< Banzembo 16 >

1 Nzembo ya Davidi. Nzambe, batela ngai, pamba te nabombami kati na Yo.
Abụ miktam nke Devid. Chebe m, O Chineke, nʼihi na nʼime gị ka m gbabara izere ndụ.
2 Nalobaka na Yawe: « Ozali Nkolo na ngai, Yo moko kaka nde ozali bolamu na ngai. »
A gwara m Onyenwe anyị, “Ị bụ Onyenwe m, e wezuga gị, enwekwaghị m ọdịmma ọbụla.”
3 Natatolaka na tina na basantu oyo bazali kati na mboka ete bazali penza bato minene oyo nasepelaka na bango makasi.
Ana m asị maka ndị nsọ bụ ndị nọ nʼala a, “Ha bụ ndị a na-asọpụrụ, ndị ihe ha nʼatọ m ụtọ.”
4 Bato oyo bapotaka mbangu mpo na koluka bolamu epai ya banzambe mosusu bakomona pasi mingi. Nakosopa te mbeka na bango ya makila epai ya banzambe ya lolenge wana mpe nakotanga bakombo na yango te na bibebu na ngai.
Iru ụjụ nke ndị ahụ na-agbaso chi ndị ọzọ ga-aba ụba. Agaghị m eso ha wụsa aja ihe ọṅụṅụ ọbara nye chi ndị a, maọbụ were egbugbere ọnụ m kpọọ aha ha.
5 Yawe, Yo moko kaka nde ozali libula mpe bomoi na ngai; ozali ndanga ya bozwi na ngai.
Onyenwe anyị, i nyeela m oke m na iko m; ị na-elekọta ihe niile bụ nke m site nʼife nza.
6 Nazwi etando ya motuya makasi, ezali libula ya kitoko penza mpo na ngai!
Ọtụtụ oke ala niile dabara m nʼebe dị ezi mma; nʼezie, e nwere m ihe nketa nke na-enye m ọṅụ.
7 Nakopambola Yawe oyo apesaka ngai toli mpe, ezala na butu, angengisaka makanisi na ngai.
Aga m eto Onyenwe anyị, onye na-adụ m ọdụ; ọ bụladị nʼabalị, obi m na-agwa m ihe m ga-eme.
8 Natalelaka Yawe tango nyonso, pamba te azali pene na ngai mpo ete naningana te.
Ana m elekwasị Onyenwe anyị anya mgbe niile. Ebe ọ nọ nʼaka nri m, agaghị m ama jijiji.
9 Yango wana motema na ngai etondi na esengo, molimo na ngai ezali kosepela, nzoto na ngai mpe ekopema na kimia.
Nʼihi nke a, obi dị m ụtọ, ire m jupụtakwara nʼọṅụ; aga m anọkwa nʼudo.
10 Oh Yawe, okosundola ngai te kati na mboka ya bakufi, okotika mpe te ete mosantu na Yo apola. (Sheol h7585)
Nʼihi na ị gaghị ahapụ m nʼala mmụọ, ị gaghị ekwekwa ka Onye gị kwesiri ntụkwasị obi hụ ire ure. (Sheol h7585)
11 Okolakisa ngai nzela ya bomoi; okotondisa ngai na esengo kati na bozalisami na Yo, elongo na bilengi ya suka te na ngambo ya loboko na Yo ya mobali.
I gosila m ụzọ ndụ; ị ga-eji ọṅụ mejupụta obi m nʼihu gị; ya na ihe ụtọ ndị dị nʼaka nri gị ruo ebighị ebi.

< Banzembo 16 >