< Masese 12 >

1 Moto oyo alingaka koyekola alingaka boyebi, kasi moto oyo aboyaka pamela azali zoba.
Onye ọbụla na-ahụ ịdọ aka na ntị nʼanya na-ahụ ihe ọmụma nʼanya, ma onye na-akpọ ịba mba asị bụ onye na-enweghị ụbụrụ isi.
2 Moto ya malamu azwaka ngolu na miso ya Yawe, kasi Nzambe akatelaka moto ya mayele mabe etumbu.
Ezi mmadụ na-anata ihuọma site nʼaka Onyenwe anyị, ma onye na-atụpụta atụmatụ ọjọọ ka ọ na-ama ikpe.
3 Motema mabe elendisaka moto te; mosisa ya bato ya sembo ekatanaka te.
Onye ajọ omume agaghị anọgide, ma apụghị ihopu onye ezi omume.
4 Mwasi ya malamu azali motole ya mobali na ye, kasi mwasi oyo ayokisaka soni azali lokola bokono oyo ezali kolia mikuwa.
Ezi nwanyị bụ ọṅụ na okpueze di ya, ma nwanyị na-eweta ihere dịka ire ure nʼọkpụkpụ di ya.
5 Mabongisi ya bayengebene ezalaka ya sembo, kasi makanisi ya bato mabe ezalaka kaka lokuta.
Echiche obi niile nke onye ezi omume bụ ihe ziri ezi, ma ndụmọdụ onye ajọ omume jupụtara nʼaghụghọ.
6 Maloba ya bato mabe ezali mitambo mpo na kosopa makila, kasi maloba ya bayengebene ebikisaka bango.
Okwu niile nke ndị ajọ omume bụ ihe na-eweta ọnwụ, ma okwu ndị omume ha ziri ezi na-anapụta ha.
7 Bato mabe bakokweyisama mpe bakozala lisusu te, kasi ndako ya bayengebene ekowumela seko.
Ndị na-emebi iwu ga-ala nʼiyi, ma ndị ezi omume ga-eguzosi ike.
8 Bwanya epesaka moto lokumu, kasi motema mabe ememaka kotiolama.
Onye nwere uche zuruoke ka mmadụ niile na-achọ, ma onye uche ya gbagọrọ agbagọ ka mmadụ na-eleda anya.
9 Eleki malamu kozala moto pamba mpe kozala na mosali, na esika ya komimona moto monene mpe kozanga bilei.
Ọ ka mma ịbụ onye a na-elelị anya ma i nwere ohu, karịa ịbụ onye a na-asọpụrụ ma bụrụ onye nri na-adịghị nʼụlọ ya.
10 Moto ya sembo ayebaka ata baposa ya bibwele na ye, kasi motema ya moto mabe eyokaka mawa te.
Onye ezi omume na-elekọta anụ ụlọ ya, ma obi ebere kachasị nro nke onye ajọ omume mere bụ enweghị obi ebere.
11 Moto oyo asalaka bilanga atondaka na bilei, kasi moto oyo alandaka bagoyigoyi azangi mayele.
Onye na-arụ ala ubi ya ga-enwe nri nʼebe ọ bara ụba, ma onye na-agbaso ihe efu dị iche iche, amamihe kọrọ.
12 Moto mabe alingaka misuni ya bato mabe, kasi mosisa ya bayengebene ebotaka mingi.
Ndị ajọ omume na-enwekwa anya ukwu nʼihe ndị ajọ omume ibe ha nwere, ma mgbọrọgwụ nke ndị ezi omume ga-eto eto.
13 Moto ya misala mabe akangamaka na motambo ya maloba na ye ya lokuta, kasi moyengebene akobika kati na pasi.
A na-ejide onye ajọ omume site nʼokwu ọnụ ya, ma onye ezi omume na-esi na nsogbu wezuga onwe ya.
14 Na nzela ya mbuma ya monoko na ye, moto akotondisama na bolamu; mpe moto akozwa lifuti ya misala ya maboko na ye.
Ikwu eziokwu na-enye mmadụ obi ụtọ, inwe mgbalị na-ewetara ya ngọzị.
