< Balam 19 >

1 Awo mu biro ebyo tewaali kabaka mu Isirayiri. Ne wabaawo Omuleevi eyabeeranga mu kyalo mu nsi ey’ensozi eya Efulayimu eyawasa omukazi mu Besirekemu mu Yuda.
Nʼoge a, Izrel enweghị eze na-achị ha. Nʼoge ahụ kwa, ọ dị otu nwoke, onye Livayị bi nʼebe dị anya nʼala ugwu ugwu Ifrem. Nwoke a gara Betlehem, nʼime Juda, kpọrọ otu nwaagbọghọ ka ọ bụrụ iko ya nwanyị.
2 Naye mukazi we oyo n’ataba mwesigwa n’anoba ku bba, n’addayo mu nnyumba ya kitaawe e Besirekemu mu Yuda n’amalayo emyezi ena.
Ma iko ya nwanyị ahụ kwara iko megide ya. Ọ hapụrụ ya laghachi nʼezinaụlọ nne na nna ya na Betlehem, Juda. Ọ nọrọ ọnwa anọ nʼebe ahụ.
3 Bba n’agolokoka n’agenda n’omuweereza we n’endogoyi bbiri okwogera ne mukazi we amukomyewo. Omukazi n’amutwala mu nnyumba ya kitaawe era kitaawe w’omuwala bwe yamulaba n’asanyuka era n’amwaniriza.
Nwoke ahụ kpebiri ịga nʼụlọ nna nwaagbọghọ ahụ ịrịọ ya ka ọ lọghachi. Ọ kpọọrọ otu nʼime ndị ohu ya, duru ịnyịnya ibu abụọ. Mgbe nwoke ahụ bịaruru nʼụlọ ahụ, iko ya nwanyị kpọbatara ya nʼụlọ nna ya. Mgbe nna nwaagbọghọ ahụ hụrụ ya, o jiri ọṅụ kelee ya ekele.
4 Awo mukoddomi we, kitaawe w’omuwala n’amuwaliriza asigaleyo ennaku ssatu. Ne balya ne banywa ne basula eyo.
Nna nwanyị ahụ rịọrọ ya ka ọ nọnyere ha ụfọdụ oge. Nʼihi nke a, ọ nọnyeere ha ụbọchị atọ. Ha niile nọrọ ọnọdụ obi ụtọ abalị atọ ahụ niile, rie ṅụọkwa.
5 Awo ku lunaku olwokuna ne bagolokoka mu makya, Omuleevi ne yeeteekateeka okugenda. Kyokka kitaawe w’omuwala n’agamba mukoddomi we nti, “Mwesanyuse mumale okulya ku mmere, mulyoke mugende.”
Nʼụbọchị nke anọ, nwoke ahụ na iko ya jikeere nʼisi ụtụtụ ịlaghachi. Ma nna nwanyị ahụ rịọrọ ha sị ha, “Jirinụ ihe oriri gbaanụ onwe unu ume. Emesịa unu nwere ike ịlawa.”
6 Ne batuula ne balya era ne banywa bonna wamu. Kitaawe w’omuwala n’agamba omusajja nti, “Kaakano kkiriza osule, omutima gwo gusanyukeko.”
Ya mere, ha abụọ nọdụrụ ala rie ihe, ṅụọkwa ihe ọṅụṅụ. Mgbe e mesiri, nna nwaagbọghọ ahụ sịrị ha, “Biko, nọdụnụ rahụ ụra nʼabalị taa, meekwanụ onwe unu obi ụtọ.”
7 Omusajja bwe yagolokoka okugenda, mukoddomi we n’amuwaliriza okusigala era n’asula ekiro ekyo.
Ma mgbe nwoke ahụ biliri ka ọ laa, nna nwaagbọghọ ahụ, nọgidere ya, nke a mere ka o kwenye ịnọ ruo echi ya.
8 Ku lunaku olwokutaano, bwe yagolokoka mu makya okugenda, kitaawe w’omuwala n’amugamba nti, “Weesanyuse kaakano. Ojjira weesanyusa okutuusa obudde lwe bunaawungeera.” Ne balya bonna wamu.
