< Levitike 6 >

1 Yawe alobaki na Moyize:
Onyenwe anyị gwara Mosis sị,
2 « Soki moto asali masumu mpe abuki mobeko ya Yawe na kokosa moninga na ye mpo na eloko oyo babombisaki epai na ye to oyo adefaki to oyo ayibaki to oyo abotolaki na makasi
“Ọ bụrụ na onye ọbụla emehie bụrụ onye na-ekwesighị ntụkwasị obi nye Onyenwe anyị, site nʼiduhie onye agbataobi ya banyere ihe e tinyere ya nʼaka idebe, maọbụ izunarị mmadụ ihe, maọbụ iji aghụghọ nara mmadụ ibe ya ihe;
3 to atako amoni eloko oyo ebungaki, kasi akosi mpe alapi ndayi ya lokuta na tina na moko kati na masumu oyo moto akoki kosala;
maọbụ site nʼijide ihe furu efu nke ọ chọtara ghaa ụgha banyere ya. Ma ọ bụrụ na ha a ṅụọ iyi na ha ejighị ya, maọbụ gbasara ụdị mmehie mmadụ pụrụ ime.
4 moto oyo asali masumu ya boye mpe amemi ngambo, akozongisa eloko oyo ayibisaki to oyo abotolaki na makasi to oyo babombisaki epai na ye to oyo amonaki sima na kobungisa yango.
Mgbe ha mehiere nʼụzọ ọbụla nʼime ụzọ ndị a niile, ghọta na ikpe mara ha. Ha aghaghị inyeghachi onye nwe ihe ahụ ha zuru nʼohi, maọbụ ihe ha pụnara nʼike, maọbụ ihe e nyere ya idebe, ma ọ bụkwanụ ihe ahụ furu efu ọ chọtara,
5 To lisusu, akozongisa eloko nyonso oyo na tina na yango ye alapaki ndayi ya lokuta mpe akobakisa eteni moko kati na biteni mitano. Akozongisa yango na nkolo eloko na mokolo oyo akobonza mbeka na ye mpo na masumu.
maọbụ ihe ọbụla ọ ṅụrụ nʼiyi ụgha. Ọ ga-akwụghachi ihe ndị a niile nʼuju, tụkwasịkwa otu ụzọ nʼime ụzọ ise nke ọnụahịa ihe ahụ, nyeghachi ya onye nwe ya, nʼụbọchị ahụ ọ ga-eweta aja ikpe ọmụma ya.
6 Mpe akomema epai ya Nganga-Nzambe mbeka na ye mpo na kozongisa boyokani elongo na Yawe. Akomema meme ya mobali oyo ezanga mbeba; akozwa yango kati na bameme mpe bantaba na ye kolanda ndenge okokata.
Ọ ga-ewetara onye nchụaja nʼihu Onyenwe anyị, aja ikpe ọmụma ya nke bụ ebule na-enweghị ntụpọ site nʼigwe anụ, nke ọnụahịa ya ga-abụ ihe ahụ e gbubiri iji ịkwụ ụgwọ mmehie.
7 Nganga-Nzambe akosala mpo na moto wana, liboso ya Yawe, mosala ya bolimbisi masumu; mpe moto yango akolimbisama. »
Nʼụzọ dị otu a, onye nchụaja ga-ekpuchikwara ya mmehie ya nʼihu Onyenwe anyị, a ga-agbaghakwara ha nʼihi ihe ọbụla ha mere nke ikpe ji maa ha.”
8 Yawe alobaki na Moyize:
Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya,
9 « Pesa mitindo oyo epai ya Aron mpe epai ya bana na ye ya mibali: ‹ Tala mobeko mpo na mbeka ya kotumba: mbeka ya kotumba ekowumela na likolo ya motalaka ya etumbelo butu mobimba kino na tongo, mpe moto ya etumbelo ekozikisa yango.
“Nye Erọn na ụmụ ya ndị ikom iwu sị: ‘Ndị a bụ usoro iwu metụtara aja nsure ọkụ. Aja nsure ọkụ ga-adịgide nʼekwu ahụ dị nʼebe ịchụ aja site nʼabalị ruo nʼụtụtụ. A ga-akwanyekwa ọkụ na-adị nʼebe ịchụ aja hapụ ya ka o nwuo abalị niile.
10 Nganga-Nzambe akolata nzambala na ye ya lino mpe bakaputula na ye ya lino. Akolongola putulu ya mbeka ya kotumba oyo moto ezikisaki na etumbelo mpe akotia yango na mopanzi ya etumbelo.
Mgbe chi bọrọ, onye nchụaja ga-eyiri uwe ime ahụ ya nke akwa ọcha, nakwa uwe elu ahụ ya, gaa kpopu ntụ dị nʼekwu nke ebe ịchụ aja nsure ọkụ ahụ, wụsa ha nʼakụkụ ebe ịchụ aja ahụ.
