< Neyemi 8 >

1 Bato nyonso basanganaki lokola moto moko na libanda, liboso ya Ekuke ya Mayi. Balobaki na Esidrasi, molakisi ya Mobeko, ete abimisa buku ya Mobeko ya Moyize, oyo Yawe apesaki bana ya Isalaele.
Ndị mmadụ niile zukọrọ dịka otu onye na mbara ala dị nʼỌnụ Ụzọ Ama Mmiri. Ha gwara Ezra onye nkuzi ka ọ weta akwụkwọ Mosis, nke Onyenwe anyị nyere ndị Izrel nʼiwu.
2 Na mokolo ya liboso ya sanza ya sambo, Nganga-Nzambe Esidrasi amemaki buku ya Mobeko liboso ya lisanga oyo, kati na yango, ezalaki na mibali, basi mpe bato nyonso oyo bazalaki na makoki ya kososola.
Ya mere, Ezra, onye nchụaja wepụtara akwụkwọ Iwu ahụ nʼụbọchị mbụ nke ọnwa asaa nʼihu mkpọkọta ahụ bụ nke ndị ikom na ndị inyom na onye ọbụla ga-aghọta ihe mejupụtara.
3 Atangelaki bango buku yango na mongongo makasi, kobanda na tongo kino na pokwa, na esika oyo etalani na Ekuke ya Mayi. Bato nyonso bazalaki koyoka na bokebi botangi buku ya Mobeko.
O chere ihu nʼỌnụ Ụzọ Ama Mmiri were oke olu gụọ ya site nʼụtụtụ ruokwa ehihie nʼihu ndị nwoke, ndị nwanyị na ndị ọzọ nwere ike ịghọta ihe o na-agụ. Mmadụ niile gekwara ntị na ngụpụta nke akwụkwọ iwu ahụ.
4 Esidrasi, molakisi ya Mobeko, atelemaki na etemelo ya kolobela oyo basalaki na mabaya, kaka mpo na mayangani wana. Matitia, Shema, Anaya, Uri, Ilikia mpe Maaseya batelemaki na ngambo ya loboko na ye ya mobali; Pedaya, Mishaeli, Malikiya, Ashumi, Ashibadana, Zakari mpe Meshulami batelemaki na ngambo ya loboko na ye ya mwasi.
Ezra onye ode akwụkwọ, rigoro nʼelu ihe mgbakwasị ụkwụ ha mere maka nke a. Ndị guzo nʼaka nri ya bụ, Matitaia, Shema, Anaia, Ụraya, Hilkaya na Maaseia. Ndị guzo nʼaka ekpe ya bụkwa ndị a: Pedaia, Mishael, Malkija, Hashum, Hashbadana, Zekaraya na Meshulam.
5 Mpo ete Esidrasi atelemaki na esika ya likolo koleka bato nyonso, moto nyonso amonaki ye kofungola buku. Mpe tango kaka afungolaki buku yango, bato nyonso batelemaki.
Ezra meghere akwụkwọ ahụ mgbe mmadụ niile na-ahụzu ya nʼihi na o guzoro nʼebe dị elu mgbe ọ na-agụ ya. Mmadụ niile guzoro ọtọ mgbe ọ na-agụ ya.
6 Esidrasi akumisaki Yawe, Nzambe Monene; mpe bato nyonso batombolaki maboko na bango mpe bazongisaki: « Amen! » Bongo bafukamaki mpe bakitisaki bilongi na bango kino na se mpo na kogumbamela Yawe.
Mgbe ahụ, Ezra gọziri Onyenwe anyị Chineke ukwu ahụ, mmadụ niile zakwara sị; “Amen! Amen!” Ha chịlịri aka ha abụọ elu, kpọọ isiala nye Onyenwe anyị.
7 Sima, batelemaki; mpe Balevi oyo: Jozue, Bani, Sherebia, Yamini, Akubi, Shabetayi, Odia, Maaseya, Kelita, Azaria, Yozabadi, Anani mpe Pelaya bakomaki kolimbolela bato Mibeko yango, wana bato bazalaki nanu ya kotelema.
