< Okuva 25 >
1 Mukama n’ayogera ne Musa nti,
Onyenwe anyị gwara Mosis sị,
2 “Gamba abaana ba Isirayiri bandeetere ekiweebwayo. Buli muntu aleete ekiweebwayo ng’okuteesa kw’omutima gwe bwe kuli, okimunzijireko.
“Gwa ụmụ Izrel ka ha wetara m onyinye. Ị ga-anabatara m onyinye ahụ site nʼaka nwoke ọbụla onye o metụrụ nʼobi inye onyinye a.
3 “Bino bye biweebwayo bye banaakukwasa: “zaabu, ne ffeeza, n’ekikomo;
“Ndị a bụ Onyinye ị ga-anata nʼaka ha: “ọlaọcha, ọlaedo na bronz.
4 n’olugoye olwa bbululu, n’olwa kakobe, n’olumyufu, n’olugoye olwa linena erangiddwa mu wuzi ennungi; n’obwoya bw’embuzi,
Ogho na-acha anụnụ anụnụ, nke odo odo, nke uhie uhie, nke ezi akwa ọcha, na nke ajị ewu;
5 n’amaliba g’endiga ennume amakunye amannyike mu langi emyufu, n’ekika ky’eddiba ekirala ekiwangaazi; n’embaawo z’omuti gwa akasiya;
akpụkpọ anụ ebule e sijiri uhie uhie, akpụkpọ ehi mmiri, na osisi akashia;
6 n’amafuta g’ettaala; n’ebyakaloosa eby’okukozesa mu mafuta ag’okwawula, ne mu bubaane obw’okunyookeza;
mmanụ oliv nke a ga-etinye nʼiheọkụ, ụda isi ụtọ a na-etinye na mmanụ nsọ, na ụda na-eme ka aja nsure ọkụ na-esi isi ụtọ;
7 n’amayinja aga onuku n’amayinja amalala ag’omuwendo, ag’okutona ku kkanzu ey’obwakabona eyitibwa efodi, era ne ku kyomukifuba.
nkume ọma ọniks, na nkume ndị ọzọ a na-ahịọnye nʼefọọd, na nke a na-ahịọnyekwa nʼihe mgbochi obi.
8 “Bankolere ekifo ekitukuvu ndyoke mbeerenga wakati mu bo.
“Mee ka ha wuoro m ebe nsọ. Mụ onwe m ga-ebikwa nʼetiti ha.
9 Mukole Eweema ya Mukama eyo entukuvu n’ebigibeeramu byonna nga bwe nnaabalagirira.
Wuo ụlọ nzute a na ihe ịchọ ya mma niile, ka ọ bụrụ otu ihe dịka oyiyi m ga-egosi gị.
10 “Bakole essanduuko mu muti gwa akasiya, obuwanvu mita emu ne sentimita kkumi na ssatu, obugazi sentimita nkaaga mu musanvu n’obugulumivu sentimita nkaaga mu musanvu.
“Ha ga-eji osisi akashia wuo igbe ọgbụgba ndụ nke ịdị ogologo ya ga-abụ otu mita na sentimita iri. Obosara ya bụ sentimita iri isii na asatọ. Ịla elu ya ga-abụkwa sentimita iri isii na asatọ.
11 Ogiteekeko zaabu omuka ennyo munda ne kungulu, era ogyetoolooze omuge ogwa zaabu.
Machie ọlaedo a nụchara anụcha nʼime na azụ ya niile, jiri ọlaedo kpụọ ihe gburugburu akụkụ ya niile.
12 Ogiweeseze empeta nnya eza zaabu ozisibe ku magulu gaayo ana, ng’empeta ebbiri ziri ku ludda olumu, n’endala ebbiri ku ludda lwayo olulala.
Kpụọ mgbaaka ọlaedo anọ maka ya, kwụnye ha nʼụkwụ anọ ya, ya bụ mgbaaka abụọ nʼotu akụkụ, mgbaaka abụọ nʼakụkụ nke ọzọ ya
13 Obajje emisituliro mu muti ogwa akasiya, ogibikkeko zaabu.
Jirikwa osisi akashia mee mkpara ogologo. Emesịa, were ọlaedo machie mkpara ndị a.
14 Ogisonseke mu mpeta eziri ku ssanduuko, okusituzanga essanduuko.
Ị ga-etinye mkpara ndị ahụ nʼime mgbaaka ahụ dị nʼakụkụ igbe ahụ, ka ọ bụrụ ihe iji na-ebu ya.
15 Emisituliro egyo ginaalekebwanga mu mpeta ze ssanduuko, si zaakuggyangamu.
Nʼihi nke a, mkpara ọlaedo ndị ahụ ga-adịgide nʼime mgbaaka ọlaedo igbe a oge niile.
16 Mu ssanduuko omwo mw’onossa Amateeka ge nnaakuwa.
Ya mere, mgbe a rụsịrị igbe ọgbụgba ndụ ahụ, tinye Ihe Ama ahụ m nyere gị nʼime ya.