15 Nzela ya moto oyo azangi mayele emonanaka alima na miso na ye, kasi moto oyo ayokaka toli azali moto ya bwanya.
Ụzọ ndị nzuzu nʼuche ha onwe ha ziri ezi, ma onye maara ihe na-aṅa ntị nye ndụmọdụ.
16 Kotomboka ya moto oyo azangi mayele eyebanaka kaka mokolo wana, kasi moto ya mayele abombaka soni na ye.
Ndị nzuzu na-egosipụta iwe ha ọsịịsọ, ma onye nwere uche na-elepụrụ mkparị anya.
17 Motatoli ya malamu apesaka matatoli ya solo, kasi motatoli ya mabe apesaka matatoli ya lokuta.
Ezi onye akaebe na-ekwu eziokwu, ma ajọ onye akaebe na-ekwu okwu ụgha.
18 Maloba ya bato oyo balobaka mingi ezokisaka lokola mopanga, kasi lolemo ya bato ya bwanya ezali lokola mafuta oyo ebikisaka.
Okwu ọjọọ na-agbawa obi dịka mma agha, ma ire onye maara ihe na-eweta ọgwụgwọ.
19 Moto oyo alobaka solo akowumela mpo na libela, kasi mokosi akowumela kaka mpo na tango moke.
Eziokwu na-eguzo ruo mgbe ebighị ebi, ma okwu ụgha anaghị adịgide.
20 Lokuta ezalaka kati na mitema ya bato oyo basalaka mabongisi ya mabe, kasi esengo ezali mpo na bato oyo bakopesaka batoli ya kimia.
Aghụghọ na-ejupụta nʼobi na-eche ihe ọjọọ; ma ndị na-eme ka udo dị na-enwe ọṅụ.
21 Mabe moko te ekokomela bayengebene, kasi bato mabe bakotondisama na pasi.
Ihe ọjọọ anaghị adakwasị onye ezi omume, ma ndị ajọ omume enwetala nsogbu ebe ọ dị ukwuu.
22 Bibebu oyo ekosaka ezali nkele na miso ya Yawe, kasi bibebu oyo ekokisaka bosembo ezalaka elengi na miso na Ye.
Onyenwe anyị kpọrọ egbugbere ọnụ nʼagha ụgha asị, ma ihe ndị kwesiri ntụkwasị obi na-amasị ya.
23 Moto ya mayele abombaka boyebi, kasi motema ya zoba etatolaka makambo ya bozoba.
Onye nwere uche na-edebe ihe ọmụma ha nye onwe ha, ma onye nzuzu na-agbasa enweghị uche ya nʼanwụ.
24 Maboko oyo esalaka ezwaka bokonzi, kasi maboko ya goyigoyi ememaka na bowumbu.
Aka na-arụsị ọrụ ike ga-achị achị, ma umengwụ ga-akwụsị naanị nʼọrụ mmanye.
25 Motema oyo etondi na komitungisa ekobuka moto, kasi liloba ya esengo esepelisaka moto.
Obi nke jupụtara na nchegbu na-ada mba, ma okwu ọma na-eme ka obi ṅụrịa.
26 Moyengebene alakisaka baninga na ye nzela, kasi nzela ya moto mabe ebungisaka ye moko moto mabe.
Onye ezi omume na-eduzi onye agbataobi ya, ma onye na-emebi iwu na-eduhie ha.
27 Moto ya goyigoyi azangaka bilei, mpe moto ya nzunzu akomaka mozwi monene.
Onye umengwụ adịghị ahụ anụ ọ chụtara na nta nʼọkụ, ma ndị na-arụsị ọrụ ike na-eri site nʼakụ ha nwetara nʼịchụ nta.
28 Bomoi ezalaka kati na nzela ya bosembo, mpe kufa ezalaka te kati na nzela ya bosembo.
Ụzọ nke onye ezi omume na-eduba na ndụ, nʼụzọ ahụ, ọnwụ adịghị ya.

< Masese 12 >