Ndị Livayị aha ha bụ Jeshua, Bani, Sherebaya, Jamin, Akub, Shabetai, Hodia, Maaseia, Kelita, Azaraya, Jozabad, Hanan na Pelia, kuziri ndị mmadụ ihe dị nʼIwu mee ka ha ghọta ya dịka ha guzo nʼebe ahụ.
8 Balevi bazalaki kotanga kati na buku ya Mobeko ya Nzambe mpe kopesa ndimbola na yango, na ndenge ya malembe mpe ya malamu, mpo ete bato bakoka kososola makomi oyo batangi.
Ha gụpụtara site nʼakwụkwọ iwu Chineke ahụ, sụgharịa ya, kọwazie ọkpụrụkpụ okwu niile dị nʼihe a gụpụtara, mee ka ndị mmadụ ghọta ihe a na-agụpụta nke ọma.
9 Bato nyonso bazalaki kolela, wana bazalaki koyoka maloba ya Mibeko. Moyangeli Neyemi mpe Esidrasi, Nganga-Nzambe mpe molakisi ya Mobeko, elongo na Balevi oyo bazalaki kolimbolela bato Mibeko balobaki na bato nyonso: — Mokolo ya lelo ezali bule mpo na Yawe, Nzambe na biso; botika kosala matanga mpe botika kolela!
Mgbe ahụ, Nehemaya, onyeisi ọchịchị, na Ezra, ode akwụkwọ na onye nchụaja, na ndị Livayị ahụ na-atụziri ndị mmadụ ihe, gwara ndị ahụ niile sị: “Taa bụ ụbọchị dị nsọ nye Onyenwe anyị, Chineke unu. Unu erula ụjụ maọbụ bee akwa.” Nʼihi na ha niile na-akwa akwa mgbe ha na-ege ntị nʼokwu niile nke iwu ahụ.
10 Neyemi alobaki na bango lisusu: — Sik’oyo, bokende, bolia bilei ya kitoko, bomela masanga ya kitoko mpe botinda ndambo epai ya bato oyo bazangi eloko ya kolamba, pamba te mokolo oyo ezali bule mpo na Nkolo na biso. Boye bozala na mawa te, pamba te esengo ya Yawe ezali makasi na bino.
Nehemaya gwakwara ha sị; “Laanụ nʼụlọ unu gaa mee mmemme oriri na ọṅụṅụ nyekwanụ ndị na-enweghị nke ha ga-eri. Ụbọchị taa dị nsọ nye Chineke anyị. Unu erukwala ụjụ, nʼihi na ọṅụ Onyenwe anyị bụ ike unu.”
11 Balevi bazalaki kokitisa bato nyonso mitema, bazalaki koloba na bango: — Bozala na kimia, pamba te mokolo ya lelo ezali bule; bozala na mawa te!
Ndị Livayị mere ka ndị mmadụ ahụ nọrọ nwayọọ, na-asị, “Nọrọnụ nwayọọ, nʼihi na taa bụ ụbọchị dị nsọ, ọ bụghị ụbọchị iru ụjụ na anya mmiri.”
12 Bato nyonso bakendeki kolia mpe komela, kotinda ndambo ya bilei epai ya bato oyo bazangaki eloko ya kolamba mpe kosepela na esengo makasi, pamba te basosolaki maloba oyo balimbolelaki bango.
Ya mere, ha niile lawara ị ga rie ma ṅụọ, na ikenye ndị ọzọ site nʼihe ha nwere. Ha gakwara ime mmemme nke oke ọṅụ, nʼihi na ha ghọtara okwu agwara ha.
13 Na mokolo ya mibale ya sanza, bakambi ya mabota nyonso elongo na Banganga-Nzambe mpe Balevi basanganaki pembeni ya Esidrasi, molakisi ya Mobeko, mpo na koluka koyeba malamu-malamu maloba ya Mibeko.
