< Mitango 16 >

1 Molevi Kore, mwana mobali ya Yitseari, ya libota ya bato ya Keati, elongo na bato misato ya libota ya bato ya Ribeni basalelaki Moyize likita; ezalaki: Datani mpe Abirami, bana mibali ya Eliabi, elongo na Oni, mwana mobali ya Peleti.
Ugbu a, Kora nwa Izha, nwa Kohat, nwa Livayị, na ụfọdụ ndị agbụrụ Ruben bụ Datan, na Abiram ụmụ Eliab, na On, nwa Pelet nupuru isi
2 Batombokelaki Moyize. Elongo na bango, ezalaki na bana ya Isalaele nkama mibale na tuku mitano oyo bayebanaki malamu lokola bakambi ya lisanga mpe bazalaki kosangana kati na mayangani ya bakambi ya lisanga.
bilie imegide Mosis. Ndị so ha bụ narị ndị ikom abụọ na iri ise, ndị ndu a maara nke ọma, ndị so nọdụ nʼụlọ nzukọ ukwuu ndị Izrel.
3 Bayaki lisanga mpo na kotelemela Moyize mpe Aron. Balobaki na bango: — Bino mpe bolekisi! Lingomba mobimba ezali bule mpe moto nyonso kati na yango azali bule, mpe Yawe azali elongo na bango. Boye, mpo na nini bozali komitia likolo ya lisanga ya Yawe?
Ha kpọrọ ọgbakọ imegide Mosis na Erọn sị ha, “Omume unu agafeela oke! Ọgbakọ Izrel dị nsọ, onye ọbụla nʼime ha kwa. Onyenwe anyị nọnyeere ha. Gịnị mere unu ji ebuli onwe unu elu karịa ọgbakọ Onyenwe anyị?”
4 Tango Moyize ayokaki bongo, akweyaki elongi kino na mabele.
Mgbe Mosis nụrụ ihe ndị a ha kwuru, ọ dara nʼala kpuo ihu ya nʼala.
5 Alobaki na Kore mpe na bato na ye nyonso oyo balandaki ye: — Lobi na tongo, Yawe akolakisa nani azali moto na Ye mpe nani oyo azali bule, mpe akotika ye kopusana pene na Ye; akotika solo moponami na Ye kopusana pene na Ye.
Mgbe ahụ, ọ gwara Kora na ndị niile sonyeere ya, sị, “Nʼụtụtụ echi, Onyenwe anyị ga-eme ka amara ndị bụ ndị ya na onye dị nsọ. Ọ ga-eme ka onye ahụ bịaruo ya nso. Onye ọ ga-ahọpụta ka ọ ga-emekwa ka ọ bịaruo ya nso.
6 Yo, Kore, elongo na bato nyonso oyo bazali kolanda yo, bokosala likambo oyo: Bokamata bambabola oyo batumbelaka malasi
Lee ihe ị ga-eme, Echi gị onwe gị Kora, na ndị niile nọnyeere gị, chịrịnụ ihe ịgụ ọkụ,
7 mpe, lobi, botia moto mpe malasi ya ansa kati na yango liboso ya Yawe. Moto oyo Yawe akopona, ye nde azali bule. Bino Balevi, bino mpe bolekisi!
mụnye ha ọkụ. Tinyekwanụ ụda na-esi isi ụtọ nʼime ha, were ha bịa nʼihu Onyenwe anyị. Onye ahụ Onyenwe anyị họpụtara ga-abụ onye ahụ dị nsọ. O zuorola unu, unu ụmụ Livayị!”
8 Moyize alobaki lisusu na Kore: — Bino Balevi, boyoka sik’oyo!
Mgbe ahụ, Mosis gwakwara Kora okwu ọzọ sị ya, “Ugbu a, geenụ ntị, unu ndị Livayị!
9 Ekoki na bino te ete Nzambe ya Isalaele atia bino pembeni kati na lisanga ya Isalaele mpe abenda bino pembeni na Ye mpo na kosala mosala na Mongombo ya Yawe mpe kotelema liboso ya lisanga mpo na kosalela bango?
Ọ bụ ihe dị nta nʼanya unu na Chineke nke Izrel kewapụtara unu site na nzukọ ndị Izrel niile, mee ka unu bịaruo ya nso, nʼihi ije ozi nʼụlọ nzute Onyenwe anyị, nakwa iguzo nʼihu nzukọ Izrel niile ijere ha ozi?
