< Levitike 26 >

1 Bokosalaka te banzambe ya bikeko to kotelemisa ekeko to likonzi ya bule mpe bokotiaka te kati na mokili na bino ata libanga moko oyo batia bililingi mpo ete bofukamela yango; pamba te nazali Yawe, Nzambe na bino.
“‘Unu emerela onwe unu arụsị ọbụla, maọbụ guzobe oyiyi apịrị apị, maọbụ ogidi nkume ọbụla ọtọ, nye onwe unu. Unu edokwala nkume a pịrị apị ọbụla nʼala unu maka ịkpọ isiala nye ya. Abụ m Onyenwe anyị Chineke unu.
2 Bokobatelaka mikolo na Ngai ya Saba mpe bokotosaka Esika na Ngai ya bule. Nazali Yawe.
“‘Debenụ iwu niile m nyere maka ụbọchị Izuike m, sọpụkwaranụ ebe nsọ m. Abụ m Onyenwe anyị.
3 Soki botosi mibeko na Ngai, soki botosi mitindo na Ngai mpe bosaleli yango,
“‘Ọ bụrụ na unu ejegharịa nʼụkpụrụ m, lezie anya debe iwu m niile,
4 nakonokisela bino mvula na tango na yango; mabele mpe banzete ya zamba ekobota bambuma na yango.
aga m enye unu mmiri ozuzo nʼoge ya, nke ga-eme ka ala unu mịa ọtụtụ ihe ubi. Osisi unu niile ga-ejupụtakwa na mkpụrụ mgbe niile.
5 Mosala ya kobeta ble ekowumela kino na tango ya kobuka, mpe tango ya kobuka ekowumela kino na tango ya kolona; bokolia na kotonda mpe bokovanda na kimia kati na mokili na bino.
Unu ga-anọgide na-azọcha ọka tutu ruo mgbe unu ga-aghọ mkpụrụ vaịnị unu, owuwe ihe ubi mkpụrụ vaịnị unu ga-adịgidekwa ruo oge ịkụ mkpụrụ nʼubi. Nʼụzọ dị otu a, unu ga-enwe nri ga-ezuru unu, unu ga-ebikwa nʼudo nʼala unu.
6 Nakotia kimia kati na mokili, bokolala pongi, mpe moto moko te akotungisa bino; nakolongola banyama oyo ebomaka kati na mokili mpe bitumba ekozala lisusu te kati na mokili na bino.
“‘Aga m eme ka udo dịrị nʼala ahụ, unu ga-edina ala, ọ dịghịkwa onye ga-eme ka unu tụọ egwu ọbụla. Aga m ewezuga site nʼetiti unu ajọ anụ ọhịa, mma agha agaghị esitekwa nʼala unu bi nʼime ya gafee.
7 Bokobengana banguna liboso na bino mpe bakokufa na mopanga liboso na bino.
Unu ga-achụ ndị iro unu ọsọ. Ha ga-ada nʼihu unu site na mma agha.
8 Bato mitano kati na bino bakolanda bato nkama moko, bato nkama moko kati na bino bakolanda bato nkoto zomi; mpe banguna na bino bakokufa liboso na bino na mopanga.
Mmadụ ise nʼime unu ga-achụ narị mmadụ ọsọ. Narị mmadụ nʼetiti unu ga-achụkwa iri puku mmadụ ọsọ. Ndị iro unu ga-ada nʼihu unu site na mma agha.
9 Nakosalela bino ngolu, nakopesa bino mabota nakokomisa bino ebele mpe nakobatela boyokani na Ngai elongo na bino.
“‘Aga m eji ihuọma leta unu, mee ka unu mụbaa ma jupụta nʼọnụọgụgụ. Aga m eme ka ọgbụgba ndụ m nʼebe unu nọ dịgide.
10 Bambuma ya bilanga na bino ekozala penza ebele mpe ekosala ete bokolia tango molayi bambuma oyo bokozala na yango kati na bibombelo; kino bokokaba mosusu mpo ete bokotisa bambuma ya sika.
