< Isaaya 11 >

1 Ensibuka erimera ng’eva ku kikonge kya Yese, ne ku mirandira kulivaako omuti, ne ku muti kulivaako Ettabi eriribala ekibala.
Ome ga-epupụta site nʼogwe osisi Jesi; otu Alaka ga-esitekwa na mgbọrọgwụ ya tolite ga-amịkwa mkpụrụ.
2 Mwoyo wa Mukama alibeera ku ye, Mwoyo ow’amagezi n’okutegeera ne Mwoyo w’okusala ensonga, n’ow’amaanyi ne Mwoyo w’okumanya era n’okutya Mukama Katonda.
Mmụọ Onyenwe anyị ga-enwekwa ọnọdụ nʼime ya, inye ya Mmụọ amamihe na Mmụọ nghọta, Mmụọ ndụmọdụ na ike, Mmụọ ihe ọmụma na nke ịtụ egwu Onyenwe anyị.
3 Era n’essanyu lye liribeera mu kutya Mukama Katonda. Taasalenga misango ng’asinziira ku maaso ge gokka nga bwe galaba, oba okusalawo ng’asinziira ku byawulira n’amatu ge byokka,
Ihe ga-amasị ya bụ egwu Onyenwe anyị. Ọ gaghị ekpe ikpe site naanị nʼihe o ji anya ya abụọ hụ, maọbụ gbubie ikpe site naanị nʼihe ọ nụrụ na ntị ya.
4 naye anaasaliranga abaavu emisango mu bwenkanya, era asalire mu bwenkanya abo abawombeefu ab’omu nsi; era alikuba ensi n’omuggo ogw’omu kamwa ke, era alitta omukozi w’ebibi n’omukka ogw’omu kamwa ke.
Kama ọ bụ ezi omume ka ọ ga-eji kpee ndị ogbenye ikpe; ọ bụkwa ikpe ziri ezi ka ọ ga-ekpere ndị na-adịghị ike nke ụwa. Okwu ọnụ ka ọ ga-eji nye ndị mmadụ ahụhụ, ọ bụ okwu ọnụ ka ọ ga-eji maa ndị ajọ omume ikpe ọnwụ.
5 Obutuukirivu, bwe buliba olukoba lwe yeesibya, n’obwesigwa, bw’alyesiba mu kiwato kye.
Ezi omume ya ga-adị ka ihe ike nʼume, ma ikwesi ntụkwasị obi ga-abụ ihe okike ukwu ya.
6 Omusege gulisulanga wamu n’omwana gw’endiga, n’engo egalamire wamu n’omwana gw’embuzi; era ennyana n’empologoma n’ennyana eya ssava binaagalamiranga wamu; era omwana omuto yalizirabirira.
Nʼụbọchị ahụ, nkịta ọhịa na nwa atụrụ ga-ebikọ nʼudo; agụ na nwa ewu ga-amakpukọkwa. Nwa ehi na ụmụ ọdụm na nwa ịnyịnya mara abụba ga-anọkọtakwa, ọ bụkwa nwantakịrị ga na-edugharị ha.
7 Ente n’eddubu biririira wamu, abaana baazo banaagalamiranga wamu. Empologoma erirya omuddo ng’ente.
Nne ehi na anụ ọhịa bịa ga-atakọkwa ahịhịa nʼotu ebe, ụmụ ha ga-amakpukọkwa nʼudo nʼotu ebe. Ọdụm ga-atakwa ahịhịa dịka ehi.
8 N’omwana ayonka alizannyira ku kinnya ky’enswera, n’omwana omuto aliteeka omukono gwe mu kinnya ky’essalambwa.
Ụmụntakịrị ga-egwugharị egwu nʼakụkụ ọnụ ajụala; nwantakịrị ga-etinyekwa aka nʼakwụ ibi.
9 Tewalibeera kukolaganako bulabe wadde okuttiŋŋana ku lusozi lwange olutukuvu. Kubanga ensi eribeera ejjudde okumanya Mukama Katonda, ng’amazzi bwe gajjuza ennyanja.
Ha agaghị eme ihe mmerụ maọbụ bibikwa ihe, nʼelu ugwu nsọ m niile. Nʼihi na ụwa niile ga-ejupụta na ihe ọmụma nke Onyenwe anyị dịka mmiri si ekpuchi oke osimiri.