10 Abendaki bino pembeni na Ye elongo na Balevi nyonso oyo bazali kolanda bino; kasi sik’oyo, bazali lisusu koluka kozwa bonganga-Nzambe!
Ọ kpọbatala gị na ndị Livayị ibe gị nso ebe ọ nọ. Ugbu a, unu na-achọkwa ọrụ nchụaja?
11 Ezali Yawe nde bosalelaki likita, yo elongo na bato oyo bazali kolanda yo. Aron nde nani mpo ete bokoka koyimayima na tina na ye?
Ọ bụ Onyenwe anyị ka gị na ndị sonyeere gị gbara izu megide. Onye ka Erọn bụ unu ji atamu ntamu megide ya?”
12 Mpe na sima, Moyize abengisaki Datani mpe Abirami, bana mibali ya Eliabi. Kasi bazongisaki: — Tokoya te!
Mgbe ahụ, Mosis ziri ozi ka a kpọọ Datan na Abiram, ụmụ ndị ikom Eliab, ma ha sịrị, “Anyị agaghị abịa.
13 Ekoki kaka te mpo na yo kobimisa biso na mokili oyo ezali kobimisa miliki mpe mafuta ya nzoyi, mpo na koya kobomisa biso kati na esobe? Sik’oyo olingi lisusu kokoma mokonzi na biso?
Ọ bụ na o zurughị gị na i si nʼala Ijipt ebe mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru kpọpụta anyị igbuchapụ anyị nʼọzara a? Ugbu a ị chọkwara ime onwe gị onyenwe anyị?
14 Te, okotisi biso kutu te na mokili oyo ezali kobimisa miliki mpe mafuta ya nzoyi to opesi biso ata libula moko te ya bilanga to ya bilanga ya vino. Boni, okanisi ete bato oyo bakufa miso? Te, tokoya te!
Nke kachasị nke, ị kpọbatabeghị anyị nʼala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya. I nyebeghị anyị ihe nketa ala ubi na ubi vaịnị. Ị chọrọ ịghụpụsị ndị ikom ndị a mkpụrụ anya? Anyị agaghị abịa!”
15 Moyize asilikaki makasi mpe alobaki na Yawe: — Kondima makabo na bango te. Nazwaki ata eloko moko te epai na bango, ezala ane; mpe nasalaki ata moto moko te mabe kati na bango.
Mgbe ahụ, oke iwe were Mosis. Ọ kpọkuru Onyenwe anyị sị ya, “Anabatakwala aja ha niile! Ọ dịbeghị oge m naara ha ihe ọbụla, ọbụladị otu ịnyịnya ibu! O nwekwaghị onye ọbụla nʼime ha m mejọrọ.”
16 Moyize alobaki na Kore: — Lobi, yo mpe bato nyonso oyo bazali kolanda yo, bokotelema elongo na Aron liboso ya Yawe.
Mgbe ahụ, Mosis sịrị Kora, “Echi, gị na ndị na-esonyere gị ga-apụta bịa nʼihu Onyenwe anyị. Erọn ga-abịakwa.
17 Moko na moko akokamata mbabola na ye, oyo batumbelaka malasi, bongo akotia malasi ya ansa kati na yango mpe akomema yango liboso ya Yawe. Bambabola nyonso ekozala nkama mibale na tuku mitano; yo mpe elongo na Aron bokomema bambabola na bino.
Nwoke ọbụla ga-eweta ihe ịgụ ọkụ nke ya, tinye ya ụda na-esi isi ụtọ, chee ha nʼihu Onyenwe anyị. Ha niile dị ihe ịgụ ọkụ narị abụọ na iri ise. Gị na Erọn ga-ejikwa nke unu bịa.”
18 Moto na moto akamataki mbabola na ye, atiaki moto mpe malasi ya ansa kati na yango; bongo atelemaki esika moko na Moyize mpe Aron, na ekotelo ya Ndako ya kapo ya Bokutani.
Ya mere, nwoke ọbụla wetara ihe ịgụ ọkụ nke ya, mụnye ya ọkụ, ma tinye ya ụda na-esi isi ụtọ. Ha niile guzoro nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute ahụ, ha na Mosis na Erọn.
19 Tango Kore asangisaki bato nyonso oyo bazalaki kolanda ye mpo na kotelemela Moyize mpe Aron, na ekotelo ya Ndako ya kapo ya Bokutani, nkembo ya Yawe ebimelaki lisanga mobimba,
Mgbe Kora kpọkọtara ndị na-eso ya imegide Mosis na Erọn nʼihu ọnụ ụzọ ụlọ nzute, ebube Onyenwe anyị pụtara ihe nye ọgbakọ Izrel niile.