Unu ga-enwebiga mkpụrụ ubi oke ruo na mgbe unu ka nọ na-eri ndị ochie unu ga-ewezuga ha nʼakụkụ maka inye ohere iwebata ihe ubi ọhụrụ.
11 Nakotia Ndako na Ngai kati na bino mpe nakotombokela bino te.
Aga m eme ka ebe obibi m dịrị nʼetiti unu. Agaghị m asọ unu oyi.
12 Nakotambola kati na bino mpo ete nazala Nzambe na bino mpe bino bozala bato na Ngai.
Aga m ejegharị nʼetiti unu, bụrụ Chineke unu, unu ga-abụkwa ndị m.
13 Nazali Yawe, Nzambe na bino, oyo abimisaki bino na Ejipito mpo ete bozala lisusu bawumbu kuna te; nakataki basinga ya bikangiseli na bino mpe nabimisaki bino lokola balongi.
Nʼihi na abụ m Onyenwe anyị Chineke unu onye kpọpụtara unu site nʼala Ijipt, ka unu ghara ịbụ ndị ohu ọzọ. Etijiela m mkpọrọ igwe nke ịbụ ohu unu, mee ka unu bụrụ ndị ji nganga ejegharị.
14 Soki boboyi kotosa mpe kosalela mibeko wana nyonso,
“‘Ma ọ bụrụ na unu ajụ ige m ntị, jụkwa imezu ihe ndị a m nyere unu iwu ya,
15 soki bobwaki bikateli na Ngai, mpe soki molimo na bino etombokeli malako na Ngai kino koboya kosalela mibeko na Ngai nyonso mpe kokata boyokani na Ngai,
ọ bụrụ na unu ajụ ịgbaso ụkpụrụ m, sọọ iwu m ndị a oyi, si otu a mebie ọgbụgba ndụ m,
16 tala ndenge nakosala bino: nakokotisa kati na bino mobulu, libebi, bokono oyo ekoboma bino miso mpe ekobebisa bomoi na bino; bokolona milona na bino na pamba mpe banguna na bino bakolia yango.
mgbe ahụ, aga m eme ka oke ụjọ, na ọrịa na-ebibi ebibi, na ahụ ọkụ, bịakwasị unu. Ọrịa ndị a ga-eme ka anya unu daa mba, ọ ga-eripịakwa anụ ahụ unu. Unu ga-akụ mkpụrụ ubi nʼubi unu ma ndị iro unu ga-eri ha.
17 Nakotombokela bino, mpe bokokweya liboso ya banguna na bino; ba-oyo bayinaka bino bakokonza bino mpe bokokima ata soki moto moko te azali kolanda bino.
Aga m eguzo megide unu nʼoge ibu agha, mee ka ndị iro unu merie unu nʼagha. Unu ga-agba ọsọ mgbe onye ọbụla na-adịghị achụ unu ọsọ. Ndị kpọrọ unu asị ga-achịkwa unu.
18 Soki atako bongo boyoki kaka te, nakopesa bino bitumbu mbala sambo mpo na masumu na bino.
“‘Ọ bụrụ na unu anọgidesie ike ju ige m ntị nʼagbanyeghị ihe ndị a, aga m enye unu ntaramahụhụ dị okpukpu asaa nʼihi mmehie unu.
19 Nakosilisa makasi na bino, nakokomisa lola makasi lokola ebende mpo na bino, mpe mabele na bino lokola bronze.
Aga m etiji ịnya isi nganga unu, mee ka mbara eluigwe dịịrị unu dịka igwe, elu ala unu na-azọkwasị ụkwụ ga-adịkwa dịka bronz.
20 Makasi na bino ekosila na pamba, mpo ete mabele na bino ekobota te mpe banzete ekobota te bambuma na yango.
Unu ga-adọgbu onwe unu nʼọrụ nʼefu, nʼihi na ala unu agaghị emepụtara unu ihe omume ya, osisi nke ala unu agaghị amịkwa mkpụrụ ya.
