< Yeremiya 22 >

1 Bw’ati bw’ayogera Mukama nti, “Serengeta ogende mu lubiri lwa kabaka wa Yuda
Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, “Jee nʼụlọeze Juda nọdụ nʼebe ahụ kwusaa ozi ndị a.
2 olangirire obubaka buno nti, Wulira ekigambo kya Katonda ggwe kabaka wa Yuda, ggw’atuula ku ntebe ya Dawudi, mmwe abakungu n’abantu bammwe abayita mu miryango gino.
‘Nụrụ okwu Onyenwe anyị, nye gị, gị eze Juda, gị onye na-anọkwasị nʼocheeze Devid. Nụrụ ya, gị na ndịisi ọchịchị gị, na unu ndị niile na-esite nʼọnụ ụzọ ama ndị a na-apụ na-abatakwa.
3 Bw’ati bw’ayogera Mukama nti, Musale emisango egy’ensonga, mukole ebituufu. Anyagiddwako ebibye mumuggye mu mukono gw’oyo amujooga. Temukola kibi oba eby’obukambwe eri omugwira, newaakubadde atalina kitaawe, newaakubadde nnamwandu so temuyiwa musaayi gw’abantu abataliiko musango mu kifo kino.
Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, Meenụ ihe dị mma na ihe ziri ezi. Napụtanụ onye eji aka ike napụ ihe o nwere site nʼaka onye ahụ na-emegbu ya. Unu emejọkwala onye ọbịa, maọbụ mee ya ihe ike. Unu emekwala ndị na-enweghị nna, maọbụ ndị inyom di ha nwụrụ ihe ọjọọ. Unu awụsịkwala ọbara ndị aka ha dị ọcha nʼebe a.
4 Kubanga bwe muneegendereza ne mukuuma ebiragiro bino, olwo bakabaka abatuula ku ntebe ya Dawudi baliyita mu miryango gy’olubiri luno nga batudde mu magaali gaabwe n’abo abeebagadde embalaasi nga bawerekerwako n’abakungu baabwe, n’abantu baabwe.
Nʼihi na ọ bụrụ na unu elezie anya mee iwu ndị a niile, mgbe ahụ, ndị eze na-anọkwasị nʼelu ocheeze Devid ga-anọgide na-esite nʼọnụ ụzọ ama ndị a na-apụta, na-abata nʼelu ụgbọ agha ha, ma nʼelu ịnyịnya ha, ha na ndịisi ọchịchị ha, na ndị ha na-achị.
5 ‘Naye bwe mutaagondere biragiro bino, nneelayirira ku lwange nti olubiri luno lulifuuka matongo,’ bw’ayogera Mukama.”
Ma ọ bụrụ na unu ajụ irube isi nye iwu ndị a, otu a ka Onyenwe anyị kwubiri, eji m onwe m na-aṅụ iyi na ụlọeze a ga-aghọ mkpọmkpọ ebe.’”
6 Kubanga kino Mukama ky’agamba ku lubiri lwa kabaka wa Yuda nti, “Newaakubadde ng’oli nga Gireyaadi gye ndi, ng’entikko y’olusozi Lebanooni, ddala ddala nzija kukufuula ddungu, ng’ebibuga ebitaliimu bantu.
Nʼihi na ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru banyere ụlọeze Juda, “Ọ bụ ezie na ịdị dịka Gilead nye m, dịka elu ugwu ukwu Lebanọn, aghaghị m ime gị ka ị dịrị ka ebe ikpofu ahịhịa, dịka obodo ndị mmadụ na-ebighị nʼime ya.
7 Ndikusindikira abakuzikiriza, buli musajja n’ebyokulwanyisa bye, era balitema emivule gyo egisinga obulungi ne bagisuula mu muliro.
Aga m ezite ndị mbibi ndị ga-abịa megide gị. Onye ọbụla nʼime ha ga-eji ngwa agha ya. Ha ga-egbutusịkwa osisi sida ọma gị niile, tụnye ha niile nʼime ọkụ.
8 “Abantu abava mu mawanga amangi baliyita ku kibuga kino nga beebuuzaganya bokka ne bokka nti, ‘Lwaki Mukama yakola ekintu ekifaanana bwe kiti ku kibuga kino ekikulu bwe kiti?’
“Ọtụtụ ndị si mba ọzọ bịa ga-agafe obodo a. Ha ga-ajụrịta ibe ha ajụjụ sị, ‘Gịnị mere Onyenwe anyị ji mee obodo ukwuu a ihe ọjọọ dị otu a?’
9 Era eky’okuddamu kibeere nti, ‘Kubanga beerabira endagaano ya Mukama Katonda waabwe ne basinza era ne baweereza bakatonda abalala.’”
Ọsịsa ha ga-enweta ga-abụ, ‘Ọ bụ nʼihi na ha gbakụtara ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị Chineke ha azụ, malite ịkpọ isiala na ife chi ndị ọzọ.’”
