< Mitango 20 >

1 Na sanza ya liboso, lisanga mobimba ya Isalaele ekomaki na esobe ya Tsini mpe bavandaki na Kadeshi. Ezalaki kuna nde Miriami akufaki mpe bakundaki ye.
Ụmụ Izrel, bụ nzukọ ahụ niile rutere nʼọzara Zin nʼọnwa nke mbụ. Ha manyere ụlọ ha na Kadesh. Ọ bụkwa nʼebe ahụ ka Miriam nwụrụ. E lie ya.
2 Nzokande esika yango ezalaki na mayi ya komela te mpo na lisanga ya Isalaele, mpe bato basanganaki mpo na kotombokela Moyize mpe Aron.
Ma mmiri ọṅụṅụ adịghị nye ndị nzukọ ahụ. Ya mere na ha gbakọtara imegide Mosis na Erọn.
3 Baswanisaki Moyize mpe balobaki: « Elingaki kozala malamu soki tokufaki na biso tango bandeko na biso bakufaki liboso ya Yawe!
Ha sesịrị Mosis okwu sị, “Ọ gaara akara anyị mma ma a sị na anyị nwụrụ mgbe ụmụnna anyị nwụrụ nʼihu Onyenwe anyị.
4 Mpo na nini omemaki lisanga ya Yawe na esobe oyo? Ezali mpo ete biso mpe bibwele na biso tokufa awa?
Gịnị mere i ji kpọbata ọgbakọ nke Onyenwe anyị nʼime ọzara a, ime ka anyị na anụ ụlọ anyị niile nwụọ nʼebe a?
5 Mpo na nini obimisaki biso na Ejipito mpe omemi biso na esika oyo ya pasi, esika oyo bakoki kutu kolona ata eloko moko te, esika oyo ezanga ata mbuma ya figi to ya vino to mpe ya grenade, esika oyo ezanga kutu ata mayi ya komela? »
Gịnị mere i ji si nʼala Ijipt kpọpụta anyị, kpọbata anyị nʼebe ọjọọ a? O nweghị mkpụrụ ọghịgha maọbụ fiig, enweghị mkpụrụ vaịnị maọbụ mkpụrụ pomegranet. Ọ dịghị mmiri dị nke ha ga-aṅụ.”
6 Moyize mpe Aron babimaki kati ya lingomba mpe bakendeki na ekuke ya Ndako ya kapo ya Bokutani, bakweyaki elongi kino na mabele, mpe nkembo ya Yawe ebimelaki bango.
Mosis na Erọn si nʼebe ọgbakọ ahụ nọ tụgharịa gaa nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute, daa kpụọ ihu ha nʼala. E mee ka ha hụ ebube Onyenwe anyị anya.
7 Yawe alobaki na Moyize:
Onyenwe anyị gwara Mosis sị,
8 « Zwa lingenda na yo; bongo elongo na Aron, ndeko na yo ya mobali, bosangisa lisanga mobimba esika moko. Boloba na libanga wana na miso na bango, mpe ekobimisa mayi wuta na yango. Okobimisa mayi na libanga mpo ete bato ya lisanga mobimba bakoka komela elongo na bibwele na bango. »
“Were mkpara ahụ, gị na nwanne gị Erọn kpọkọta nzukọ Izrel niile. Gwa nkume ahụ okwu nʼihu ha, ọ ga-asọpụta mmiri ya. Unu ga-eme ka mmiri si na nkume ahụ sọpụta nye ọgbakọ ahụ, ka ha na igwe anụ ụlọ ha, ṅụọ mmiri.”
9 Moyize azwaki lingenda oyo ezalaki liboso ya Yawe, ndenge kaka Yawe atindaki ye.
Ya mere Mosis sitere nʼihu Onyenwe anyị weere mkpara ahụ dịka iwu Onyenwe anyị nyere ya si dị.
10 Ye mpe Aron basangisaki lisanga ya bato esika moko liboso ya libanga, mpe Moyize alobaki na bango: « Boyoka, bino batomboki, tokoki kobimisela bino mayi na libanga oyo? »
Emesịa, Mosis na Erọn kpọkọtara ụmụ Izrel niile nʼihu nkume ahụ. Mgbe ha bịaruru nso, Mosis gwara ha okwu sị ha, “Geenụ ntị unu ndị nnupu isi! Ọ bụ site na nkume a ka anyị ga-enye unu mmiri?”
