< 1 Bassekabaka 13 >
1 Omusajja wa Katonda n’ajja e Beseri okuva mu Yuda olw’ekigambo kya Mukama, n’asanga Yerobowaamu ng’ayimiridde mu maaso g’ekyoto ng’ateekateeka okwotereza obubaane.
Otu onye nke Chineke si Juda bịa Betel, site nʼokwu nke Onyenwe anyị oge Jeroboam guzo nʼebe ịchụ aja ka ọ chụọ aja.
2 N’ayogerera mu ddoboozi ery’omwanguka eri ekyoto olw’ekigambo kya Mukama ng’agamba nti, “Ayi ekyoto, ekyoto! Kino Mukama ky’agamba nti, ‘Omwana erinnya lye Yosiya alizaalibwa mu nnyumba ya Dawudi, ku ggwe kw’aliweerayo bakabona ab’ebifo ebigulumivu ng’ebiweebwayo era n’amagumba g’abantu galyokerwa ku ggwe.’”
O tiri mkpu nʼoke olu megide ebe ịchụ aja ahụ dịka okwu Onyenwe anyị si dị, “Ebe ịchụ aja, ebe ịchụ aja! Otu a ka Onyenwe anyị na-ekwu: ‘A ga-amụ otu nwa nwoke nʼụlọ Devid, aha ya ga-abụ Josaya. Ọ ga-eji ndị nchụaja niile nke ebe dị elu, bụ ndị na-achụ aja nʼelu gị, chụọ aja nʼelu gị. A ga-esurekwa ọkpụkpụ ndị mmadụ ọkụ nʼelu gị.’”
3 Ku lunaku olwo omusajja wa Katonda n’awa akabonero: “Kano ke kabonero Mukama kalangirira. Ekyoto kiryatika n’evvu lyakyo liriyiyibwa ebweru.”
Nʼụbọchị ahụ, onye nke Chineke ahụ kwuru okwu banyere ihe ịrịbama ga-emezu. O kwuru sị, “Nke a bụ ihe ịrịbama Onyenwe anyị ji emesi okwu ya ike: Ebe ịchụ aja a ga-agbawa ụzọ abụọ. Ntụ dị nʼelu ya ga-awụsasị nʼala.”
4 Awo kabaka Yerobowaamu bwe yawulira omusajja wa Katonda bye yayogera, n’ayogera n’eddoboozi eddene ku kyoto e Beseri ng’awanise omukono gwe mu maaso g’ekyoto nti, “Mumukwate!” Omukono gwe yawanika eri omusajja wa Katonda ne gukala ne gukalambalirayo n’okuyinza n’atayinza kuguzza.
Mgbe eze Jeroboam nụrụ ihe onye nke Chineke ahụ kwuru megide ebe ịchụ aja Betel, o setịpụrụ aka ya site nʼebe ịchụ aja ahụ sị, “Jidenụ nwoke a!” Ma aka ahụ ọ setịpụrụ tụgide nwoke ahụ kpọnwụrụ na o nwekwaghị ike iweghachi ya azụ ọzọ.
5 N’ekyoto ne kyatikamu, n’evvu ne liyiika ng’akabonero omusajja wa Katonda ke yawa olw’ekigambo kya Mukama.
Ọzọkwa, ebe ịchụ aja ahụ gbawara abụọ, ntụ dị nʼelu ya wụsịkwara nʼala dịka ihe ịrịbama nke onye amụma Chineke nyere, site nʼokwu Onyenwe anyị.
6 Awo Kabaka n’agamba omusajja wa Katonda nti, “Negayiririra Mukama Katonda wo, onsabire omukono gwange guwonyezebwe.” Omusajja wa Katonda n’amwegayiririra eri Mukama, omukono gwe ne guddawo nga bwe gwali olubereberye.
Mgbe ahụ, eze sịrị onye nke Chineke ahụ, “Biko, rịọọ Onyenwe anyị Chineke gị, kpekwara m ekpere ka e nyeghachi m aka m.” Ya mere, onye nke Chineke ahụ rịọrọ Onyenwe anyị site nʼekpere, emekwara ka aka eze dịghachi dịkwa ka ọ dị na mbụ.
