< Matayo 2 >

1 Yesu abotamaki na Beteleemi ya Yuda, wana Erode azalaki mokonzi. Na tango yango, bato ya mayele oyo bawutaki na este bayaki na Yelusalemi
Mgbe a mụchara Jisọs na Betlehem nke Judịa nʼoge Herọd bụ eze, ndị amamihe si ọwụwa anyanwụ bịaruru Jerusalem,
2 mpe batunaki: « Mokonzi ya Bayuda oyo abotami azali wapi? Tomonaki monzoto na Ye kobima, yango wana toyei kogumbamela Ye. »
na-ajụ ajụjụ sị, “Olee ebe ọ nọ, bụ onye a mụrụ ịbụ eze ndị Juu? Anyị hụrụ kpakpando ya nʼọwụwa anyanwụ, ma bịa ịkpọ isiala nye ya.”
3 Tango mokonzi Erode ayokaki bongo, motema na ye etungisamaki makasi elongo na Yelusalemi mobimba.
Mgbe eze Herọd nụrụ nke a, obi lọrọ ya mmiri nke ukwuu, ya na ndị niile bi na Jerusalem.
4 Abengaki mpe asangisaki bakonzi nyonso ya Banganga-Nzambe mpe balakisi ya Mobeko; atunaki bango: — Klisto asengeli kobotama wapi?
Mgbe ọ kpọkọtara ndịisi nchụaja na ndị ozizi iwu niile, ọ jụrụ ha, olee ebe e kwuru na a ga-amụ Kraịst ahụ.
5 Bazongiselaki ye: — Na Beteleemi ya Yuda, pamba te mosakoli akoma:
Ha zara ya sị, “Na Betlehem nke Judịa. Nʼihi na otu a ka onye amụma ahụ dere nʼakwụkwọ sị,
6 « Bongo yo, Beteleemi, kati na mabele ya Yuda, ozali solo moke te kati na bingumba ya Yuda, pamba te Mokonzi oyo, lokola Mobateli bibwele, akotambolisa bato na Ngai, Isalaele, akobima nde kati na yo. »
“‘Ma gị onwe gị, Betlehem, dị nʼala Juda, ị dịghị nta karịchasịa nʼetiti ndị ọchịchị Juda, nʼihi na ọ bụ site na gị ka onye ọchịchị ga-esi pụta, onye ga-achị ndị nke m Izrel.’”
7 Bongo, Erode abengaki bato ya mayele na nkuku mpe alukaki koyeba epai na bango tango nini monzoto ebimaki.
Mgbe ahụ Herọd kpọrọ ndị amamihe ahụ na nzuzo jụpụta ha banyere oge kpakpando ahụ ji pụta ìhè.
8 Boye, atindaki bango na Beteleemi; alobaki: — Bokende koluka malamu mwana yango, na Beteleemi; tango kaka bokomona ye, boyebisa ngai mpo ete ngai mpe nakende kogumbamela ye.
O zipụrụ ha ije Betlehem sị ha, “Gaanụ lee anya nke ọma chọpụta ebe nwantakịrị ahụ nọ. Mgbe unu chọtara ya, bịanụ mee ka m mara, ka m gaakwa kpọọ isiala nye ya.”
9 Sima na bango koyoka maloba ya mokonzi, bakobaki nzela na bango. Bamonaki lisusu monzoto oyo ewutaki kobima na este: monzoto yango ezalaki kotambola liboso na bango kino ekendeki kotelema na likolo ya esika oyo Mwana azalaki.
Mgbe ha nụrụ okwu eze, ha pụrụ gawa, ma kpakpando ahụ ha hụrụ nʼọwụwa anyanwụ pụtakwara ọzọ, na-aga nʼihu ha ruo mgbe ọ bịara guzo nʼelu ebe nwantakịrị ahụ nọ.
10 Tango kaka bamonaki lisusu monzoto yango, batondisamaki na esengo.
Ha ṅụrịrị ọṅụ nke ukwuu mgbe ha hụrụ kpakpando ahụ.
11 Bakomaki na ndako yango, bamonaki Mwana elongo na Mari, mama na Ye, mpe bagumbamelaki Ye; bongo bafungolaki mabenga na bango mpe babonzelaki Ye biloko oyo lokola bakado: wolo, malasi ya ansa mpe mire.
Ka ha banyere nʼụlọ ahụ, ha hụrụ nwantakịrị ahụ na nne ya Meri, ha gburu ikpere nʼala ma kpọọrọ ya isiala. Ha meghere akpa akụ ha nye ya onyinye ọlaedo na ọkpụrụkpụ eso osisi na-esi isi ụtọ a na-akpọ frankisens, ya na máá.
12 Sima na yango, Nzambe akebisaki bango kati na ndoto ete bazonga lisusu te epai ya Erode. Boye, bazongaki na mboka na bango na nzela mosusu.
Nʼihi na a dọrọ ha aka na ntị na nrọ ka ha ghara ịlaghachikwuru Herọd, ha sitere nʼụzọ ọzọ laghachi obodo ha.
