< Okuva 28 >

1 “Muganda wo Alooni muyiteyo mu baana ba Isirayiri, awamu ne batabani be: Nadabu, ne Abiku, ne Eriyazaali, ne Isamaali, bajje bampeereze nga be bakabona.
“Ugbu a, site nʼetiti ụmụ Izrel kpọbata nwanne gị nwoke Erọn, ya na ụmụ ya ndị ikom, bụ Nadab, na Abihu, na Elieza na Itama. Ka ha jeere m ozi dịka ndị nchụaja.
2 Muganda wo Alooni mutungire ebyambalo ebitukuvu, nga bya kitiibwa era nga birabika bulungi.
Meere Erọn nwanne gị nwoke uwe nsọ, nke ga-enye ya ugwu na nsọpụrụ.
3 Yogera n’abo bonna abasobola, be nawa ekirabo eky’amagezi mu mirimu egyo, bakolere Alooni ebyambalo mw’anaayawulirwa okubeera kabona wange.
Gwa ndị niile nwere onyinye ǹka nʼịdụ akwa, bụ ndị m nyere amamihe nʼihe ndị a, sị ha dụọrọ Erọn uwe pụrụ iche, nke e ji edo ya nsọ, ime ya onye na-ejere m ozi dịka onye nchụaja.
4 Bino bye byambalo bye banaakola: eky’omu kifuba, ekkanzu ey’obwakabona okutali mikono ennyimpi eyitibwa ekkanzu ey’obwakabona eyitibwa efodi; ng’ekoma mu ntumbwe; omunagiro; ekkooti erimu obusaze obw’obusimba n’obw’obukiika; ekitambaala; n’olukoba. Bakolere Alooni ne batabani be ebyambalo ebitukuvu balyoke bampeereze nga be bakabona.
Nke a bụ ụdị uwe ha ga-adụ: Ihe mgbochi obi, efọọd, uwe ime ahụ akpara akpa na-enweghị aka na uwe mwụda buru ibu, na uwe ime ahụ nke tụrụ agwa agwa na akwa a na-atụhị nʼisi na nke a na-eke nʼukwu. Ha ga-adụrụ Erọn nwanne gị nwoke na ụmụ ya ndị ikom uwe ndị a dị nsọ. Ka ha na-ejere m ozi dịka ndị nchụaja.
5 Abakozi baweebwe ewuzi eza zaabu, ne bbululu, ne kakobe, ne myufu, ne linena omulebevu omulange.
Ka ha jiri ogho ọlaedo, nke na-acha anụnụ anụnụ, nke ngwakọta anụnụ na uhie, nke uhie uhie nakwa nke ezi akwa ọcha dụọ ha.
6 “Abakozi abakugu bakole ekkanzu ey’obwakabona ennyimpi etaliiko mikono n’ewuzi eza zaabu, ne bbululu, ne myufu, ne linena omulebevu omulange.
“Weere ogho ọlaedo, na nke na-acha anụnụ anụnụ, na ngwakọta anụnụ na uhie, na uhie uhie na ezi akwa ọcha a kpara nke ọma mee efọọd ahụ, nke bụ akaọrụ onye ǹka.
7 Ebeere n’eby’okubibegabega bibiri nga bitungiddwa w’ekoma, eryoke egattibwe bulungi.
Ọ ga-enwe akwa nʼubu ya abụọ nke e ji ejikọta ọnụ nkuku ya abụọ, ka e nwe ike na-ekechisi ya ike.
8 Omusipi gwayo mu kiwato gukolebwe n’amagezi mangi nga aganaakola ekkanzu ey’obwakabona, era n’ebinaakola bifaanagane, ng’ewuzi za zaabu, ne bbululu, ne kakobe, ne myufu, ne linena omulebevu alangiddwa.
Ihe okike nke ukwu ahụ nke onye ǹka kpaziri nke ọma ga-adị ka ya. Ya na efọọd ahụ bụ otu, nke e ji ogho na-acha edo edo, nke anụnụ anụnụ, na ngwakọta anụnụ na uhie na uhie uhie, nakwa nke ezi akwa ọcha a kpara nke ọma mee.
