< Ekyamateeka Olwokubiri 29 >

1 Bino bye bigambo by’endagaano Mukama Katonda gye yalagira Musa okukola n’abaana ba Isirayiri nga bali mu nsi ya Mowaabu, ng’egattibwa ku ndagaano gye yali akoze nabo ku Kolebu.
Ndị a bụ okwu nke ọgbụgba ndụ ahụ Onyenwe anyị nyere Mosis nʼiwu ka ya na ụmụ Izrel gbaa nʼala Moab na-agbanweghị ọgbụgba ndụ ahụ ya na ha gbara nʼugwu Horeb.
2 Awo Musa n’ayita Abayisirayiri bonna n’abagamba nti, Mwalaba n’amaaso gammwe ebyo byonna Mukama Katonda bye yakolera mu nsi y’e Misiri ku Falaawo ne ku bakungu be, ne ku nsi ye yonna.
Mosis kpọkọtara ụmụ Izrel niile gwa ha okwu sị, Unu ji anya unu hụ ihe Onyenwe anyị mere nʼIjipt megide Fero, na ndị ozi ya, na ala ya niile.
3 Walaba n’amaaso go ebigezo ebinene, n’obubonero obw’ebyamagero, n’ebyewuunyisa ebikulu.
Anya unu hụrụ oke nwale niile, na ihe ịrịbama ndị ahụ, na ọrụ ebube niile ahụ.
4 Naye n’okutuusa ku lunaku lwa leero Mukama tabawanga mutima ogutegeera, oba amaaso agalaba, oba amatu agawulira.
Ma tutu ruo taa, Onyenwe anyị enyebeghị unu obi nwere nghọta, na anya na-ahụ ụzọ, maọbụ ntị na-anụ ihe, nke ga-enyere unu aka ịṅomi ihe ndị a niile.
5 Bwe nabakulembera okumala emyaka amakumi ana mu ddungu engoye zammwe tezaakaddiwako, n’engatto y’omu kigere kyo teyakaddiwa.
Ma Onyenwe anyị na-asị, “Nʼime iri afọ anọ ndị ahụ nke m duuru unu nʼime ọzara, uwe unu emeghị ochie, akpụkpọụkwụ unu akapụghị nʼụkwụ unu.
6 Temwalya ku mugaati wadde okunywa ku nvinnyo, oba ku kyokunywa ekirala kyonna ekitamiiza. Ekyo nakikola mulyoke mumanye nga nze Mukama Katonda wammwe.
Ọ dịghị achịcha unu riri, ọ dịkwaghị mmanya maọbụ ihe ọṅụṅụ na-aba nʼanya unu ṅụrụ. E mere m ihe ndị a ime ka unu mata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke unu.”
7 Bwe mwatuuka mu kifo kino, Sikoni kabaka w’e Kesuboni, ne Ogi kabaka w’e Basani, ne basituka okutulwanyisa, naye ne tubawangula.
Mgbe unu rutere ebe a, Saịhọn, eze ndị Heshbọn, na Ọg, eze ndị Bashan, pụtara ibuso anyị agha, ma anyị lụgburu ha.
8 Twatwala ensi yaabwe, ne tugigabira Abalewubeeni, n’Abagaadi, n’ekitundu ky’ekika eky’Abamanase, okuba obutaka bwabwe obw’ensikirano.
Anyị weere ala ha nye agbụrụ Ruben, na Gad, na otu ọkara ebo Manase, dịka ihe nketa ha.
9 Noolwekyo mukwatenga ebigambo by’endagaano eno n’obwegendereza, mulyoke muwangulenga mu buli kimu kye munaakolanga.
Nʼihi ya, lezie anya idebe ụkpụrụ niile nke ọgbụgba ndụ a, ka ihe niile unu na-eme gaara unu nke ọma.
10 Mukuŋŋaanye wano leero mwenna mu maaso ga Mukama Katonda wammwe, nga muli n’abakulembeze b’ebika byammwe, n’abakulu bammwe abakulembeze, n’abafuzi bammwe, n’abasajja bonna aba Isirayiri,
Unu niile, ndị ndu unu, na ndịisi unu, na okenye, na ndịisi ọchịchị, na ndị ikom niile nke Izrel, unu ndị guzo nʼihu Onyenwe anyị Chineke taa,
11 n’abaana bammwe abato, ne bakazi bammwe, ne munnaggwanga asula awamu naawe mu lusiisira lwo, okukutyabira enku, n’okukukimira amazzi.
na ụmụntakịrị unu, na ndị nwunye unu, na ndị ọbịa bi nʼetiti unu, ndị na-egburu unu nkụ, na ndị na-echukwara unu mmiri.