21 Soki botelemeli Ngai mpe boboyi koyoka Ngai, nakopesa bino bitumbu mbala sambo mpo na masumu na bino.
“‘Ọ bụrụkwa na mgbe nke a mesịrị, unu anọgidekwa jụ ime ihe m nyere nʼiwu, aga m eme ka ntaramahụhụ unu dịrị ukwuu, ugboro asaa ọzọ, nʼihi mmehie unu.
22 Nakotinda kati na mokili na bino banyama ya zamba oyo ekoboma bana na bino, ekolia bibwele na bino mpe ekosilisa koboma bino kino banzela na bino ezanga bato.
Aga m ezite anụ ọhịa megide unu. Ha ga-adọgbu ụmụ unu, bibie anụ ụlọ unu, meekwa ka unu dị nta nʼọnụọgụgụ, ruo na ndị a ga-ahụ nʼokporoụzọ unu ga-adị ole na ole.
23 Soki bitumbu yango ekoki kaka te mpo na kozongisa bino na nzela, nzokande bokobi kaka koboya kotosa Ngai,
“‘Ọ bụrụkwa na unu anọgide jụ ịdọ aka na ntị m, chie ntị nọgide na-ebu agha nnupu isi unu megide m,
24 Ngai mpe nakotelemela bino mpe nakopesa bino bitumbu mbala sambo mpo na masumu na bino.
mụ onwe m ga-ebu agha megide unu. Aga m eti unu ugbo ihe otiti asaa, nʼihi mmehie unu.
25 Nakopesa nzela na mopanga mpo ete eboma bino mpo na kozongisa mabe na mabe likolo ya boyokani oyo bino bobebisi. Tango bokosangana kati na bingumba na bino, nakotindela bino bokono oyo ebomaka, mpe nakokaba bino na maboko ya monguna.
Aga m ewebata mma agha nʼebe unu nọ, ịbọ ọbọ nʼihi ọgbụgba ndụ m unu mebiri. Mgbe unu ga-agba ọsọ gbaba nʼobodo unu, aga m ezite ihe mbibi ga-ebibi unu nʼebe ahụ. Aga m enyefekwa unu nʼaka ndị iro unu.
26 Tango nakopimela bino bilei, basi zomi bakotumba mapa na fulu moko mpe bakobanda kopesa bino mapa yango na kilo: bokolia kasi bokotonda te.
Aga m eme ka unu hapụ inwe ihe oriri ga-ezuru unu. Otu ite nri naanị ka ndị inyom iri ga-eji sie nri ha nwere. Ha ga-eji ihe ọtụtụ tụọ ya mgbe ha na-eke ya. Unu ga-eri ya, ma afọ agaghị eju unu.
27 Soki, atako bongo, boyoki kaka te mpe bokobi kaka kotelemela Ngai,
“‘Ọ bụrụkwa na unu agaa nʼihu jụ ige m ntị nʼagbanyeghị ihe ndị a, nọgide na-emegide m,
28 Ngai mpe nakotelemela bino lisusu na kanda makasi mpe nakopesa bino bitumbu mbala sambo mpo na masumu na bino.
mgbe ahụ, aga m egosi unu oke iwe m, nye unu ntaramahụhụ dị okpukpu asaa nʼihi mmehie unu.
29 Bokolia bana na bino ya mibali mpe ya basi.
Unu ga-eri anụ ụmụ unu ndị ikom, na anụ ụmụ unu ndị inyom.
30 Nakokweyisa bisambelo na bino ya likolo ya bangomba, nakokweyisa bitumbelo na bino ya malasi, nakotia bibembe na bino likolo ya bibembe ya banzambe na bino ya bikeko mpe nakotombokela bino.