9 “Oddire amayinja ga onuku abiri, ogalambeko amannya ga batabani ba Isirayiri,
“Were nkume ọniks abụọ, gbunye aha ụmụ ndị nwoke Izrel nʼelu ya,
10 amannya mukaaga ku jjinja erimu, n’amannya g’abasigaddewo omukaaga ku jjinja eryokubiri, ng’okuzaalibwa kwabwe bwe kugenda kuddiriragana.
nʼusoro dịka e si mụọ ha, isii nʼelu otu nkume, isii fọdụrụ na nkume nke ọzọ.
11 Olambe amannya ga batabani ba Isirayiri ku mayinja ago abiri ng’omusazi w’amayinja bw’ayola akabonero ku jjinja; ogateeke mu fuleemu ogeetoolooze n’emikugiro egya zaabu.
Gbunye aha ụmụ ndị nwoke Izrel nʼelu nkume abụọ ndị ahụ, dịka onye ǹka si egbunye akara na nkume. Mgbe ahụ, hịọnye nkume ndị ahụ nʼime ihe ọlaedo ahụ a kpara akpa,
12 Amayinja ago ojja gakwasiza ku by’okubibegabega eby’ekkanzu ey’obwakabona eyitibwa efodi, ng’amayinja ag’ekijjukizo ky’abaana ba Isirayiri. Alooni asitulenga amannya gaabwe awali Mukama ng’ekijjukizo.
jikọta ha nʼelu akwa ubu nke efọọd ahụ ka ọ bụrụ nkume ncheta mgbe ebighị ebi nye ụmụ Izrel. Erọn ga-ebukwa aha ndị a nʼelu ubu ya abụọ, dịka ihe ncheta nʼihu Onyenwe anyị.
13 Okole fuleemu eza zaabu,
Ị ga-eji ọlaedo mee ihe ịchọ mma a tụrụ atụ.
14 n’enjegere bbiri eza zaabu omuka, ozirange ng’emiguwa; olyoke osibire enjegere ez’oku fuleemu.
Jirikwa ọlaedo a nụchara anụcha kpụọ eriri a tụhịkọtara dịka ụdọ, jikọta eriri ọlaedo ahụ na ihe ịchọ mma ndị ahụ.
15 “Kola ekyomukifuba eky’okutereezanga ensonga, nga mulimu gwa kikugu ng’ogw’ekkanzu ey’obwakabona eyitibwa efodi, n’ewuzi eza zaabu, ne bbululu, ne kakobe, ne myufu, ne linena omulebevu omulange.
“Ị ga-adụ ihe mgbochi obi nke ikpe, nke bụ ọrụ aka onye ǹka. Mee ya dịka efọọd ahụ: jiri ogho edo edo, nke anụnụ anụnụ, na ngwakọta anụnụ na uhie, na nke uhie uhie nakwa ezi akwa ọcha a kpara nke ọma mee ya.
16 Kijja kwenkanankana, buli ludda sentimita amakumi abiri mu bbiri, okiwetemu wakati.
Akụkụ anọ ya ga-aha nʼotu, iri sentimita abụọ na atọ nʼogologo, iri sentimita abụọ na atọ nʼobosara, nke apịajiri ụzọ abụọ.
17 Otungireko ennyiriri nnya ez’amayinja ag’omuwendo omungi. Mu lunyiriri olusooka osseemu amayinja saasiyo, ne topazi, ne kaabankulo;
Mgbe ahụ, hịọnye nʼelu ya ahịrị nkume anọ ndị dị oke ọnụahịa. Ụdị ga-adị nʼahịrị nke mbụ bụ, nkume kanelian, krisolaịt na beril,
18 ne mu lunyiriri olwokubiri osseemu emalada, ne safiro ne dayamandi;
nʼahịrị nke abụọ, ga-abụ nkume tọkwọisi, safaia na emeralụdụ.
19 ne mu lunyiriri olwokusatu osseemu jasinta; ne ageti, ne ametisita,
Nʼahịrị nke atọ ga-abụ nkume jasint, ageeti na ametisiti.
