< Masese 23 >

1 Soki ovandi mpo na kolia mesa moko elongo na mokonzi, tala malamu moto oyo azali liboso na yo.
Mgbe gị na onye na-achị achị nọdụrụ irikọ nri, lezie ihe dị nʼihu gị anya,
2 Tia mbeli na mongongo na yo soki ozalaka lokoso.
tụkwasị mma nʼakpịrị gị, ma ọ bụrụ na ị bụ onye iri oke nri na-atọ ụtọ.
3 Kolula te bilei na ye ya kitoko, pamba te, tango mosusu, ezali na yango bololo.
Achọsila nri ụtọ ya ike, nʼihi na nri ahụ bụ nri aghụghọ.
4 Koboma nzoto te mpo na koluka kozwa bomengo, kotia mayele na yo te kati na yango.
Adọgbula onwe gị nʼọrụ maka ịbụ ọgaranya, atụkwasịla obi na nghọta gị.
5 Tango okobwaka miso na ngambo ya bomengo, ekobunga, pamba te ezalaka na mapapu mpe epumbwaka na likolo makasi lokola mpongo.
Nʼihi na akụ nwere ike ifu nʼotu ntabi anya dịka a ga-asị na ha nwere nku dịka nnụnụ ugo.
6 Kolia te bilei ya moto oyo azali kotala yo na miso mabe mpe kolula te bilei na ye ya kitoko,
Erila nri onye aka ntagide na-enye gị. Nri ụtọ ya agụkwala gị agụ.
7 pamba te azalaka ndenge makanisi ya motema na ye ezali. Alobaka: « Lia mpe mela, » kasi motema na ye ezali elongo na yo te.
Nʼihi na ọ bụ ụdị mmadụ ahụ na-eche ọnụahịa ihe ọ na-emefuru gị. Ọ na-asị gị, “Rie ihe, ṅụọkwa ihe ọṅụṅụ,” ma obi ya adịghị nʼebe ị nọ.
8 Okosanza eteni oyo oliaki, mpe maloba na yo ya kitoko ekokende pamba.
Ị ga-agbọkwa nke ntakịrị ahụ i riri mgbe ahụ, okwu ọma ahụ niile i kwuru banyere ya ga-abụ ihe efu.
9 Kolobaka na zoba te, pamba te akotiola bwanya ya maloba na yo.
Atụfula ume gị ịgwa onye nzuzu okwu, nʼihi na ọ ga-eleda okwu i sitere nʼezi uche kwuo anya.
10 Kozongisa te na sima mondelo ya kala mpe kokota te na bilanga ya bana bitike,
Anarala nwa na-enweghị nne na nna ala ya site nʼihigharị oke ala e gwunyere site nʼoge gara aga,
11 pamba te Molobeli na bango azalaka makasi, akozwa makambo na bango na maboko mpo na kotelemela yo.
nʼihi na onye mgbapụta ha dị ike; ya onwe ya ga-ekwuchitere ha ọnụ ha.
12 Tika ete motema na yo endimaka kotosa mibeko, mpe matoyi na yo eyokaka maloba ya boyebi!
Tinye uche gị nʼịdọ aka na ntị; gekwaa ntị nụrụ okwu ihe ọmụma niile.
13 Kozangisa te kopesa mwana etumbu; soki obeti ye fimbu, akokufa te.
Ahapụla ịdọ ụmụ gị aka na ntị. Ha agaghị anwụ nʼihi na ị tiri ha ihe.
14 Na kobeta ye fimbu, okokangola molimo na ye na lifelo. (Sheol h7585)
Jiri mkpara tie ya ihe ma zọpụta ndụ ya site nʼọnwụ. (Sheol h7585)
15 Mwana na ngai, soki motema na yo ezali na bwanya, motema na ngai ekozala na esengo.
Nwa m, aga m aṅụrị ọṅụ nke ukwuu ma ọ bụrụ na ị ghọọ onye maara ihe.
16 Solo, bomoto na ngai nyonso ekotonda na esengo, soki bibebu na yo elobi makambo ya sembo.
Mkpụrụobi m ga-aṅụrị ọṅụ mgbe egbugbere ọnụ gị abụọ kwuru ihe ziri ezi.
17 Tika ete motema na yo elulaka te bato ya masumu, kasi zalaka tango nyonso na posa makasi ya kotosa Yawe;
Ekwela ka obi gị kwosa ndị mmehie ekworo, kama nọgide nʼịnụ ọkụ nʼobi nʼịtụ egwu Onyenwe anyị mgbe niile,
18 pamba te suka na yo ekozala solo malamu mpe elikya na yo ekozala ya pamba te.
nʼihi na i nwere ọtụtụ ihe ọma nʼihu gị. Olileanya dị ukwuu dịrị gị.
