< Matayo 5 >
1 Tango Yesu amonaki ebele yango ya bato, amataki likolo ya ngomba mpe avandaki. Bayekoli na Ye bapusanaki pene na Ye,
Mgbe Jisọs hụrụ igwe mmadụ ahụ, ọ rigooro nʼelu ugwu. Mgbe ọ nọdụrụ ala, ndị na-eso ụzọ ya bịakwutere ya,
2 mpe akomaki kopesa bango malakisi. Alobaki:
o bido ikuziri ha ihe. Ọ sịrị:
3 « Esengo na babola na molimo, pamba te Bokonzi ya Likolo ezali mpo na bango!
“Ngọzị na-adịrị ndị bụ ogbenye nʼime mmụọ, nʼihi na alaeze eluigwe bụ nke ha.
4 Esengo na bato oyo bazali kolela, pamba te bakobondisama!
Ngọzị na-adịrị ndị na-eru ụjụ, nʼihi na a ga-akasị ha obi.
5 Esengo na bato na komikitisa, pamba te bakozwa mokili lokola libula!
Ngọzị na-adịrị ndị dị nwayọọ nʼobi, nʼihi na ha ga-eketa ụwa.
6 Esengo na bato oyo bazali na nzala mpe na posa ya bosembo, pamba te bakotondisama!
Ngọzị na-adịrị ndị agụụ ezi omume na-agụ, nʼihi na ndị ahụ ka afọ ga-eju.
7 Esengo na bato oyo bayokelaka bato mosusu mawa, pamba te bakoyokela bango mpe mawa!
Ngọzị na-adịrị ndị na-eme obi ebere, nʼihi na ha ka a ga-emere ebere.
8 Esengo na bato oyo bazali na mitema peto, pamba te bakomona Nzambe!
Ngọzị na-adịrị ndị dị ọcha nʼobi, nʼihi na ha ga-ahụ Chineke anya.
9 Esengo na bato oyo bayeisaka kimia, pamba te bakobengama bana na Nzambe!
Ngọzị na-adịrị ndị na-eme ka udo dị nʼetiti mmadụ na ibe ya, nʼihi na a ga-akpọ ha ụmụ Chineke.
10 Esengo na bato oyo bazali konyokolama likolo ya bosembo, pamba te Bokonzi ya Likolo ezali mpo na bango!
Ngọzị na-adịrị ndị a na-emegbu nʼihi ezi omume, nʼihi na alaeze eluigwe bụ nke ha.
11 Esengo na bino tango bazali kofinga bino, tango bazali konyokola bino, mpe tango bazali kokosela bino makambo ya lolenge nyonso likolo na Ngai!
“Ngọzị na-adịrị unu mgbe ndị mmadụ na-akọcha unu, na-emegbu unu, ma na-ekwukwa okwu ọjọọ na ụgha niile dị iche iche megide unu nʼihi m.
12 Bosepela mpe bozala na esengo, pamba te lifuti na bino ezali monene kati na Likolo; pamba te ezalaki mpe kaka ndenge wana nde banyokolaki basakoli oyo bazalaki liboso na bino.
Ṅụrịanụ ọnụ, nwekwanụ obi ụtọ, nʼihi na ụgwọ ọrụ unu dị ukwuu nʼeluigwe. Nʼihi na nʼụzọ dị otu a ka ha sogburu ndị amụma ndị buru unu ụzọ.
13 Bozali mungwa ya mokili. Kasi soki mungwa ebungisi elengi na yango, ndenge nini bakokoka lisusu kozongisa elengi na yango? Ezali lisusu na tina moko te; etikali kaka eloko ya kobwaka mpe ya konyata.
“Unu bụ nnu nke ụwa, ma ọ bụrụ na nnu adịghị atọkwa ụtọ, a ga-eji gịnị mee ka ọ tọọ ụtọ ọzọ? Ọ bakwaghị uru ọbụla, ma ọ bụghị naanị itufu ya, ka ndị mmadụ zọọ ya ụkwụ.
14 Bozali pole ya mokili. Engumba oyo batongi na likolo ya ngomba ekoki kobombama te.
“Unu bụ ihe nke ụwa. Unu dị ka obodo e wuru nʼelu ugwu nke a na-apụghị izo ezo.
15 Moto moko te apelisaka mwinda mpo na kotia yango na se ya katini; nzokande, atiaka yango na likolo ya etelemiselo ya minda mpo ete engengisa bato nyonso oyo bazali kati na ndako.
Ndị mmadụ adịghị amụnye oriọna dọnye ya nʼokpuru igbe, kama a na-adọkwasị ya nʼelu ihe ịdọba oriọna, ka o nye ndị niile nọ nʼụlọ ahụ ìhè.
