwe ne bamugoberera.
Ngwangwa ha hapụrụ ụgbụ azụ ha ma soro ya.
19 Bwe yeeyongerayo katono, n’alaba Yakobo ne Yokaana batabani ba Zebbedaayo, nga bali mu lyato baddaabiriza obutimba bwabwe.
Mgbe ọ gatụrụ nʼihu nke nta, ọ hụrụ Jemis nwa Zebedi na nwanne ya bụ Jọn ndị nọ nʼime ụgbọ mmiri, na-ekezi ụgbụ azụ ha.
20 Amangwago n’abayita ne baleka kitaabwe Zebbedaayo mu lyato n’abapakasi, ne bagoberera Yesu.
Ngwangwa, ọ kpọrọ ha, ha hapụrụ nna ha Zebedi na ndị o goro ọrụ nʼime ụgbọ soro ya.
21 Awo ne bayingira mu Kaperunawumu. Amangwago n’ayingira mu kuŋŋaaniro ku Ssabbiiti, n’abayigiriza.
Ha gara Kapanọm, mgbe ụbọchị izuike ruru, ọ bara nʼime ụlọ ekpere ma malite izi ha ihe.
22 Ne beewuunya okuyigiriza kwe, kubanga yabayigiriza nga nannyini buyinza, so si ng’abannyonnyozi b’amateeka bwe baakolanga.
Ozizi ya juru ha anya nke ukwuu, nʼihi na o ziri ha ihe dịka onye nwere ikike, ọ bụghị dị ka nke ndị ozizi iwu.
23 Amangwago ne walabika omusajja eyaliko omwoyo omubi mu ssinzizo, n’awowoggana,
Ma nʼotu oge ahụ, otu nwoke nọ nʼime ụlọ ekpere ahụ nke mmụọ na-adịghị ọcha bi nʼime ya, tiri mkpu nʼoke olu,
24 ng’agamba nti, “Otwagaza ki Yesu Omunnazaaleesi? Ozze okutuzikiriza? Nkumanyi gwe Mutukuvu wa Katonda.”
sị, “Gịnị ka anyị na gị nwekọrọ, gị Jisọs onye Nazaret? Ị bịala ịla anyị nʼiyi? Amaara m onye ị bụ, Onye Nsọ nke Chineke.”
25 Awo Yesu n’aguboggolera ng’agamba nti, “Sirika era muveeko.”
Ma Jisọs baara ya mba sị ya, “Mechie ọnụ sikwa nʼime ya pụta!”
26 Awo omwoyo omubi ne gumusikambula nnyo, ne gumuvaako.
Mmụọ ahụ na-adịghị ọcha seere ya, mee ka ahụ ya maa jijiji, o tiri mkpu nʼoke olu, ma sikwa nʼime ya pụta.
27 Buli omu ne yeewuunya, ne beebuuzaganya nti, “Kuyigiriza kwa ngeri ki kuno okuggya okujjudde obuyinza? So n’emyoyo emibi agiragira ne gimugondera.”
Ha niile bụ ndị nọ nʼọnọdụ ihe iju anya ma na-ajụrịtara onwe ha ajụjụ sị, “Gịnị bụ nke a? Ozizi ọhụrụ ya na ikike! Ọ na-enye ọ bụladị mmụọ na-adịghị ọcha iwu. Ha na-erubekwara ya isi.”
28 Amangwago amawulire agamukwatako ne gasaasaana wonna mu byalo ebyetoolodde Ggaliraaya.
Akụkọ banyere ya gbasara ngwangwa ruo akụkụ niile nke Galili.
29 Amangwago ne bava mu kkuŋŋaaniro ne bagenda mu nnyumba ya Simooni ne Andereya nga bali ne Yakobo ne Yokaana.
Ngwangwa ha hapụrụ ụlọ ekpere ahụ, ha na Jemis na Jọn soro banye nʼụlọ Saimọn na Andru.
30 Ne basanga nga nnyina muka Simooni agalamidde mulwadde omusujja. Amangwago ne bakitegeeza Yesu.
Nʼoge a, nne nwunye Saimọn dina nʼakwa ndina. Ahụ ọkụ jikwa ya. Ha mere ka ọ mata banyere ya.
31 Bwe yamusemberera, n’amukwata ku mukono n’amuyimusa, omusujja ne gumuwonako, n’abaweereza!
Ọ gakwuru ya, jide ya nʼaka selite ya elu. Ahụ ọkụ ahụ hapụrụ ya. Ọ malitekwara ile ha ọbịa.
32 Awo obudde bwe bwali buwungeera, ng’enjuba egwa, ne bamuleetera abalwadde bonna, n’abaaliko dayimooni.
Nʼoge uhuruchi, mgbe anwụ dara, ha kpọtaara ya ndị niile ahụ na-esighị ike na ndị mmụọ ọjọọ bi nʼime ha.
