< Levitike 19 >

1 Yawe alobaki na Moyize:
Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya,
2 « Yebisa lisanga mobimba ya bana ya Isalaele: ‹ Bozala bule, pamba te Ngai Yawe, Nzambe na bino, nazali Bule.
“Gwa ọgbakọ ụmụ Izrel niile okwu sị ha: ‘Dịnụ nsọ, nʼihi na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị bụ Chineke unu, dị nsọ.
3 Moto nyonso kati na bino asengeli kotosa mama mpe tata na ye, mpe bosengeli kotosa mikolo na Ngai ya Saba. Nazali Yawe, Nzambe na bino.
“‘Onye ọbụla nʼime unu aghaghị ịsọpụrụ nne na nna ya, debekwa iwu m nyere maka ụbọchị izuike, nʼihi na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke unu.
4 Bomipesa te na banzambe ya bikeko to bomisalela te banzambe ya bikeko ya bibende; Ngai nazali Yawe, Nzambe na bino.
“‘Unu akpọla isiala nye arụsị, unu emekwarala onwe unu chi ndị e ji ọla kpụọ. Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke unu.
5 Tango bokobonza mbeka ya boyokani epai na Yawe, bosala yango na ndenge esengeli mpo ete endimama mpo na bolamu na bino.
“‘Mgbe unu ga-achụrụ Onyenwe anyị aja udo, soronụ ụkpụrụ m nyere unu chụọ ya, ka m nabata ya.
6 Bosengeli kolia yango kaka na mokolo oyo bobonzi yango lokola mbeka to na mokolo oyo elandi. Mpe eloko nyonso oyo ekotikala, bosengeli kozikisa yango na moto na mokolo ya misato.
Unu ga-eri ya nʼụbọchị ahụ unu chụrụ ya, maọbụ nʼụbọchị nke na-eso ụbọchị ahụ. Nke ọbụla fọdụrụ ruo ụbọchị nke atọ ka unu ga-esure ọkụ.
7 Kasi na mokolo yango ya misato, mbeka yango ekokoma mbindo; soki moto moko alie yango, nakondima yango lisusu te.
Ọ bụrụ na unu erie ya nʼụbọchị nke atọ ihe arụ ka ọ bụ. A gaghị anabata aja ọbụla unu ga-eri nʼụbọchị nke atọ.
8 Moto nyonso oyo akolia yango, akomema mokumba ya mabe na ye mpo ete asambwisi eloko oyo ezali bule mpo na Yawe, mpe basengeli kobengana ye kati na bato na ye.
Ikpe ga-ama onye ga-eri ya nʼụbọchị nke atọ nʼihi na o meela ka ihe nsọ Onyenwe anyị bụrụ ihe arụ. A ga-ekewapụ onye ahụ site nʼetiti ndị ya.
9 Tango okobuka mbuma ya bilanga na yo, okobuka yango te kino na mondelo, mpe okozonga te mpo na kolokota mbuma oyo ekokweya.
“‘Mgbe unu na-ewe ihe ubi, unu ewechala ihe niile dị nʼakụkụ ubi niile, maọbụ chịkọtachaa irighiri ihe ubi niile fọdụrụ nʼala.
10 Okobuka mpe te mbuma ya vino oyo ekotikala to kolokota oyo ekokweya. Okotika yango mpo na babola to bapaya: nazali Yawe Nzambe na yo.
A ghọrọchakwala mkpụrụ vaịnị niile mịrị nʼelu vaịnị gị, maọbụ chịkọrọ mkpụrụ ndị dara nʼala. Hapụrụ ha ụmụ ogbenye na ndị ọbịa, nʼihi na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke unu.
11 Okoyiba te, okoloba lokuta te, moto moko te akosa moninga na ye.
“‘Unu ezula ohi. “‘Unu aghala ụgha. “‘Unu aghọgbula ibe unu.
12 Okolapa te ndayi ya lokuta na Kombo na Ngai mpe okobebisa te bosantu ya Kombo ya Nzambe na yo. Nazali Yawe, Nzambe na yo.
“‘Unu aṅụla iyi ụgha, si otu a weta nkọcha nye aha Onyenwe anyị Chineke unu. Abụ m Onyenwe anyị.
13 Okonyokola te moninga na yo to okoyiba ye te. Okobomba te lifuti ya mosali na yo butu mobimba kino na tongo.
“‘Unu ejila ike pụnara onye agbataobi unu ihe ya, maọbụ zuru ihe o nwere nʼohi. “‘Kwụọnụ onye ọbụla unu goro ọrụ ụgwọ ọrụ ya ọsịịsọ. Unu echela ka chi bọọ tupu unu akwụọ ya ụgwọ ya.
14 Okolakela mabe te moto oyo akufa matoyi mpe okotia libaku te liboso ya mokufi miso, kasi okotosa Nzambe na yo. Nazali Yawe.
