< Banzembo 10 >

1 Yawe, mpo na nini otelemi mosika? Mpo na nini obombami na tango ya pasi?
Onyenwe anyị, gịnị mere i ji na-eguzoro onwe gị nʼebe dị anya? Gịnị mere ị na-ezo onwe gị nʼoge nsogbu?
2 Na lolendo na ye, moto mabe oyo akangami na mabongisi na ye anyokolaka mobola.
Site na mpako, onye ajọ omume na-emegbu ndị na-adịghị ike, ndị mpịa mpịa aghụghọ ya mara dịka ọnya.
3 Pamba te moto mabe amikumisaka na tina na posa makasi ya motema na ye, apambolaka moto oyo azali na lokoso mpe afingaka Yawe.
Ọ na-anya isi banyere ọchịchọ niile nke obi ya, ọ na-elelị Onyenwe anyị anya ma na-agọzi ndị oke ọchịchọ.
4 Na lolendo na ye, moto mabe alobaka: « Nzambe azalaka te. » Kati na makanisi na ye nyonso, ezali na esika te mpo na Nzambe.
Nʼọnọdụ mpako ya, onye ajọ omume anaghị achọ Chineke, nʼechiche ya niile, ọ naghị eche banyere ya.
5 Misala na ye ekendeke liboso tango nyonso, asalaka keba te na mikano na Yo, Yawe; atiolaka banguna na ye nyonso.
Ma ihe niile ọ na-eme na-agara ya nke ọma; ọ bụ onye na-ebuli onwe ya elu, iwu gị niile dịkwa anya site nʼebe ọ nọ; ọ na-elelị ndị iro ya niile.
6 Amilobelaka: « Eloko moko te ekotikala kolengisa ngai. » Alapaka ndayi boye: « Moko te akotikala kosala ngai mabe. »
Nʼime obi ya, ọ na-asị, “Ọ dịghị ihe ga-emetụta m. Aga m anọ nʼọnọdụ ọṅụ mgbe niile. Nsogbu ọbụla agaghị adakwasị m.”
7 Monoko na ye etonda na bilakeli mabe, lokuta mpe mangungu; abongisaka kaka pasi mpe mabe.
Ọnụ ya jupụtara nʼokwu ụgha na ịba mba ime ihe ọjọọ, nʼokpuru ire ya ka nsogbu na ajọ ihe dịkwa.
8 Abombamaka pene ya bamboka. Wuta na bisika oyo abombamaka, abomaka moto oyo asali mabe te. Miso na ye ezelaka na kobombama bato ya koboma.
Ha na-ezo onwe ha nʼobodo nta dị iche iche, nʼebe zooro ezo ka ha na-anọ, na-eche itigbu ndị aka ha dị ọcha.
9 Abombamaka lokola nkosi kati na evandelo na yango, abombamaka mpo na kokanga moto oyo azangi nguya; akangaka moto oyo azangi nguya na kotindika ye pembeni ya motambo.
Dịka ọdụm, ha anaghị eme mkpọtụ ọbụla, ọ na-eche ịdakwasị ụmụ ogbenye. Dịka ndị bụ dinta si ejide ụmụ anụmanụ nʼọnya ha siri, otu a ka ha si ejide ụmụ ogbenye.
10 Agumbaka ye mpe avandisaka ye na mabele, mpe akweyaka na se ya bokonzi na ye.
Ụmụ ogbenye ndị a na-ada nʼala nʼihi ịdị ike ya, ọ na-azọpịakwa ha.
11 Amilobelaka: « Nzambe akotikala koyeba te, abombaka elongi na Ye mpe akotikala komona te. »
Nʼime obi ya, ọ na-asị, “Chineke echefuola. O zofuola ihu ya, ọ dịghị mgbe ọ hụrụ ya.”
12 Oh Yawe, telema. Nzambe, sembola loboko na Yo, kanisa babola.
Bilie O Onyenwe anyị! O Chineke welie aka gị, echefukwala ndị na-enweghị onye inyeaka.
13 Mpo na nini moto mabe afinga Nzambe? Mpo na nini amilobela: « Nzambe akopesa ngai etumbu te? »
Gịnị mere onye ajọ omume ji na-eleda Chineke anya? Gịnị mere o ji na-asị nʼime obi ya, “Ọ gaghị akpọ m ka m zaa ajụjụ banyere omume m”?
14 Pamba te, Yo Nzambe, omoni pasi ya banyokolami; otalaka pasi na bango mpe ozwaka yango kati na loboko na Yo. Banyokolami bamipesaka epai na Yo oyo osungaka bana bitike.
Ma gị, O Chineke, ị na-ahụ nsogbu na ihe mwute, ị na-atule ihe ị ga-eme banyere ha. Ndị a na-emegbu na-atụkwasị gị obi, nʼihi na ị bụ onye inyeaka ndị na-enweghị nna.
15 Bebisa nguya ya moto mabe, pesa moto ya misala mabe etumbu mpo na mabe na ye, mpo ete emonana lisusu te.
Gbajie aka onye ajọ omume a na-eme ihe ọjọọ, kpọọ ya ka ọ zaa ajụjụ banyere ajọ omume ya niile nke a na-apụghị ịchọpụta.
16 Yawe azali Mokonzi mpo na seko, bapagano bakozala lisusu te kati na mokili na Ye.
Onyenwe anyị bụ eze ruo mgbe ebighị ebi. Ọ ga-esite nʼala ya kpochapụ mba niile.
17 Yawe, oyokaka posa ya banyokolami, olendisaka bango, mpe oyokaka koganga na bango,
O Onyenwe anyị, ị maara ọchịchọ obi ndị niile a na-akpagbu; ị na-ege ntị na mkpu akwa ha ma kasịekwa ha obi,
18 mpo na kolongisa mwana etike mpe monyokolami; boye, bato ya mokili bakobangisa lisusu te.
Ị na-echedo ndị na-enweghị nna na ndị niile a na-emegbu emegbu, ka mmadụ efu, onye e kere eke, ghara imenye ha egwu ọzọ.

< Banzembo 10 >