10 Awo ku lunaku luli, muzzukulu wa Yese aliyimirira ng’ebendera eri amawanga. Oyo amawanga gwe ganaanoonyanga, n’ekifo kye eky’okuwummuliramu, kiribeera kya kitiibwa.
Nʼụbọchị ahụ, mgbọrọgwụ Jesi ga-eguzo ka ọkọlọtọ nye ndị dị iche iche. Mba niile ga-abịakwute ya; ebe izuike ya ga-ejupụtakwa nʼebube.
11 Era ku lunaku olwo Mukama aligolola omukono gwe omulundi ogwokubiri okununula abasigalawo ku bantu be, okubaggya mu Bwasuli ne mu Misiri ne mu Pasuloosi ne mu Kuusi ne mu Eramu ne mu Sinaali ne mu Kamasi ne mu bizinga eby’omu nnyanja.
Nʼụbọchị ahụ, Onyenwe anyị ga-esetikwa aka nke ugboro abụọ inwetaghachiri onwe ya ndị ya fọdụrụ site na Asịrịa, sitekwa na ndịda Ijipt, sitekwa na Mgbago Ijipt, sitekwa na Kush, sitekwa na Elam, sitekwa na Babilọn, bụ Shaịna, sitekwa na Hamat na obodo niile dị nʼala niile osimiri gbara gburugburu.
12 Era aliwanikira amawanga bbendera, akuŋŋaanye abawaŋŋanguse ba Isirayiri; aleete wamu abantu ba Yuda abaali basaasaanye mu nsonda ennya ez’ensi.
Ọ ga-ebuliri mba niile ọkọlọtọ ọ ga-akpọghachite ụmụ Izrel achụpụrụ achụpụ, ọ ga-esite na nsọtụ anọ nke ụwa kpokọta ndị Juda niile site nʼebe a chụsasịrị ha.
13 Olwo obuggya bwa Efulayimu bulyoke buggweewo, n’abo abateganya Yuda balizikirizibwa. Efulayimu talikwatirwa Yuda buggya wadde Yuda okubeera omulabe wa Efulayimu.
Ekworo Ifrem ga-akwụsị, a ga-ebipụ ndị iro Juda. Nʼikpeazụ, ekworo ahụ nke dị nʼetiti Izrel na Juda ga-akwụsị; ha agaghị alụsokwa onwe ha ọgụ ọzọ.
14 Bombi awamu balirumba ne bamalawo Abafirisuuti mu busozi bw’ebugwanjuba; era bombiriri balinyaga abantu b’omu buvanjuba. Baligolola omukono gwabwe ku Edomu ne Mowaabu; n’abaana ba Amoni balibagondera.
Ha ga-ejikọta aka ha buso ndị Filistia nọ nʼakụkụ ọdịda anyanwụ ala ha agha; ha ga-ebusokwa ndị bichiri nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ ala ahụ agha. Ha ga-emeri ndị Edọm na Moab. Ndị Amọn ga-erubekwara ha isi.
15 Era Mukama Katonda alikaliza omukutu gw’ennyanja y’Abamisiri; era aliwujira omukono gwe ku mugga Fulaati ne guleetawo omuyaga ogukaza, agwawulemu ebitundu musanvu abantu bye banaasomokanga ku bigere.
Onyenwe anyị ga-eme ka warawara ọnụ osimiri Ijipt taa. Ọ ga-eji ifufe siri ike, nke na-ekpo ọkụ mikọrọ mmiri dị nʼosimiri Yufretis. Ọ ga-ekewa ya ka ọ bụrụ isi iyi asaa, nke mmadụ nwere ike iji ụkwụ gafee.
16 Era abo abalisigalawo ku bantu be balibeera n’ekkubo ery’okuyitamu ery’eggwanga eryasigala ku Bwasuli nga bwe kyali eri Isirayiri ku lunaku lwe baaviirako mu Misiri.
Ọ ga-esite nʼAsịrịa kpawaa ụzọ nʼihi ndị ya fọdụrụ nʼebe ahụ, dịka o si meere ndị Izrel nʼoge gara aga, mgbe ha si nʼIjipt na-alọta.

< Isaaya 11 >