Nʼisi ụtụtụ ụbọchị nke ise, ha bilikwara ngwangwa jikere ịhapụ ma ịlaghachi. Ọzọkwa, nna nwaagbọghọ ahụ rịọkwara ha sị ha, “Biko, nọgidenụ nʼụtụtụ taa, ma nʼoge ehihie unu nwere ike laa.” Nʼihi nke a, ha nọgidekwara rie, ṅụọ.
9 Omusajja bwe yagolokoka okugenda ne mukazi we n’omugole we, mukoddomi we kitaawe w’omuwala n’amugamba nti, “Laba, kaakano obudde buzibye. Sula obudde buyise. Sigala wano weesanyuse, onoogolokoka enkya n’oddayo ewuwo.”
Mgbe nwoke ahụ na iko ya nwanyị, na ohu ya, jikeere ịhapụ, nna nwaagbọghọ ahụ rịọkwara ha sị ha, “Biko, lee chi ebidola iji ugbu a, abalị adịkwala nso. Biko, nọgide nʼụlọ m naanị abalị taa. Anyị ga-emekwa onwe anyị obi ụtọ abalị taa niile. Ma unu ga-amalite ije unu nʼisi ụtụtụ echi. Mgbe ahụ, unu ga-ala nʼudo.”
10 Naye omusajja n’atakkiriza. N’asitula n’agenda ne mukazi we, n’endogoyi ze zombi nga zeetisse, ku luuyi olw’e Yebusi, ye Yerusaalemi.
Ma nwoke ahụ ekweghị ịnọ ọnọdụ abalị ọzọ, ọ hapụrụ gawa nʼụzọ ije Jebus (ya bụ Jerusalem), ya na ịnyịnya ibu ya abụọ akwadoro maka njem nakwa iko ya nwanyị.
11 Bwe baali bali kumpi ne Yebusi, n’obudde nga buyise, omuweereza n’agamba mukama we nti, “Jjangu tukyame tuyingire mu kibuga kino eky’Abayebusi tusule omwo.”
Ha rutere ebe ahụ oge chi na-akwado iji. Ohu ya sịrị nna ya ukwu, “Bịa, ka anyị kwụsị nʼobodo ndị Jebus a, nọ ọnọdụ abalị.”
12 Mukama we n’amuddamu nti, “Tetuukyame kuyingira mu kibuga ky’abatali baana ba Isirayiri, eky’abannaggwanga. Tujja kweyongerayo tulage e Gibea.”
Ma nna ya ukwu zaghachiri, “Mba! Anyị agaghị aba nʼobodo ndị na abụghị ụmụ Izrel. Anyị ga-aga nʼihu ruo Gibea.”
13 N’agamba omuweereza we nti, “Tusemberere ekimu ku bifo ebyo, tusule e Gibea oba mu Laama.”
O kwukwara sị, “Bịa ka anyị gbalịa iru Gibea maọbụ Rema, nọọ ọnọdụ abalị nʼotu nʼime ebe ndị a.”
14 Ne beeyongerayo. Enjuba n’egwa nga basemberera Gibea ekya Benyamini.
Ya mere, ha gara nʼihu nʼije ha. Anwụ dara dịka ha na-eru Gibea dị na Benjamin.
15 Ne bakyama eyo mu Gibea, gye baba basula. Ne balaga mu kifo ekigazi eky’ekibuga ne batuula eyo, kyokka ne wataba muntu n’omu eyajja okubatwala ewuwe.
Nʼebe ahụ ka ha kwụsịrị ịnọ ọnọdụ abalị. Ha gara nọrọ na mbara ama obodo ahụ, ma o nweghị onye ọbụla kpọbatara ha ka ha rahụ ụra nʼụlọ ya.
16 Era laba, ne wajja omusajja omukadde eyali ava ku mirimu gye egy’omu nnimiro akawungeezi, ng’asibuka mu nsi ey’ensozi eya Efulayimu, ng’abeera mu Gibea. Abantu b’e Gibea baayitibwanga Babenyamini.