7 Kabaka n’agamba omusajja wa Katonda nti, “Jjangu eka ewange obeeko ky’olya, n’okukuwa nkuweeyo ekirabo.”
Emesịa, eze gwara onye nke Chineke ahụ okwu sị, “Soro m gaa nʼụlọ m. Aga m enye gị ihe oriri, nyekwa gị onyinye.”
8 Naye omusajja wa Katonda n’agamba kabaka nti, “Ne bw’onompa ekitundu ky’obugagga bwo, sijja kugenda naawe, wadde okulya omugaati oba okunywa amazzi wano.
Ma onye nke Chineke ahụ zara eze sị, “Ọ bụrụ na i nye m ọkara ihe niile i nwere, agaghị m eso gị baa nʼime ụlọ gị. Agaghị m erikwa nri gị maọbụ ṅụọ mmiri nʼebe a.
9 Kubanga nkuutiddwa ekigambo kya Mukama nti, ‘Tolya mugaati newaakubadde okunywa amazzi wadde okuddira mu kkubo ly’ojjiddemu.’”
Nʼihi na-enyere m iwu site nʼokwu Onyenwe anyị, sị, ‘Erila nri, aṅụkwala mmiri, esitekwala ụzọ i si gaa laghachi.’”
10 Awo n’addirayo mu kkubo eddala, so si mu eryo lye yajjiramu e Beseri.
Ya mere, o sitere nʼụzọ ọzọ lawa, nke na-abụghị ụzọ o si bịa Betel.
11 Awo mu biro ebyo waaliwo nnabbi omukadde eyabeeranga mu Beseri, eyategeezebwa batabani be ebyo byonna omusajja wa Katonda bye yali akoze ku lunaku olwo, ne bye yali agambye kabaka.
Ma o nwere otu onye amụma bụ agadi bi na Betel. Onye ụmụ ya bịara kọọrọ ihe niile onye nke Chineke ahụ mere nʼụbọchị ahụ na Betel, ha kọkwaara nna ha ihe niile ọ gwara eze.
12 Kitaabwe n’ababuuza nti, “Akutte kkubo ki?” Awo batabani be ne bamulaga ekkubo omusajja wa Katonda ow’e Yuda ly’akutte.
Nna ha jụrụ ha, “Olee ụzọ ọ gara?” Ụmụ ya ndị ikom ziri ya ụzọ nke onye nke Chineke ahụ si Juda gara.
13 Awo n’agamba batabani be nti, “Munteekereteekere endogoyi.” Bwe baamala okumutegekera endogoyi, n’agyebagala,
Mgbe ahụ, ọ sịrị ụmụ ya ndị ikom, “Jikekwaranụ m ịnyịnya ibu m.” Ha jikekwaara ya ịnyịnya ibu, ọ nọkwasịrị nʼelu ya.
14 n’akwata ekkubo omusajja wa Katonda lye yali akutte. Yamusanga atudde wansi w’omwera, n’amubuuza nti, “Gwe musajja wa Katonda eyavudde e Yuda?” N’addamu nti, “Nze nzuuno.”
Ọ gbasooro onye nke Chineke nʼazụ, ọ hụrụ ya ka ọ nọ ala nʼokpuru osisi ook, Ọ sịrị ya, “Ọ bụ gị bụ onye nke Chineke ahụ si Juda bịa?” Ọ zara, “E, ọ bụ mụ onwe m.”
15 Awo nnabbi n’amugamba nti, “Tuddeyo eka olye ku mmere.”
Onye amụma ahụ sịrị ya, “Soro m ka anyị gaa nʼụlọ m, ka i rie nri.”
16 Omusajja wa Katonda n’amuddamu nti, “Siyinza kuddayo newaakubadde okugenda naawe, wadde okulya omugaati oba okunywa amazzi naawe mu kifo kino.
Ma ọ sịrị, “Apụghị m iso gị laghachi azụ, maọbụ rie nri, ma ọ bụkwa ṅụọ mmiri ọbụla nʼebe a.
17 Ndagiddwa ekigambo kya Mukama nti, ‘Toteekwa kulyayo ku mmere newaakubadde okunywayo amazzi, wadde okuddirayo mu kkubo lye wajjiddemu.’”
Nʼihi na a gwara m site nʼokwu Onyenwe anyị sị, ‘Erikwala nri maọbụ ṅụọ mmiri nʼebe ahụ, maọbụ soro ụzọ ị si gaa lọtakwa.’”