33 Ekibuga kyonna ne kikuŋŋaanira ku luggi.
Obodo ahụ niile gbakọrọ nʼọnụ ụzọ.
34 Era Yesu n’awonya abalwadde bangi abaalina endwadde ez’enjawulo era n’abaaliko baddayimooni bangi n’ababagobako, ne baddayimooni teyabaganya kwogera, kubanga baali bamumanyi.
Ọ gwọrọ ọtụtụ ndị bu ọrịa dị iche iche, ọ chụpụkwara ọtụtụ mmụọ ọjọọ ma o kweghị ka mmụọ ọjọọ ndị ahụ kwuo okwu nʼihi na ha matara onye ọ bụ.
35 Enkeera ng’obudde tebunnalaba yesu n’azuukuka n’agenda yekka mu kifo ekyekusifu, okusaba.
Nʼisi ụtụtụ, mgbe ọchịchịrị ka gbachiri, o biliri, ga ebe ọ ga-anọrọ onwe ya, naanị ya. Nʼebe ahụ kwa ka ọ nọ kpee ekpere.
36 Awo Simooni ne be yali nabo ne bamunoonya,
Saimọn na ndị ya na ha nọ pụrụ na-achọgharị ya.
37 bwe baamulaba ne bamugamba nti, “Buli muntu akunoonya.”
Ma mgbe ha hụrụ ya, ha sịrị ya, “Mmadụ niile na-achọgharị gị!”
38 Naye Yesu n’abagamba nti, “Tugende awalala mu byalo ebituliraanye, n’abeeyo mbabuulire, kubanga ekyo kye najjirira.”
Ọ zaghachiri ha sị, “Ka anyị gaanụ ebe ọzọ, nʼobodo ndị ọzọ dị anyị gburugburu, ka m zisakwaara ha oziọma. Ọ bụ nʼihi nke a ka m ji bịa.”
39 Awo n’abuulira mu makuŋŋaaniro ag’omu kitundu kyonna eky’e Ggaliraaya, era n’agoba ne baddayimooni.
Ya mere, ọ pụrụ jegharịa na Galili niile na-ekwusa oziọma nʼụlọ ekpere ha niile, na-achụpụkwa mmụọ ọjọọ.
40 Awo omugenge n’ajja eri Yesu ne yeegayirira ng’afukamidde mu maaso ge, n’amugamba nti, “Bwe kuba nga kwe kusiima kwo, oyinza okunnongoosa.”
Otu onye ekpenta bịakwutere ya gbuo ikpere nʼala rịọọ ya sị, “Ọ bụrụ na ị chọrọ, ị pụrụ ime ka m dị ọcha.”
41 Yesu n’amusaasira, n’agolola omukono gwe, n’amukwatako, n’amugamba nti, “Nsiimye, longooka!”
Ebe o jupụtara nʼọmịiko, Jisọs setịpụrụ aka ya metụ ya sị, “Achọrọ m, dị ọcha!”
42 Amangwago ebigenge ne bimuwonako, n’aba mulongoofu.
Ngwangwa ekpenta ya hapụrụ ya, e mekwara ka ọ dị ọcha.
43 Awo Yesu n’amukuutira nnyo n’amusiibula,
Mgbe ahụ, Jisọs ji ịdọ aka na ntị zilaga ya,
44 ng’agamba nti, “Kino tokibuulirako muntu n’omu, wabula genda weeyanjule eri kabona, oweeyo n’ekirabo Musa kye yalagira okuweebwangayo, okuba obujulirwa gye bali.”
ọ gwara ya sị, “Hụkwa na ọ dịghị onye ọbụla ị ga-agwa ihe a. Kama gaa gosi onye nchụaja onwe gị. Chụọkwa aja dị ka Mosis nyere nʼiwu, maka ime ka ị dị ọcha gị, ka ọ bụrụ ihe ama nye ha.”
45 Naye omusajja n’atandika okwogera ku ebyo ebyamubaako, n’okubibunyisa. Yesu n’atasobola kuyingira mu kibuga mu lwatu, naye n’abeeranga mu bifo ebyekusifu. Abantu ne bajjanga gy’ali okuva mu njuyi zonna.
Ma ọ pụrụ malite ịkọsa akụkọ banyere ọgwụgwọ ya ebe niile. Nʼihi ya Jisọs enwekwaghị ike ịbanye nʼobodo, kama ọ gara nọrọ nʼebe zoro ezo. Ma ndị mmadụ na-abịakwutekwa ya site nʼebe niile dị iche iche.

< Makko 1 >