< Yeremiya 27 >
1 Ku ntandikwa y’obufuuzi bwa Zeddekiya mutabani wa Yosiya kabaka wa Yuda, ekigambo kino kyajjira Yeremiya okuva eri Mukama:
Na mmalite ọchịchị Zedekaya, nwa Josaya eze Juda, okwu ndị a si nʼọnụ Onyenwe anyị rute Jeremaya ntị.
2 Bw’ati Mukama bwe yaŋŋamba nti: “Weekolere ekikoligo okiteeke ku nsingo yo,
Ihe ndị a ka Onyenwe anyị gwara m, “Jiri akpụkpọ anụ dị warawara na ụfọdụ okporo igwe, meere onwe gị ụdị agbụ ahụ a na-amanye ụmụ ehi nʼolu, nyakwasị ya nʼolu gị.
3 oweereze ekigambo eri bakabaka ba Edomu, ne Mowaabu, ne Ammoni, ne Tuulo ne Sidoni, ng’otuma ababaka abazze mu Yerusaalemi eri Zeddekiya kabaka wa Yuda.
Mgbe ahụ, zigara ndị eze Edọm, na Moab, na Amọn, na Taịa, na Saịdọn ozi site nʼọnụ ndị ozi ha bịara Jerusalem iwetara Zedekaya eze Juda ozi.
4 Tumira bakama baabwe obagambe nti, ‘Bw’ati bw’ayogera Mukama ow’Eggye, Katonda wa Isirayiri nti, “Kino mukitegeeze bakama bammwe.
Zie ha ozi ha ga-ezi ndị nwe ha, sị, ‘Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel kwuru, sị, “Zienụ ndị nna unu ukwu ozi a, sị,
5 N’amaanyi gange amangi n’omukono ogugoloddwa natonda ensi n’abantu baamu n’ensolo ezigiriko, era ngiwa omuntu yenna gwe njagala.
Ọ bụ site nʼike aka m, na site nʼogwe aka m, nke e setịrị eseti, ka m ji mee ụwa, na mmadụ, na anụmanụ dị nʼime ya. Mụ onwe m ka ọ dịkwara ikpebi itinye ha niile nʼaka onye ọbụla m họpụtara dịka o si dị m mma.
6 Kaakano ŋŋenda kuwaayo amawanga gammwe eri omuddu wange Nebukadduneeza kabaka w’e Babulooni, n’ensolo ez’omu nsiko nzija kuziteeka wansi we.
Ugbu a, ana m ewere alaeze unu niile nyefee ya nʼaka onye na-ejere m ozi bụ Nebukadneza eze Babilọn; aga m emekwa ka ọ bụladị ụmụ ajọ anụ ọhịa mee ihe o nyere nʼiwu.
7 Amawanga gonna galimuweereza ne mutabani we ne muzzukulu we okutuusa ekiseera eky’ensi ye okusalirwa omusango lwe kirituuka; olwo amawanga mangi ne bakabaka bangi ab’amaanyi balimuwangula.
Mba niile ga-akpọ isiala nye ya; ha ga-akpọkwa isiala nye nwa ya na nwa nwa ya, tutu ruo mgbe m kpebiri na oge ha ezuola. Mgbe ahụ, aga m eme ka ọtụtụ mba na ọtụtụ ndị eze merie ya.
8 “‘“Naye singa eggwanga lyonna oba obwakabaka bwonna tebuliweereza Nebukadduneeza kabaka w’e Babulooni oba okuteeka ensingo wansi w’ekikoligo ky’abwo, nzija kubonereza ensi eyo n’ekitala, n’ekyeya, ne kawumpuli, bw’ayogera Mukama, okutuusa lwe ndigizikiriza n’omukono gwange.