18 Awo nnabbi omukadde n’amuddamu nti, “Nze nange ndi nnabbi nga ggwe. Era malayika yaŋŋambye ekigambo kya Katonda nti, ‘Mukomyewo mu nnyumba yo alye ku mmere anywe ne ku mazzi.’” Naye yali amulimba.
Ma onye nke ọzọ sịrị ya, “Mụ onwe m bụkwa onye amụma dịka gị, mmụọ ozi zikwara m ozi site nʼokwu Onyenwe anyị sị, ‘Kpọrọ ya ka o soro gị laghachi nʼụlọ gị, ka o rie nri, ṅụọkwa mmiri.’” (Ma ọ gwara ya okwu ụgha.)
19 Awo omusajja wa Katonda n’addayo naye mu nnyumba ye n’alya era n’anywa.
Ya mere, nwoke nke Chineke ahụ soro ya laghachi rie nri, ṅụọkwa mmiri.
20 Bwe baali batudde nga balya, ekigambo kya Mukama ne kijjira nnabbi omukadde eyali amukomezzaawo.
Ma mgbe ha abụọ nọdụ na-eri ihe na tebul, okwu Onyenwe anyị rutere onye amụma agadi ahụ ntị, bụ onye mere ka ọ lọghachi azụ.
21 N’ayogerera mu ddoboozi ery’omwanguka eri omusajja wa Katonda eyava mu Yuda nti, “Bw’ati bw’ayogera Mukama nti, ‘Ojeemedde ekigambo kya Mukama era tokuumye kiragiro Mukama Katonda kye yakulagidde.
Ọ kpọrọ onye nke Chineke ahụ si Juda bịa sị ya, “Otu a ka Onyenwe anyị na-ekwu, ‘Nʼihi na ị nupula isi nʼokwu ọnụ Onyenwe anyị, hapụ idebe iwu Onyenwe anyị Chineke gị nyere gị.
22 Wakomyewo n’olya emmere era n’onywa amazzi mu kifo kye yakugaanye okulyamu wadde okunywamu amazzi. Noolwekyo omulambo gwo teguliziikibwa mu ntaana ya bajjajjaabo.’”
Ị laghachikwara nʼebe a, rie nri, ṅụọkwa mmiri, bụ ebe ọ gwara gị sị gị, erila nri, aṅụkwala mmiri. Ya mere, agaghị eli ozu gị nʼala ili nna gị ha.’”
23 Omusajja wa Katonda bwe yamala okulya n’okunywa, nnabbi oli eyali amukomezzaawo, n’ategeka endogoyi y’omusajja wa Katonda.
Mgbe onye nke Chineke ahụ risiri nri, ṅụọkwa ihe ọṅụṅụ, ha kwadooro ya ịnyịnya ibu nke onye amụma ahụ kpọghachiri ya azụ.
24 Awo bwe yali ng’ali ku lugendo lwe, empologoma n’emusangiriza n’emutta, era n’esuula omulambo gwe ku kkubo, empologoma n’endogoyi ne biyimirira okumpi nagwo.
Dịka ọ na-alaghachi, otu ọdụm zutere ya nʼụzọ, dọgbuo ya. Ma ọ hapụrụ ozu ya ka ọ tọgbọrọ nʼokporoụzọ, ma ịnyịnya ibu ya ma ọdụm ahụ dọgburu nwoke ahụ guzokwa nʼakụkụ ozu ya.
25 Laba, abantu abamu abaalaba omulambo nga gusuuliddwa wansi, nga n’empologoma eyimiridde kumpi nagwo, ne bagenda mu kibuga nnabbi mwe yabeeranga ne bategeeza abaayo.
Ndị mmadụ na-agafe hụrụ ozu ahụ ka ọ tọgbọrọ nʼụzọ, hụkwa ka ọdụm ahụ guzo nʼakụkụ ya. Ndị a gara kọọ akụkọ ihe ha hụrụ nʼụzọ nʼobodo ebe onye amụma agadi ahụ bi.
26 Nnabbi eyali amukomezzaawo bwe yakiwulira n’ayogera nti, “Ye musajja wa Katonda ataagondedde kigambo kya Mukama. Mukama amuwaddeyo eri empologoma emutaagudde n’emutta, ng’ekigambo kya Mukama bwe ky’amulabudde.”
