< Masese 17 >

1 Kolia na kimia ndambo ya lipa ya kokawuka ezali malamu koleka kovanda na ndako etonda na misuni elongo na koswana.
Ọ ka mma ịta iberibe achịcha kpọrọ nkụ ma ịnọ nʼudo adị ya, karịa nʼụlọ jupụtara nʼoke oriri na ịlụ ọgụ.
2 Mosali ya bwanya akozala na bokonzi likolo ya mwana mobali oyo asalaka soni, mpe akozwa libula elongo na bandeko.
Ohu nwere uche ga-achị nwa nna ya ukwu na-eweta ihere ma ketakwa oke nʼihe nketa dịka otu nʼime ndị ezinaụlọ ahụ.
3 Bapetolaka palata na kikalungu, mpe bapetolaka wolo na fulu ya moto makasi, kasi ezali Yawe nde amekaka mitema.
Ite eji anụcha ihe dịrị ọlaọcha, oke ọkụ dịkwara ọlaedo ma Onyenwe anyị na-anwale obi.
4 Moto oyo asalaka mabe ayokaka maloba ya bato mabe, mokosi apesaka litoyi na ye na maloba ya lokuta.
Ajọ mmadụ na-aṅa ntị nʼegbugbere ọnụ na-eduhie, onye ụgha na-aṅakwa ntị nye ire na-ekwu okwu ịla nʼiyi.
5 Moto oyo anyokolaka mobola anyokolaka Mokeli ya mobola yango; moto oyo asepelaka na pasi ya moninga akozanga te kozwa etumbu.
Onye ọbụla na-akwa ogbenye emo ọ bụ Chineke kere ha ka ọ na-elelị anya. Ndị niile na-aṅụrị ọṅụ nʼihi ihe ike dakwasịrị ha aghaghị ịta ahụhụ.
6 Bakitani bazali motole ya bakoko, mpe baboti bazali lokumu ya bana.
Ụmụ ụmụ bụ okpueze ndị okenye. Nne na nna bụ ịnya isi nke ụmụ ha.
7 Ndenge maloba ya lokumu ebongi te mpo na moto mabe, ndenge mpe maloba ya lokuta ebongi te mpo na mokonzi.
Egbugbere ọnụ na-ekwu okwu dị mma abụghị nke onye nzuzu, otu a kwa, egbugbere ọnụ na-agha ụgha ekwesighị ịbụ nke onye na-achị achị.
8 Kanyaka ezalaka lokola kisi na miso ya moto oyo azali na yango; alongaka na esika nyonso oyo akendaka.
Nʼanya onye na-enye ngarị ọ na-ahụta ya dịka ọgwụ ịrata mmadụ, ha na-eche nʼebe ọbụla ha chere ihu ihe ga-aga nke ọma.
9 Moto oyo abombaka mabe alukaka bolingo, kasi moto oyo azongelaka yango tango nyonso akabolaka bato oyo balingani.
Onye ọbụla na-akwado ịhụnanya na-ekpuchi njehie, ma onye na-ekwu ihe mere mgbe na mgbe na-ekewa ezi enyi.
10 Pamela ezalaka na litomba mpo na moto ya mayele, kasi kobeta zoba bafimbu nkama moko ezalaka na litomba te.
Ịba mba ntakịrị a baara onye nwere nghọta bara uru karịa narị ụtarị nke a pịara onye nzuzu.
11 Moto mabe alukaka kaka kotomboka, kasi bakotindela ye ntoma ya motema mabe mpo na kotelemela ye.
Onye ọjọọ na-ebi naanị ndụ nnupu isi megide Chineke. Ọ bụkwa onyeozi nke ọnwụ ka a ga-eziga imegide ya.
12 Kokutana na ngombolo oyo babotoli bana ezali malamu koleka kokutana na zoba oyo azali kati na bolema.
Ọ ka mma izute nne Bịa a napụrụ ụmụ ya karịa izute onye nzuzu uche ya gbagọrọ agbagọ.
13 Pasi etikaka ata moke te ndako ya moto oyo azongisaka mabe mpo na malamu.
Ọ bụrụ na i jiri ihe ọjọọ kwụọ ụgwọ ihe ọma, ọbụbụ ọnụ dịrị ezinaụlọ gị.