13 Sima na bato ya mayele kokende, anjelu na Nkolo abimelaki Jozefi kati na ndoto mpe alobaki na ye: « Telema, kamata Mwana elongo na mama na Ye; bokima na Ejipito mpe bowumela kuna kino tango nakoyebisa yo lisusu ete bozonga, pamba te Erode akoluka koboma Mwana. »
Mgbe ndị amamihe ahụ lasịrị, mmụọ ozi Onyenwe anyị mere ka Josef hụ ya na nrọ, ọ sịrị ya, “Bilie ọsịịsọ kpọrọ nwantakịrị a na nne ya gbalaa Ijipt. Alọghachikwala tutu ruo mgbe m ga-agwa gị, nʼihi na Herọd na-achọ nwantakịrị a ka o gbuo ya.”
14 Jozefi atelemaki, azwaki Mwana elongo na mama na Ye, kaka na butu wana, mpe akimaki na Ejipito
Nʼoge abalị, Josef biliri kpọrọ Meri na nwantakịrị ahụ gbalaa Ijipt.
15 epai wapi awumelaki kino na kufa ya Erode, mpo ete makambo oyo Nkolo alobaki na nzela ya mosakoli ekokisama: « Wuta na Ejipito, nabengaki mwana na Ngai. »
Ebe ahụ ka ha nọgidere tutu ruo mgbe Herọd nwụrụ. Nke a mere ka okwu ahụ Onyenwe anyị kwuru site nʼọnụ onye amụma mezuo. “Ọ bụkwa site nʼIjipt ka m kpọpụtara nwa m.”
16 Tango Erode asosolaki ete bato ya mayele bakosi ye, atombokaki makasi mpe apesaki mitindo ete baboma bana mike nyonso ya mibali ya mibu mibale kino na se, oyo bazalaki na Beteleemi mpe na zingazinga na yango, kolanda tango oyo bato ya mayele bayebisaki ye na tina na eleko oyo monzoto ebimaki.
Iwe were Herọd nke ukwuu mgbe ọ chọpụtara na ndị amamihe ahụ aghọọla ya aghụghọ. Nʼihi ya, o nyere iwu banyere Betlehem na obodo nta ndị ọzọ gbara ya gburugburu, ka ha gbuo ụmụntakịrị niile nọ nʼobodo ndị a, bụ ndị gbara site nʼafọ abụọ gbadaa, dị ka ihe ọ nụtara site nʼọnụ ndị amamihe si dị.
17 Boye nde ekokisamaki makambo oyo mosakoli Jeremi alobaki:
E sitekwara otu a mezuo amụma ahụ Jeremaya buru sị,
18 « Makelele moko eyokani na Rama, makelele ya kolela makasi mpe ya matanga: Rasheli azali kolela bana na ye; aboyi kobondisama, pamba te bazali lisusu na bomoi te. »
“A nụrụ otu olu na Rema, ịkwa akwa na oke iru ụjụ dị, Rechel na-akwa akwa nʼihi ụmụ ya; ọ dịghị nkasiobi ọbụla dịrị ya, nʼihi na ha adịghịkwa.”
19 Sima na kufa ya Erode, anjelu na Nkolo abimelaki Jozefi kati na ndoto, kuna na Ejipito,
Mgbe Herọd nwụrụ, mmụọ ozi Onyenwe anyị bịakwutere Josef na nrọ nʼIjipt
20 mpe alobaki na ye: « Telema, kamata Mwana elongo na mama na Ye, mpe zonga kati na mokili ya Isalaele, pamba te bato oyo bazalaki koluka koboma Mwana basili kokufa. »
sị ya, “Bilie, kpọrọ nwantakịrị ahụ na nne ya laghachi nʼala Izrel nʼihi na ndị na-achọ igbu ya anwụọla.”
21 Jozefi atelemaki, azwaki Mwana elongo na mama na Ye mpe akendeki na mokili ya Isalaele.
Ya mere, o biliri, kpọọrọ nwantakịrị ahụ na nne ya, laghachi nʼala Izrel.
22 Kasi tango ayokaki ete Arikelawusi akitanaki na tata na ye, Erode, na bokonzi kati na Yuda, abangaki kokende kuna; kasi Nzambe akebisaki Jozefi kati na ndoto, mpe Jozefi akendeki kati na etuka ya Galile
Mgbe ọ nụrụ na eze ọhụrụ gbanwere Herọd na Judịa bụ nwa ya a na-akpọ Akelus, egwu tụrụ Josef ịlaghachi ebe ahụ. Ma nʼihi na adọwo ya aka na ntị na nrọ, ọ wezugara onwe ya gaa nʼakụkụ Galili.
23 epai wapi avandaki kati na engumba Nazareti, mpo ete makambo oyo basakoli balobaki ekokisama: « Bakobenga Ye moto ya Nazareti. »
Ọ gara biri nʼobodo a na-akpọ Nazaret. E sitekwara otu a mezuo okwu ọnụ ndị amụma sị na, “A ga-akpọ ya onye Nazaret.”

< Matayo 2 >