17 “Okolereko ekisaanikira, ye ntebe ey’okusaasira, nga kya zaabu omuka ennyo; obuwanvu bwakyo sentimita nkaaga mu musanvu, n’obugazi sentimita nkaaga mu musanvu.
“Ị ga-ejikwa ọlaedo a nụchara anụcha mee ihe mkpuchi igbe ọgbụgba ndụ ahụ. Ogologo ya ga-adị nzọ ụkwụ anọ. Obosara ya ga-abụ nzọ ụkwụ abụọ na ọkara.
18 Era okolereko ebifaananyi bya bakerubi babiri mu zaabu empeese, ku njuyi ebbiri ez’ekisaanikira.
Ị ga-eji ọlaedo a nụchara anụcha, nke e tipịara etipịa kpụọ cherubim abụọ na nsọtụ abụọ nke ebe mkpuchi ahụ.
19 Oteeke ekifaananyi kya kerubi omu ku ludda lumu olw’ekisaanikira, n’ekifaananyi kya kerubi omulala ku ludda olwokubiri, nga ebifaananyi bya bakerubi byombi byekutte wamu n’ekisaanikira.
Rụọ otu cherub nʼotu nsọtụ, otu cherub na nsọtụ nke ọzọ; mee ka cherubim ndị a na okwuchi igbe ahụ bụrụ otu na nsọtụ abụọ ahụ.
20 Ebiwaawaatiro bya bakerubi bibe bibikkule nga bisonze waggulu, era nga bisiikiriza ekisaanikira. Bakerubi batunulagane nga boolekedde ekisaanikira.
Cherubim ndị a ga-agbasa nku ha laa elu, were ha na-ekpuchi okwuchi ahụ. Cherubim ndị ahụ ga-eche onwe ha ihu, na-ele anya nʼebe okwuchi ahụ dị.
21 Ekisaanikira onookissa kungulu ku Ssanduuko; ekiwandiiko eky’Endagaano ey’Amateeka kye nnaakuwa, okisse munda mu Ssanduuko.
Tụkwasị ihe mkpuchi ahụ nʼelu igbe ọgbụgba ndụ ahụ. Tinyekwa Ihe Ama ahụ m nyere gị nʼime igbe ahụ.
22 Awo waggulu w’ekisaanikira, mu bakerubi bombi abali ku Ssanduuko ey’Endagaano, we nzija okukusisinkana ndyoke nkuwe ebiragiro byange byonna bye nkoledde abaana ba Isirayiri.
Nʼebe ahụ, nʼetiti cherubim abụọ ndị ahụ dị nʼelu ihe mkpuchi igbe ọgbụgba ndụ, ka m ga-ezute gị, nye gị iwu niile ị ga-enye ndị Izrel.
23 “Okole emmeeza mu muti gwa akasiya, obuwanvu bwayo sentimita kyenda, obugazi sentimita amakumi ana mu ttaano, n’obugulumivu sentimita nkaaga mu musanvu.
“Jiri osisi akashia mee tebul nke ogologo ya ga-adị iri sentimita itoolu. Obosara ya ga-abụ iri sentimita anọ na ise. Ịla elu ya ga-abụ iri sentimita isii na asaa.
24 Ogibikkeko zaabu omuka ennyo; era ogyetoolooze ne zaabu omuge gwonna.
Ị ga-eji ọlaedo a nụchara anụcha machie ya nke ọma, jirikwa ọlaedo kpụọ ọnụ ọnụ ya gburugburu.
25 Era ogyetoolooze olukugiro oluweza sentimita musanvu ne desimoolo ttaano obugazi, n’omuge ogwa zaabu okwetooloola olukugiro olwo.
Ị ga-etinye ihe njikọta a kpụrụ akpụ gburugburu ọnụ ọnụ ya, nke ga-aha ka otu ọbụ aka dimkpa. A ga-eji mpempe ọlaedo techie ihe njikọta ahụ gburugburu.
26 Ogikolere empeta nnya eza zaabu, ozisibe mu nsonda ennya awali amagulu ana.
Kpụọ mgbaaka ọlaedo anọ maka tebul ahụ, kwụnye ha nʼakụkụ anọ ahụ nke ụkwụ anọ ya.
27 Empeta zijja kubeera waggulu okumpi n’omuge, emisituliro gy’emmeeza mwe ginaayisibwa.
Mgbaaka ndị ahụ ga-adị nso nso, ihe njikọ ahụ ka ha jide mkpara ndị ahụ, i ji ebu tebul ahụ.
28 Okole emisituliro mu muti gwa akasiya, ogibikkeko zaabu, egyo emmeeza kw’eneesitulirwanga.
Jiri osisi akashia mee mkpara a ga-eji na-ebu tebul ahụ. Jiri ọlaedo techie ha.
