< Ezeekyeri 39 >

1 “Omwana w’omuntu, wa obunnabbi ku Googi oyogere nti, ‘Bw’ati bw’ayogera Mukama Katonda nti, Nkulinako ensonga ggwe Googi, omulangira omukulu owa Meseki ne Tubali.
“Ma gị, nwa nke mmadụ buo amụma megide Gog, sị, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu: Ana m emegide gị, Gog, onyeisi nke Meshek na Tubal.
2 Ndikukyusa nkukulule, era ndikuggya mu bukiikakkono obw’ewala ne nkutuma eri ensozi za Isirayiri.
Aga m echigharị gị, kpụrụ gị na-aga. Aga m esi nʼebe dịkarịsịrị anya nʼakụkụ ugwu kpọta gị, ziga gị ka i buso ugwu niile nke Izrel agha.
3 Ndiggya omutego gwo mu mukono gwo ogwa kkono; n’obusaale bwo obungi obubadde mu mukono gwo ogwa ddyo, ndibukusuuza.
Mgbe ahụ, aga m etichapụ ụta dị gị nʼaka ekpe, meekwa ka àkụ niile nke dị nʼaka nri gị dachapụ.
4 Oligwa ku nsozi za Isirayiri ggwe n’eggye lyo lyonna n’amawanga agali naawe; ndibawaayo eri ensega eza buli ngeri n’eri buli nsolo enkambwe mufuuke emmere yaazo.
Nʼelu ugwu niile nke Izrel ka ị ga-ada, gị onwe gị, na usuu ndị agha gị niile, na mba niile dị iche iche ndị na-eso gị. Udele niile dị iche iche na anụ ọhịa niile ka m ga-enyefe anụ ahụ unu ka ha were unu mere ihe oriri.
5 Muligwa ku ttale, kubanga nze nkyogedde, bw’ayogera Mukama Katonda.
Ị ga-ada nʼọhịa na-enweghị ebe nzobe, nʼihi na m ekwuola ya. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.
6 Ndisindika omuliro ku Magogi ne ku abo ababeera mu bifo ebirimu emirembe ku lubalama lw’ennyanja; balyoke bamanye nga nze Mukama.
Aga m awụkwasị ọkụ nʼahụ Magog, na nʼahụ ndị ahụ niile bi nʼudo, nʼọnụ mmiri niile. Ha ga-amatakwa na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.
7 “‘Ndimanyisa abantu bange Isirayiri Erinnya lyange ettukuvu. Siriganya linnya lyange kuddayo kuvumibwa, era amawanga galimanya nga nze Mukama, Omutukuvu mu Isirayiri.
“‘Aga m eme ka amara aha nsọ m nʼetiti ndị m bụ Izrel. Agaghị m ekwekwa ka e lelịa aha nsọ m anya ọzọ. Mba niile dị iche iche ga-amatakwa na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, bụ Onye nsọ nọ nʼIzrel.
8 Ekiseera kyakyo kituuse era kirituukirira, bw’ayogera Mukama Katonda. Luno lwe lunaku lwe nayogerako.
Lee, ọ na-abịa, nʼezie, ọ ga-emekwa, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri. Nke a bụ ụbọchị ahụ nke m kwuru ihe banyere ya.
9 “‘Abo ababeera mu bibuga bya Isirayiri balifuluma ne bakozesa ebyokulwanyisa ng’enku era balibikumako omuliro, engabo entono n’engabo ennene, emitego n’obusaale n’ebiti ebinene n’amafumu. Balibikozesa ng’enku okumala emyaka musanvu.
“‘Nʼoge ahụ, ndị bi nʼobodo niile nke Izrel ga-apụ tụtụkọtaa ngwa agha ndị ahụ, were fụnwue ọkụ, surekwaa ha ọkụ, ma ọta ukwu ma ọta nta niile, ụta na àkụ niile, ma mkpọ agha na ùbe niile. Ọ bụ afọ asaa ka ha ga-eji ha mere nkụ.
10 Tekiribeetaagisa kutyaba nku ku ttale so tebalitema nku mu bibira, kubanga ebyokulwanyisa bye balikozesa ng’enku. Balinyaga abo abaabanyaga, ne babba abo abaababba, bw’ayogera Mukama Katonda.
Ha agaghị akpatakwa nkụ site nʼọhịa ọzọ, maọbụ gbuta ha site nʼoke ọhịa, nʼihi na ha ga-eji ngwa agha ndị a mere ihe ịfụnwu ọkụ. Mgbe ahụ, ha ga-akwata ihe onwunwe nke ndị ahụ kwakọrọ ihe onwunwe ha nʼagha, lụtakwa ihe onwunwe nke ndị ahụ lụnara ha ihe onwunwe ha nʼike. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.