20 mpe Yawe alobaki na Moyize mpe Aron:
Onyenwe anyị gwara Mosis na Erọn okwu sị,
21 — Bokabwana na lisanga ya bato oyo mpo ete nalingi kosilisa bango kaka na mbala moko.
“Sitenụ nʼetiti ọgbakọ ndị a pụọ, ka m bibie ha nʼotu ntabi anya.”
22 Kasi Moyize mpe Aron bakweyaki bilongi kino na mabele mpe bagangaki: — Eh Nzambe ya milimo nyonso ya bato! Okosilikela lisanga mobimba likolo ya lisumu ya moto moko kaka?
Ma Mosis na Erọn dara kpuo ihu nʼala nʼihu Onyenwe anyị rịọọ ya sị, “O Chineke, gị bụ Chineke nwe ndụ mmadụ niile, ị ga-ewe iwe megide nzukọ niile nʼihi mmehie otu onye?”
23 Bongo, Yawe alobaki na Moyize:
Ma Onyenwe anyị zara Mosis sị ya,
24 — Loba na lisanga ete bakende mosika ya bandako ya kapo ya Kore, ya Datani mpe ya Abirami.
“Gwa nzukọ Izrel niile sị ha, ‘Wezuganụ onwe unu site nʼụlọ ikwu Kora, Datan na Abiram.’”
25 Moyize atelemaki mpe akendeki epai ya Datani mpe Abirami; mpe bakambi nyonso ya Isalaele balandaki ye.
Mosis biliri jekwuru Datan na Abiram, ndị okenye Izrel sokwa Mosis.
26 Akebisaki lisanga mobimba: « Bozala mosika ya bandako ya kapo ya bato oyo ya mabe. Bosimba ata eloko moko te ya bango, noki te bokokufa likolo ya masumu na bango! »
Mgbe Mosis ruru nʼebe ahụ, ọ dọrọ nzukọ Izrel aka na ntị sị, “Ngwa, sinụ nʼụlọ ndị ọjọọ a wezuga onwe unu. Unu ebitụkwala ihe ọbụla bụ nke ha aka. Ma ọ bụghị otu a, a ga-agụnyekọ unu na mmehie ha, lakọọ unu na ha nʼiyi.”
27 Boye bakendeki mosika ya bandako ya kapo ya Kore, ya Datani mpe ya Abirami. Datani mpe Abirami elongo na basi, bana mpe bakoko na bango babimaki libanda mpe bakendeki kotelema liboso ya bikotelo ya bandako na bango ya kapo.
Ya mere mmadụ niile wezugara onwe ha site nʼọmụma ụlọ ikwu Kora, na Datan na Abiram. Ma Datan na Abiram pụtara guzoro nʼọnụ ụzọ ụlọ ikwu ha, ha onwe ha na ndị nwunye ha niile, na ụmụ ha niile, na ụmụntakịrị ha niile.
28 Bongo Moyize alobaki: « Tala ndenge nini bokoyeba solo ete Yawe atindaki ngai kosala makambo oyo nyonso, kasi ezali makanisi ya motema na ngai moko te:
Mgbe ahụ, Mosis kwuru sị, “Ugbu a ka unu ga-amata na ọ bụ Onyenwe anyị zitere m ime ihe ndị a niile m mere. Nʼihi na-emeghị m ha site nʼuche nke onwe m.
29 Soki bato oyo bakufi kufa ya bato nyonso mpe bamoni makambo oyo bato nyonso bamonaka, wana nde Yawe atindaki ngai te!
Ọ bụrụ na ndị ikom ndị a anwụọ ọnwụ chi ha, bụ ụdị nleta nke dịrị mmadụ ọbụla, mgbe ahụ, matanụ na ọ bụghị Onyenwe anyị zitere m.