12 Oli wano okukola endagaano ne Mukama Katonda wo, ng’ekirayiro gy’ali, Mukama Katonda wo gy’akola naawe leero;
Unu guzo nʼebe a taa ka unu na Onyenwe anyị Chineke gbaa ndụ. Unu guzokwa, maka ọgbụgba ndụ a unu na Onyenwe anyị na-agba taa, nke e ji ịṅụ iyi mesie ike,
13 alyoke akukakase ng’akunyweza leero okubeeranga eggwanga lye, naye nga ye Katonda wo, nga bwe yakusuubiza, era nga bwe yalayirira bakadde bo: Ibulayimu ne Isaaka.
ime ka ọ pụta ìhè nye unu taa na unu bụ ndị nke ya, imekwa ka unu mata na ọ bụ Chineke unu, dịka o kwere nna nna unu ha, Ebraham, na Aịzik, na Jekọb na nkwa.
14 Endagaano eno gye nkola, ng’eriko n’ekirayiro kyayo,
Ọgbụgba ndụ a nke ya na ịṅụ iyi so nke m na-eme ka ọ dịrị abụghị naanị nʼihi unu,
15 sigikola nammwe abayimiridde wano naffe leero mwekka, wabula ngikola wamu n’oyo atali wano naffe leero.
ndị soro anyị guzo nʼebe a taa, nʼihu Onyenwe anyị Chineke anyị, kama ọ bụkwa nʼihi ndị ahụ na-anọghị nʼebe a.
16 Mujjukira bulungi nga bwe twali mu nsi y’e Misiri, ne bwe twajjanga tuyita wakati mu mawanga okutuukira ddala wano.
Unu onwe unu maara otu anyị si bie nʼala Ijipt, na otu anyị si gafee mba ndị ahụ niile anyị gafere nʼụzọ.
17 Mwalabanga ebintu eby’ekikaafiiri, nga mwe mwalinga ebifaananyi ebibajje mu miti n’ebiwoole mu mayinja ne mu ffeeza ne mu zaabu.
Unu hụrụ nʼetiti ha ihe arụ ha niile, na arụsị niile e ji osisi, na nkume na ọlaọcha, na ọlaedo kpụọ.
18 Mukakasize ddala leero nga mu maka gammwe oba mu bika byammwe temulinaamu musajja oba mukazi n’omu akyamizza omutima gwe okuva ku Mukama Katonda waffe agende asinze bakatonda bali abalala abamawanga ago. Mukakasize ddala nga mu mmwe temuliimu kikolo okuyinza okukula obutwa obw’engeri eyo obukaawa ng’omususa.
Lezienụ anya ka unu hụ na obi onye ọbụla nʼime unu, nwoke maọbụ nwanyị, agbụrụ maọbụ ebo ọbụla nʼIzrel, esighị nʼebe Onyenwe anyị bụ Chineke anyị nọ pụọ, bido chewe echiche ife chi ndị mba ọzọ ndị a niile. Lezienụ anya hụ na mgbọrọgwụ na-ewepụta nsi na-elu ilu dị otu a adịghị nʼetiti unu.
19 Omuntu ow’engeri ng’eyo ng’awulidde ebigambo eby’ekikolimo kino n’amala yeeyibaala, ne yeetukuza ku bubwe yekka, n’alowooza munda ye nti, “Nzija kubeera bulungi newaakubadde nga mmaliridde okukwata ekkubo eryange ery’obujeemu,” ekyo kinaaletanga akacwano ku ttaka erinnyogovu obulungi ne ku kkalu.
Mgbe onye dị otu a nụrụ okwu ịṅụ iyi a, na ha ga-agọzi onwe ha, na-eche, “Ihe ga-agara m nke ọma, ọ bụ ezie na m nọgidere na-agbaso ụzọ isiike m.” Ha ga-eweta mbibi nye ala a gbara mmiri nke ọma nyekwa ala ahụ kpọrọ nkụ.
20 Mukama taamusonyiwenga, kubanga obusungu bwa Mukama n’ekiruyi kye binaabuubuukiranga ku muntu oyo. Ebikolimo byonna ebiwandiikiddwa mu Kitabo kino binaamukkangako, era Mukama alisangula erinnya lye n’aliggya wansi w’eggulu.
Nʼihi na Onyenwe anyị agaghị agbaghara onye dị otu a! Iwe ya, na ekworo ya, ga-adị ọkụ megide nwoke ahụ. Ọbụbụ ọnụ niile e dere nʼime akwụkwọ a ga-abịakwasịkwa ya. Onyenwe anyị ga-ehichapụkwa aha ya, ka a ghara ịnụkwa ihe banyere ya nʼụwa.