16 Yango wana, tika ete pole na bino engenga liboso ya bato, mpo ete bamona misala malamu na bino mpe bakumisa Tata na bino oyo azali kati na Likolo.
Ya mere, kwerenụ ka ìhè unu nwuo nye mmadụ niile, ka ndị mmadụ hụ ọrụ ọma unu, tookwa Nna unu nke bi nʼeluigwe.
17 Bokanisa te ete Ngai nayaki mpo na kolongola Mobeko to basakoli; solo, nayaki te mpo na kolongola, kasi nayaki nde mpo na kokokisa.
“Unu echela na m bịara ịkagbu iwu Mosis, maọbụ ozizi ndị amụma. Abịaghị m ịkagbu akagbu, kama abịara m imezu ha.
18 Pamba te, nazali koloba na bino penza ya solo: liboso ete Likolo mpe mabele elimwa, nkoma moko te oyo eleki moke to litono oyo ezalaka na likolo ya i ekotikala kolongwa kati na Mobeko, kino makambo nyonso ekokisama.
Nʼezie, agwa m unu, na tutu eluigwe na ụwa agabiga, ọ dịghị otu mkpụrụ edemede ọbụla dị nta, ọ bụladị nke dịkarịsịrị nta, nke a ga-esi nʼIwu a wepụ ruo mgbe ha niile ga emezu.
19 Yango wana, moto nyonso oyo akobuka moko kati na mibeko oyo, ezala oyo eleki moke kati na yango, mpe akoteya bato mosusu kosala bongo, bakozwa ye lokola moto pamba kati na Bokonzi ya Likolo. Kasi moto oyo akotosa mpe akoteya mibeko oyo epai na bato mosusu akozala moto monene kati na Bokonzi ya Likolo.
Nʼihi ya, onye ọbụla nke ga-emebi otu nʼime iwu ndị a, ọ bụladị nke dịkarịsịrị nta, ma kuziekwara ndị ọzọ ime otu ahụ, a ga-agụ onye ahụ nʼonye dịkarịsịrị nta nʼalaeze eluigwe. Ma onye na-ezi ụmụ mmadụ ka ha debe iwu ahụ, ma na-emekwa okwu ndị ahụ nʼonwe ya, a ga-akpọ ya onye dị ukwuu nʼalaeze eluigwe.
20 Pamba te, nazali koloba na bino solo ete soki bosembo na bino liboso ya Mobeko eleki te bosembo ya balakisi ya Mobeko mpe ya Bafarizeo, bokokota te na Bokonzi ya Likolo.
Ka m dọọ unu aka na ntị. Ọ bụrụ na ezi omume unu akarịghị ezi omume ndị Farisii na ndị ozizi iwu, unu apụghị ịba nʼalaeze eluigwe ma ọlị.
21 Boyokaki ete baloba na bakoko na biso: ‹ Okobomaka te. Moto nyonso oyo akoboma moninga na ye asengeli na kosambisama liboso ya basambisi. ›
“Unu nụrụ na-agwara ndị mmadụ nʼoge gara aga, sị, ‘Onye egbula mmadụ, onye ọbụla gburu mmadụ a ga-ekpe ya ikpe.’
22 Kasi Ngai, nalobi na bino: Moto nyonso oyo akokangela ndeko na ye kanda akosamba na esambiselo liboso ya basambisi; moto oyo akofinga ndeko na ye: ‹ zoba, › akosamba liboso ya Likita-Monene; mpe oyo akoloba na ndeko na ye: ‹ moto ya liboma, › akobwakama kati na moto ya lifelo. (Geenna )
Ma asị m unu, na onye ọbụla nke na-ewe iwe megide nwanna ya, na-enyefe onwe ya nʼaka ikpe. Onye ọbụla nke na-akpọ nwanna ya ‘Raka,’ ya bụ Onye iberiibe, ga-aza ajụjụ nʼụlọikpe. Ọzọkwa, onye ọbụla nke kpọrọ nwanne ya, ‘Onye nzuzu,’na-edo onwe ya ịba nʼọkụ ala mmụọ. (Geenna )
23 Soki ozali kokende kopesa makabo na yo liboso ya etumbelo, mpe ososoli ete ndeko na yo azwa yo na likambo,
“Ya mere, ọ bụrụ na ị gaa inye onyinye gị nʼebe ịchụ aja, ma cheta nʼebe ahụ na gị na nwanne gị adịghị nʼudo,
24 tika makabo na yo liboso ya etumbelo mpe kende nanu koyokana na ndeko na yo wana; sima na yango nde okoya kopesa makabo na yo.
hapụ onyinye gị nʼebe ịchụ aja, laa ka gị na nwanne gị kpezie. Mgbe unu mere udo, laghachi bịa nye onyinye gị.