10 Temukaabira kabaka afudde oba okumukungubagira, wabula mukaabire nnyo oyo omuwaŋŋanguse, kubanga taliddayo kulaba nsi ye nate.
Unu akwala akwa nʼihi eze ahụ nwụrụ anwụ, maọbụ ruo ụjụ nʼihi na ọ gaghị abụkwa eze unu, kama kwaanụ akwa nʼihi onye ahụ a dọtara nʼagha buru gaa mba ọzọ. Nʼihi na ọ gaghị alọghachi ọzọ; ọ gaghị ahụkwa ala ebe a mụrụ ya anya ọzọ.
11 Kubanga kino Mukama ky’agamba ku Sallumu mutabani wa Yosiya kabaka wa Yuda eyasikira Yosiya n’afuuka kabaka wa Yuda naye n’atwalibwa. “Talidda.
Nʼihi na ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru banyere Shalum nwa Josaya, onye nọchiri anya nna ya dịka eze Juda, bụ onye ahụ e si nʼebe a buru gaa mba ọzọ, “Ọ gaghị alọtakwa ọzọ.
12 Alifiira eyo gye baamutwala nga musibe, taliraba nsi eno nate.”
Ebe ahụ e buuru ya gaa ka ọ ga-anọ nwụọ. Ọ gaghị ahụkwa ala nke aka ya anya ọzọ.”
13 “Zimusanze oyo azimba olubiri ku butali butuukirivu, ebisenge bye ebya waggulu ku butali bwenkanya abantu b’ensi ye n’abakozeseza bwereere n’atabasasula mpeera yaabwe.
“Ahụhụ na-adịrị onye ahụ na-ewu ụlọeze ya site nʼụzọ ajọ omume, nke jikwa ikpe na-ezighị ezi na-ewu ime ụlọ elu ya niile, onye ahụ nke na-eme ndị mmadụ rụọ ọrụ nʼefu, nke na-adịghị akwụ ha ụgwọ ọbụla nʼihi ọrụ ha.
14 Agamba nti, ‘Nzija kwezimbira olubiri olunene n’ebisenge ebya waggulu ebigazi ennyo.’ Kale nnaakola amadirisa amanene nnaateekamu emivule era nnaasiigako langi emyufu.
Onye na-asị, ‘Aga m ewuru onwe m ụlọeze buru ibu, nke ọnụụlọ dị nʼụlọ elu ya sara ezi mbara.’ Ya mere, ọ tinyere oghereikuku sara mbara nʼụlọ ahụ, jirikwa osisi sida machie elu ya, werekwa penti na-acha uhie uhie chọọ ya mma.
15 “Okweyongerayongera emivule emingi kikufuula kabaka? Kitaawo teyalina byakulya na byakunywa? Yakola ebituufu eby’obwenkanya. Noolwekyo byonna byamugendera bulungi.
“Ị ga-abụ eze nʼihi na i nwere ọtụtụ osisi sida karịa ndị ọzọ? Nna gị o nweghị ihe oriri na ihe ọṅụṅụ? O mere ihe dị mma na ihe ziri ezi nʼihi ya ihe niile gaara ya nke ọma.
16 Yalwanirira abaavu n’abali mu bwetaavu kale byonna ne bimugendera bulungi. Ekyo si kye kitegeeza okummanya?” bw’ayogera Mukama.
O kwuchitere ọnụ ndị ogbenye na ndị nọ na mkpa, nke a mere na ihe niile gara nke ọma. Ọ bụghị nke a bụ ihe ọ pụtara bụ ịmara m? Ka Onyenwe anyị kwupụtara
17 “Naye amaaso gammwe n’emitima gyammwe biri ku magoba ag’obukuusa, ne ku kuyiwa omusaayi ogutaliiko musango ne ku kunyigiriza ne ku kunyaga.”
Ma anya unu na obi unu adịghị nʼihe ọzọ ma ọ bụghị naanị nʼuru nʼezighị ezi nʼiwufu ọbara ndị aka ha dị ọcha, na imegbu ndị mmadụ, na iji aka ike pụnara ha ihe ha nwere.”
18 Noolwekyo kino Mukama ky’ayogera ku Yekoyakimu omwana wa Yosiya kabaka wa Yuda nti, “Tebalimukungubagira; ‘Kikafuuwe, mukama wange!’ Kikafuuwe, obugagga bwe!
Ya mere, ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru banyere Jehoiakim nwa Josaya eze Juda: “Ha agaghị eruru ya uju sị, ‘Ewoo nwanne m nwoke! Ewoo nwanne m nwanyị!’ Ha agaghị eruru ya uju sị, ‘Ewoo nna anyị ukwu! Ewoo ịma mma ya!’
19 Aliziikibwa nga bwe baziika endogoyi, akululwe asuulibwe ebweru w’enzigi za Yerusaalemi.”
A ga-eli ya dịka e si eli ịnyịnya ibu. A ga-adọkpụrụ ozu ya nʼala tufuo ya nʼazụ ọnụ ụzọ ama Jerusalem.”