30 Kasi soki Yawe asali penza likambo moko ya sika, bongo mabele efungoli monoko na yango mpe emeli bango elongo na biloko na bango nyonso, mpe bakiti ya bomoi kati na mokili ya bakufi, wana nde bokoyeba solo ete bato oyo batiolaki Yawe. » (Sheol h7585)
Ma ọ bụrụ na Onyenwe anyị emee ihe ọhụrụ dị iche, mee ka ala meghee ọnụ ya, lodaa ndị a niile, na ihe niile bụ nke ha, si otu a mee ka ha rịda nʼala ili na ndụ, mgbe ahụ, unu ga-amata na ndị ikom ndị a eledala Onyenwe anyị anya.” (Sheol h7585)
31 Tango kaka asilisaki koloba makambo oyo nyonso, mabele efungwamaki na se ya matambe ya Datani mpe Abirami;
Mgbe Mosis kpụ okwu a nʼọnụ ya, lee ala ahụ Kora, na Datan, na Abiram, na ndị ezinaụlọ ha niile guzo nʼelu ya kewara abụọ nʼotu ntabi anya ahụ,
32 efungolaki monoko na yango mpe emelaki bango elongo na mabota na bango, bato ya Kore nyonso elongo na bozwi na bango nyonso.
ala ahụ meghere ọnụ ya, loo ha, na ezinaụlọ ha niile, na ndị ahụ niile so Kora, na ihe niile ha nwere.
33 Bakitaki ya bomoi kati na mokili ya bakufi elongo na biloko na bango nyonso, mabele ezipaki bango mpe bakufaki ndenge wana. Mpe balimwaki kati na lisanga. (Sheol h7585)
Ha niile rịdaruru nʼala ndị nwụrụ anwụ na ndụ. Ala ahụ kpuchikwara ha niile, si otu a mee ka ha laa nʼiyi. (Sheol h7585)
34 Bato nyonso ya Isalaele oyo bazalaki pembeni na bango bakimaki tango bayokaki bango koganga. Bazalaki komilobela: « Mabele ekomela biso mpe lokola! »
Ndị Izrel niile nọ ha gburugburu gbara ọsọ, mgbe ha tiri mkpu akwa, na-asị, “Ala na-agakwa iloda anyị.”
35 Moto ewutaki epai na Yawe mpe etumbaki bato nkama mibale na tuku mitano oyo bazalaki kobonza malasi ya ansa.
Mgbe ahụ, ọkụ si nʼebe Onyenwe anyị nọ dara, rechapụ narị mmadụ abụọ na iri ise ndị ahụ na-enye onyinye aja nsure ọkụ na-esi isi ụtọ.
36 Yawe alobaki na Moyize:
Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya,
37 « Loba na Eleazari, mwana mobali ya Nganga-Nzambe Aron, ete balongola bambabola oyo batumbelaka malasi na kati-kati ya moto, mpe bapanza makala ya moto mosika, pamba te bambabola wana ezali bule.
“Gwa Elieza nwa Erọn, onye nchụaja, ka o site nʼọkụ ahụ wepụta ihe ịgụ ọkụ ndị ahụ niile nʼihi na ha dị nsọ. Ọ ga-ekposakwa icheku ọkụ niile nʼakụkụ niile.
38 Tika ete bakamata bambabola yango, atako ezali ya bato oyo bakufaki likolo ya masumu na bango; mpe tika ete batuta yango na marto mpo ete ekoma papala mpe batia yango likolo ya etumbelo, pamba te bamemaki yango liboso ya Yawe mpe ekomaki bule. Tika ete yango ekoma elembo mpo na bana ya Isalaele. »
Ha bụ ihe ịgụ ọkụ nke ndị ikom sitere na mmehie ha tufuo ndụ ha. Ka etipịa ihe ịgụ ọkụ ndị ahụ. Mee ha ka ha ghọọ ihe sara mbara nke a ga-eji machite ebe ịchụ aja, nʼihi na e chere ha nʼihu Onyenwe anyị, ha aghọọla ihe dị nsọ. Ka ha bụrụ ihe ịrịbama nye ndị Izrel niile.”
39 Boye, Nganga-Nzambe Eleazari alokotaki bambabola nyonso ya bronze oyo bato oyo bazikaki na moto bamemaki, mpe atutaki yango na marto mpo na kotia yango likolo ya etumbelo;
Ya mere Elieza, onye nchụaja, chịkọtara ihe ịgụ ọkụ bronz ndị ahụ nke ndị ahụ a kpọrọ ọkụ wetara, tipịa ha, mee ka ha ghọọ ihe sara mbara e ji ekpuchi ebe ịchụ aja,
40 ndenge Yawe atindaki ye, na nzela ya Moyize. Yango ekozala lokola ekaniseli mpo na bana ya Isalaele ete moto moko te, moto oyo abulisama te, moto oyo azali mopaya liboso ya bakitani ya Aron, akoki koya kotumba malasi ya ansa liboso ya Yawe, noki te akokoma lokola Kore mpe bato oyo balandaki ye.
dịka Onyenwe anyị nyere ya nʼiwu site nʼọnụ Mosis. Ka ọ bụrụ ihe ncheta nye ndị Izrel niile na onye mba ọzọ a na-enyeghị ike, nke na-esiteghị nʼagbụrụ Erọn, ekwesighị ịbịaru Onyenwe anyị nso isure aja nsure ọkụ nye ya, ka ihe mere Kora na ndị sonyere ya ghara ime ha.