Nʼanyasị ahụ, otu agadi nwoke zutere ha ka o si ịrụ ọrụ nʼubi na-alọghachi, onye si nʼobodo ugwu ugwu Ifrem, ma o bi ka onye ọbịa na Gibea (ndị bi nʼebe a bụ ndị Benjamin).
17 N’ayimusa amaaso ge n’alaba omusajja omutambuze, ng’ali mu kifo ekigazi eky’ekibuga. Omusajja n’amubuuza nti, “Ova wa era olaga wa?”
Mgbe agadi nwoke a hụrụ ndị ije ahụ na mbara ama obodo ahụ, ọ jụrụ ha ajụjụ sị, “Ebee ka unu si bịa? Ebee ka unu na-aga?”
18 N’amuddamu nti, “Nva mu Besirekemu mu Yuda, ndaga mu byalo eby’ensi ey’ensozi eya Efulayimu gye mbeera. Nva mu Besirekemu mu Yuda, nzirayo mu nnyumba ya Mukama, naye tewali anyannirizza mu nnyumba ye.”
Nwoke ahụ zara sị ya, “Anyị si Betlehem dị na Juda na-alọghachi nʼụlọ anyị dị nʼebe dị anya nʼala ugwu ugwu Ifrem. Esi m ebe ahụ gaa Betlehem dị na Juda, ma ugbu a, ana m aga nʼụlọ Onyenwe anyị. O nweghị onye kpọbatara anyị nʼụlọ ya.
19 Wabula nnina essubi n’emmere ey’endogoyi zange, ate naffe abaweereza bo tulina emmere ne wayini ebitumala nze, n’omuweereza wo omukazi, n’omuvubuka.
Anyị nwere ihe oriri nke ịnyịnya ibu anyị ga-eri, achịcha na mmanya nke anyị bụ ndị ohu gị ga-eri, ya bụ, mụ onwe m na ohu gị nwanyị na nwokorobịa so anyị. Anyị achọghị ihe ọbụla nʼaka onye ọbụla.”
20 Omusajja omukadde n’abagamba nti, “Mbanirizza ewange mwenna. Temwetaaga kusula mu kifo ekigazi eky’ekibuga.”
Agadi nwoke ahụ sịrị ha, “Batanụ nʼụlọ m dịka ndị ọbịa nke m. Ka m nye unu ihe niile bụ mkpa unu. Naanị unu anọla ọnọdụ abalị nʼama.”
21 Awo n’abatwala mu nnyumba ye, n’aliisa endogoyi ze, ne banaaba ku bigere, ne balya, ne banywa.
Nʼihi nke a, ọ kpọbatara ha nʼụlọ ya. O duuru ịnyịnya ibu ha, nye ha ihe oriri. Emesịa, ha sara ụkwụ ha mmiri, nọdụ ala rie ma ṅụọkwa.
22 Awo bwe baali nga beesanyusaamu, laba, abasajja ab’omu kibuga ekyo, abaana ab’obutali butuukirivu ne bazingiza ennyumba nga bwe bakoona oluggi. Ne bagamba nannyini nnyumba, omusajja omukadde nga bwe bawowoggana nti, “Fulumya omusajja oyo ayingidde mu nnyumba yo, tumusiyage.”
Ma mgbe ha risiri nri, nọrọ na-ezu ike, na-akpakọrịta ụka, na mberede, ndị ikom ụfọdụ sitere nʼobodo ahụ, ndị jọgburu onwe ha nʼomume gbara ụlọ ahụ gburugburu. Ha malitekwara iti aka nʼụzọ ahụ na iti mkpu na-akpọku agadi nwoke ahụ, sị ya, “Kpọpụta onye ọbịa ahụ nọ nʼime ụlọ gị ka anyị mara ya.”
23 Nannyini nnyumba n’afuluma, n’abagamba nti, “Nedda mikwano gyange, temubeera bagwenyufu. Olw’okuba ng’omusajja ono azze mu nnyumba yange, temukola kintu kya buswavu bwe kityo.
Agadi nwoke ahụ bụ onyenwe ụlọ ahụ pụkwuuru ha nʼezi, sị ha, “Biko ụmụnna m, unu emela ihe ọjọọ dị otu a. Nwoke a nọ nʼụlọ m dịka ọbịa. Unu emela ihe ihere dị otu a.