25 Soki moto azwi yo na likambo, yokana na ye noki, wana bozali nanu na nzela; soki te, akofunda yo epai ya mosambisi, mosambisi akokaba yo na maboko ya bakengeli, mpe bakengeli bakobwaka yo na boloko.
“Mee ọsịịsọ ka gị na onye kpọ gị eje ụlọ ikpe kpezie, mgbe ọ na-eburubeghị ikpe gị na ya jee nʼaka ọkaikpe, onye ga-enyefe gị nʼaka ndị nche, ma eleghị anya etinye gị nʼụlọ mkpọrọ.
26 Nazali koloba na yo penza ya solo: okobima na boloko soki kaka ofuti niongo na yo nyonso.
Nʼezie, agwa m gị, ị gaghị e si nʼebe ahụ pụta ruo mgbe ị kwụghachiri kobo niile i ji.
27 Boyokaki ete baloba: ‹ Okosalaka ekobo te. ›
“Unu nụrụ na e kwuru sị, ‘Akwala iko.’
28 Kasi Ngai, nalobi na bino: Mobali nyonso oyo atali mwasi na makanisi ya kolula ye, asili kosala na ye ekobo kati na motema na ye.
Ma asị m unu, onye ọbụla lere nwanyị anya site na-agụụ ịkwa iko emeelarị mmehie ịkwa iko nʼime obi ya megide nwanyị ahụ.
29 Yango wana, soki liso na yo ya ngambo ya mobali ekweyisaka yo na masumu, longola yango mpe bwaka yango mosika na yo; pamba te eleki malamu mpo na yo kobungisa eteni moko ya nzoto, na esika ete nzoto na yo mobimba ebwakama na lifelo. (Geenna )
Nʼihi nke a, ọ bụrụ na anya aka nri gị na-eme ka i jehie, ghụpụ ya tufuo. Ọ kaara gị mma na i tufuru otu akụkụ ahụ gị baa nʼalaeze karịa na i ji ahụ zuruoke baa nʼọkụ ala mmụọ. (Geenna )
30 Soki mpe loboko na yo ya ngambo ya mobali ekweyisaka yo na masumu, kata yango mpe bwaka yango mosika na yo; pamba te eleki malamu mpo na yo kobungisa eteni moko ya nzoto, na esika ete nzoto na yo mobimba ekende na lifelo. (Geenna )
Ọ bụrụ na aka nri gị na-eme ka i jehie, gbupụ ya tufuo. Ọ kaara gị mma na i tufuru otu akụkụ ahụ gị ma baa nʼalaeze eluigwe, karịa na i ji ahụ zuruoke ma baa nʼọkụ ala mmụọ. (Geenna )
31 Boyokaki lisusu ete baloba: ‹ Soki mobali akabwani na mwasi na ye, asengeli kopesa ye mokanda ya koboma libala. ›
“E kwukwara sị, ‘Onye ọbụla chọrọ ịgbara nwunye ya alụkwaghị m, ga-ebu ụzọ dee akwụkwọ alụkwaghị m nye nwunye ya.’
32 Kasi Ngai, nazali koloba na bino: Mobali nyonso oyo alongoli mwasi na ye na libala, longola kaka soki mwasi yango akweyaki na ekobo, afungoleli ye nzela ya kosala kindumba; mpe mobali oyo abali mwasi oyo balongola na libala asali mpe ekobo.
Ma asị m unu, onye ọbụla gbara nwunye ya alụkwaghị m, ma ọ bụghị nʼihi ịkwa iko, ọ na-etinye nwanyị ahụ nʼọnọdụ ga-eme ka ọ kwaa iko. Ọ bụrụ na nwanyị ahụ alụọ di ọzọ, nwoke ahụ lụrụ nwanyị ahụ na-emekwa mmehie ịkwa iko.
33 Boyokaki lisusu ete baloba na bakoko na biso: ‹ Okolapa ndayi ya lokuta te, kasi kokisa bilaka oyo opesaki na nzela ya ndayi liboso ya Nkolo. ›
“Ọzọkwa, unu nụrụ na a gwara ndị mmadụ nʼoge gara aga sị, ‘Aṅụla iyi ụgha, kama mezuo ihe niile unu ṅụrụ nʼiyi nye Onyenwe anyị.’
34 Kasi Ngai, nazali koloba na bino: bolapaka ndayi te, ezala na kombo ya Likolo, pamba te Likolo ezali Kiti ya Bokonzi ya Nzambe,
Ma asị m unu aṅụla iyi ọbụla. Ejikwala eluigwe aṅụ iyi nʼihi na eluigwe bụ ebe ocheeze Chineke dị.
35 to na kombo ya mokili, pamba te mokili ezali enyatelo makolo ya Nzambe; to mpe na kombo ya Yelusalemi, pamba te Yelusalemi ezali engumba ya Mokonzi Monene.