20 “Genda mu Lebanooni okaabe, leka eddoboozi lyo liwulirwe mu Basani. Kaabira ku Abalimu, kubanga bonna ababadde ku ludda lwo bazikiridde.
“Gbagoruo na Lebanọn tie mkpu akwa, meenụ ka a nụ olu unu na Bashan, sitekwanụ na Abarim tie mkpu akwa nʼihi na e gweriela ndị niile unu na ha dị na mma.
21 Nayogera gy’oli ng’okyali mu biseera byo eby’obugagga naye n’ogamba nti, ‘Sijja kuwuliriza!’ Bw’oti bw’obadde okuva mu buto bwo, togonderanga ku ddoboozi lyange.
Adọrọ m gị aka na ntị nʼoge ahụ ị nọ na-eche na i guzo chịm, ma ị jụrụ ige ntị. Nke a bụkwa omume gị site na mgbe ị bụ nwantakịrị. Ị jụkwara irubere m isi.
22 Empewo erikunguzza abalunzi b’ebisibo byo bonna, n’abawagizi bo batwalibwe mu buwaŋŋanguse. Olwo okwatibwe ensonyi oggweemu amaanyi olw’ebibi byo byonna.
Oke ifufe ga-ebufu ndị ọzụzụ atụrụ gị niile, a ga-emekwa ka ndị gị na ha dị na mma gaa biri na mba ọzọ. Mgbe ahụ, ihere ga-eme gị, ị ga-aghọkwa onye e wedara nʼala nʼihi ajọ omume gị niile.
23 Mmwe abali mu Lebanooni, abesulira mu bizimbe eby’emivule, nga mulikaaba, ng’obulumi bubajjidde! Okulumwa ng’okw’omukazi alumwa okuzaala.
Gị onye na-ebi na Lebanọn, onye ebe obibi ya dị nʼụlọ e ji osisi sida wuo, lee ka i si na-asụ ude mgbe ihe mgbu bịakwasịrị gị, ihe mgbu yiri nke nwanyị ime na-eme.
24 “Ddala ddala nga bwe ndi omulamu, wadde ggwe Koniya omwana wa Yekoyakimu, singa wali mpeta ey’obuyinza ku mukono gwange ogwa ddyo, nandikusiseeko,” bw’ayogera Mukama.
“Ma dịka m na-adị ndụ,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya, “a sịkwarị na gị, bụ Jehoiakin, nwa Jehoiakim eze Juda, bụ mgbaaka akara m gbanyere na mkpịsịaka dị nʼaka nri m, aga m agbapụkwa gị,
25 “Ndikuwaayo eri abo abanoonya obulamu bwo, abo bootya, Nebukadduneeza kabaka w’e Babulooni era n’eri Abakaludaaya.
were gị nyefee nʼaka ndị ahụ na-achọsi ndụ gị ike, bụ ndị ahụ ị na-atụ ụjọ ha. Aga m enyefe gị nʼaka Nebukadneza eze Babilọn na ndị Kaldịa.
26 Ndikusuula mu nsi endala gye mutaazaalibwa, ggwe ne maama wo eyakuzaala, era eyo mwembi gye mulifiira.
Aga m atụfu gị na nne mụrụ gị, tụga unu na mba ọzọ dị iche site nʼobodo a nọ mụọ unu. Ebe ahụ ka unu ga-anọ nwụọ.
27 Temulidda mu nsi gye mwegomba okuddamu.”
Unu agaghị alọghachikwa nʼala ahụ na-agụ unu agụụ ịlọghachi nʼime ya.”
28 Omusajja ono Koniya kintu ekinyoomebwa, ekimenyese, ekitaliiko ayagala? Lwaki ye n’abaana be balikanyugibwa ebweru, basuulibwe mu nsi gye batamanyi?
Nwoke a bụ Jehoiakin, ọ bụ ite tiwara etiwa, nke e lelịrị elelị, ihe onye ọbụla na-achọghị? Nʼihi gịnị ka a ga-eji tufuo ya na ụmụ ya, tụga ha na mba ha na-amaghị?
29 Ayi ggwe ensi, ensi, wulira ekigambo kya Katonda!
Ala, ala, ala, nụrụ okwu Onyenwe anyị.
30 Bw’ati bw’ayogera Mukama nti, “Omusajja ono mumubale ng’atazaalangako kubanga tewali ku baana be alikulaakulana, alituula ku ntebe ya Dawudi oba aliddayo okufuga mu Yuda.”
Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru: “Detuo ya nʼakwụkwọ na nwoke a bụ onye gba aka nwa, nwoke nke ihe na-agaghị agara nke ọma nʼoge ndụ ya niile, nʼihi na o nweghị onye nʼime ụmụ ọ mụrụ nke ihe ga-agara nke ọma, o nwekwaghị onye nʼime ha ga-anọkwasị nʼocheeze Devid, maọbụ chịakwa ọzọ na Juda.”

< Yeremiya 22 >