< Banzembo 53 >

1 Nzembo ya Davidi. Wuta na buku ya mokambi ya bayembi. Eyembamaki na flite. Bazoba bamilobelaka: « Nzambe azali te. » Makanisi na bango esila kobeba, basalaka makambo mabe mpe ya nkele; moko te asalaka bolamu.
Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Nʼusoro Mahalat. Abụ maskil Devid. Onye nzuzu na-asị nʼime obi ya, “Ọ dịghị Chineke ọbụla dị.” Ha bụ ndị ajọ omume riri ahụ, ụzọ ha niile bụkwa ihe arụ; ọ dịghị onye ọbụla na-eme ezi ihe.
2 Wuta na likolo, Nzambe atalaka bato mpo na koluka koyeba soki ezali ata na moko ya mayele, oyo atalelaka Nzambe.
Chineke sitere nʼeluigwe na-ele ụmụ mmadụ anya, ịhụ ma ọ ga-achọta onye ọbụla nwere nghọta, onye nke na-achọ Chineke.
3 Bango nyonso bazali batomboki, bango nyonso bamibebisa; moko te asalaka bolamu, ata moto moko te.
Onye ọbụla, nʼotu nʼotu ewezugala onwe ha, ha niile abụrụla ndị ajọ omume riri ahụ; ọ dịghị onye ọbụla na-eme ihe ziri ezi, ọ dịghị ọ bụladị otu onye.
4 Boni, bato nyonso ya misala mabe bayebi eloko te? Baliaka bato na ngai ndenge baliaka lipa mpe batikala nanu kobelela Nzambe te, bazali penza kososola eloko moko te?
Ndị niile na-eme ajọ ihe, ha amaghị ihe? Ha na-eripịa ndị m dịka mmadụ si eri nri, ha adịghị akpọkukwa Chineke.
5 Somo monene ekokanga bango na esika oyo ezali ata na eloko moko te oyo ekoki kopesa bango somo, pamba te Nzambe apanzi mikuwa ya bato oyo bayei kobundisa yo. Okoyokisa bango soni, pamba te Nzambe abwaka bango.
Ma nʼebe ahụ ka ha nọ, nʼọnọdụ oke egwu, ebe ọ dịghị ihe egwu na-adịghị. Chineke fesasịrị ọkpụkpụ ndị niile megidere gị; i mere ka ihere mee ha, nʼihi na Chineke ajụla ha.
6 Tika ete lobiko ya Isalaele ebimela na Siona! Tango Nzambe akobimisa bato na Ye na bowumbu, bakitani ya Jakobi bakosepela, mpe Isalaele ekozala na esengo.
O, a sịkwarị na nzọpụta Izrel ga-esi na Zayọn pụta! Mgbe Chineke ga-akpọghachite ndị ya nʼọnọdụ ha, ka Jekọb ṅụrịa ọṅụ, ka Izrel nwekwaa obi ụtọ!

< Banzembo 53 >