24 Mulaba muwala wange wuuno, mbeerera, ate n’omukazi w’omusajja naye nzija kubamuwa. Baabo mubakole kye mwagala. Naye omusajja ono temumukola kintu kya buswavu bwe kityo.”
Ka m kpọpụtara unu nwa m nwanyị na-amaghị nwoke, na iko nwanyị nwoke a ka unu jiri ha mee ihe ọbụla unu chọrọ ma hapụnụ nwoke a. Unu emela ihe ihere dị otu a.”
25 Naye abasajja ne bagaana okumuwuliriza. Omusajja kyeyava addira mukazi we, n’amufulumya, ne bamukwata ne bamusobyako ekiro kyonna, ne bamuta agende ng’emmambya esala.
Ma ndị ikom ahụ egeghị ya ntị. Ya mere, nwoke ahụ kpọpụtara iko ya nwanyị zipụrụ ha ya nʼezi. Ha niile nʼotu na otu, dinakwuru nwanyị ahụ abalị ahụ niile. Mgbe chi na-achọ ịbọ, ha hapụrụ ya ka ọ laa.
26 Omukazi n’addayo n’atuuka obudde nga bukya, n’agwa ku luggi lw’ennyumba, mukama we gye yali asuze, n’abeera awo okutuusa obudde bwe bwakya.
Nʼisi ụtụtụ, nwanyị ahụ biliri laghachi azụ nʼụlọ ahụ iko ya nwoke nọ. Ma ọ dara nʼala nʼihu ọnụ ụzọ ụlọ ahụ tọgbọrọ nʼebe ahụ tutu chi abọzie.
27 Mukama we bwe yagolokoka mu makya, n’aggulawo enzigi z’ennyumba ye n’afuluma agende ku lugendo lwe, laba, mukazi we ng’agudde mu maaso g’ennyumba, ng’emikono gye gikunukkiriza omulyango.
Mgbe nwoke ahụ biliri nʼụtụtụ, meghee ụzọ ka ọ malite ije ya, ọ hụrụ iko ya nwanyị ahụ ka ọ tọgbọ nʼọnụ ụzọ ahụ. Aka ya abụọ dịkwa nʼọnụ ụzọ mbata ụlọ ahụ.
28 N’agamba mukazi we nti, “Golokoka tugende.” Kyokka ne wataba kanyego. Omusajja n’amuteeka ku ndogoyi, n’agenda ewuwe.
Nwoke ahụ kpọkuru ya sị ya, “Ngwa, bilie ka anyị laa.” Ma nwaagbọghọ ahụ ekwughị okwu ọbụla. Nwoke ahụ buliri ya, tụkwasị ya nʼelu ịnyịnya ibu ya, buru ya laa nʼobodo nke aka ya.
29 Bwe yatuuka ewuwe, n’addira akambe, n’akwata mukazi we, n’amusalaasalamu ebifi kkumi na bibiri, n’abiweereza mu buli kitundu ekya Isirayiri.
Mgbe ọ bịaruru obodo ya, ọ banyere nʼụlọ ya wepụta mma jiri ya bọwaa ozu iko ya nwanyị ahụ ụzọ iri na abụọ. O zigaara ebo iri na abụọ niile dị nʼIzrel otu ụzọ, otu ụzọ.
30 Awo buli muntu eyabirabangako n’agamba nti, “Ekikolwa ekiri nga kino tekikolebwanga so tekirabibwanga okuva ku lunaku abaana ba Isirayiri lwe baayambukirako okuva mu nsi y’e Misiri n’okutuusa leero. Mukirowoozeeko, mukifumiitirizeeko era tulabe eky’okukola.”
Nʼihi nke a, Onye ọbụla hụrụ ihe ọjọọ a kwuru sị, “O nwebeghị onye ọbụla mere ụdị ajọ omume dị otu a kemgbe ụmụ Izrel si nʼobodo Ijipt pụta. Chee echiche banyere ihe a. Tulee ya ma gwa anyị ihe anyị ga-eme?”

< Balam 19 >