Nʼụbọchị nke abụọ nke ọnwa ahụ, ndịisi ezinaụlọ niile na ndị nchụaja, na ndị Livayị, zukọrọ nʼebe Ezra, bụ onye nkuzi nọ, maka itinye uche nʼakwụkwọ iwu ahụ.
14 Bamonaki ete ekomama kati na Mibeko oyo Yawe apesaki na nzela ya Moyize, ete bana ya Isalaele basengeli kovanda kati na bandako oyo batonga na matiti, na tango ya feti ya sanza ya sambo,
Mgbe ha na-agụ ya, ha chọpụtara ebe Onyenwe anyị gwara Mosis sị ya na ụmụ Izrel kwesiri ibi nʼụlọ ikwu mgbe ọbụla a na-eme mmemme ụlọ ikwu nke a ga-eme nʼọnwa ahụ.
15 mpe basengeli kotatola to kopanza kati na bingumba na bango nyonso mpe kati na Yelusalemi liloba oyo: « Bobima wuta na mokili ya bangomba, bomema longwa kuna bitape ya nzete ya olive ya mboka mpe ya zamba, bitape ya nzete ya mirite, mandalala mpe bitape ya nzete ya makasa ebele mpo na kotonga bandako ya matiti, kolanda ndenge ekomama. »
O kwukwara na ha ga-ekwusa okwu a nʼobodo niile nke Juda na Jerusalem sị; “Gaanụ nʼala ugwu ugwu gbute alaka osisi oliv ụlọ, na alaka oliv ọhịa, na alaka osisi mietul, na alaka nkwụ, na alaka osisi ndị ọzọ na-enye ndo nke a ga-eji wuo ebe unu ga-ebi tutu ruo mgbe mmemme ahụ ga-agwụsị, dịka e dere ya nʼakwụkwọ iwu.”
16 Bato babimaki mpe bamemaki longwa kuna bitape ya banzete; batongaki bandako ya matiti, na likolo ya mwanza ya bandako na bango, kati na mapango na bango, kati na lopango ya Ndako ya Nzambe, na libanda ya Ekuke ya Mayi mpe na esika oyo ezalaki pembeni ya Ekuke ya Efrayimi.
Ya mere, ndị ahụ pụrụ gaa weta alaka osisi, jiri ha wuore onwe ha ụlọ ahịhịa ha ga-ebi nwa mgbe nta nʼelu ụlọ ha, na nʼogige ụlọ nke aka ha, nakwa nʼogige ụlọ Chineke, na mbara ala Ọnụ Ụzọ Ama Mmiri, na nʼakụkụ Ọnụ Ụzọ Ama Ifrem.
17 Lisanga ya bato nyonso oyo bawutaki na bowumbu batongaki bandako ya matiti mpe bavandaki kati na yango. Wuta na tango ya Jozue, mwana mobali ya Nuni, kino na mokolo wana, bana ya Isalaele batikalaki lisusu te kosepela feti yango. Boye, mpo na libaku oyo, bazalaki na esengo makasi.
Ndị ahụ niile si na ndọta nʼagha lọta wuuru onwe ha ụlọ ikwu biri nʼime ya ụbọchị asaa ahụ niile e mere mmemme ahụ. Oke ọṅụ jupụtara obi mmadụ niile, nʼihi na site nʼoge Joshua nwa Nun ruo nʼoge a, o nwebeghị mgbe ụmụ Izrel mere mmemme a nʼụzọ dị otu a.
18 Mokolo na mokolo, kobanda na mokolo ya liboso kino na mokolo ya suka, Esidrasi azalaki kotanga buku ya Mobeko ya Nzambe. Basepelaki feti mikolo sambo; mpe na mokolo ya mwambe, kolanda malako ya Mobeko, basalaki mayangani mpo na kosukisa feti.
Ezra na-agụpụta site nʼakwụkwọ iwu Chineke kwa ụbọchị, site nʼụbọchị mbụ ruo nʼụbọchị ikpeazụ. Ha mere mmemme ahụ ụbọchị asaa ma nʼụbọchị nke asatọ ha nwere ọgbakọ ofufe mmechi dịka e dere ya nʼiwu.

< Neyemi 8 >