Ejikwala ụwa aṅụ iyi nʼihi na ụwa bụ ebe mgbakwasị ụkwụ ya. Ejikwala Jerusalem aṅụ iyi nʼihi na ọ bụ obodo Eze ukwu ahụ.
36 Bosalelaka mpe te mito na bino mpo na kolapa ndayi, pamba te bokoki te kokomisa moko kati na suki ya mito na bino pembe to mwindo.
Ejikwala isi gị aṅụ iyi nʼihi na ị pụghị ime ka otu agịrị isi gị dị ọcha maọbụ dị oji.
37 Kasi bolobaka kaka ‹ iyo › soki ezali iyo, mpe ‹ te › soki ezali bongo, pamba te maloba nyonso oyo ebakisamaka likolo ewutaka na Mokosi.
Aṅụla iyi ọbụla. Kama ka okwu unu bụrụ ‘E’ maọbụ ‘Ee’; ihe ọbụla gafere nke a sitere nʼaka ajọ onye ahụ.
38 Boyokaki ete baloba: ‹ Liso mpo na liso, linu mpo na linu. ›
“Unu anụla na e kwuru sị, ‘Ọ bụ anya ka a kụkpọrọ, anya nʼọnọdụ anya. Ọ bụrụkwa otu eze ka e tipụrụ, eze nʼọnọdụ eze.’
39 Kasi Ngai, nazali koloba na bino: Botelemelaka te moto mabe; kutu soki abeti yo mbata na litama ya ngambo ya loboko ya mobali, pesa ye mpe litama ya ngambo ya loboko ya mwasi.
Ma ana m asị unu eguzogidela onye bụ ajọ onye. Kama ọ bụrụ na mmadụ amaa gị ụra na ntị aka nri, tụgharịara ya ntị nke ọzọ.
40 Soki moto alingi kofunda yo mpo na kozwa elamba na yo, pesa ye mpe kazaka na yo.
Ọ bụrụ na mmadụ agbaa gị akwụkwọ nʼụlọikpe, ka ọ nara gị uwe ime gị, nyekwa ya uwe nke elu gị.
41 Soki moto atindi yo na makasi ete otambola kilometele moko, yo, tambola bakilometele mibale elongo na ye.
Ọ bụrụ na mmadụ esite nʼike chọọ ka i soro ya gaa puku nzọ ụkwụ atọ, soro ya gaa puku nzọ ụkwụ isii.
42 Pesa na moto oyo asengi yo, mpe koboya te kodefisa na moto oyo alingi kodefa epai na yo.
Nye onye ọbụla rịọrọ gị ihe. Achụghachikwala ndị na-abịa ka i binye ha ego.
43 Boyokaki ete baloba: ‹ Linga moninga na yo mpe yina monguna na yo. ›
“Unu nụrụ na e kwuru sị, ‘Hụnụ ndị agbataobi unu nʼanya, ma kpọkwanụ ndị iro unu asị.’
44 Kasi Ngai, nazali koloba na bino: Bolingaka banguna na bino mpe bosambelaka mpo na bato oyo banyokolaka bino.
Ma asị m unu, hụnụ ndị iro unu nʼanya, kpekwaaranụ ndị na-esogbu unu ekpere.
45 Na ndenge wana nde bokozala bana ya Tata na bino, oyo azali kati na Likolo, pamba te abimisaka moyi mpo na bato malamu mpe mpo na bato mabe, mpe anokisaka mvula mpo na bato ya sembo mpe mpo na bato oyo bazali sembo te.
Nke a ga-eme ka unu bụrụ ụmụ nke Nna unu bi nʼeluigwe, onye na-eme ka anwụ mụọrọ ndị ọma na ndị ọjọọ, na-emekwa ka mmiri zooro ndị ezi omume na ndị ajọ omume.
46 Soki bolingaka kaka bato oyo balingaka bino, lifuti nini bokozwa? Boni, bafutisi mpako basalaka mpe bongo te?
Ọ bụrụ naanị ndị hụrụ unu nʼanya ka unu na-ahụ nʼanya, gịnị ga-abụ ụgwọ ọrụ unu? Ọ bụladị ndị ọna ụtụ na-emekwa otu a.
47 Soki bopesaka mbote kaka na bandeko mibali na bino, likambo nini ya kokamwa oyo bosalaka? Boni, bapagano basalaka mpe bongo te?
Ọ bụrụkwa na unu na-ekele naanị ndị enyi unu ekele, ọ dịghị ihe ọbụla dị iche nʼebe unu na ndị ọzọ nọ. Nʼihi na ndị na-amaghị Chineke na-emekwa otu ahụ.
48 Bozala bato ya kokoka ndenge Tata na bino ya Likolo azali ya kokoka.
Ya mere, unu kwesiri izuoke nʼịrụ ọrụ ọma, dịka Nna unu bi nʼeluigwe si zukwaa oke.