“‘Akọchala onye ntị chiri, edochikwarala onye ìsì ihe nʼụzọ. Tụọ egwu Chineke. Abụ m Onyenwe anyị.
15 Okosambisa na bosembo. Okokotela te, ezala mobola to mozwi. Okosambisa moninga na yo na bosembo.
“‘Unu ekpela ikpe na-ezighị ezi, unu elela mmadụ anya nʼihu mgbe unu na-ekpe ikpe, ma onye unu na-ekpe ikpe ọ bụ ọgaranya maọbụ ogbenye. Kama kpeenụ ikpe kwụ ọtọ.
16 Okokende te kotonga bato na yo bipai na bipai. Okosala eloko moko te oyo ekoyeisa pasi na bomoi ya moninga na yo. Nazali Yawe.
“‘Unu ejegharịla na-agbasa okwu nkwujọ nʼetiti ndị mmadụ. “‘Emela ihe ọbụla ga-ebutere onye agbataobi gị ọnwụ. Abụ m Onyenwe anyị.
17 Okoyina ndeko na yo te na motema na yo; kasi pamela moninga mpo ete omema ngambo te na likambo na ye.
“‘Akpọla nwanne gị asị nʼime obi gị. Tụọ onye agbataobi gị mmehie ya nʼihu ya, ka ị ghara iketa oke nʼikpe ọmụma dịrị ya.
18 Okozongisa mabe na mabe te to okobombela moko kati na bato na yo kanda te, kasi okolinga moninga na yo ndenge yo moko omilingaka. Nazali Yawe.
“‘Abọla ọbọ, ebukwala iro nʼobi megide onye ọbụla nʼetiti ndị gị. Kama hụ onye agbataobi gị nʼanya dịka i si hụ onwe gị nʼanya. Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị unu.
19 Okobatela bikateli na ngai: okosangisa nzoto te ya banyama mibale ya lolenge mibale ekesana; okolona mpe te na elanga na yo nkona mibale ekesana. Okolata te elamba oyo batongi na basinga mibale ekesana.
“‘Unu ga-edebe iwu m niile. “‘Unu ejila otu ụdị anụ ụlọ unu na-agba ụdị anụ ụlọ ọzọ dị iche. “‘Akụla ụdị mkpụrụ abụọ nʼubi. “‘Eyila uwe e ji ụzọ ihe abụọ, dịka ajị anụ na ogho dụọ.
20 Soki mobali moko asangisi nzoto na mwasi oyo azali mobandami ya mobali mosusu, kasi nanu bapeseli ye te biloko ya libala to kopesa ye bonsomi, esengeli mobali wana afuta lomande. Nzokande bango mibale, bakoboma bango te mpo ete mwasi yango asikolamaki nanu te.
“‘Ọ bụrụ na nwoke ọbụla akpọrọ nwaagbọghọ bụ ohu nwanyị nke a na-agbapụtabeghị, maọbụ nke na-enwerebeghị onwe ya, nke nwoke ọzọ chọrọ ịlụ, mee ka ha abụọ dinakọọ, a ga-ekpe ha abụọ ikpe nʼụlọikpe, ma a gaghị egbu ha, nʼihi na nwanyị ahụ abụghị onye nwe onwe ya.
21 Mpe mobali asengeli komema na ekotelo ya Ndako ya kapo ya Bokutani meme ya mobali oyo akobonza epai na Yawe lokola mbeka mpo na masumu.
Ma nwoke ahụ ga-eweta aja ikpe ọmụma nye Onyenwe anyị nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute. Ọ ga-abụkwa ebule ka ọ ga-eji chụọ aja ahụ.
22 Bongo na nzela ya meme yango ya mbeka mpo na masumu, Nganga-Nzambe akosala mosala ya bolimbisi masumu ya mobali yango liboso ya Yawe, mpe masumu oyo asilaki kosala ekolimbisama.
Onye nchụaja ga-eji ebule aja ikpe ọmụma ahụ chụọrọ nwoke ahụ aja mkpuchi mmehie ya nʼihu Onyenwe anyị, nʼihi mmehie o mere. A ga-agbaghakwara ya mmehie ya.
23 Tango bokokota na mokili ya Kanana, bokolona banzete ya lolenge nyonso oyo ebotaka mbuma. Na mibu misato, bokozwa bambuma na yango nyonso lokola bambuma ya mbindo; boye bokolia yango te.
“‘Mgbe unu batara nʼala ahụ kụọ mkpụrụ osisi dị iche iche, unu erila mkpụrụ osisi ahụ mịrị nʼafọ nke mbụ, ọ bụ ihe rụrụ arụ. Ruo nʼafọ nke atọ, ha bụ ihe rụrụ arụ. Unu agaghị eri ha.
24 Na mobu ya minei, bokobulisa bambuma na yango nyonso ekozala bule mpo na Yawe lokola litatoli ya kozongisa matondi epai na Ye.