11 “‘Ku lunaku olwo ndiwa Googi ekifo eky’okuziikamu mu Isirayiri mu kiwonvu ky’abatambuze ku luuyi olw’ebuvanjuba ku Nnyanja ey’Omunnyo. Kiriziba ekkubo ly’abatambuze, kubanga Googi n’enkuyanja y’abantu be baliziikibwa eyo. Era kiriyitibwa ekiwonvu kya Kamonugoogi.
“‘Nʼụbọchị ahụ, aga m enye Gog ebe olili ya nʼIzrel, nʼime ndagwurugwu si ọwụwa anyanwụ gawa nʼụzọ oke osimiri. Ọ ga-anọchi ụzọ ndị ije nʼihi na ebe ahụ ka a ga-eli Gog na usuu ndị agha ya. Ya mere, a ga-akpọ ya Ndagwurugwu Hamọn Gog.
12 “‘Ennyumba ya Isirayiri balimala emyezi musanvu nga babaziika, okusobola okutukuza ensi.
“‘Ọnwa asaa ka ọ ga-ewe ndị Izrel ili ozu ahụ niile, ime ka ala ahụ dị ọcha.
13 Abantu bonna ab’omu nsi balibaziika, era luliba lunaku lwa kujjukiranga era lwe lunaku lwe ndigulumizibwa, bw’ayogera Mukama Katonda.
Ndị niile nke ala ahụ ga-eli ha, ụbọchị ahụ m ga-eme ka ebube m pụta ìhè ga-abụ ụbọchị ihe ncheta nye ha. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.
14 Wanaabangawo abasajja abanaapangisibwanga okukola omulimu ogw’okutukuza ensi. Abamu ku bo banaayitanga mu nsi nga bakola omulimu ogwo, n’abalala banaaziikanga emirambo gy’abo egirisigala kungulu. “‘Oluvannyuma olw’emyezi omusanvu balitandika okunoonya abaafa.
A ga-ekewapụtakwa ndị ọrụ ha ga-abụ naanị ime ka ala ahụ dị ọcha. Ha ga-ejegharị nʼala ahụ niile, ha na ndị ọzọ, na-eli ozu ọbụla bụ ndị tọgbọrọ nʼala. “‘Mgbe ọnwa asaa zuru, ha ga-edo anya chọgharịa nʼala ahụ ma o nwere ebe ozu ọzọ dị.
15 Bwe baliba nga bayita mu nsi, omu n’alaba eggumba ly’omuntu, aliteeka akabonero mu kifo ekyo, okutuusa abaziika bwe baliba bayita ne balaba akabonero ne baliziika mu kiwonvu kya Kamonugoogi.
Mgbe ahụ, ha na-ejegharị, ọ bụrụ na onye ọbụla achọta ọkpụkpụ mmadụ ọ ga-amanye ihe ịrịbama nʼakụkụ ya, ka ndị na-eli ozu hụ ha, kporokwa ha gaa na Ndagwurugwu Gog na ndị agha ya lie ha.
16 (Era ne mu kifo ekyo eribaayo ekibuga ekiyitibwa Kamona). Bwe batyo bwe balitukuza ensi.’
Ọzọkwa, otu obodo aha ya bụ Hamona, nke pụtara ọtụtụ, ga-adị nʼebe ahụ. Otu a ka ha ga-esi mee ka ala ahụ dị ọcha.’
17 “Omwana w’omuntu, bw’ati bw’ayogera Mukama Katonda nti, Koowoola buli kika ky’ennyonyi n’ebisolo byonna ebikambwe obigambe nti, ‘Mukuŋŋaane, mujje okuva mu njuyi zonna eri ssaddaaka gye mbateekeddeteekedde, ssaddaaka ennene ku nsozi za Isirayiri, mulye ennyama munywe n’omusaayi.
“Nwa nke mmadụ, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, kpọọ ụmụ nnụnụ niile oku, na anụ ọhịa niile dị iche iche, sị ha, ‘Chịkọtaanụ onwe unu, site nʼakụkụ niile bịanụ nʼọchụchụ aja m, nke mụ onwe m na-achụ nʼihi unu, bụ aja dị ukwuu nke m na-achụ nʼelu ugwu niile dị nʼIzrel. Nʼebe ahụ ka unu ga-anọ taa anụ, ṅụọkwa ọbara.
18 Mulirya ennyama ey’abalwanyi ab’amaanyi, era mulinywa omusaayi gw’abalangira ab’ensi, ng’abanywa ogw’endiga ennume n’obuliga obuto, ogw’embuzi n’ente ziseddume, zonna ensava ez’e Basani.
Anụ ahụ ndị dị ike ka unu ga-eri, ọ bụkwa ọbara ndịisi niile nke ụwa ka unu ga-aṅụ, dịka a ga-asị na ha bụ ebule na ụmụ atụrụ, na mkpi, na oke ehi, anụ mara abụba nke si na Bashan.