20 ne mu lunyiriri olwokuna osseemu berulo, ne onuku, ne yasipero, ogateeke mu fuleemu ya zaabu.
Nʼahịrị nke anọ, ga-abụ nkume topaazi, ọniks na jaspa. Hịọnye ha nʼime ihe ọlaedo a kpara akpa.
21 Wabeerewo amayinja kkumi n’abiri, n’amannya gaago ng’amannya g’abatabani ba Isirayiri. Gasalibwe bulungi ng’obubonero obuwoolebwa, nga ku buli limu kulambiddwako erinnya lyako okumalirayo ddala amannya g’ebika ekkumi n’ebibiri.
Ha niile ga-adị nkume iri na abụọ, nke ọbụla na-anọchi anya aha ụmụ ndị ikom Izrel. Egbunyere aha ebo iri na abụọ ahụ, otu nʼotu, nke ọbụla dịka aha ya si dị.
22 “Ekyomukifuba kikolere enjegere ennange ng’emiguwa gya zaabu omuka.
“Jiri ọlaedo a nụchara anụcha mee eriri a kpara akpa dịka ụdọ, maka ihe mgbochi obi.
23 Era ekyomukifuba kikolere empeta za zaabu bbiri, oteeke empeta ezo zombi ku mikugiro ebiri egy’ekyomu kifuba.
Kpụkwaa mgbaaka ọlaedo abụọ, dụnye ha na nkuku abụọ nke ihe mgbochi obi ahụ.
24 Oyise enjegere ebbiri eza zaabu mu mpeta ebbiri eziri ku mikugiro gy’eky’omu kifuba.
Dụnye ụdọ ọlaedo abụọ ndị ahụ nʼelu mgbaaka ndị ahụ dị na nkuku ihe mgbochi obi ahụ,
25 Oddire enjuuyi ebbiri ezisigaddewo ez’enjegere ozikwasize ku fuleemu ebbiri, ozinywereze mu maaso g’eby’oku bibegabega byombi eby’ekkanzu ey’obwakabona eyitibwa efodi.
were isi ndị ọzọ nke ụdọ ahụ dụnye nʼihe ahụ a kpara akpa, konye ha nʼelu ubu efọọd ahụ, nʼebe ihu ya.
26 Era okole empeta bbiri eza zaabu, ozitunge ku mikugiro gy’eky’omu kifuba ku luuyi olw’omunda oluliraanye ekkanzu ey’obwakabona eyitibwa efodi.
Ị ga-emekwa mgbaaka ọlaedo, konye ha na nkuku abụọ nke ihe mgbochi obi ahụ, nʼime ọnụ ọnụ ya ebe dị nso efọọd ahụ.
27 Era okole empeta bbiri eza zaabu oziteeke mu maaso, mu bitundu ebya wansi eby’eby’okubibegabega byombi eby’ekkanzu ey’obwakabona eyitibwa efodi, wagguluko okumpi n’oluzizi lw’omusipi olw’ekkanzu ey’obwakabona eyitibwa efodi.
Ị ga-akpụ mgbaaka ọlaedo abụọ ọzọ, konye ha nʼelu ubu abụọ nke efọọd ahụ, nʼokpuru nʼebe nʼihu ya, na nso nso ebe a dụkọtara ya, nʼelu ihe okike ukwu nke efọọd ahụ.
28 Empeta ez’oku kyomukifuba zisibwe wamu n’empeta z’ekkanzu ey’obwakabona eyitibwa efodi n’akaguwa aka bbululu, kagattibwe n’olukoba, olw’omu kifuba luleme kutaggulukuka ku kkanzu ey’obwakabona eyitibwa efodi.
A ga-eji eriri na-acha anụnụ kekọta mgbaaka ihe mgbochi obi ahụ na mgbaaka efọọd ahụ, jikọtaa ya na ihe okike ukwu ahụ, ime ka ihe mgbochi obi ahụ ghara ịtọghapụ site nʼefọọd ahụ.