14 Kobanda koswana ezali lokola kofungola nzela ya mayi; tika na yo liboso ete kobendana ekoma makasi.
Esemokwu malite ọ na-esi ike imedo ya, nʼihi ya ekwela ka ọ malite.
15 Moto oyo alongisaka bato mabe mpe moto oyo akweyisaka bato ya sembo bazali, bango mibale, nkele na miso ya Yawe.
Onye na-asị onye ikpe maara na ikpe amaghị ya na-amakwa onye aka ya dị ọcha ikpe, Onyenwe anyị na-akpọ omume abụọ a asị.
16 Mpo na nini mbongo ezala na maboko ya zoba? Mpo ete asomba bwanya wana azali na posa na yango te!
Uru gịnị ka ego bara nʼaka onye nzuzu; ebe ọ bụ na o nweghị ike ịchọ amamihe.
17 Molingami alingaka tango nyonso, mpe akomaka ndeko na tango ya pasi.
Ezi enyi na-egosi ịhụnanya ya nʼoge ọbụla. Otu a kwa, nwanne na-aba uru nʼoge mkpa.
18 Moto oyo azangi mayele abetaka tolo mpo na kondima baniongo ya mopaya.
Ọ bụ uche ezughị oke ịnara ụgwọ onye ọzọ ji, si otu a ghọọ onye ji ụgwọ.
19 Moto oyo alingaka koswana alingaka masumu; moto oyo atongaka ekuke na ye na likolo amilukelaka kokweya.
Onye na-ahụ esemokwu nʼanya hụrụ mmehie nʼanya. Onye na-ewuli ọnụ ụzọ ama ya elu na-akpọ ntipịa oku.
20 Moto ya motema mabe abongaka te, mpe moto ya lolemo ya lokuta akomona pasi.
Ọ dịghị aga nʼihu bụ onye obi ya gbagọrọ agbagọ. Onye nwere ire nrafu ga-adanye na nsogbu.
21 Kozala na mwana ya zoba esalaka pasi na motema, mpe tata ya moto ya liboma akotikala kozala na esengo te.
Ọ bụ naanị iru ụjụ na obi ọjọọ dịịrị nna nke nwa ya na-eme ihe nzuzu.
22 Motema ya esengo ebikisaka nzoto, kasi motema oyo etutami ebukaka mikuwa.
Obi nke na-aṅụrị ọṅụ na-eme ka ahụ sie ike, ma mmụọ na-eru ụjụ oge niile na-akpata ọrịa.
23 Moto mabe azwaka kanyaka na nkuku mpo na kobebisa nzela ya bosembo.
Onye ajọ omume na-anara ihe ngarị na nzuzo ka ọ sụgharịa ikpe ziri ezi isi.
24 Bwanya emonanaka na elongi ya moto ya mayele, kasi miso ya zoba ekendaka kino na suka ya mokili.
Onye nwere nghọta na-eche uche amamihe nʼihe ọ na-eme, ma anya onye nzuzu na-elegharị ruo na nsọtụ nke ụwa.
25 Mwana oyo azangi mayele apesaka tata na ye mawa, mpe ayokisaka mama na ye pasi na motema.
Nwa dị nzuzu na-ewetara nna ya mwute, bụrụkwa nne mụrụ ya ihe ilu.
26 Ezali malamu te kopesa moto ya sembo etumbu, mpe ezali malamu te kobeta bato ya lokumu na miso ya bosembo.
Ọ bụrụ na ịra onye ezi omume nra adịghị mma, nʼezie, ịpịa ndị ọrụ ihe nʼihi ezi ọrụ ha ezighị ezi.
27 Moto oyo abatelaka monoko na ye azali na boyebi; moto oyo alengaka-lengaka te azali mayele.
Nwoke ahụ na-adịghị ekwu ọtụtụ okwu bụ onye maara ihe, onye mmụọ ya dịkwa jụụ bụ onye nwere nghọta.
28 Ezala moto ya liboma, soki avandi kimia, amonanaka lokola moto ya bwanya; moto oyo akangaka monoko na ye amonanaka lokola moto ya mayele.
A ga-agụ onye nzuzu nʼonye maara ihe ma ọ bụrụ na ha gba nkịtị, gụọkwa ha na ndị nwere nghọta ma ọ bụrụ na ha e jide ire ha.

< Masese 17 >