“‘“Ma ọ bụrụkwa na mba maọbụ alaeze ọbụla ajụ ife Nebukadneza, bụ eze Babilọn, maọbụ jụ ijere ya ozi dịka ohu, aga m eji mma agha na ụnwụ na ọrịa na-efe efe, taa mba ahụ ahụhụ, tutu ruo mgbe m bibiri ya site nʼaka ya. Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
9 Noolwekyo bannabbi bammwe, n’abalaguzi, n’abavvuunuzi b’ebirooto, temubawuliriza wadde abalogo wadde abafumu ababagamba nti, ‘Temulibeera baddu ba kabaka w’e Babulooni.’
Ya mere, unu aṅala ndị amụma unu, na ndị na-ajụ mmụọ ase, na ndị na-akọwara unu nrọ, na ndị mmụọ ọjọọ si nʼọnụ ha ekwu okwu, na ndị mgbaasị ntị. Unu aṅala ha ntị mgbe ha na-asị unu, ‘Unu agaghị abụ ndị ohu eze Babilọn.’
10 Baabawa bunnabbi bwa bulimba obunaabaleetera okutwalibwa ewala okuva mu mawanga gammwe. Ndibagobera wala era mulizikirira.
Nʼihi na ọ bụ naanị amụma ụgha ka ha na-eburu unu, okwu ụgha nke ga-eme ka e site nʼala unu wezuga unu, bulaa unu ala dị anya. Aga m esi nʼala unu chụsaa unu. Unu ga-alakwa nʼiyi.
11 Naye singa eggwanga lirikutamya ensingo yaalyo wansi w’ekikoligo kya kabaka w’e Babulooni limuweereze, nzija kuleka eggwanga eryo lisigale mu nsi yaalyo, okugirima, n’okugibeeramu, bw’ayogera Mukama.”’”
Ma ọ bụrụ na mba ọbụla ekwere ịbụ ohu eze Babilọn, kwenyekwa ife ya ofufe, mba ahụ ka m ga-eme ka ọ nọgide nʼala nke aka ya. Ọ ga-akọ ala ahụ, birikwa nʼime ya. Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.”’”
12 Nategeeza obubaka bwe bumu eri Zeddekiya kabaka wa Yuda nga ŋŋamba nti, “Kutamya ensingo yo wansi w’ekikoligo kya kabaka w’e Babulooni, beera omuddu we n’abantu be, onoobeera mulamu.
Otu ozi ahụ ka m ziri Zedekaya, bụ eze Juda. Asịrị m, “Were olu gị nyefee eze Babilọn nʼaka dịka ohu, feekwa ya na ndị ya, ị ga-adịkwa ndụ.
13 Lwaki ggwe n’abantu bo mufa ekitala, n’ekyeya ne kawumpuli Mukama by’agambye okutuuka ku nsi yonna eteefuuke muddu wa kabaka w’e Babulooni?
Nʼihi gịnị ka gị na ndị gị ga-eji nwụọ site na mma agha, na site nʼụnwụ na ọrịa na-efe efe, dịka nke Onyenwe anyị kwurula banyere mba ọbụla nke na-agaghị efe eze Babilọn?
14 Towuliriza bigambo bya bannabbi abakugamba nti, ‘Tolibeera muddu wa kabaka w’e Babulooni,’ kubanga bakutegeeza bya bulimba.
Egela ntị nʼokwu ndị amụma na-agwa gị sị, ‘Unu agaghị efe eze Babilọn,’ nʼihi na ọ bụ okwu ụgha ka ha na-agwa unu.
15 ‘Sibatumanga,’ bw’ayogera Mukama. ‘Bawa obunnabbi bwa bulimba mu linnya lyange. Noolwekyo, nzija kubagobera wala muzikirire, mmwe ne bannabbi ababategeeza obunnabbi.’”
‘Ọ bụghị m zitere ha,’ otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. ‘Ha ji aha m na-ebu amụma ụgha. Nʼihi ya, aga m achụpụ unu, unu ga-alakwa nʼiyi, unu na ndị amụma ahụ na-eburu unu amụma.’”