29 “Buli kiseera Alooni lw’anaayingiranga mu Kifo Ekitukuvu, anaabanga ayambadde amannya ga batabani ba Isirayiri ku kyomukifuba eky’okumala ensonga, nga kiri ku mutima gwe, kibeerenga ekijjukizo awali Mukama.
“Nʼụzọ dị otu a, mgbe ọbụla Erọn banyere nʼEbe Nsọ, ọ ga-ebu aha ụmụ ndị ikom Izrel niile nʼelu obi ya, nʼelu ihe mgbochi obi nke ikpe ahụ, dịka ihe ncheta nʼihu Onyenwe anyị mgbe niile.
30 Mu ky’omu kifuba eky’okumala ensonga, onooteekamu Ulimu ne Sumimu, era binaabeeranga ku mutima gwa Alooni buli lw’anaayingiranga awali Mukama. Bw’atyo Alooni anaasitulanga ekkubo omuyitwa okumala ensonga z’abaana ba Isirayiri okumpi n’omutima gwe buli lw’anaagendanga awali Mukama.
Ị ga-etinyekwa nʼime ihe mgbochi obi ahụ ụmụ nkume abụọ e ji ajụta ase nke bụ Urim na Tumim. Ha ga-adị nʼelu obi Erọn mgbe ọbụla ọ gara nʼihu Onyenwe anyị. Otu a kwa, Erọn ga-ebukwa ihe e ji ajụta ase banyere ndị Izrel nʼelu obi ya mgbe niile, nʼihu Onyenwe anyị.
31 “Onookola ekyambalo ekiri ng’ekkanzu ey’obwakabona eyitibwa efodi, nga kyonna kya bbululu.
“Ọ bụ akwa nke na-acha anụnụ anụnụ, ka ị ga-eji dụọ uwe mwụda efọọd ahụ.
32 Waggulu mu makkati gaakyo munaabaamu ekituli omw’okuyisa omutwe; okwetooloola ekituli ekyo kunaabaako omuge omuyonde obulungi ng’omuleera ku kituli ky’omutwe eky’ekkanzu ey’obwakabona, kireme okuyulika.
Ọ ga-enwe oghere nʼetiti ya ebe a ga-esi na-etinye isi. A ga-enwe ihe ọkpụkpa gburugburu oghere a dịka nke olu uwe agha, ime ka o sie ike, ghara ịdọka.
33 Okwetooloola ebirenge wansi onootungayo amajjolobera mu wuzi eza bbululu, ne kakobe, ne myufu; nga mu makkati ga buli langi eziriraanye otobekamu obude obwa zaabu.
Nʼọnụ ala ala uwe ahụ gburugburu, ị ga-akpanye ihe ọkpụkpa oyiyi mkpụrụ pomegranet. Ọ bụ ogho nke na-acha anụnụ anụnụ, ngwakọta anụnụ na uhie na uhie uhie ka ị ga-eji. Ị ga-akpanyekwa ataṅụ ọlaedo nʼetiti ha.
34 Ng’otunga amajjolobera n’ozzaako akade, ate n’oddiriza amajjolobera n’ozzaako akade; bw’otyo okwetooloola ebirenge by’ekyambalo ekyo.
Nʼọnụ ọnụ ala uwe mwụda ahụ, a ga-adụnye otu ataṅụ ọlaedo, otu oyiyi mkpụrụ pomegranet, gbaa gburugburu.
35 Gunaabanga mulimu gwa Alooni okwambala ekyambalo ekyo ng’agenda okuweereza. Obude obwo bunaawulirwanga ng’ayingira mu Kifo Ekitukuvu awali Mukama, ne bw’anaabanga afuluma, aleme okufa.
Mgbe ọbụla Erọn na-eje ozi ya, ọ ghaghị iyi ya. Aga na anụ mgbịrịgba ataṅụ ahụ ka ọ na-akụ, mgbe ọ banyere nʼEbe Nsọ ahụ nʼihu Onyenwe anyị, na mgbe o si nʼebe ahụ na-apụta, ka ọ ghara ịnwụ.
36 “Onookola akapande aka zaabu omuka ennyo, okayoleko, nga bwe bayola akabonero, nti, Mutukuvu wa Mukama.
