< Banzembo 35 >

1 Nzembo ya Davidi. Yawe, kota likambo na ngai liboso ya bayini na ngai; bundisa bato oyo bazali kobundisa ngai.
Abụ Ọma Devid. O Onyenwe anyị, lụso ha ọgụ bụ ndị na-alụso m ọgụ; buso ha agha bụ ndị na-ebuso m agha.
2 Kamata nguba ya moke mpe ya monene, mpe telema mpo na kosunga ngai.
Yikwasị uwe agha gị, werekwa ọta gị; bilie bịa nyere m aka.
3 Tombola likonga ya monene mpe ya moke mpo na kobundisa bato oyo bazali kolanda ngai. Loba na ngai: « Nazali lobiko na Yo. »
Sepụta ùbe gị na anyụike agha gị; bịa zute ndị na-achụ m ọsọ. Gwa mkpụrụobi m, “Abụ m nzọpụta gị.”
4 Tika ete bato oyo bazali komeka bomoi na ngai basambwa mpe bayoka soni; tika ete bato oyo bazali kokana kosala ngai mabe bazonga sima mpe bakoma mawa-mawa!
Mee ka ihere mee ndị niile na-agbalịsị ike igbu m. Ka ndị na-agba izuzu igbu m bụrụkwa ndị a chụghachiri azụ, na ndị ihere mere.
5 Tika ete bakoma lokola matiti ya kokawuka oyo mopepe ezali kopumbwisa, tango anjelu ya Yawe akotindika bango;
Ka ha dịka igbugbo ọka mgbe oke ifufe na-efe, ka mmụọ ozi Onyenwe anyị bụrụ onye na-achụfu ha.
6 tika ete nzela na bango ekoma molili mpe moselu tango anjelu ya Yawe akobengana bango.
Mee ka ụzọ ha gbaa ọchịchịrị, bụrụkwa ebe na-amị amị; ka mmụọ ozi Onyenwe anyị bụrụ onye na-achụ ha ọsọ.
7 Mpo ete, na kozanga tina, mpo na kokanga ngai, batielaki ngai mitambo mpe batimolaki mabulu,
Ọ bụ ezie na ọ dịghị ihe ọjọọ ọbụla m mere ha, ma ha siere m ọnya, gwukwaara m olulu nʼụzọ m.
8 tika ete libebi ekweyela bango na mbalakata, bakangama bango moko na mitambo oyo batielaki ngai mpe bakweya kati na mabulu yango!
Ka mbibi bịakwasị ha na mberede, ka ụgbụ ha zobeere m kee ha; ka ha lakwaa nʼiyi site nʼidaba nʼolulu ahụ ha gwuru.
9 Nakotonda na esengo kati na Yawe mpe nakosepela kati na lobiko na Ye.
Mgbe ahụ, mkpụrụobi m ga-aṅụrị ọṅụ na Onyenwe anyị, ọ ga-enwekwa obi ụtọ nʼime nzọpụta ya.
10 Mikuwa na ngai nyonso ekoloba: « Oh Yawe, nani akoki kokangola, lokola Yo, mobola wuta na maboko ya moto oyo aleki ye na makasi, mobola mpe mokeleli wuta na maboko ya banyokoli na bango? »
Ihe niile dị nʼime m ga-eti mkpu sị, “O Onyenwe anyị, ọ bụ onye dịka gị? Ị na-agbapụta ndị na-adịghị ike site nʼaka ndị dị ike karịa ha, ma na-anapụta ndị ogbenye ndị chọrọ enyemaka site nʼaka ndị na-apụnara ha ihe ha nwere nʼike.”
11 Batatoli oyo bamipesa na kanza batelemi, bazali kopesa ngai mituna na tina na makambo oyo nayebi te.
Ndị akaebe, ndị kwara obi nʼazụ na-apụkwute m; ha na-ebo m ebubo ihe ndị m na-anụbeghị ihe banyere ha na mbụ.
12 Bazali kozongisela ngai mabe mpo na bolamu oyo nasalaki, mpe kosundola ngai lokola monyokolami.
Ana m emere ha ihe ọma, ma ha na-akwụghachi m ihe ọjọọ. Nke a na-ewute mmụọ m ruo nʼọnwụ.
13 Nzokande tango bango babelaki, ngai nalataki saki, namikitisaki na kokila bilei, nazalaki kobondela mpo na bango.
Mgbe ha na-arịa ọrịa, eyiri m akwa mkpe, site na ibu ọnụ weda onwe m nʼala. Mgbe ekpere m lọghachikwutere m na-enweghị ọsịsa,
14 Nazalaki kotambola na mawa lokola mpo na moninga to mpo na ndeko; nazalaki kokitisa moto na se mpo na mawa lokola moto oyo azali kolela mama na ye.
ejegharịrị m nʼọnọdụ iru ụjụ, dịka a ga-asị na ọ bụ nwanne m, maọbụ enyi m, jegharịakwa nʼobi ọjọọ dịka a ga-asị na ọ bụ nne m na-arịa ọrịa ahụ.