Aga m ebibikwa ụlọ arụsị unu niile dị nʼelu ugwu, gbutuo ebe ịchụ aja niile unu na-esure ihe nsure ọkụ na-esi isi. Aga m atụkọta ozu unu nʼelu arụsị unu na-enweghị ume ndụ, ka unu bụrụ ihe m na-asọ oyi.
31 Nakokomisa bingumba na bino bisobe, nakobebisa bisika na bino ya bule mpe nakosepela te lisusu na solo kitoko ya malasi na bino.
Aga m eme ka obodo unu niile tọgbọrọ nʼefu, kụdasịakwa ebe nsọ unu niile. Agaghị m anabatakwa isisi ụtọ nke aja unu.
32 Ngai moko nakokotisa mobulu kati na mokili, mpe ezala banguna na bino oyo bakoya kovanda kati na yango bakokamwa.
Aga m eme ka ala unu tọgbọrọ nʼefu, mee ka ọnọdụ ịdị ala unu bụrụ ihe ga-eju ndị iro unu ga-ebi nʼime ya anya.
33 Nakopanza bino kati na bikolo ya bapaya mpe nakobengana bino na mopanga; mokili na bino ekozanga bato mpe bingumba na bino ekokawuka.
Aga m achụsa unu na mba niile, mịpụta mma agha m jiri ya chụso unu ọsọ. Ala unu ga-atọgbọrọ nʼefu, a ga-etikpọkwa obodo unu niile.
34 Boye, mokili na bino ekosepela Saba na yango mibu nyonso oyo ekozanga bato mpe oyo bokokima epai ya banguna na bino; ekozwa bopemi mpe ekosepela Saba na yango.
Mgbe ahụ, ala ahụ ga-ezu ike, ogologo oge ndị ahụ niile ọ ga-atọgbọrọ nʼefu. Mgbe unu ga-anọ dịka ndị ohu nʼala ndị iro unu. Ala ahụ ga-ezu ike, imejupụta afọ izuike ya niile.
35 Na tango nyonso oyo ekozanga bato, ekozwa bopemi oyo ezalaki na yango na tango ya Saba na bino tango bozalaki kovanda kati na yango.
Ogologo oge niile ala ahụ tọgbọrọ nʼefu, ala ahụ ga-ezu ike, ụdị izuike ọ na-enweghị nʼafọ izuike ndị ahụ unu bi nʼime ya.
36 Bongo na mikili ya banguna na bino, bato oyo bakotikala na bomoi kati na bino, nakolembisa bango nzoto: bakokima ata makelele ya lokasa oyo mopepe eningisi, bakokima lokola nde bazali kokima liboso ya mopanga mpe bakobambana na mabele ata soki moto moko te azali kolanda bango.
“‘Ma ndị ahụ fọdụrụ ndụ nʼime unu, aga m etinye ịda mba nʼobi ha nʼala ndị iro ha. Mkpọtụ ahịhịa nke ifufe na-ebugharị ga-eme ka ha gbapụ ọsọ. Ha ga-agba ọsọ dịka ndị si nʼihu mma agha na-agba ọsọ. Ha ga-ada mgbe onye ọbụla na-adịghị achụ ha ọsọ.
37 Bakokweya moko likolo ya moninga lokola nde bazali kokima mopanga ata soki moto moko te azali kolanda bango. Bokolonga te liboso ya banguna na bino.
Nʼezie, ha ga-agba ọsọ mgbe onye ọbụla na-adịghị achụ ha ọsọ. Ha ga-adagide ibe ha mgbe ha na-agba ọsọ a, dịka ndị si nʼebe a na-alụ agha na-agbapụ ọsọ. Unu agaghị enwe ike iguzo nʼihu ndị iro unu.
38 Bokokufa kati na bikolo ya bapaya mpe mokili ya banguna na bino ekolia bino.
Unu ga-ala nʼiyi nʼetiti ndị mba ọzọ, ala ndị iro unu ga-eri unu.
39 Kati na mikili ya banguna na bino, bato oyo bakotikala na bomoi kati na bino bakokufa kuna mpo na masumu na bango moko mpe mpo na masumu ya batata na bango.
