< Banzembo 66 >

1 Wuta na buku ya mokambi ya bayembi. Nzembo. Bino bato ya mokili mobimba, bobetela Nzambe maboko!
Abụ dịrị onyeisi abụ. Otu Abụ. Abụ Ọma. Ụwa niile, jirinụ ọṅụ tikuo Chineke!
2 Boyemba banzembo ya lokumu mpo na nkembo ya Kombo na Ye, bopesa lokumu na Ye nkembo.
Bụọ abụ banyere ebube aha ya; meenụ ka otuto ya bụrụ ihe dị ebube!
3 Boloba na Nzambe: « Tala ndenge nini misala na Yo ebongi na kobanga yango! Mpo na nguya monene na Yo, banguna na Yo bakomi koluka kokoma baninga na Yo.
Gwa Chineke okwu sị ya, “Lee ka ọrụ gị niile si dị oke egwu! Ike gị dị nnọọ ukwu, ya mere ndị iro gị, na-ada nʼihu gị nʼihi ụjọ.
4 Mokili mobimba efukamaka liboso na Yo; bayembaka mpo na lokumu na Yo, basanzolaka Kombo na Yo. »
Ndị niile bi nʼụwa na-akpọ isiala nye gị; ha na-abụku gị abụ otuto, ha na-abụ abụ otuto nye aha gị.” (Sela)
5 Boya kotala misala ya Nzambe! Misala na Ye ya minene mpo na bana ya bato ebongi na kobanga yango.
Bịa lee ihe Chineke mere, ụdị ọrụ oke egwu ọ na-arụ nʼihi mmadụ!
6 Abongolaki ebale monene mabele ya kokawuka; bakatisaki ebale na makolo ekawuka. Tozali kosepela kati na Ye.
O mere ka osimiri ghọọ ala akọrọ, ha ji ụkwụ si nʼetiti osimiri gafee; bịanụ ka anyị ṅụrịa nʼime ya.
7 Na nguya na Ye, akonzaka mpo na libela; miso na Ye ekengelaka bikolo. Tika ete batomboki batombokela Ye te.
Ọ na-achị ruo mgbe ebighị ebi site nʼike ya, anya ya na-elekwa mba niile, ka ndị nnupu isi ghara ịfụlị onwe ha elu megide ya. (Sela)
8 Bino bikolo, bopambola Nzambe na biso! Bosala ete lokito ya masanzoli na Ye eyokana!
Toonu Chineke anyị, unu mmadụ niile, kwere ka a nụ ụda otuto ya;
9 Asalaka ete totangama kati na bato ya bomoi. Abatelaki makolo na biso mpo ete tokweya te.
O chebela ndụ anyị, ma mee ka ụkwụ anyị ghara ịmịchapụ.
10 Pamba te, Nzambe, omekaki biso, olekisaki biso kati na moto ndenge basalaka mpo na palata.
Nʼihi na ọ bụ gị, O Chineke, nwara anyị; ị nụchara anyị dịka ọlaọcha.
11 Okangaki biso kati na motambo; otiaki mikumba ya kilo, na baloketo na biso.
Ị kpọbatara anyị nʼụlọ mkpọrọ, ma bokwasị ibu dị arọ nʼazụ anyị.
12 Otikaki moto komatela biso na moto. Tolekaki kati na moto mpe kati na mayi, mpe obimisaki biso kati na yango mpo na komema biso na bofuluki.
I kwere ka ndị mmadụ rịa anyị elu; anyị esitela nʼime ọkụ na nʼime mmiri gafee. Ị kpọbatala anyị ebe anyị nwezuru ihe niile.
13 Nakokota kati na Ndako na Yo, nakomemela Yo makabo ya kotumba, nakokokisa bandayi na ngai epai na Yo.
Aga m e ji aja nsure ọkụ bata nʼime ụlọnsọ ukwu gị, imezu nkwa m kwere gị
14 Bandayi oyo bibebu na ngai moko etatolaki mpe monoko na ngai elobaki na tango nazalaki kati na pasi.
nʼihi na nke a bụ ihe m ji ọnụ m kwuo, ọ bụkwa nke a ka egbugbere ọnụ m kwupụtara na m ga-eme nʼoge nsogbu m.
15 Lokola bambeka ya kotumba, nakobonzela Yo banyama minene, bameme elongo na bambeka ya malasi; nakobonzela Yo bangombe mpe bantaba ya mibali.
Aga m eji anụ ndị gbara abụba chụọrọ gị aja, ya na aja onyinye nke ọtụtụ ebule; Aga m achụkwa aja onyinye nke ọtụtụ oke ehi na mkpi. (Sela)
16 Bino nyonso oyo botosaka Nzambe, boya koyoka! Nakoyebisa bino makambo oyo asali mpo na bomoi na ngai.
Bịanụ nụrụ, unu niile na-atụ egwu Chineke; ka m kọọrọ unu ihe o meere m.
17 Nabelelaki Ye na monoko na ngai, mpe lolemo na ngai ekumisaki Ye.
Eji m ọnụ m kpọkuo ya; otuto ya dị m nʼire.
18 Soki nazalaki na masumu kati na motema na ngai, Nkolo alingaki koyoka ngai te.
Ọ bụrụ na mmehie na-amasị m nʼime obi m, Onyenwe anyị agaraghị ege m ntị;
19 Nzokande, Nzambe ayokaki ngai, ayokaki na bokebi libondeli na ngai.
ma Chineke gere ntị nʼezie, nụrụkwa olu arịrịọ m.
20 Tika ete Nzambe akumisama! Aboyaki te koyoka libondeli na ngai mpe kotalisa ngai bolingo na Ye.
Otuto dịrị Chineke, onye na-ajụghị ekpere m maọbụ ghara izi m ịhụnanya ya!

< Banzembo 66 >