Mgbe onye amụma ahụ mere ka ọ laghachi azụ nụrụ ihe mere, ọ sịrị, “Ọ bụ onye nke Chineke ahụ nupuru isi nʼokwu Onyenwe anyị. Onyenwe anyị enyefeela ya nʼaka ọdụm, nke dọgburu ma gbukwaa ya, dịka okwu Onyenwe anyị dọrọ ya aka na ntị.”
27 Awo nnabbi n’agamba batabani be nti, “Muntegekere endogoyi.” Ne bagimutegekera.
Mgbe ahụ, ọ sịrị ụmụ ya ndị ikom, “Jikekwaranụ m ịnyịnya ibu.” Ha mere otu a.
28 Nagenda n’asanga omulambo gw’omusajja wa Katonda nga gusuuliddwa mu kkubo n’endogoyi n’empologoma nga ziyimiridde kumpi nagwo; empologoma nga teridde mulambo so nga tetaaguddetaagudde ndogoyi.
Ọ pụrụ gaa chọta ozu nwoke ahụ ka ọ tọgbọrọ nʼụzọ. Ịnyịnya ibu ya na ọdụm ahụ guzokwa nʼakụkụ ozu ahụ. Ọdụm erighị anụ nwoke ahụ, ọ dọgbukwaghị ịnyịnya ibu ahụ.
29 Nnabbi n’asitula omulambo gw’omusajja wa Katonda n’aguteeka ku ndogoyi, era n’aguzzaayo mu kibuga kye n’amukungubagira, omulambo n’aguziika.
Onye amụma agadi ahụ buliri ozu onye nke Chineke ahụ dọkwasị ya nʼelu ịnyịnya ibu ya, buru ya bughachi ya nʼobodo, nʼihi iruru ya ụjụ, nakwa ili ya.
30 N’ateeka omulambo gwe mu ntaana ye ye, ne bamukungubagira nga bakaaba nti, “Woowe, muganda wange!”
O liri ozu onye nke Chineke ahụ nʼili nke aka ya. Mgbe o liri ya, ọ kwara akwa sị, “Ewoo nwanna m!”
31 Awo bwe baamala okumuziika, n’agamba batabani be nti, “Bwe nfanga, munziikanga mu ntaana omusajja wa Katonda mw’aziikiddwa; muteekanga amagumba gange kumpi n’amagumba ge.
Mgbe o lisiri ya, ọ gwara ụmụ ya ndị ikom sị, “Mgbe m nwụrụ, lienụ m nʼotu ili a e liri onye nke Chineke; doonụ ọkpụkpụ m ka ọ dịrị nʼakụkụ ọkpụkpụ ya.
32 Ekigambo kya Mukama, omusajja wa Katonda kye yayogera n’eddoboozi ery’omwanguka ku kyoto ekiri mu Beseri ne ku masabo ag’ebifo ebigulumivu ebiri mu bibuga eby’e Samaliya, tekirirema kutuukirira.”
Nʼihi na ozi ahụ niile o ziri site nʼokwu Onyenwe anyị megide ebe ịchụ aja dị na Betel, na megidekwa ebe ụlọ arụsị niile dị nʼebe dị elu nʼobodo Sameria aghaghị imezu.”
33 Oluvannyuma lw’ekigambo ekyo Yerobowaamu n’atakyuka kuleka amakubo ge amabi, naye ne yeeyongera nate okussaawo bakabona ab’ebifo ebigulumivu ng’abaggya mu bantu abaabulijjo. Buli eyayagalanga okubeera kabona, n’amwawulanga okubeera mu bifo ebigulumivu.
Nʼagbanyeghị ihe ndị a niile, Jeroboam esiteghị nʼụzọ ọjọọ ya tụgharịa. Kama ọ gara nʼihu họpụta ndị nchụaja maka ebe niile dị elu site nʼetiti ndị mmadụ efu. Onye ọbụla chọrọ ị bụ onye nchụaja ka o doro nsọ maka ije ozi nʼebe niile dị elu.
34 Kino kye kyali ekibi ky’ennyumba ya Yerobowaamu ekyagireetera okugwa, okugimalawo n’okugizikiriza okuva ku nsi.
Nke a bụ mmehie ezinaụlọ Jeroboam. Ọ bụ ya mere alaeze Jeroboam ji daa, meekwa ka e kpochapụ ya nʼelu ụwa.