< 2 Samwiri 9 >
1 Dawudi n’abuuza nti, “Wakyaliwo omuntu mu nnyumba ya Sawulo eyasigalawo gwe nnyinza okulaga ekisa ku lwa Yonasaani?”
Otu ụbọchị, Devid jụrụ ajụjụ sị, “O nwere onye fọdụrụ ndụ nʼezinaụlọ Sọl? Achọrọ m igosi onye ahụ obi ebere nʼihi Jonatan.”
2 Awo waaliwo omuddu mu nnyumba ya Sawulo erinnya lye Ziba. Ne bamutumya, n’ajja mu maaso ga Dawudi. Kabaka n’amubuuza nti, “Ggwe Ziba?” N’addamu nti, “Nze wuuyo omuddu wo.”
Ọ nụrụ ihe banyere otu nwoke aha ya bụ Ziba, onye bụ otu nʼime ndị ohu Sọl. O ziri ozi ka a kpọọ ya. Mgbe ọ bịara nʼihu Devid, eze jụrụ ya sị, “Ọ bụ gị bụ Ziba?” Ọ zara sị, “E, onyenwe m, ọ bụ m ohu gị.”
3 Kabaka n’amubuuza nti, “Tewaliwo muntu mu nnyumba ya Sawulo eyasigalawo gwe nnyinza okukolera ebirungi olw’ekisa kya Katonda?” Ziba n’addamu kabaka nti, “Wakyaliwo mutabani wa Yonasaani, eyalemala ebigere.”
Eze jụrụ ya sị, “Ọ dị onye fọdụrụ ndụ nʼezinaụlọ Sọl? Ọ bụrụ na ọ dị onye fọdụrụ, achọrọ m igosi ya ụdị obiọma Chineke na-egosi.” Ziba zara ya sị, “Otu nwa nwoke Jonatan, nke dara ngwụrọ nọ ndụ.”
4 Kabaka n’amubuuza nti, “Ali ludda wa?” Ziba n’amuddamu nti, “Ali mu nnyumba ya Makiri mutabani wa Ammiyeri mu Lodebali.”
Eze jụrụ, “Ebee ka ọ nọ?” Ziba zaghachiri, “Ọ nọ na Lo Deba, nʼụlọ Makia, nwa Amiel.”
5 Awo Dawudi n’amutumya, ne bamuleeta okuva mu nnyumba ya Makiri mutabani wa Ammiyeri mu Lodebali.
Ya mere eze Devid ziri ka e site nʼobodo Lo Deba, nʼụlọ Makia nwa Amiel kpọta ya.
6 Mefibosesi mutabani wa Yonasaani, muzzukulu wa Sawulo n’ajja eri Dawudi n’avuunama mu maaso ge. Dawudi n’amubuuza nti, “Ggwe Mefibosesi?” N’addamu nti, “Nze wuuyo omuddu wo.”
Mgbe Mefiboshet nwa Jonatan, nwa Sọl, bịara nʼebe Devid nọ, o hulatara isi, kpọọrọ ya isiala, nʼọnọdụ nsọpụrụ. Mgbe ahụ, Devid kpọrọ ya aha sị, “Mefiboshet,” Mefiboshet zara sị ya, “A bụ m ohu gị.”
7 Dawudi n’amugamba nti, “Totya kubanga siireme kukukolera bya kisa ku lwa Yonasaani kitaawo. Nzija kukuddiza ettaka lyonna eryali erya jjajjaawo Sawulo, era onooliranga ku mmeeza yange.”
Ma Devid sịrị ya, “Atụla egwu, nʼezie, aga m egosi gị obiọma nʼihi nna gị Jonatan. Aga m enyeghachi gị ala niile nna nna gị Sọl nwere. Ma ị ga-eso soro m na-eri nri na tebul m oge niile.”
8 Mefibosesi ne yeeyanza n’ayogera nti, “Omuddu wo kye ki, okufaayo ku mbwa enfu nga nze?”
Mefiboshet dara nʼala nʼihu eze sị, “Eze, onye ka m bụ i ji egosi nkịta nwụrụ anwụ dịka m obi ebere?”
9 Awo kabaka n’ayita Ziba, omuddu wa Sawulo, n’amugamba nti, “Mpadde muzzukulu wa mukama wo ebintu byonna ebyali ebya Sawulo n’ennyumba ye.
Eze kpọrọ Ziba ohu Sọl ahụ sị ya, “Enyeghachila m nwa nwa nna gị ukwu ihe niile Sọl na ụlọ ya nwere.
10 Ggwe ne batabani bo n’abaddu bo munaamulimiranga ettaka ne muleeta ebibala ebirivaamu, muzzukulu wa mukama wo abenga n’ekyokulya. Mefibosesi muzzukulu wa mukama wo, ye anaaliiranga ku mmeeza yange nange, ennaku zange zonna.” Ziba yalina abaana aboobulenzi kkumi na bataano n’abaddu amakumi abiri.
Gị na ụmụ gị ndị ikom na ndị ozi gị ga-arụ ọrụ nʼubi ya ịrụpụta nri. Ma Mefiboshet, nwa nwa nna gị ukwu ga na-eri ihe na tebul m.” Ziba, nwere ụmụ ndị ikom iri na ise, na iri ndị ozi abụọ.
11 Awo Ziba n’agamba kabaka nti, “Nga bw’olagidde mukama wange kabaka, bwe kijja okukolebwa omuddu wo.” Mefibosesi n’aliiranga ku mmeeza ya Dawudi ng’omu ku balangira.
Ọ sịrị eze, “Onyenwe m, ohu gị ga-eme ihe niile eze nyere m nʼiwu.” Site nʼoge ahụ, Mefiboshet riri nri na tebul Devid dịka ọ bụ otu nʼime ụmụ ndị ikom eze.
12 Mefibosesi yalina mutabani we omuto, eyayitibwanga Mikka, ne bonna abaali ab’ennyumba ya Ziba baali baddu ba Mefibosesi.
Mefiboshet nwekwara otu nwa nwoke aha ya bụ Mika. Ziba na ndị niile bi nʼụlọ ya niile ghọrọ ndị ohu Mefiboshet.
13 Mefibosesi n’abeera mu Yerusaalemi kubanga yaliiranga ku mmeeza ya kabaka. Yali yalemala ebigere.
Ma Mefiboshet biri na Jerusalem nʼihi na ọ bụ na tebul eze ka ọ na-eri nri mgbe niile. Ọ bụ onye dara ngwụrọ nʼụkwụ ya abụọ.