< Banzembo 40 >

1 Nzembo ya Davidi. Wuta na buku ya mokambi ya bayembi. Natiaki elikya na ngai kati na Yawe; abalukaki epai na ngai mpe ayokaki koganga na ngai.
Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ Ọma Devid. Eji m ndidi chere Onyenwe anyị, ọ tụgharịkwutere m, ọ nụkwaara akwa m.
2 Abimisaki ngai na libulu ya mozindo, kati na potopoto; atelemisaki ngai na likolo ya libanga mpe alendisaki makolo na ngai.
O sitere nʼolulu na-amị amị, nke apịtị na ụrọ juru, sepụta m; o guzobere ụkwụ m abụọ nʼelu oke nkume, nyekwa m ebe siri ike ka m guzo.
3 Atiaka nzembo ya sika kati na monoko na ngai, nzembo ya masanzoli mpo na Nzambe na biso. Bato ebele bakomona, bakobanga mpe bakotiela Yawe motema.
O tinyere abụ ọhụrụ nʼọnụ m, abụ otuto nye Chineke anyị. Ọtụtụ ga-ahụ ya ma tụọ egwu, ha ga-atụkwasị obi ha nʼime Onyenwe anyị.
4 Esengo na moto oyo atiaka elikya kati na Yawe, kasi atalelaka te bato ya lolendo mpe bakosi.
Onye a gọziri agọzi ka onye ahụ bụ, onye na-eme Onyenwe anyị ebe ntụkwasị obi ya; onye na-adịghị ele ndị mpako anya maọbụ ndị na-atụgharị gbasoo arụsị.
5 Yawe, Nzambe na ngai, bikamwa mpe mabongisi oyo osalaka mpo na biso ezali ebele penza. Moko te akokani na Yo; nalingi kotatola mpe kopanza sango na yango, kasi motango na yango eleki ebele.
O Onyenwe anyị Chineke m, ọrụ ebube ị rụrụ dị ọtụtụ, ọ dịghị onye pụrụ ịgụkọta ihe niile ị kwadooro maka inye anyị; a sịkwarị na aga m ekwu ma kọsaa ihe banyere ha, ha karịrị ihe ọnụ pụrụ ikwu.
6 Osepelaki te na bambeka mpe na makabo, kasi ofungolaki matoyi na ngai; osengaki te makabo ya kotumba mpe bambeka mpo masumu.
Aja na onyinye abụghị ihe ị chọrọ ma ị megheela ntị abụọ; aja nsure ọkụ na aja a chụrụ maka mmehie abụghị ihe ị chọrọ.
7 Bongo nalobaki: « Ngai oyo, nayei epai na Yo kolanda ndenge ekomami na tina na ngai kati na buku.
Mgbe ahụ, ekwuru m sị, “Lee m, abịala m, e dere banyere m nʼime akwụkwọ mpịakọta.
8 Nzambe na ngai, nasepelaka kosala mokano na Yo, Mobeko na Yo ezali kati na motema na ngai. »
O Chineke m, ọ bụ ọchịchọ m ime ihe ị na-achọ, iwu gị dị nʼime obi m.”
9 Nasakolaka bosembo na Yo kati na mayangani, nakokanga monoko na ngai te; Yawe, oyebi yango!
Ana m anọ nʼetiti ọgbakọ ukwuu na-ekwusa ihe ziri ezi; dịka ị maara, o Onyenwe anyị, anaghị m emechi ọnụ m.
10 Nabombaka bosembo na Yo te kati na motema na ngai, natatolaka boyengebene mpe lobiko na Yo kati na mayangani, nakobomba yango ata moke te.
Ekpuchighị m ezi omume gị nʼime obi m, ana m ekwupụta maka ikwesi ntụkwasị obi gị na nzọpụta gị. Adịghị m ekpuchi ịhụnanya na eziokwu gị, nʼebe ọgbakọ ukwuu nọ.
11 Yawe, kopimela ngai mawa na Yo te; kasi sala ete bolingo mpe bosolo na Yo ebatelaka ngai tango nyonso.
O Onyenwe anyị, ezonarịla m ebere gị, ka ịhụnanya gị na eziokwu gị chebe m oge niile.
12 Pamba te makambo ebele ya pasi ezingeli ngai, mabunga na ngai ekomi konyokola ngai, mpe nazali kokoka lisusu te kotala yango; ezali ebele koleka suki ya moto na ngai, mpe motema na ngai elembi kati na ngai.
Nʼihi na ọtụtụ nsogbu a na-apụghị ịgụta ọnụ gbara m gburugburu; mmehie m niile akarịala m, apụghịkwa m ịhụ ụzọ: ha karịrị agịrị isi dị m nʼisi, obi m na-adakwa mba nʼime m.
13 Yawe, nabondeli Yo, kangola ngai; Yawe, yaka noki kosunga ngai.
O Onyenwe anyị, ya masị gị ịzọpụta m; O Onyenwe anyị, bịa ngwangwa inyere m aka.
14 Tika ete bato oyo balukaka kufa na ngai bakufa soni mpe basambwa! Tika ete bato oyo bazelaka libebi na ngai bazonga sima mpe babungisa lokumu na bango!
Ka ndị niile na-achọ ịnapụ m ndụ m, bụrụ ndị a ga-etinye nʼọnọdụ ihere na ọgbaaghara; ka ndị niile ọ na-amasị ịhụ ịla nʼiyi m, laghachi azụ nʼihere.
15 Tika ete ba-oyo balobaka na ngai: « Ah! Ah! » bayoka somo mpe bakufa soni!
Ka ndị ahụ na-asị m, “Ehee! Ehee!” kụja nʼihi ihere onwe ha.
16 Kasi tika ete bato nyonso oyo balukaka Yo batonda na esengo mpe basepela kati na Yo! Tika ete ba-oyo balingaka lobiko na Yo balobaka tango nyonso: « Yawe azali monene! »
Ma ka ndị niile na-achọ gị ṅụrịa ọṅụ, nweekwa obi ụtọ nʼime gị; ka ndị ahụ hụrụ nzọpụta gị nʼanya na-ekwu mgbe niile, “Onyenwe anyị dị ukwuu.”
17 Solo, nazali mobola mpe moto akelela, kasi tika ete Nkolo asunga mpe akangola ngai. Nzambe na ngai, kowumela te!
Ma mụ onwe m bụ m ogbenye na onye nọ na mkpa; ka Onyenwe anyị cheta m. Ị bụ onye inyeaka m na onye mgbapụta m; Ị bụ Chineke m, anọla ọdụ ịbịa.

< Banzembo 40 >