29 Era ogikolere essowaani eza zaabu, n’ebijiiko ebya zaabu, n’ensuwa eza zaabu, n’ebibya ebya zaabu eby’okufukanga ebiweebwayo.
Ọzọkwa, jiri ọlaedo a nụchara anụcha kpụọ efere dị iche iche, na iko dị iche iche, na ọkwa dị iche iche, nke e ji awụpụ onyinye.
30 Era ku mmeeza eno onossaako Emigaati egy’Okulaga, egy’okubeeranga mu maaso gange bulijjo.
Dọkwasị achịcha nke iche nʼIhu nʼelu tebul ahụ, nʼihu m, oge niile.
31 “Okole ekikondo ky’ettaala nga kya zaabu omuka. Ekikondo kyonna na bino ebikiriko: entobo yaakyo n’enduli, ebikopo ebifaanana ng’ebimuli, amatabi n’emitunsi n’ebimuli byako, byonna byakuweesebwa mu kyuma kya zaabu kimu bulambalamba.
“Jiri ọlaedo a nụchara anụcha kpụọ ihe ịdọkwasị oriọna. Kpụọ ụkwụ ala ala ya, na alaka ya, mee ka iko ya niile yiri okoko osisi, na isi ya niile, na ifuru ya niile bụrụ otu ya na ahụ ya.
32 Kunaabako amatabi mukaaga omutuula emisubbaawa: amatabi asatu nga gali ku ludda lumu, n’amalala asatu nga gali ku ludda olulala.
Alaka isii ga-esite nʼakụkụ abụọ nke ihe ịdọkwasị oriọna ahụ wapụta, alaka atọ nʼotu akụkụ ya, alaka atọ nʼakụkụ nke ọzọ.
33 Ku matabi gonna omukaaga agava ku kikondo ky’ettaala, kubeeko ku buli ttabi, ebikopo bisatu ebikole ng’ebimuli by’alumondi; mu buli kikopo nga mulimu omutunsi n’ekimuli.
Iko atọ e mere dịka okoko osisi alụmọnd ya na ifuru, ya na okoko ya niile ga-adị nʼotu alaka, iko atọ nʼalaka nke ọzọ, otu a ka ọ ga-adị nʼalaka isii niile ahụ na-awapụta site nʼihe ịdọkwasị oriọna ahụ.
34 Ku kikondo ky’ettaala kyennnyini kubeeko ebikopo bina ebifaanana ebimuli by’alumondi nga mulimu emitunsi n’ebimuli.
Nʼelu ihe ịdọba oriọna ahụ, ọ ga-adị iko anọ dịka ifuru osisi alụmọnd, ya na ebe o si awapụta na okoko ya.
35 Omutunsi gumu gujja kuba wansi w’amatabi abiri agava ku kikondo, n’omutunsi ogwokubiri gubeere wansi w’amatabi abiri amalala, n’omutunsi ogwokusatu gubeere wansi w’amatabi abiri amalala; amatabi gonna omukaaga ne gaggwaayo.
Otu isi ga-adịkwa nʼokpuru alaka abụọ si nʼetiti ihe ịdọba oriọna ahụ pụta. Isi nke abụọ ga-adị nʼokpuru alaka abụọ nke ọzọ. Isi nke atọ ga-adị nʼokpuru alaka nke atọ, ya bụ ha niile alaka isii.
36 Emitunsi n’amatabi biweesebwe mu kyuma kya zaabu omwereere, nga kiri bulambalamba n’ekikondo ky’ettaala.
Isi nwapụta ya na alaka ya niile ga-adịkọtakwa ọnụ, ha na ihe ịdọkwasị oriọna ahụ, nke e ji ọlaedo a nụchara anụcha rụọ.
37 “Era ekikondo kikolere ettaala musanvu; ettaala zino nga zaakira mu maaso gaakyo.
“Ị ga-eme oriọna asaa, dọba ha nʼelu ihe ịdọkwasị iheọkụ ahụ, ka ha na-enye ìhè naanị nʼebe ihu ya.
38 Makansi ezikomola entambi, n’essowaani ez’okussaako ebisirinza, byonna bikolebwe mu zaabu mwereere.
Mkpa ya na ihe ịkpakepụ ọkụ ya niile, ga-abụ ọlaedo a nụchara anụcha.
39 Ojja kwetaaga zaabu omwereere aweza obuzito bwa kilo asatu mu nnya, okukola ekikondo ky’ettaala ne byonna ebigenderako.
Ọlaedo a nụchara anụcha nke dị iri kilogram atọ na anọ ka a ga-eji kpụọ ihe ịdọkwasị oriọna ahụ na ngwongwo ndị a niile.
40 Weegendereze, byonna obikole ng’ogoberera ekifaananyi kye nkulaze wano ku lusozi.”
Lezie anya hụ na i mere ihe ndị a niile nʼusoro ihe atụ nke e gosiri gị nʼelu ugwu.