11 Moyize atombolaki loboko na ye mpe abetaki lingenda na ye na libanga mbala mibale. Mayi ebimaki; bongo lisanga mobimba elongo na bibwele na bango bamelaki.
Mgbe ahụ Mosis weliri aka ya elu jiri mkpara ahụ tie nkume ahụ ugboro abụọ. Mmiri sitere na ya sọpụta. Ọgbakọ Izrel niile na igwe anụ ụlọ ha ṅụkwara mmiri.
12 Kasi Yawe alobaki na Moyize mpe Aron: « Lokola bondimeli Ngai te mpe bopesi lokumu na bosantu na Ngai te na miso ya bana ya Isalaele, bokokotisa lisusu lingomba oyo te na mokili oyo napesi bango. »
Ma Onyenwe anyị gwara Mosis na Erọn okwu sị, “Ebe ọ bụ na unu jụrụ ikwenye nʼokwu m, jụkwa ido m nsọ nʼihu ndị Izrel niile, unu agaghị edubata ọgbakọ ndị a nʼala ahụ m na-aga inye ha.”
13 Ezalaki mayi ya Meriba epai wapi bana ya Isalaele baswanaki na Yawe, mpe epai wapi Yawe alakisaki bosantu na Ye kati na bango.
A kpọrọ ebe ahụ mmiri Meriba, nʼihi na ọ bụ nʼebe ahụ ka Izrel wesoro Onyenwe anyị iwe. O gosikwara ha ịdị nsọ ya.
14 Wuta na Kadeshi, Moyize atindaki bantoma epai ya mokonzi ya Edomi mpe alobaki: — Tala maloba oyo ndeko na yo, Isalaele, alobi: « Oyebi pasi nyonso oyo ekomelaki biso.
Mosis sitere nʼọzara Kadesh, zipụ ndị ozi ka ha gakwuru eze Edọm, sị ya, “Otu a ka nwanne gị bụ Izrel na-ekwu: Ị nụla akụkọ ihe nhụju anya niile dakwasịrị anyị.
15 Bakoko na biso bakendeki na Ejipito mpe tokomaki kovanda kuna mibu ebele. Bato ya Ejipito banyokolaki biso elongo na bakoko na biso;
Nna anyị gara biri nʼala Ijipt. Anyị biri nʼebe ahụ ọtụtụ afọ. Ndị Ijipt mekpara anyị na nna nna anyị ha ahụ.
16 kasi tango togangaki epai na Yawe, ayokaki kolela na biso, atindelaki biso anjelu oyo abimisaki biso na Ejipito. Sik’oyo tozali awa na kadeshi, engumba oyo ezali na suka ya mokili na yo.
Ma mgbe anyị tikuru Onyenwe anyị mkpu akwa, ọ nụrụ akwa anyị, zitere anyị mmụọ ozi ya, onye dupụtara anyị site nʼala Ijipt. “Ugbu a, anyị nọ na Kadesh obodo dị nso nʼoke ala gị.
17 Tobondeli yo, tika biso tolekela na mboka na yo. Tokokota na elanga to na elanga ya vino moko te mpe tokomela mayi ya mabulu na bino te. Tokotambola kaka pembeni-pembeni ya nzela ya monene ya mokonzi bongo, tokokatisa ezala na ngambo ya loboko ya mobali to ya mwasi te, kino tokosilisa kokatisa mokili na yo. »
Biko kwere ka anyị si nʼala gị gafee. Anyị ga-akpachara anya hụ na anyị esiteghị nʼubi ihe ọkụkụ gị maọbụ nʼubi vaịnị gị gafee. Anyị agaghị aṅụ mmiri ọbụla site nʼolulu mmiri gị. Anyị ga-anọgide naanị nʼokporoụzọ eze. Anyị agaghị ahapụ ya, chee ihu akụkụ aka nri maọbụ aka ekpe, tutu ruo mgbe anyị gafechara oke ala gị.”
18 Kasi mokonzi ya Edomi azongiselaki ye: — Okoki kolekela na mokili na ngai te; soki omeki, tokobimela bino mpe tokobundisa bino na mopanga.
Ma eze Edọm zara sị, “Unu amanyela ụkwụ; ọ bụrụ na unu anwaa anwa bata nʼala m, aga m eji ndị agha m zute unu.”