19 Mwana na ngai, yoka mpe zala na bwanya, batela motema na yo kati na nzela ya sembo.
Nwa m, nwee uche, gbasookwa ụzọ Chineke.
20 Kozala esika moko te na balangwi masanga to na bato ya lokoso,
Anọla nʼetiti ndị na-aṅụbiga mmanya oke, na ndị iri oke oriri na-atọ ụtọ,
21 pamba te balangwi masanga mpe bato na lokoso bakomaka babola, mpe bogoyigoyi ekolatisa bango bilamba epasuka.
nʼihi na ihe niile ga-akọ ha. Ọ bụkwa nkịrịnka akwa ka onye oke ụra na-eyi nʼahụ.
22 Yokela tata oyo aboti yo, mpe kotiola mama na yo te ata soki anuni.
Ṅaa ntị nʼịdọ aka na ntị nna gị, akpọkwala ịdọ aka na ntị nne gị bụ agadi nwanyị asị.
23 Luka bosolo, kasi koteka yango te; sala se bongo na bwanya, na mateya mpe na mayele.
Zụta eziokwu, erekwala ya, zụtakwa amamihe, ntụziaka, na nghọta.
24 Tata ya moto ya sembo akozala na esengo mingi, mpe moto oyo abota mwana ya bwanya akosepela kati na ye.
Nna onye ezi omume ga-aṅụrị ọṅụ. Ọ bụkwa ihe oke ọṅụ inweta nwa maara ihe.
25 Tika ete tata na yo mpe mama na yo basepela! Tika ete mama oyo abota yo azala na esengo!
Ka nne na nna gị nwee obi ụtọ. Ka onye mụrụ gị ṅụrịa.
26 Mwana na ngai ya mobali, pesa ngai motema na yo, mpe tika ete miso na yo esepela na nzela na ngai!
Nwa m, nye m obi gị ka ụzọ m niile nyekwa anya gị ọṅụ.
27 Pamba te mwasi ya ndumba azali lokola libulu ya monene, mpe mwasi ya mopaya azali lokola libulu ya mozindo.
Nʼihi na onye akwụna bụ olulu miri emi, nwanyị nwe di na-akwa iko bụ olulu mmiri dị warawara.
28 Mwasi ya ndumba atelemaka na ekenge lokola moyibi mpe akomisaka mibali bazoba koleka.
Dịka onye ohi ka ọ na-echere na-emekwa ka ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi baa ụba nʼetiti ụmụ nwoke.
29 Mpo na nani: « Ah ngai, mawa! » Mpo na nani: « Eh! » Mpo na nani koswanaswana? Mpo na nani kolelalela? Mpo na nani kowelana ezanga tina? Mpo na nani kotelisa miso?
Onye ka obi ya jupụtara nʼahụhụ? Onye nọ na iru ụjụ? Olee onye nwere esemokwu? Onye nwere ọtụtụ ihe mkpesa? Onye nwere mmerụ ahụ nke na-abaghị uru? Onye nwere anya nke na-acha ọbara ọbara?
30 Mpo na bato oyo bawumelaka liboso ya masanga ya vino, mpo na bato oyo bamelaka masanga ya makasi.
Ọ bụ ndị na-anọ ogologo oge na-aṅụ mmanya, onye na-aga ịchọpụta mmanya agwara agwa.
31 Kotalaka te masanga ya vino tango ezali motane, tango ezali kongala kati na kopo mpe kokita na pete na mongongo.
Elekwasịla mmanya anya mgbe ọ na-acha ọbara ọbara, mgbe ọ na-ezipụta ọdịdị ya nʼiko mgbe ọ na-asụgharị nke ọma nʼime iko.
32 Na suka na yango, ekoswa yo lokola nyoka mpe ekotia yo minu lokola etupa.
Nʼikpeazụ, ọ na-ata dịka agwọ na-atụkwa dịka ajụala.
33 Miso na yo ekomona biloko na ndenge ya kokamwa, mpe motema na yo ekobimisa makambo ya bozoba.
Anya gị abụọ ga-ahụ ihe ị na-amaghị isi ya na ọdụ ya, obi gị ga-atụlekwa ihe ndị na-agbagwoju anya.
34 Boye, okokoma lokola moto oyo alali kati na ebale monene, mpe lokola moto oyo alali na songe ya nzete ya molayi.
Ị ga-adị ka onye na-edina nʼetiti oke osimiri, nke na-edinakwa nʼelu ụdọ nʼejide ụgbọ.
35 Okoloba: « Babeti ngai, kasi nazali koyoka pasi te; babeti ngai fimbu, kasi nazali koyoka eloko te! Tango nini nakolamuka? Nakozongela lisusu komela vino. »
Ị ga-asị, “Ha tiri m ihe, ma emerụghị m ahụ. Ha pịara m ihe, ma amaghị m. Olee mgbe m ga-eteta, ka m pụọ ga chọọ mmanya ọzọ?”

< Masese 23 >