< Yobu 39 >

1 “Omanyi ebiro embuzi z’oku nsozi mwe zizaalira? Oba oyinza okumanya empeewo we ziwakira?
“Ị maara mgbe ewu ọhịa bi nʼelu ugwu ji amụ nwa? O nweela mgbe ị ji hụ nne ele ka ọ na-amụpụta nwa ya?
2 Oyinza okubala emyezi gye zimala zizaale? Omanyi obudde mwe zizaalira?
Ị na-agụkọ ọnwa ole afọ ime ha na-adị tupu ha amụọ nwa ha. Ị maara oge ha na-amụ ụmụ ha?
3 Zikutama ne zizaala abaana baazo, ne ziwona obulumi bw’okuzaala.
Ha na-amakpuru ala mụpụta nwa ha. Ihe mgbu nke ọmụmụ nwa ha ebiekwa.
4 Abaana baazo bakula ne bagejjera ku ttale, batambula ne bagenda obutadda.
Ụmụ ha na-eto nʼọhịa gbasiekwa ike. Ha na-apụ, ha adịghị alaghachikwute ha ọzọ.
5 “Ani eyaleka entulege okwetambulira mu ddembe lyayo? Ani eyasumulula emiguwa gyayo,
“Onye na-eme ka ịnyịnya ibu ọhịa nwere onwe ya? Onye na-atọpụ agbụ e kere ya?
6 gye nawa ensi ey’omuddo okuba amaka gaayo, n’ensi ey’omunnyo okubeerangamu?
Nke m nyere ala ihe na-adịghị ka ọ bụrụ ebe obibi ha, ala nnu ahụ ka ọ bụrụ ụlọ ha.
7 Esekerera oluyoogaano lw’ekibuga, tewuliriza kulekaana kw’abavuzi ba bidduka.
Ụzụ dị nʼobodo adịghị emetụta ya, ọ naghị anụkwa mbigbọ nke onye na-achị ya.
8 Ebuna ensozi, ly’eddundiro lyayo, ng’enoonya ekintu kyonna ekibisi.
Elu ugwu niile bụ ebe ịkpa nri ya, ebe ahụ ka ọ na-achọpụta ahịhịa ndụ ọbụla.
9 “Embogo eyinza okukkiriza okuba omuweereza wo, n’esula ekiro mu kisibo kyo?
“Ị nwere ike ime ka atụ jeere gị ozi? Ị nwere ike ime ka ọ nọdụ nʼabalị nʼụlọ ebe ị na-azụ anụ ụlọ gị nri?
10 Oyinza okugisiba ku muguwa n’ogirimisa olubimbi? Eyinza okukuvaako emabega ng’erima mu kiwonvu.
Ị nwere ike ime ka atụ rụọra gị ọrụ nʼubi gị? Ọ ga-akpụgharịrị gị ọgụ ị ji akọ ala?
11 Oyinza okugyesiga olw’amaanyi gaayo amangi? Oyinza okugirekera emirimu gyo egy’amaanyi?
Ị ga-atụkwasị ya obi nʼihi na ike ya hiri nne? Ị ga-ahapụrụ ya ọrụ ndị ahụ siri ike ka ọ rụọ?
12 Oyinza okugyesiga okukuleetera emmere yo ey’empeke, oba okukuleetera eŋŋaano mu gguuliro lyo?
I nwere ike ịtụkwasị ya obi ka o gaa bulatara gị ọka site nʼebe ịzọcha ọka gị?
13 “Ebiwaawaatiro bya maaya bisanyusa nga byewujja, naye ebiwaawaatiro n’ebyoya bya kalooli tebiraga kisa.
“Enyi nnụnụ na-eji ọṅụ gbasapụ nku ya, ma a pụghị iji nku ya tụnyere nku na abụba nke ụgbala.
14 Kubanga emaaya ebiika amagi gaayo ku ttaka, n’egaleka ne gabugumira mu musenyu,
Ọ na-eyi akwa ya nʼala ma hapụ ha ka uzuzu kpoo ha ọkụ.
15 ne yeerabira nti, ekigere kisobola okugaasa, era nga ensolo ey’omu nsiko eyinza okugalinnya.
Ọ naghị emetụ ya nʼobi na ụkwụ nwere ike ịzọpịa ha maọbụ na anụ ọhịa nwere ike zọrie ha.