19 Bana ya Isalaele bazongiselaki ye: — Tokotambola kaka pembeni-pembeni ya nzela ya monene mpe soki biso to bibwele na biso tomeli mayi na bino, tokofuta yango. Tolingi kaka eloko moko, eloko mosusu te: toleka kaka na makolo.
Ma ndị Izrel zara ozi o ziri sị ya, “Ọ bụ naanị nʼokporoụzọ ka anyị ga-esi gafee. Ọ bụrụ na anyị maọbụ anụ ụlọ anyị a ṅụọ mmiri dị nʼala gị, anyị ga-akwụ ọnụahịa ya. Naanị mkpa anyị bụ ịgafe. Ọ dịghị ihe ọzọ anyị chọrọ.”
20 Azongiselaki bango lisusu: — Bokoki kolekela awa te. Boye, bato ya Edomi babimelaki bango na mampinga monene ya basoda mpo na kobundisa bana ya Isalaele.
Ma eze Edọm aṅaghị ntị, ọ gwaghere ha ọnụ sị, “Unu agaghị esite nʼala gabiga.” Edọm chịkọtara ọtụtụ ndị agha dị ike duru ha pụọ ịga izute ha.
21 Lokola Edomi eboyaki ete bana ya Isalaele balekela na etuka na yango, bana ya Isalaele bazwaki nzela mosusu.
Ebe ọ bụ na ndị Edọm ekweghị ka ndị Izrel si nʼoke ala ha gafee, ndị Izrel tụgharịrị azụ hapụ isi ụzọ ahụ.
22 Lisanga mobimba ya Isalaele babimaki wuta na Kadeshi mpe bakomaki kino na ngomba Ori.
Ọgbakọ Izrel niile sitere na Kadesh bulie ije gagide rute nʼugwu Hor.
23 Bongo, Yawe alobaki na Moyize mpe Aron na ngomba Ori, pembeni ya mondelo ya Edomi:
Nʼugwu Hor, nʼoke ala Edọm, Onyenwe anyị gwara Mosis na Erọn okwu sị ha,
24 « Aron alingi kokende kokutana na bakoko na ye, pamba te akokota te na mokili oyo napesi bana ya Isalaele, mpo ete bino mibale botombokelaki mitindo na Ngai na mayi ya Meriba.
“Oge eruola mgbe Erọn ga-anwụ. Ọ gaghị abanye nʼala ahụ m nyere ụmụ Izrel, nʼihi na unu abụọ nupuru isi nʼiwu m na mmiri Meriba.
25 Kamata Aron na Eleazari, mwana na ye ya mobali mpe mema bango likolo ya ngomba Ori.
Ugbu a, kpọrọ Erọn na nwa ya nwoke Elieza, duru ha gaa nʼugwu Hor.
26 Longola Aron bilamba na ye mpe latisa yango Eleazari, mwana na ye ya mobali, pamba te Aron alingi kokende kokutana na bakoko na ye, akokufa kuna. »
Nʼebe ahụ ka ị ga-eyipụ Erọn uwe onye nchụaja o yi, yikwasị ha Elieza nwa ya nwoke. Ọ bụkwa nʼebe ahụ ka Erọn ga-anọ nwụọ.”
27 Moyize asalaki ndenge kaka Yawe atindaki: bamataki likolo ya ngomba Ori na miso ya lisanga mobimba.
Ya mere Mosis mere dịka Onyenwe anyị nyere ya iwu. Ha atọ rigoro nʼugwu Hor mgbe nzukọ Izrel niile nọ na-ele ha anya.
28 Moyize alongolaki Aron bilamba mpe alatisaki yango Eleazari, mwana na ye ya mobali. Mpe Aron akufa kuna na likolo ya ngomba. Boye, Moyize mpe Eleazari bakitaki ngomba;
Mgbe ha ruru nʼelu ugwu ahụ, Mosis yipụrụ Erọn uwe onye nchụaja ya yikwasị ha nwa ya nwoke Elieza. Erọn nọkwa nʼebe ahụ, nʼelu ugwu ahụ nwụọ. Emesịa, Mosis na Elieza tụgharịrị site nʼugwu ahụ lọghachi.
29 mpe tango lingomba mobimba eyokaki sango ete Aron asilaki kokufa, bato nyonso ya Isalaele basalelaki ye matanga ya mikolo tuku misato.
Mgbe ọgbakọ Izrel nụrụ ihe banyere ọnwụ Erọn ha ruru ụjụ nʼihi ya iri ụbọchị atọ.

< Mitango 20 >