< Banzembo 62 >

1 Wuta na buku ya mokambi ya bayembi, kolanda Yedutuni. Nzembo ya Davidi. Solo, nazwaka kimia kati na Nzambe; lobiko na ngai ewutaka epai na Ye.
Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Maka Jedutun. Abụ Ọma Devid. Ọ bụ naanị nʼime Chineke ka mkpụrụobi m na-achọta izuike. Nzọpụta m na-esite na ya na-abịa.
2 Solo, azali libanga mpe lobiko na ngai; azali ebombamelo na ngai, nakoningana te.
Naanị ya bụ oke nkume m na nzọpụta m; ọ bụ ebe mgbaba m e wusiri ike, agaghị m ama jijiji nʼọnọdụ m.
3 Kino tango nini bokosangela moto moko? Kino tango nini bino nyonso bokosangana mpo na koluka koboma ye lokola mir oyo etengami, lokola lopango oyo esili kokweya?
Ruo ole mgbe ka unu ga-anọgide na-ebuso agha megide nwoke a? Unu niile, unu chọrọ ịkwatu ya, ebe ọ bụ naanị mgbidi na-ada ada, mgbidi na-esighị ike e ji osisi wuo?
4 Solo, basalaka makita mpo na kokweyisa ye wuta na esika na ye ya likolo, basepelaka kotatola lokuta. Bapambolaka na nzela ya minoko na bango; kasi kati na mitema na bango, balakelaka mabe.
Ha ekpebiela isite nʼọnọdụ ya dị elu kwatuo ya; okwu ụgha na-atọ ha ụtọ. Ha na-eji ọnụ ha na-agọzi, ma nʼime obi ha, ha na-abụ ọnụ. (Sela)
5 Oh molimo na ngai, zwa bopemi kati na Nzambe, pamba te elikya na ngai ewutaka epai na Ye.
O mkpụrụobi m, chọta ezumike naanị nʼime Chineke; olileanya m na-esite na ya na-abịa.
6 Solo, azali libanga mpe lobiko na ngai; azali ebombamelo na ngai, nakoningana te.
Naanị ya bụ oke nkume m, na onye nzọpụta m. Naanị ya kwa bụ ebe mgbaba m e wusiri ike, agaghị m ama jijiji nʼọnọdụ m.
7 Nzambe azali lobiko mpe nkembo na ngai; libanga ya makasi na ngai mpe ebombamelo na ngai ezali kati na Nzambe.
Nzọpụta m na nsọpụrụ m dabeere na Chineke, Ọ bụ oke nkume m, ebe mgbaba m.
8 Botielaka Ye elikya tango nyonso, bosopaka mitema na bino liboso na Ye, pamba te Nzambe azali ebombamelo mpo na biso.
Tụkwasịnụ ya obi mgbe niile, unu ndị mmadụ; kwupụtaranụ ya obi unu, nʼihi na Chineke bụ ebe mgbaba anyị. (Sela)
9 Solo, bato bazali lokola molunge, bazali lokola lokuta; Soki batie bango na emekelo kilo, ata molunge ekoleka bango nyonso na kilo.
Ndị nta nʼetiti ụmụ mmadụ bụ naanị otu nkuume, ndị ukwu bụ naanị ụgha; ọ bụrụ na a tụọ ha nʼihe ọtụtụ, ha bụ ihe efu; ha niile bụ naanị otu nkuume.
10 Botiaka elikya te na mileki ya moyibi, mpe botielaka yango motema te; soki bomengo na bino ekomi ebele, bokangama na yango te.
Unu atụkwasịla obi unu nʼiji aka ike kpata ego, maọbụ tụkwasị olileanya unu nʼihe e zuru ezu; akụ unu nwere ike mụbaa, unu atụkwasịla ha obi.
11 Nzambe alobaki mbala moko, ngai nayokaki mbala mibale: « Pamba te makasi ezali ya Nzambe;
Chineke ekwuola otu ihe, ihe abụọ ka m nụrụ: “Na gị, O Chineke, dị ike,
12 mpe bolingo ezali ya Nkolo; » mpe « ofutaka moto nyonso kolanda misala na ye. »
na gị, Onyenwe anyị, jupụtara nʼịhụnanya. Nʼezie, ị ga-akwụghachi onye ọbụla dịka ọrụ ya si dị.”

< Banzembo 62 >