Ndị ahụ a hapụrụ na ndụ nʼetiti unu ga-ata ahụhụ nʼala ndị iro ha nʼihi mmehie ha. Ha ga-atakwa ahụhụ nʼihi mmehie nke nna nna ha.
40 Nzokande, soki bakotubela masumu na bango mpe masumu ya batata na bango, misala na bango ya mabe mpe botomboki na bango liboso na Ngai,
“‘Ma ọ bụrụ na ha ekwupụta mmehie ha niile, na mmehie niile nke ndị nna nna na ha na ha mehiere megide m, mmehie ekwesighị ntụkwasị obi ha, na mmehie nnupu isi ha, nke ha mehiere megide m,
41 oyo mpo na yango, Ngai natelemelaki bango mpe namemaki bango na mokili ya banguna na bango, wana mitema na bango oyo ekatama ngenga te ekomikitisa mpe bakozwa lifuti ya mabunga na bango,
nke mere ka m doo onwe m imegide ha, na izipụ ha gaa nʼala ndị iro ha, ọ bụrụ na ha eweda onwe ha ala nabata ntaramahụhụ m nyere ha nʼihi mmehie ha
42 nakokanisa boyokani na Ngai, oyo nasalaki elongo na Jakobi, na Izaki mpe na Abrayami; mpe nakokanisa mokili.
aga m echeta ọgbụgba ndụ mụ na Jekọb gbara, ọgbụgba ndụ mụ na Aịzik gbara, na ọgbụgba ndụ mụ na Ebraham gbara. Aga m echeta ala ahụ.
43 Boye, wana bakotika mokili mpe wana mokili yango ekosepela Saba na yango, na mikolo nyonso oyo yango ekozala ezanga bato, na tango yango, bakozwa lifuti ya mabe na bango mpo ete batosaki mibeko na Ngai te mpe batombokelaki bikateli na Ngai.
Ma ala ahụ aghaghị ịtọgbọrọ nʼefu. Ọ ghakwaghị inwezu izuike ruuru ya, oge ndị ahụ ọ tọgbọrọ nʼefu, mgbe ha na-ebighị nʼime ya. Ha ga-anata ntaramahụhụ ruuru ha nʼihi na ha jụrụ iwu m, sọọkwa ụkpụrụ m oyi.
44 Nzokande, ezala tango bakozala kati na mokili ya banguna na bango, nakosundola bango te, nakotombokela bango te kino kobebisa bango mpe kokata boyokani na Ngai elongo na bango; pamba te Ngai nazali Yawe, Nzambe na bango.
Ma ewezugakwa ihe ndị a niile, agaghị m ajụ ha, maọbụ sọọ ha oyi, ruo na ibibi ha kpamkpam mgbe ahụ ha nọ nʼala ndị iro ha. Agakwaghị m emebi ọgbụgba ndụ mụ na ha gbara nʼihi na abụ m Onyenwe anyị Chineke ha.
45 Nakokanisa boyokani oyo nasalaki elongo na batata na bango, oyo Ngai nabimisaki na Ejipito, na miso ya bikolo mosusu, mpo ete nazala Nzambe na bango. Nazali Yawe. › »
Kama nʼihi ha, aga m echeta ọgbụgba ndụ ahụ mụ na nna nna ha gbara, ịbụ Chineke ha, ndị ahụ m kpọpụtara site nʼala Ijipt nʼihu mba niile. Abụ m Onyenwe anyị.’”
46 Oyo nde bikateli, mitindo mpe mibeko oyo Yawe atiaki kati ya Ye mpe bana ya Isalaele, na ngomba Sinai, na nzela ya Moyize.
Ndị a bụ iwu, na ụkpụrụ na ndụmọdụ Onyenwe anyị guzobere nʼugwu Saịnaị, nʼetiti ya onwe ya, na ụmụ Izrel, site nʼaka Mosis.

< Levitike 26 >