19 Mulirya amasavu ne mukkuta, ne munywa omusaayi ne mutamiira ku ssaddaaka yange gye mbategekera.
Unu ga-erijukwa abụba afọ, ṅụbigakwa ọbara oke ruo mgbe ọ ga-ebu unu, site nʼaja mmemme nke m na-achụ nʼihi unu.
20 Ku mmeeza yange mulirya embalaasi n’abazeebagala, wamu n’abalwanyi ab’amaanyi n’abasajja abaserikale aba buli kika,’ bw’ayogera Mukama Katonda.
Afọ anụ ịnyịnya, na ụgbọala, na nke ndị dike, na nke ndị agha niile ga-eju unu na tebul m.’ Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri ya.
21 “Ndyoleka ekitiibwa kyange mu mawanga, era amawanga gonna galiraba ekibonerezo kye ndikuwa, nga n’omukono gwange gubateekeddwaako.
“Mgbe ahụ, aga m egosi ebube m na nsọpụrụ m nʼetiti mba niile dị iche iche. Mba niile ga-ahụkwa ahụhụ nke m tara ha, na aka m nke m tụkwasịrị ha.
22 Okuva ku lunaku olwo, ennyumba ya Isirayiri balimanya nga nze Mukama Katonda waabwe.
Site nʼụbọchị ahụ gaa nʼihu, ụlọ Izrel ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke ha.
23 N’amawanga galimanya ng’abantu ba Isirayiri balitwalibwa mu buwaŋŋanguse olw’ebibi byabwe, kubanga tebaali beesigwa gye ndi. Kyenava mbakweka amaaso gange ne mbawaayo mu mukono gw’abalabe baabwe, bonna ne battibwa ekitala.
Mba niile ga-amatakwa na ọ bụ nʼihi mmehie ka e ji dọta Izrel nʼagha, buru ha jee mba dị iche iche. Ha ga-amata na ihe dị otu a dakwasịrị ha nʼihi ekwesighị ntụkwasị obi ha. Ọ bụ nʼihi ya ka m ji zoo ihu m site nʼebe ha nọ, were ha nyefee nʼaka ndị iro ha. Ha niile dakwara site na mma agha.
24 Nababonereza ng’obutali butuukirivu bwabwe n’ebikolwa byabwe bwe byali, ne mbakisa amaaso gange.
Atara m ha ahụhụ dịka adịghị ọcha ha na ajọ omume ha si dị. Ezokwara m ihu m site nʼebe ha nọ.
25 “Noolwekyo Mukama Katonda ayogera nti, Ndikomyawo Yakobo okuva mu buwaŋŋanguse, era ndikwatirwa ekisa ennyumba ya Isirayiri yonna, era ndirwanirira erinnya lyange ettukuvu.
“Nʼihi ya, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, Aga m eme ka Jekọb a dọtara nʼagha lọta. Aga m enwekwa obi ebere nʼahụ ndị Izrel niile. Aga m esitekwa nʼekworo mee ka aha m dịgide nsọ.
26 Balyerabira okuswazibwa kwabwe, n’obutali bwesigwa bwe bandaga, bwe baabeera mu nsi yaabwe emirembe, nga tebaliiko abatiisa.
Ha ga-echezọkwa ihe ihere ha, na-ekwesighị ntụkwasị obi ha niile, nke ha gosiri m, mgbe ha biri nʼudo nʼala ha, na-enweghị onye na-eme ka ha tụọ egwu.
27 Bwe ndibakomyawo okuva mu mawanga, nga mbakuŋŋaanyizza okuva mu nsi ez’abalabe baabwe, ndyoleka obutukuvu bwange mu bo eri amawanga mangi.
Mgbe m mere ka ha site na mba dị iche iche pụta, mgbe m sitere nʼala niile nke ndị iro ha kpọpụta ha, aga m esite na ha gosi ịdị nsọ m nye mba dị iche iche.
28 Olwo balimanya nga nze Mukama Katonda, kubanga nabasindika mu buwaŋŋanguse mu mawanga, ate ne mbakuŋŋaanya eri ensi yaabwe, ne sirekaayo n’omu.
Mgbe ahụ, ha ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke ha. Ha ga-amata na ọ bụ ezie na ọ bụ m mere ka a dọta ha nʼagha buru ha jee mba dị iche iche, na m ga-achịkọta ha mee ka ha lọghachi nʼala nke aka ha. Ọ dịkwaghị onye a ga-ahapụ na mba ọzọ.
29 Siribakisa maaso gange nate, bwe ndifuka Omwoyo wange ku nnyumba ya Isirayiri, bw’ayogera Mukama Katonda.”
Agaghị m ezokwa ihu m ọzọ nʼebe ha nọ, nʼihi na aga m awụkwasị ụlọ Izrel Mmụọ m. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri ya.”

< Ezeekyeri 39 >