< Banzembo 9 >

1 Wuta na buku ya mokambi ya bayembi. Nzembo ya Davidi. Nakosanzola Yawe na motema na ngai mobimba, nakotatola misala minene na Yo nyonso.
Abụ Ọma. Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Nʼusoro olu abụ “Ọnwụ nke Ọkpara.” Abụ ọma Devid. O Onyenwe anyị, aga m esite nʼala ala obi m too gị, aga m agwakwa onye ọbụla ihe ọma niile ị na-eme.
2 Nakozala na esengo mpe nakosepela kati na Yo, nakoyemba mpo na lokumu ya Kombo na Yo-Oyo-Oleki-Likolo.
Obi ga-atọ m ụtọ; obi m ga-ejupụta nʼọṅụ nʼihi gị, aga m abụrụ gị abụ otuto, gị Onye kachasị ihe niile elu.
3 Banguna na ngai bazongaka sima, bakweyaka mpe balimwaka liboso na Yo.
Ndị iro m na-alaghachi azụ, ha na-asọ ngọngọ na-alakwa nʼiyi nʼihu gị.
4 Pamba te, okataki likambo na ngai mpe olongisaki ngai, ovandi na Kiti ya Bokonzi lokola Mosambisi ya sembo.
I kpeela ikpe m nʼụzọ ziri ezi, nʼocheeze gị ka ị nọdụrụ na-ekpe ikpe ziri ezi.
5 Opamelaki bikolo mpe obomaki moto mabe, olimwisaki kombo na bango mpo na libela.
I baarala mba niile mba ma laa ndị ajọ omume nʼiyi, hichapụkwa aha ha ruo mgbe ebighị ebi.
6 Banguna na ngai balimwa mpo na libela; opanzaki bingumba na bango kino bakanisa bango lisusu te.
Mbibi nke na-enweghị ọgwụgwụ adakwasịla ndị iro m, I hopukwala obodo ha niile. Ọ dịghị onye na-echetakwa ha ọzọ.
7 Yawe akonzaka mpo na libela, atia Kiti na Ye ya Bokonzi mpo na kokata makambo ya bato.
Onyenwe anyị bụ eze ruo mgbe ebighị ebi. Ọ kwadoola ocheeze ya maka ikpe ikpe ziri ezi.
8 Akonzaka mokili na bosembo, akataka makambo ya bato na alima.
Ọ ga-eji ezi omume kpee mba niile ikpe; jirikwa ikpe ziri ezi chịa mba niile.
9 Yawe azali ebombamelo mpo na bato oyo bazali konyokolama, mpe ndako makasi mpo na tango ya pasi.
Onyenwe anyị bụ ebe mgbaba nye ndị niile a na-emegbu emegbu. Ọ bụụrụ ha ebe mgbaba e wusiri ike nʼoge nsogbu.
10 Bato oyo bayebi Kombo na Yo batiaka elikya na bango kati na Yo; pamba te, Yo Yawe, osundolaka te bato oyo balukaka Yo.
Onyenwe anyị, ndị niile maara aha gị ga-atụkwasị gị obi, nʼihi na ọ dịghị mgbe ị na-agbakụta ndị niile na-atụkwasị gị obi azụ.
11 Boyembela Yawe oyo avandaka kati na Siona banzembo ya masanzoli; bopanza sango ya misala na Ye kati na bikolo.
Bụkuonụ Onyenwe anyị abụ otuto, bụ onye nọ nʼocheeze ya na Zayọn. Kwusaaranụ mba niile ihe banyere ọrụ ebube ya.
12 Pamba te Yawe azongisaka mabe na mabe mpo na makila oyo esopani, akanisaka koganga ya banyokolami.
Nʼihi na onye ahụ na-abọrọ ndị e gburu egbu ọbọ anaghị echefu ihe; ọ dịghị elefu mkpu akwa nke ndị a na-akpagbu anya.
13 Yawe, yokela ngai mawa, tala ndenge nini bayini na ngai bazali konyokola ngai, mpe kangola ngai wuta na bikuke ya kufa;
O Onyenwe anyị, lee ka ndị iro m si akpagbu m! Meere m ebere ma napụta m site nʼọnụ ọnwụ,
14 mpo ete napanza sango ya lokumu na Yo kati na bikuke ya Siona, mboka kitoko, mpe nasepela na lobiko na Yo kuna.
ka m nwee ike ikwusa banyere otuto gị nʼọnụ ụzọ ama niile nke ada Zayọn, nọrọkwa ebe ahụ ṅụrịa ọṅụ nʼime nzọpụta gị.
15 Bapagano bakweyi na libulu oyo batimolaki, makolo na bango ekangami na mitambo oyo bango moko basalaki.
Ndị mba niile adabala nʼime olulu ahụ ha gwuru; ọnya ahụ ha siri, zoo, amaala ha.
16 Yawe amilakisi na nzela ya misala na Ye ya bosembo; bato mabe bakangami na mitambo oyo bango moko basalaki.
Ihe e ji mara Onyenwe anyị bụ ikpe ya ziri ezi; ọrụ aka ndị na-emebi iwu na-ama ha dịka ọnya. (Sela)
17 Bato mabe, bikolo nyonso, oyo bakanisaka Nzambe te, bakokende na mboka ya bakufi. (Sheol h7585)
Ndị niile na-eme ajọ omume na-alaghachi nʼili; nke a bụkwa ọnọdụ mba niile na-echefu Chineke. (Sheol h7585)
18 Kasi Nzambe akotikala te kobosana mobola, mpe elikya ya banyokolami ekotikala seko na seko.
Ma ọ bụghị ruo mgbe ebighị ebi ka a ga-echefu ndị nọ na mkpa; olileanya ndị a na-akpagbu agaghị abụkwa nke efu.
19 Yawe, telema! Tika ete moto alonga te; tika ete bapagano basamba liboso na Yo!
O Onyenwe anyị, bilie! Ekwela ka mmadụ nwee mmeri ọbụla nʼebe ị nọ; ka e kpee mba niile ikpe nʼihu gị.
20 Yawe, tika ete somo ekanga bango; tika ete bapagano bayeba ete bazali na bango kaka bato!
O Onyenwe anyị! Mee ka ha maa jijiji nʼoke egwu; mee ka mba niile ghọta na ha bụ naanị mmadụ. (Sela)

< Banzembo 9 >