“Ị ga-ejikwa ọlaedo a nụchara anụcha mee efere ntakịrị, gbunye akara dị otu a nʼelu ya: Ihe nsọ dịrị Onyenwe anyị.
37 Akapande okasibeko akaguwa aka bbululu, okanywereze ku kitambaala ky’oku mutwe ku ludda olw’omu maaso olw’ekitambaala.
Kenye eriri na-acha anụnụ anụnụ i ji jikọta ya na ihe ike nʼisi ahụ; ọ ga-adị nʼihu akwa ike nʼisi ahụ.
38 Akapande ako kanaabeeranga mu kyenyi kya Alooni, era Alooni y’anaabangako obuvunaanyizibwa nga wabaddewo ebitatuuse mu biweebwayo ebitukuvu abaana ba Isirayiri bye banaaleetanga nga bamaze okubyawula ng’ebirabo byabwe ebitukuvu; kanaabeeranga ku kyenyi kye bulijjo, Mukama alyoke akkirize ebirabo ebyo.
Ọ ga-adị nʼegedege ihu Erọn. Ọ ga-ebukwa ikpe ọmụma metụtara njehie gbasara ihe nsọ niile nke ụmụ Izrel doro nsọ, na onyinye ha niile. Ọ ga-adị nʼegedege ihu Erọn mgbe niile, ka ha bụrụ ndị Onyenwe anyị ga-anabata.
39 “Luka ekkooti erimu obusaze obw’obusimba n’obw’obukiika mu wuzi eza linena omulebevu, era okole n’ekitambaala eky’oku mutwe mu linena omulebevu, era okole olukoba ng’olutunzeemu amajjolobera.
“Jiri ezi akwa ọcha kpaa uwe ime ahụ. Werekwa ezi akwa ọcha mee akwa ike nʼisi ahụ. Ihe ike nʼukwu ahụ ga-abụ ọrụ aka onye ǹka na-akpanye ihe ịchọ mma.
40 Batabani ba Alooni bakolere amakooti, n’emisipi, n’enkuufiira; nga byonna bya kitiibwa era nga birabika bulungi nnyo.
Meekwara ụmụ ndị ikom Erọn uwe ime ahụ, ihe ike nʼukwu na akwa ike nʼisi, inye ha ugwu na nsọpụrụ.
41 Alooni muganda wo mwambaze ebyambalo ebyo, ne batabani be nabo bw’otyo; olyoke obafukeko amafuta ag’omuzeeyituuni, obaawule, obatukuze, bampeerezenga nga be bakabona.
Mgbe i yinyekwasịrị Erọn nwanne gị na ụmụ ya ndị ikom uwe ndị a, tee ha mmanụ, doo ha nsọ. Chee ha nʼihu m ka ha bụrụ ndị na-ejere m ozi dịka ndị nchụaja.
42 “Bakolere empale ez’omunda eza linena, nga ziva mu kiwato okukoma mu bisambi, zibikke omubiri gwabwe.
“Meekwara ha uwe ụkwụ nke eji akwa ọcha mee, maka ikpuchi anụ ahụ ha. Ọ ga-esite nʼukwu ruo nʼikpere.
43 Alooni ne batabani be banaazambalanga nga bajja mu Weema ey’Okukuŋŋaanirangamu oba bwe banaasembereranga Ekyoto okuweereza mu Kifo Ekitukuvu, baleme okwereetako omusango ne bafa. “Alooni ne batabani be ne bazzukulu be abalimuddirira banaakuumanga etteeka lino nga lya nkalakkalira.”
Erọn na ụmụ ya ndị ikom aghaghị iyi ha mgbe niile ha ga-aba nʼime ụlọ nzute, maọbụ mgbe ha na-abịa nso ebe ịchụ aja ije ozi nʼEbe Nsọ. Ka ha ghara imeta ihe ikpe ọmụma, ma nwụọ. “Nke a ga-abụ iwu na ụkpụrụ ebighị ebi, nke ga-adịrị Erọn na ụmụ ụmụ ya.

< Okuva 28 >