15 Kasi awa ngai nakomi na pasi, bango bazali kosepela mpe kosangana; wana ngai nayebi te, bango bazali kosangana mpo na kotonga ngai, bazali kolemba te kofinga ngai.
Ma mgbe m dahiere, ha zukọtara na-aṅụrị ọṅụ; mgbe m na-adịghị ele anya, ha biliri imegide m. Ha na-ekwulu m na-esepụghị aka.
16 Lokola bapagano, bazali koseka ngai, bazali kolia minu na tina na ngai.
Dịka ndị ajọ omume, ha na-akwa m emo nʼiwe, na-atakwara m ikikere eze ha.
17 Yawe, kino tango nini okotala kaka boye? Kangola ngai wuta na misala na bango ya mabe, bomoi na ngai wuta na manzaka ya bankosi oyo.
O Onyenwe anyị, ọ bụ ruo ole mgbe ka ị ga-anọ na-ele ihe na-eme? Gbapụta ndụ m site na mbibi ha niile, site nʼaka ụmụ ọdụm ndị a, gbapụta ndụ m dị oke ọnụahịa.
18 Nakokumisa Yo kati na mayangani monene, nakosanzola Yo kati na ebele ya bato.
Aga m enye gị ekele nʼihu ọha mmadụ dị ukwuu, nʼetiti ọha kachasị ibe ya dị ukwuu, ka m ga-anọ too gị.
19 Tika ete banguna na ngai basepela te na tina na ngai; tika ete bayini na ngai na kozanga tina bakanga miso te.
Ekwekwala ka ndị ahụ bụ ndị iro m, mgbe o nweghị ihe m mere ha, chịa m ọchị; ekwekwala ka ndị ahụ kpọrọ m asị nʼihi iro, mgbe o nweghị ihe m mere ha nwee izuike.
20 Pamba te balobaka te maloba ya kimia, kasi babongisaka lokuta mpo na kokosela bato ya kimia makambo kati na mboka.
Nʼihi na ọ bụghị okwu udo ka ha na-ekwu, kama ha na-echepụta ebubo ụgha dị iche iche megide ndị ahụ na-anọrọ onwe ha jụụ nʼime ala ahụ.
21 Balobaka na mongongo makasi: « Eh! Eh! Tomonaki ye! »
Nʼiju anya, ha na-ele m anya na-eti mkpu na-asị, “Ewoo! Ewoo! Anya anyị abụọ ka anyị ji hụ ya.”
22 Yawe, omoni nyonso wana; kovanda nye te! Nkolo, kozala mosika na ngai te!
O Onyenwe anyị, ị hụla nke a, agbakwala nkịtị; anọkwala m nʼebe dị anya, O Onyenwe anyị.
23 Lamuka mpe telema mpo na kolongisa ngai! Nzambe na ngai mpe Nkolo na ngai, kota likambo na ngai.
Teta, bilie bụụrụ m onye mkpepụta m. Kpechitere m ọnụ m, Chineke m na onyenwe m.
24 Yawe, Nzambe na ngai, longisa ngai na bosembo na Yo; kotika bango te kosepela na tina na ngai.
O Onyenwe anyị Chineke m, kpepụta m nʼihi ezi omume gị; ekwekwala ka ha chịa m ọchị.
25 Tika ete bamilobela te: « Ah! Tala makambo oyo tozalaki koluka! » Tika ete baloba te: « Tolie ye. »
Ekwekwala ka ha sị, “Ahaa, ọ dị ka anyị tụrụ anya ya!” Maọbụ sị, “Anyị eloola ya!”
26 Tika ete bato nyonso oyo basepelaka na pasi na ngai, bango nyonso lisanga, bayoka soni mpe basambwa! Tika ete bato oyo batombokelaka ngai balata soni mpe bazala kati na yikiyiki!
Mee ka ihere na ọgbaaghara bụrụ nke ndị na-achị m ọchị nʼime mkpagbu m; were ihere na nweda nʼala yinye ha dịka uwe, bụ ndị niile na-ebuli onwe ha elu imegide m.
27 Tika ete bato oyo basepelaka na bosembo na ngai baganga na esengo mpe basepela; tika ete balobaka tango nyonso: « Tika ete Yawe anetolama, Ye oyo asepelaka na kimia ya mowumbu na Ye! »
Ka ndị niile mkpepụta m dị mma were obi ụtọ tie mkpu ọṅụ; ka ha na-asị mgbe niile, “Ka e bulie Onyenwe anyị elu, onye ọdịmma nke ohu ya na-amasị.”
28 Nakosakola bosembo na Yo, nakokumisa Yo mikolo nyonso.
Ire m ga-ekwu banyere ezi omume gị na otuto gị niile ogologo ụbọchị niile.

< Banzembo 35 >