16 Obwana bwayo ebuyisa bubi ng’obutali bwayo gy’obeera nti, yazaalira bwereere.
Ọ na-emeso ụmụ ya ihe ike dịka a ga-asị na ha abụghị nke ya, ọ dịghị emetụta ya na ndọgbu nʼọrụ ya nwere ike i bụ nʼefu, ma ọ dịghị atụ egwu.
17 Kubanga Katonda teyagiwa magezi wadde okutegeera.
Nʼihi na Chineke ekenyeghị ya amamihe maọbụ kenye ya oke na inwe uche.
18 Ate bw’eyanjuluza ebiwaawaatiro byayo edduke esoomooza embalaasi n’omugoba waayo.
Ma ọ na-agbalite ọsọ. Mgbe ọbụla ọ gbasara nku ya ịgba ọsọ, ọ na-achị ịnyịnya na onye na-agba ịnyịnya ọchị.
19 “Embalaasi ggwe ogiwa amaanyi, oba ggwe oyambaza ensingo yaayo obwoya obwewumba?
“Ọ bụ gị na-enye ịnyịnya ike ya, ka ọ bụ gị mere ka ajị ogologo ahụ o nwere dịrị nʼolu ya?
20 Ggwe ogisobozesa okubuuka ng’enzige n’ekanga n’okukaaba kwayo okw’entiisa?
Ị na-eme ya ka ọ wụgharịa dịka igurube, were ebube nke ịmapụ imi ya na-eyinye ihe oke egwu?
21 Etakula ettaka mu kiwonvu, nga yeeyagala olw’amaanyi gaayo, n’eryoka efuluma okusisinkana abalwanyi abakutte ebyokulwanyisa.
Ọ na-azọ ụkwụ gam gam nʼala, ọ na-aṅụrị ọṅụ nʼihi ike ya, ọ na-apụ izute agha na-atụghị egwu.
22 Esekerera okutya, n’eteba na kigitiisa. Ekitala tekigitiisa kugizza mabega.
Ọ na-achị ihe egwu ọchị, ụjọ ọbụla anaghị atụ ya; ọ naghị esi na mma agha wezuga onwe ya.
23 Omufuko ogujjudde obusaale gwesuukundira ku lubuto lwayo, awamu n’effumu erimasamasa, n’akasaale.
Akpa àkụ na-ayọgharị nʼakụkụ ya, ya na ùbe na arụa na-egbu maramara.
24 Mu busungu obungi emira ettaka, tesobola kusigala mu kifo kimu ng’ekkondeere livuze.
Mgbe ụzụ agha bara ya nʼisi, ọ na-eripịa ala. Mgbe ọ nụrụ ụda opi ike, ọ naghị eguzo otu ebe.
25 Ekkondeere bwe livuga n’egamba nti, ‘Awo!’ N’ewunyiriza olutalo olukyali ewala, n’ewulira n’okuleekaana kwa baduumizi b’amaggye.
Mgbe ụzụ agha bara ya nʼisi, ọ na-eti mkpu sị, ‘Ahaa!’ Site nʼebe dị anya ka ọ na-anụ isisi agha. Ọ na-aṅụrịkwa ọṅụ maka iti mkpu nke ndị ọchịagha nʼoge agha.
26 “Amagezi go ge gabuusa kamunye, n’ayanjuluza ebiwaawaatiro bye e bukiikaddyo?
“Ọ bụ site nʼamamihe gị ka egbe ji efego nʼelu, gbasaakwa nku ya gaa nʼebe ndịda?
27 Ggwe olagira empungu okubuukira ewala mu bbanga, era n’ezimba n’ekisu kyayo waggulu ennyo?
Ọ bụ gị nyere ugo iwu ifeli elu ma wuo akwụ ya nʼebe dị elu?
28 Ku lwazi kw’ezimba amaka gaayo ekiro n’esula okwo, ku lwazi olunywevu olutabetentebwa.
Nʼelu nkume dị elu ka ọ na-ebi nọọkwa ọnọdụ abalị; ọwara nkume dị elu bụ ebe e wusiri ike ya.
29 Eyo gy’ekettera omuyiggo gw’eneerya, eriiso lyayo ligulengerera wala.
O bụ site nʼebe ahụ ka ọ na-esi enyochapụta ihe ọ ga-eburu.
30 Obwana bwayo bunywa omusaayi, era awali emirambo w’ebeera.”
Ụmụ ya na-amịchakwa ọbara, nʼihi na ebe ọ na-aga bụ ebe ọbụla ọ ga-ahụ ihe e gburu egbu.”

< Yobu 39 >