16 Olwo ne ŋŋamba bakabona n’abantu bano bonna nti, “Kino Mukama ky’agamba nti, Temuwuliriza bannabbi abagamba nti, ‘Amangu ddala ebintu by’omu nnyumba ya Mukama bijja kukomezebwawo okuva mu Babulooni.’ Bababuulira bunnabbi bwa bulimba.
Mgbe ahụ, agwara m ndị nchụaja na ndị mmadụ niile okwu sị ha, “Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru: Unu egela ndị amụma ahụ ntị, bụ ndị na-asị unu, ‘Na mgbe na-adịghị anya a ga-ebughachi ngwongwo ahụ e si nʼụlọnsọ Onyenwe anyị bulaa Babilọn.’ Ọ bụ amụma ụgha ka ha na-eburu unu.
17 Temubawuliriza. Muweereze kabaka w’e Babulooni, mubeere balamu. Lwaki ekibuga kino kifuuka amatongo?
Unu egela ha ntị. Feenụ eze Babilọn, nʼihi na ọ bụ naanị site nʼụzọ ahụ ka unu ga-esi dịrị ndụ. Nʼihi gịnị ka unu ga-eji kwenye ka obodo a ghọọ mkpọmkpọ ebe?
18 Bwe baba bannabbi nga balina ekigambo kya Mukama, leka bakaabirire Mukama Katonda ow’Eggye nti ebintu eby’omuwendo ebikyasigadde mu nnyumba ya Mukama ne mu lubiri lwa kabaka wa Yuda ne mu Yerusaalemi bireme kutwalibwa Babulooni.
Ọ bụrụ nʼezie na ọ bụ okwu Onyenwe anyị si nʼọnụ ndị amụma a na-apụta, ha rịọọnụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile arịrịọ ka ọ hapụ ikwe ka e bukọrọ ngwongwo fọdụrụ nʼime ụlọnsọ nakwa ndị fọdụrụ nʼụlọeze Juda, na nʼime Jerusalem bulaa Babilọn.
19 Kubanga bw’ati Mukama Katonda ow’Eggye bw’ayogera ku mpagi, n’Ennyanja, okuteekebwa ebintu, n’ebintu ebirala ebisigadde mu kibuga kino,
Nʼihi na ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru banyere ogidi niile ndị ahụ, na Oke osimiri bronz ahụ, na ihe ndọkwasị niile, na ihe niile fọdụrụ nʼobodo a,
20 kabaka Nebukadduneeza ow’e Babulooni by’ataatwala lwe yatwala Yekoyakini mutabani wa Yekoyakimu kabaka wa Yuda n’abakungu bonna aba Yuda ne Yerusaalemi.
nke Nebukadneza, bụ eze Babilọn na-eburughị mgbe o sitere na Juda na Jerusalem, dọkpụrụ Jehoiakin nwa Jehoiakim, bụ eze Juda, na ndị niile a na-asọpụrụ bulaa Babilọn.
21 Bw’atyo bw’ayogera Mukama ow’Eggye, Katonda wa Isirayiri ku bikwata ku bibya ebyasigala mu nnyumba ya Mukama ne mu lubiri olwa kabaka wa Yuda ne mu Yerusaalemi nti,
E, ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile bụ Chineke Izrel kwuru banyere ihe niile fọdụrụ nʼụlọnsọ Onyenwe anyị, na ndị fọdụrụ nʼụlọeze Juda na nʼime Jerusalem.
22 ‘Biritwalibwa mu Babulooni eyo gye birisigala okutuusa ku lunaku lwe ndibikima, olwo ndibikomyawo mbizze mu kifo kino,’” bw’ayogera Mukama.
‘A ga-eburu ha niile bulaa ha Babilọn. Ebe ahụ ka ha ga-anọkwa tutu ruo mgbe m ga-abịa leta ha,’ ka Onyenwe anyị kwubiri. ‘Mgbe ahụ, aga m ebulatakwa ha, kpọghachitekwa ha nʼebe a.’”