11 Sima, akolongola bilamba wana mpe akolata bilamba mosusu; bongo akomema putulu na libanda ya molako, na esika ya peto.
Mgbe o mesịrị nke a, ọ ga-agbanwe uwe ya, kporo ntụ ahụ, buru ya pụọ nʼazụ ogige ahụ gaa wufuo ya nʼebe ahụ e mere ka ọ dị ọcha.
12 Moto ya etumbelo ekobanda kopela tango nyonso mpe ekoki kokufa te. Nganga-Nzambe akobanda kobakisa tongo nyonso bakoni mpe kotia mbeka ya kotumba na likolo ya bakoni; bongo akotumba biteni ya mafuta ya mbeka ya boyokani na likolo na yango.
Ọkụ dị nʼebe ịchụ aja ga na-enwu mgbe niile, a gaghị ekwe ka ọ nyụọ. Nʼụtụtụ niile onye nchụaja ga-akwanye ya nkụ ọhụrụ, tụkwasịkwa aja nsure ọkụ nʼelu ya surekwaa abụba aja udo nʼelu ya.
13 Moto esengeli kopela tango nyonso na etumbelo, ekoki kokufa te. ›
Ọkụ ga-enwugide nʼebe ịchụ aja mgbe niile. A gaghị ekwe ka ọ nyụọ mgbe ọbụla.’
14 ‹ Tala mobeko mpo na likabo ya gato: ‘Bana mibali ya Aron bakomema yango liboso ya Yawe, liboso ya etumbelo.
“‘Ndị a bụ usoro iwu gbasara onyinye mkpụrụ ọka. Ụmụ Erọn ndị ikom ga-eguzo nʼihu ebe ịchụ aja iche ya nʼihu Onyenwe anyị.
15 Nganga-Nzambe akozwa na loboko na ye ndambo ya farine, mafuta mpe ansa nyonso oyo ezali na likolo ya gato; akotumba yango na likolo ya etumbelo mpo ete solo kitoko na yango esepelisa Yawe mpe ezala ekaniseli mpo na Ye.
Mgbe ahụ, onye nchụaja ga-ekpoju ọka ahụ a kwọrọ nke ọma, na ụfọdụ mmanụ oliv, tinyere ụda na-esi isi ụtọ nʼaka ya dịka oke ncheta. Kpọọ ya ọkụ nʼelu ebe ịchụ aja ka ọ nọchie anya onyinye ahụ niile, nke isisi ya dị Onyenwe anyị ezi mma.
16 Ndambo oyo ekotikala, Aron mpe bana na ye ya mibali bakolia yango. Kasi bakolia yango ezanga levire, na Esika ya bule, na libanda ya Ndako ya kapo ya Bokutani.
Erọn na ụmụ ya ndị ikom ga-eri nke fọdụrụnụ. Ma a ga-eri ya na-ejighị ihe na-eko achịcha, nʼime ebe nsọ, nʼogige ụlọ nzute ka a ga-anọ eri ya.
17 Bakotumba yango te na levire: ezali eteni oyo napesi bango kati na bambeka na Ngai oyo etumbami na moto: ezali eloko ya bule penza lokola mbeka mpo na masumu mpe mpo na kozongisa boyokani.
Agaghị etinye ya ihe na-eko achịcha ma a na-eghe ya. Enyela ya ka ọ bụrụ oke ruuru ha site nʼonyinye nsure ọkụ e chere nʼihu m. Ha bụkwa ihe dịkarịsịrị nsọ, dịka aja ikpe ọmụma na aja mmehie.
18 Bana mibali nyonso kati na bakitani ya Aron bakolia yango. Ezali eteni na bango mpo na tango nyonso mpe na milongo nyonso kati na makabo bazikisa na moto mpo na Yawe. Bato nyonso oyo bakosimba yango bakokoma bule.’ › »
Nwoke ọbụla sitere nʼagbụrụ Erọn, onye nchụaja, nwere ike iri ya. Ọ bụ oke ọ ga na-eketa site nʼonyinye nsure ọkụ niile echere nʼihu Onyenwe anyị ruo nʼọgbọ niile na-abịa. Ihe ọbụla metụrụ ha ahụ ga-aghọ ihe dị nsọ.’”
19 Yawe alobaki na Moyize:
Onyenwe anyị gwakwara Mosis sị,
20 « Tala likabo oyo Aron mpe bana na ye ya mibali bakopesa epai na Yawe, na mokolo oyo bakozwa epakolami: eteni ya zomi ya efa ya farine lokola likabo ya tango nyonso. Na tongo, akopesa eteni moko kati na biteni mibale; mpe eteni mosusu, na pokwa.