41 Mokolo oyo elandaki, lisanga mobimba ya bana ya Isalaele ekomaki koyimayima mpo na Moyize mpe Aron. Bazalaki koloba: « Bino bobomi bato na Yawe. »
Ma nʼụtụtụ echi ya, nzukọ Izrel niile malitere itamu ntamu megide Mosis na Erọn sị, “Unu egbuchaala ndị nke Onyenwe anyị.”
42 Kasi tango lisanga mobimba esanganaki mpo na kotelemela Moyize mpe Aron, babalukaki na ngambo ya Ndako ya kapo ya Bokutani, mpe mbala moko lipata ezipaki yango mpe nkembo na Yawe emonisamaki.
Ma mgbe ọgbakọ Izrel zukọtara imegide Mosis na Erọn, mgbe ha chere ihu nʼụlọ nzute, na mberede, igwe ojii kpuchiri ụlọ nzute ahụ, ebube Onyenwe anyị pụtakwara ihe.
43 Boye, Moyize mpe Aron bakendeki liboso ya Ndako ya kapo ya Bokutani
Mgbe ahụ, Mosis na Erọn gara nʼihu ụlọ nzute ahụ.
44 mpe Yawe alobaki na Moyize:
Ma Onyenwe anyị gwara Mosis sị,
45 « Bokende mosika ya lisanga oyo mpo ete nasilisa bango kaka na mbala moko. » Mpe bakweyaki bilongi kino na mabele.
“Sinụ nʼetiti ọgbakọ a pụọ ka m bibie ha nʼotu ntabi anya.” Ha dara kpuo ihu nʼala.
46 Moyize alobaki na Aron: « Kamata mbabola na yo mpe tia malasi ya ansa kati na yango elongo na moto ya etumbelo. Bongo, kima mbangu kati na lisanga mpo na kosala mosala ya bolimbisi masumu mpo na bango, pamba te kanda makasi ebimi liboso ya Yawe, etumbu ezali koya. »
Mgbe ahụ, Mosis sịrị Erọn, “Ngwa, were ihe ịgụ ọkụ ma site nʼebe ịchụ aja gụnye ya ọkụ. Tinye ya ụda na-esi isi ụtọ. Burukwa ya gaa ngwangwa nʼetiti nzukọ Izrel ka i kpuchiere ha mmehie ha, nʼihi na iwe ọkụ Onyenwe anyị adakwasịla ha. Nrịa nrịa na-efe efe amalitekwalarị ibibi ha.”
47 Aron asalaki ndenge kaka Moyize alobaki, mpe akimaki mbangu na kati-kati ya lisanga. Nzokande, etumbu emibandelaki kosala mosala na yango na kati-kati ya bato, kasi Aron abonzaki malasi ya ansa mpe asalaki mosala ya bolimbisi masumu mpo na bango.
Erọn mere dịka Mosis kwuru. O mere ngwangwa gbaba nʼetiti ndị Izrel nʼihi na nrịa nrịa ahụ ebidola nʼezie ịdakwasị ha. Erọn mụnyere ụda na-esi isi ụtọ ahụ ọkụ, si otu ahụ kpuchiere ha mmehie ha niile.
48 Atelemaki na kati-kati ya bato oyo bazalaki na bomoi mpe oyo bazalaki ya kokufa mpe etumbu esilaki.
O guzokwara nʼetiti ndị dị ndụ na ndị nwụrụ anwụ tutu ihe otiti ahụ akwụsị.
49 Nzokande, bato nkoto zomi na minei na nkama sambo bakufaki na etumbu wana, bakisa oyo bakufaki likolo ya Kore.
Ma ihe otiti ahụ egbuolarị puku mmadụ iri, puku anọ na narị asaa. A gụnyeghị ndị niile ahụ so Kora nwụọ nʼụbọchị gara aga.
50 Bongo, Aron azongaki epai ya Moyize na ekotelo ya Ndako ya kapo ya Bokutani, pamba te etumbu esilaki.
Mgbe ahụ, Erọn laghachikwutere Mosis nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute ahụ, nʼihi na nrịa nrịa ahụ na-efe efe akwụsịla.

< Mitango 16 >