21 Mukama anaamwawulanga n’amuggya mu bika byonna ebya Isirayiri n’amubonereza nnyo, nga bwe kiri mu bikolimo byonna eby’endagaano ebiwandiikiddwa mu Kitabo ky’Amateeka kino.
Onyenwe anyị ga-akpa oke nʼetiti ya na ebo niile nke Izrel, maka iwetara ya mbibi, dị ka ọbụbụ ọnụ niile nke ọgbụgba ndụ nke e dere nʼime Akwụkwọ Iwu a si dị.
22 Abaana bammwe abaliddawo ne bannamawanga abaliva mu nsi ezeewala baliraba ekibonerezo ekiriba kigudde ku nsi n’obulwadde Mukama bw’aliba aleese ku ttaka ly’ensi.
Mgbe ahụ, ụmụ unu ndị ga-eso unu nʼọgbọ ndị dị nʼihu, na ndị ọbịa si ebe dị anya bịa, ga-ahụ oke ihe otiti ọjọọ a bịakwasịrị ala a, ya na ọrịa niile Onyenwe anyị mere ka ọ bịakwasị ya.
23 Ettaka liriba lyonoonese nga lya munnyo n’amayinja agookya, nga tekuyinza kusimbibwako kintu wadde okubaako n’ekimerako, nga n’omuddo tegusobola kumerako. Ensi erifaanana ng’okuzikirizibwa kwa Sodomu, ne Ggomola, ne Aduma, ne Zeboyimu, Mukama bye yazikiriza mu busungu bwe obungi.
Ala ahụ niile ga-abụ ala nnu, nke ọkụ repịara, ala nke a na-adịghị akụ ihe ọbụla nʼime ya, ala na-adịghị amị mkpụrụ, nke ahịhịa na-adịghị epu nʼelu ya. Ala dịka ala Sọdọm na Gọmọra, na Adma, na Zeboiim, nke Onyenwe anyị sitere nʼoke iwe ya mebie.
24 Amawanga galyebuuza nga geewunya nti, “Lwaki Mukama akoze ekintu kino, n’akikola n’obusungu obungi butyo?”
Mba niile ga-ajụ sị, “Gịnị mere Onyenwe anyị ji mee ihe dị otu a nʼala a? Gịnị kpatara oke iwe ọkụ a?”
25 Na kino kye kiriba eky’okuddamu nti, “Kubanga abantu bano basudde eri endagaano ya Mukama Katonda wa bajjajjaabwe, endagaano gye yakola nabo bwe yabaggya mu nsi y’e Misiri.
Ọsịsa ya ga-abụ, “Ọ bụ nʼihi na ndị a hapụrụ idebe ọgbụgba ndụ ha na Onyenwe anyị, Chineke nke nna nna ha gbara, ọgbụgba ndụ ha na ya gbara mgbe o mere ka ha site nʼIjipt pụta.
26 Baagenda ne basinza bakatonda abalala, ne babaweereza, bakatonda be baali batamanyi, era Katonda waabwe be yali tabawadde.
Nʼihi na ha fere chi ndị ọzọ ofufe, kpọọkwa isiala nye ha, bụ chi ndị nke ha na-amaghị, chi ndị nke ọ na-enyeghị ha.
27 Bwe butyo obusungu bwa Mukama ne bubuubuukira ku nsi eyo, n’agireetako ebikolimo byonna ebiwandiikiddwa mu Kitabo kino.
Ọ bụ ya mere iwe Onyenwe anyị ji dị ọkụ megide ala a, meekwa ka o zidata nʼisi ha ọbụbụ ọnụ niile e dere nʼime akwụkwọ a.
28 Mukama n’abasiguukulula mu nsi yaabwe ng’aliko ekiruyi, era ng’ajjudde obusungu bungi, n’abakasuka mu nsi endala, nga bwe kiri leero.”
Nʼoke iwe ya na ọnụma ya ka Onyenwe anyị ji hopu ha site nʼala ha, werekwa ha tụba nʼala ọzọ, dịka ọ dị ugbu a.”
29 Ebintu eby’ekyama bya Mukama Katonda waffe, naye ebyo ebyabikkulibwa bye byaffe n’abaana baffe emirembe gyonna, tulyoke tugonderenga ebigambo byonna ebiri mu mateeka gano.
Ihe niile e zoro ezo dịrị Onyenwe anyị Chineke anyị, ma ihe ndị ahụ niile e kpughere ekpughe dịịrị anyị, dịkwara ụmụ anyị ruo mgbe ebighị ebi, ka anyị nwee ike ịgbaso na imezu okwu niile nke iwu a.

< Ekyamateeka Olwokubiri 29 >