< Yeremiya 43 >

1 Yeremiya bwe yamala okutegeeza abantu ebigambo byonna Mukama Katonda waabwe bye yamutuma okubagamba,
Mgbe Jeremaya gwasịrị ndị ahụ niile okwu ahụ Onyenwe anyị Chineke ha ziri ya ka o zie ha,
2 Azaliya mutabani wa Kosaaya ne Yokanaani mutabani wa Kaleya n’abasajja bonna ab’amalala ne bagamba Yeremiya nti, “Olimba! Mukama Katonda wo takutumye kugamba nti, ‘Temugenda Misiri kusenga eyo.’
Azaraya nwa Hoshaya, Johanan nwa Kariya na ndị nganga niile nọ nʼebe ahụ, gwara Jeremaya okwu sị ya, “Ọ bụ okwu ụgha ka i kwuru! Onyenwe anyị Chineke anyị ezighị gị ka i kwuo na anyị ekwesighị ịga biri nʼIjipt,
3 Naye Baluki mutabani wa Neriya y’akusendasenda otugabule mu mukono gw’Abakaludaaya, batutte oba batutwale mu buwaŋŋanguse e Babulooni.”
Kama ọ bụ Baruk nwa Neraya na-akwalị gị megide anyị, nʼihi na ọ chọrọ inyefe anyị nʼaka ndị Babilọn ka ha gbuo anyị, maọbụ buru anyị gaa Babilọn dịka ndị a dọtara nʼagha.”
4 Awo Yokanaani mutabani wa Kaleya n’abaduumizi ba magye bonna n’abantu bonna ne bajeemera ekiragiro kya Mukama eky’okusigala mu nsi ya Yuda.
Ya mere, Johanan nwa Kariya na ndịisi agha ahụ niile, nakwa ndị mmadụ ahụ niile nupuru isi nʼiwu Onyenwe anyị, jụụ ịnọgide nʼala Juda.
5 Yokanaani mutabani wa Kaleya n’abaduumizi ba magye ga Yuda bonna ne bakulembera abantu ba Yuda abaali basigaddewo nga bakomyewo okuva mu mawanga gonna gye baali baddukidde okubeera mu nsi ya Yuda.
Kama Johanan nwa Kariya, na ndịisi agha ahụ, duuru ndị ahụ fọdụrụ na Juda pụọ, ha na ndị ahụ si na mba ndị ọzọ dị iche iche, ebe ha gbagara lọta.
6 Ne batwala n’abasajja bonna, n’abakazi n’abaana n’abawala ba kabaka, Nebuzaladaani omuduumizi w’eggye lya kabaka w’e Babulooni be yali alekedde Gedaliya mutabani wa Akikamu, mutabani wa Safani, ne nnabbi Yeremiya ne Baluki mutabani wa Neriya.
Ha duuru ndị ikom niile na ndị inyom niile na ụmụntakịrị niile, na ụmụ ndị inyom eze niile, bụ ndị ahụ Nebuzaradan ọchịagha ndị nche eze Babilọn tinyere na nlekọta Gedaliya nwa Ahikam, nwa Shefan na Jeremaya onye amụma na Baruk nwa Neraya.
7 Awo ne bayingira e Misiri nga bajeemedde Mukama, ne bagenda okutuukira ddala e Tapaneese.
Ya mere, ha nupuru isi nʼebe Onyenwe anyị nọ site nʼịbanye ala Ijipt. Ha jegidere ije ruo nʼobodo Tapanhis.
8 Bwe baba bali e Tapaneese, ekigambo kya Mukama ne kijjira Yeremiya nti,
Mgbe ha nọ na Tapanhis, okwu Onyenwe anyị ruru Jeremaya ntị sị ya,
9 “Twala amayinja amanene ogaziike mu bbumba mu lubalaza olw’amatoffaali ku mulyango gw’olubiri lwa Falaawo e Tapaneese, ng’Abayudaaya bonna balaba.
“Mgbe ndị Juu nọ na-ele gị anya, chịrị ụfọdụ nkume buru ibu nʼaka gị, gaa zoo ha nʼime ụrọ dị na mpụta ihu ụlọ e ji aja ụrọ wuo, nke dị nʼọnụ ụzọ e si abata nʼụlọ Fero dị na Tapanhis.
10 Obagambe nti, ‘Bw’ati bw’ayogera Mukama ow’Eggye, Katonda wa Isirayiri nti, Nditumya omuddu wange Nebukadduneeza kabaka w’e Babulooni, era nditeeka entebe ye ey’obwakabaka ku mayinja gano ge nziise wano. Ku go kwalikuba eweema ye ey’obwakabaka.
Mgbe ahụ sị ha, ‘Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel sịrị, Aga m ezi ozi kpọta ohu m bụ Nebukadneza, eze Babilọn. Aga m edokwasịkwa ocheeze ya nʼelu nkume ndị a m zoro nʼebe a, ọ ga-agbasa ụlọ ndo nke ịbụ eze ya nʼelu ha.
11 Alijja n’alumba Misiri, atte abo ab’okufa, awambe n’abo ab’okuwambibwa, n’ab’okuttibwa n’ekitala battibwe n’ekitala.
Ọ ga-abịa buso Ijipt agha, si otu a mee ka ha nwụọ, bụ ndị ahụ a kwadobere maka ọnwụ, mee ka a dọta ha nʼagha, bụ ndị ahụ a kwadobere na-aga adọta nʼagha; mekwaa ka ha nwụọ site na mma agha bụ ndị ahụ a kwadobere na ha ga-anwụ site na mma agha.
12 Alikoleeza omuliro ku masabo ga bakatonda b’e Misiri, n’abatwala mu busibe nga alese amasabo gaabwe agookezza. Ng’omulunzi w’endiga bwe yeezingirira ekyambalo kye, bw’atyo bw’alyezingirira ensi y’e Misiri n’avaayo nga tewali kabi konna kamutuuseeko.
Ọ ga-esunyekwa ọkụ nʼụlọ ebe a nọ na-efe chi niile nke ndị Ijipt. Ọ ga-esure ụlọ ndị a ọkụ, dọtakwa chi ha niile nʼagha. Dịka onye ọzụzụ atụrụ si ewepụcha igwu site na uwe ya, ọ ga-esikwa otu a wezuga onwe ya nʼudo site nʼIjipt pụọ.
13 Alimenyamenya empagi ezaawongebwa mu ssabo ly’enjuba mu Misiri, n’ayokya n’amasabo ga bakatonda b’e Misiri.’”
Nʼime ụlọnsọ anyanwụ dị nʼIjipt, ka ọ ga-akwatu ogidi nsọ niile, surekwaa ụlọnsọ niile nke chi dị iche iche nʼIjipt ọkụ.’”

< Yeremiya 43 >