“Nke a bụ aja Erọn na ụmụ ya ndị ikom ga-achụrụ Onyenwe anyị nʼụbọchị a ga-ete ya mmanụ. Ọ ga-abụ ọtụtụ ruru lita abụọ nke ọka dị ezi mma dịka aja onyinye a na-achụ mgbe niile. Ha ga-enye otu ọkara ya nʼụtụtụ, nye nke ọzọ nʼuhuruchi.
21 Okosangisa yango liboso na mafuta, bongo okokalinga yango na kikalungu. Sima okobonza yango na biteni lokola mbeka oyo solo kitoko na yango ekosepelisa Yawe.
Ha ga-etinye ya mmanụ, ghee ya nʼite. Ị ga-ebubata ya mgbe a gwọkọrọ ya nke ọma, chee ya dịka aja ọka a nyawasịrị anyawasị nke isisi ya dị Onyenwe anyị ezi mma.
22 Mwana mobali ya Aron oyo bakopakola mafuta mpo na kokitana na Aron lokola Nganga-Nzambe akobonza mpe likabo yango: ezali likabo ya libela mpo na Yawe mpe bakotumba yango mobimba.
Nwa nwoke ahụ nke ga-anọchi ya dịka onye nchụaja e tere mmanụ bụ onye ga-akwado ya. Ọ bụ oke ruuru Onyenwe anyị ebighị ebi, bụrụkwa nke a ga-esure ọkụ kpamkpam.
23 Mbeka nyonso oyo Nganga-Nzambe akobonza na mobimba na yango ekoliama te, ezala ata ndambo na yango. »
Onyinye mkpụrụ ọka ọbụla nke onye nchụaja nyere ka a ga-akpọ ọkụ kpamkpam. A gaghị eri ya eri.”
24 Yawe alobaki na Moyize:
Onyenwe anyị sịrị Mosis,
25 « Loba na Aron mpe na bana na ye ya mibali: ‹ Tala mobeko ya mbeka mpo na masumu: ‘Bakokata kingo ya mbeka mpo na masumu liboso ya Yawe, na esika oyo bakataka bakingo ya bambeka ya kotumba; ezali mbeka ya bule penza.
“Gwa Erọn na ụmụ ya ndị ikom, sị, ‘Ndị a bụ usoro iwu unu ga-edebe banyere aja mmehie. A ga-egbu anụ aja mmehie nʼihu Onyenwe anyị, nʼebe ahụ a na-egbu anụ aja nsure ọkụ. Ọ bụ ihe dịkarịsịrị nsọ.
26 Nganga-Nzambe oyo azali kobonza yango mpo na masumu akolia yango na Esika ya bule, na libanda ya Ndako ya kapo ya Bokutani.
Onye nchụaja chụrụ ya ga-eri anụ ya, ọ bụ nʼakụkụ ebe nsọ ahụ, ya bụ nʼogige ụlọ nzute ahụ ka a ga-anọ rie ya.
27 Moto nyonso oyo akosimba mosuni na yango akozala bule. Soki kaka makila ya mbeka yango ezwi elamba na ye, asengeli kosukola esika oyo ezwi makila, na esika moko ya bule.
Ihe ọbụla metụrụ anụ nke ọbụla aka, ga-aghọ ihe dị nsọ. Ọ bụrụkwa na ọbara ya efesa nʼuwe ọbụla, ị ga-asụ uwe ahụ nʼakụkụ ebe nsọ ahụ.
28 Bongo soki basaleli nzungu ya mabele mpo na kokalinga mosuni ya mbeka mpo na masumu, bakopanza nzungu yango. Soki bakalingi yango na nzungu ya bronze, bakopalola nzungu yango mpe bakosukola yango na mayi ebele.
A ghaghị itiwa ite aja e ji sie anụ ahụ. Ọ bụrụkwanụ nʼite bronz ka e siri ya, a ga-asa ite ahụ mmiri nke ọma, saa ya ka ọ dị ezi ọcha.
29 Kaka mibali oyo bazali na libota ya Nganga-Nzambe nde bakoki kolia yango, pamba te ezali eloko ya bule penza.
Nwoke ọbụla a mụrụ nʼezinaụlọ ndị nchụaja nwere ike iri anụ ahụ, ọ bụ ihe dịkarịsịrị nsọ.
30 Nzokande, mbeka moko te mpo na masumu ekoki koliama soki bamemi makila na yango na Ndako ya kapo ya Bokutani mpo na kosala mosala ya bolimbisi masumu; esengeli kotumba yango na moto.’ › »
Ma a gaghị eri anụ aja mmehie ọbụla, bụ nke e webatara ọbara ya nʼime ụlọ nzute maka ikpuchi mmehie nʼEbe nsọ ahụ. Aghaghị ịkpọ ya ọkụ.

< Levitike 6 >