< Koseya 13 >

1 Efulayimu buli lwe yayogeranga, abantu baakankananga. Yagulumizibwanga mu Isirayiri. Naye bwe yayonoona olw’okusinza Baali, n’afa.
Na mbụ, mgbe ọbụla Ifrem kwuru okwu, a na-enwe ọma jijiji, nʼihi na ọ bụ onye e buliri elu nʼIzrel. Ma ikpe maara ya nʼihi ofufe o fere Baal, ọ nwụkwara.
2 Ne kaakano bongera okwonoona; ne beekolera ebifaananyi ebisaanuuse mu ffeeza yaabwe, ng’okutegeera kwabwe bwe kuli, nga byonna mulimu gw’abaweesi. Kigambibwa nti, “Bawaayo ssaddaaka ez’abantu, ne banywegera ebifaananyi eby’ennyana.”
Ugbu a, ha na-aga nʼihu nʼime mmehie, ha na-eji ọlaọcha na-akpụrụ onwe ha arụsị dị iche iche, nke ha ji uche kpachara anya kpụzie nke ọma, ha niile bụ akaọrụ ndị ǹka. Ha onwe ha na-ekwu, “Ha na-achụ aja ụmụ mmadụ. Ha na-esusukwa nwa ehi a kpụrụ akpụ ọnụ”
3 Kyebaliva babeera ng’olufu olw’oku makya, oba ng’omusulo oguvaawo amangu, ng’ebisusunku embuyaga ze bifumuula okubiggya mu gguuliro, oba ng’omukka ogufulumira mu ddirisa.
Nʼihi ya, ha ga-adị ka igirigi nke ụtụtụ, maọbụ igirigi nke na-agbachapụ ngwangwa, dịka igbugbo nke a fụchapụrụ nʼebe ịzọcha ọka, dịka anwụrụ ọkụ nke si na oghereikuku na-ekupụ.
4 “Nze Mukama Katonda wo eyakuggya mu nsi ya Misiri; so tolimanya Katonda mulala wabula nze, so tewali mulokozi wabula nze.
“Ma mụ onwe m bụ Onyenwe anyị na Chineke gị, siterịị nʼala Ijipt. Unu agaghị anabatara onwe unu Chineke ọzọ karịa m. Ọ dịghị Onye nzọpụta ọzọ dị karịa m.
5 Nakulabirira mu ddungu, mu nsi ey’ekyeya ekingi.
Elekọtara m unu nʼime ọzara, nʼala ahụ kpọrọ nkụ, nke mmiri na-adịghị.
6 Bwe nabaliisa, bakkuta; bwe bakkuta ne beegulumiza, bwe batyo ne banneerabira.
Mgbe m nyere ha nri, ha rijukwara afọ. Mgbe afọ juru ha, ha bidoro ịkpa nganga, chefuo m.
7 Kyendiva mbalumba ng’empologoma, era ndibateegera ku kkubo ng’engo.
Nʼihi ya, aghaghị m ịbịakwasị ha dịka ọdụm; maọbụ dịka agụ nke na-ezo onwe ya nʼakụkụ ụzọ.
8 Ng’eddubu erinyagiddwako abaana baalyo, ndibalumba ne mbataagulataagula. Era okufaananako ng’empologoma bw’ekola ndibaliira eyo, ensolo ey’omu nsiko eribataagulataagula.
Aga m adakwasị ha dịka anụ ọhịa bịa nke a gbabara aka ụmụ ya, dọwasịa anụ ahụ kpuchiri obi ha aga m eripịa ha dịka ọdụm, anụ ọhịa ga-adọkasịkwa ha.
9 Ndibazikiriza mmwe Isirayiri, kubanga munnwanyisa.
“Aga m ala gị nʼiyi, gị Izrel, onye pụrụ inyere gị aka?
10 Kabaka wammwe ali wa, abalokole? Abafuzi ab’omu bibuga byo byonna bali ludda wa, be wayogerako nti, ‘Tuwe kabaka n’abafuzi?’
Ebee ka ndị eze gị nọ, ka ha bịa zọpụta gị? Ebee ka ndịisi ọchịchị nke obodo gị niile nọ, bụ ndị ahụ i ji nʼihi ha na-asị, ‘Nye m eze na ndị ọchịchị’?
11 Nabawa kabaka nga nsunguwadde, ate ne mmubaggyako nga ndiko ekiruyi.
Esitere m nʼiwe m nye gị eze, sitekwa nʼọnụma m, napụ gị ya.
12 Omusango gwa Efulayimu guterekeddwa, era n’ekibi kye kimanyiddwa.
Njehie nke Ifrem ka e kechikọtara debe; a na-edetukwa mmehie ya niile nʼakwụkwọ.
13 Obubalagaze ng’obw’omukyala alumwa okuzaala bumujjira, naye omwana olw’obutaba n’amagezi, ekiseera bwe kituuka, tavaayo mu lubuto.
Ihe mgbu nke dịka ihe mgbu nwanyị ime na-eme na-abịakwasị ya; maọbụ nwantakịrị na-enweghị uche. Mgbe oge ya zuru, ọ jụrụ ịpụta site nʼọnụ akpanwa ka a mụpụta ya.
14 “Ndibanunulayo mu maanyi g’emagombe, era ndibalokola mu kufa. Ggwe kufa, endwadde zo ziri ludda wa? Ggwe Magombe, okuzikiriza kwo kuli ludda wa? “Sirimusaasira, (Sheol h7585)
“Aga m anapụta ha site nʼike nke Ala mmụọ. Aga m agbapụta ha site nʼọnwụ. Gị ọnwụ, olee ebe ajọọ ọrịa gị niile na-efe efe dị? Gị ala mmụọ, olee ebe ike ịla nʼiyi gị dị? “Agaghị m enwe ọmịiko ọbụla, (Sheol h7585)
15 ne bw’anaakulaakulana mu baganda be. Empewo ey’ebuvanjuba erijja okuva eri Mukama, ng’eva mu ddungu, n’ensulo ze ne zikalira, n’oluzzi lwe ne lukalira. Eggwanika lye lirinyagibwa, eby’omuwendo byonna ne bitwalibwa.
ọ bụ ezie na ya onwe ya bụ onye na-amị mkpụrụ nʼetiti ụmụnne ya niile. Ma oke ifufe si nʼọwụwa anyanwụ, nke Onyenwe anyị zitere, ga-esi nʼọzara fekwasị ya. Isi iyi niile ga-ata, olulu mmiri ya ga-atakọrọkwa. A ga-apụnara ya ihe dị nʼụlọakụ ya niile, na akụ niile o nwere.
16 Abantu b’e Samaliya balivunaanibwa omusango gwabwe kubanga bajeemedde Katonda waabwe. Balittibwa n’ekitala, n’abaana baabwe abato balibetentebwa, n’abakyala baabwe abali embuto balibaagibwa.”
Sameria aghaghị ịta ahụhụ ikpe ọmụma ya, nʼihi na o nupuru isi megide Chineke ha. A ga-eji mma agha gbuo ndị ya niile, tụpịa ụmụntakịrị ya niile nʼala, jirikwa mma agha bọwaa ndị inyom niile dị ime.”

< Koseya 13 >