< Levitike 18 >

1 Yawe alobaki na Moyize:
Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya,
2 « