< 2 Ebyomumirembe 16 >
1 Mu mwaka ogw’amakumi asatu mu omukaaga ogw’obufuzi bwa Asa, Baasa kabaka wa Isirayiri n’alumba Yuda, n’azimba ebigo ku Laama okuziyiza omuntu yenna okuyingira wadde okufuluma mu nsalo ya Asa kabaka wa Yuda.
Nʼafọ nke iri atọ na isii nke ọchịchị Asa, Baasha eze Izrel, busoro Juda agha, wuchie Rema igbochi onye ọbụla na-apụ apụ maọbụ onye na-abata abata nʼoke ala Asa, eze Juda.
2 Awo Asa n’addira ffeeza ne zaabu ebyali mu mawanika ga yeekaalu ya Mukama, n’ebyali mu lubiri lwa kabaka, n’abiweereza Benikadadi kabaka w’e Busuuli, eyabeeranga e Ddamasiko, n’aweereza n’obubaka nti,
Mgbe ahụ, Asa chịịrị ọlaọcha na ọlaedo niile dị nʼụlọakụ ụlọnsọ Onyenwe anyị, na ndị dị nʼụlọeze ya, zigara Ben-Hadad, eze Aram, onye na-achị na Damaskọs, sị,
3 “Wabeerewo endagaano wakati wo nange, ng’eri eyaliwo wakati wa kitange ne kitaawo. Laba, nkuweerezza ffeeza ne zaabu omenyewo endagaano yo wakati wo ne Baasa kabaka wa Isirayiri, anveeko.”
“Biko, ka anyị gbaa ndụ dịka nna m na nna gị mere. Lee, ana m ezitere gị ọlaọcha na ọlaedo. Ugbu a, mebie ọgbụgba ndụ dị nʼetiti gị na Baasha, bụ eze Izrel, ka o si nʼebe m nọ wezuga onwe ya.”
4 Benikadadi n’akkiriziganya ne kabaka Asa, era n’aweereza abaduumizi b’eggye lye okulumba ebibuga bya Isirayiri; ne bawamba Yiyoni, ne Ddaani ne Aberumayimu, n’ebibuga byonna eby’amaterekero ebya Nafutaali.
Ben-Hadad kwenyere eze Asa, zipụ ndị ọchịagha ndị agha ya ka ha gaa buso obodo Izrel niile agha. Ha lụgburu Ijon, Dan, Ebel-Maim na obodo niile a na-achịkọbata ihe dị na Naftalị.
5 Awo Baasa bwe yawulira ekyo, n’alekeraawo okuzimba mu Laama, n’omulimu n’agukomya.
Mgbe Baasha nụrụ nke a, ọ kwụsịrị iwu Rema, hapụkwa ọrụ ya.
6 Kabaka Asa n’aleeta Yuda yenna e Laama, ne baggyayo amayinja n’embaawo Baasa bye yali azimbisa, Asa n’abikozesa okuzimba Geba ne Mizupa.
Mgbe ahụ, eze Asa chịịrị ndị ikom niile nke Juda. Ha bịara bupusịa nkume na osisi niile dị na Rema, nke Baasha ji na-ewu ihe. O ji ihe ndị a wulie Geba na Mizpa.
7 Mu biro ebyo Kanani omulabi n’ajja eri Asa kabaka wa Yuda, n’amugamba nti, “Olw’okwesiga kabaka w’e Busuuli mu kifo ky’okwesiga Mukama Katonda wo, eggye lya kabaka w’e Bwasuli kyelivudde likuddukako.
Nʼoge ahụ Hanani, bụ onye ọhụ ụzọ bịakwutere Asa, bụ eze Juda sị ya, “Ebe ọ bụ na ị hapụrụ Onyenwe anyị Chineke gị, tụkwasị eze Aram obi, lee na usuu ndị agha Siria esitela nʼaka gị wezuga onwe ha.
8 Abaesiyopiya n’Abalubimu tebaali ggye ddene nga balina amagaali mangi n’abeebagala embalaasi bangi? Naye, olwokubanga weesiga Mukama, kyeyava abagabula mu mukono gwo.
Ndị Kush na ndị Libịa, ha abụghị usuu ndị agha ji ọtụtụ ụgbọ agha, na ndị na-agba ịnyịnya? Ma mgbe ị dabeere na Onyenwe anyị, o nyefere ha nʼaka gị.
9 Kubanga amaaso ga Mukama galaba wonna mu nsi, nga ganyweza emitima gy’abo abamwesigira ddala. Ky’okoze kya busirusiru, era okuva ne leero ojja kubeeranga n’entalo.”
Nʼihi na anya Onyenwe anyị na-agazu ụwa niile, ịgba ha ume bụ ndị obi ha zuruoke nʼebe ọ nọ. I meela omume nzuzu na nke a, site ugbu a gaa nʼihu ị ga na-enwe agha.”
10 Awo Asa n’anyiigira nnyo omulabi, n’amuteeka ne mu kkomera. Mu kiseera kye kimu Asa n’ayisa bubi nnyo abantu abamu.
Iwe were Asa megide onye ọhụ ụzọ a nʼihi nke a; iwe were ya nke ukwuu nke mere na ọ tụnyere Hanani nʼụlọ mkpọrọ. Sitekwa nʼoge ahụ, Asa bidoro imekpa ụfọdụ nʼime ndị ya ahụ.
11 Ebyafaayo eby’obufuzi bwa Asa okuva ku ntandikwa okutuusa ku nkomerero, byawandiikibwa mu kitabo kya bassekabaka ba Yuda ne Isirayiri.
Ihe banyere ihe ọzọ niile nʼoge ọchịchị Asa, site na mmalite ruo ọgwụgwụ ka e dere nʼime akwụkwọ ndị eze Juda na Izrel.
12 Mu mwaka ogw’amakumi asatu mu mwenda ogw’obufuzi bwe, Asa n’alwala ebigere. Newaakubadde ng’obulwadde bweyongera, teyanoonyanga buyambi okuva eri Mukama, yabunoonyanga mu basawo bokka.
Nʼime iri afọ atọ na itoolu nke ọchịchị ya, eze Asa rịara ọrịa nke metụtara ụkwụ ya abụọ. Ọ bụ ezie na ọrịa a siri nọọ ike ma nʼime ọnọdụ ya ọ chọghị enyemaka site nʼaka Onyenwe anyị kama ọ bụ naanị ndị dibịa ka o jekwuru.
13 Awo mu mwaka ogw’amakumi ana mu ogumu ogw’obufuzi bwe, Asa ne yeebakira awamu ne bajjajjaabe.
Asa nwụrụ nʼiri afọ anọ na otu nke ọchịchị eze ya, sooro ndị nna nna ya ha dina nʼọnwụ.
14 N’aziikibwa mu ntaana gye yali yeezimbidde mu kibuga kya Dawudi. Ne bamuteeka ku kitanda ekyaliko obuloosa obwenjawulo n’obuwoowo obwa buli kika, ne bamukumira n’ekyoto ky’omuliro kinene nnyo okujjukira bye yakola.
Ha liri ya nʼili nke ọ waara onwe ya nʼobodo Devid. Ha dobere ya nʼelu ihe ịdọba ozu nke jupụtara na ụda dị iche iche, na mmanụ na-esi isi ụtọ nke a gwọkọtara nke ọma, surekwara ya ihe nsure ọkụ nʼebe ọ dị ukwuu iji kwanyere ya ugwu.