Nʼafọ nke anọ, mkpụrụ nke osisi ndị ahụ niile ga-amị dị nsọ. Unu ga-eji ya nye Onyenwe anyị onyinye otuto.
25 Nzokande na mobu ya mitano, bokoki kolia bambuma yango. Na nzela wana, bambuma na bino ekokoma ebele. Nazali Yawe, Nzambe na bino.
Site nʼafọ nke ise, mkpụrụ ọbụla ga-abụ nke unu. Nʼụzọ dị otu a ihe ha ga-amịpụta ga-adị ukwuu. Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke unu.
26 Bokolia te nyama oyo ezali na makila kati na yango. Bokosalela soloka to kindoki te.
“‘Unu erila anụ ọbụla ọbara dị nʼime ya. “‘Unu agbala afa maọbụ jụta mmụọ ase.
27 Okokata suki te na bangambo nyonso ya moto na yo, okokata mpe te mandefu na bapembeni na yango.
“‘Unu akpụchala agịrị isi dị gburugburu akụkụ isi unu, maọbụ chabie ọnụ ọnụ afụọnụ unu.
28 Soki bozwi matanga, bomikata-kata banzoto na bino te to bomikatisa banzoloko te. Nazali Yawe.
“‘Unu akala ihe ọbụla nʼahụ unu, nʼihi onye nwụrụ anwụ maọbụ jiri mma ọkụ dee ihe nʼahụ unu. Abụ m Onyenwe anyị.
29 Bobebisa te lokumu ya bana na bino ya basi na kokomisa bango basi ya ndumba, noki te mboka mobimba ekomipesa na kindumba mpe ekotonda na mabe.
“‘Emerụla nwa gị nwanyị site nʼịkwagide ya ka ọ bụrụ akwụna, ka ala unu ghara ijupụta nʼịgba akwụna na ihe ọjọọ dị iche iche.
30 Bokobatelaka mikolo na Ngai ya Saba mpe bokotosaka Esika na Ngai ya bule. Nazali Yawe.
“‘Debenụ iwu niile m nyere maka ụbọchị izuike m. Sọpụkwaranụ ebe nsọ m. Abụ m Onyenwe anyị.
31 Bokende te kotuna makambo na bino epai ya bato oyo basololaka na bakufi to epai ya banganga-kisi, noki te bokomikomisa mbindo; Ngai nazali Yawe, Nzambe na bino.
“‘Unu ejekwurula ndị na-ajụ mmụọ ọjọọ ase maọbụ chọgaa ndị dibịa afa, nʼihi na unu ga-emerụ onwe site na ha. Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke unu.
32 Bokotelema liboso ya bato oyo banuni, bokolakisa botosi na bino epai ya mibange; na nzela wana, bokokumisa Nzambe na bino. Nazali Yawe.
“‘Bilienụ ọtọ nʼihu okenye, sọpụrụnụ ndị okenye, ma tụọnụ egwu Chineke unu. Abụ m Onyenwe anyị.
33 Soki mopaya moko ayei kovanda kati na bino, na mokili na bino, bonyokola ye te.
“‘Mgbe onye ọbịa soro unu biri nʼala unu, unu emejọla ya.
34 Nzokande bozwa ye kati na bino lokola mwana mboka. Bokolinga ye lokola bino moko, pamba te bino mpe bozalaki bapaya kati na Ejipito. Nazali Yawe, Nzambe na bino.
Mesonụ onye ọbịa bi nʼetiti unu mmeso dịka ọ bụ otu nʼime ndị amụrụ nʼala. Hụnụ ha nʼanya dịka unu si hụ onwe unu, nʼihi na o nwere oge unu bụ ọbịa nʼala Ijipt. Abụ m Onyenwe anyị Chineke unu.
35 Bokosalela lokuta te tango bokomeka molayi, bakilo mpe tango bokoluka koyeba ebele oyo ekoki kozala na kati.
“‘Unu ejila ihe ọtụtụ aghụghọ mgbe unu na-atụ ihe dị ogologo, maọbụ ihe dị arọ, maọbụ ihe dị ukwuu,
36 Bokosalela bimekelo ya malamu, bakilo ya malamu, efa ya malamu; Ngai nazali Yawe, Nzambe na bino, oyo abimisaki bino na Ejipito.
Jirinụ ezi ihe ọtụtụ tụọ ogologo, maọbụ ihe dị arọ, maọbụ ihe dị ukwuu. Abụ m Onyenwe anyị Chineke unu, onye si nʼala Ijipt kpọpụta unu.
37 Bokobatela bikateli mpe mibeko na Ngai nyonso mpe bokosalela yango. Nazali Yawe. › »
“‘Debenụ ụkpụrụ m niile, na iwu m niile, gbasoonụ ha. Abụ m Onyenwe anyị.’”

< Levitike 19 >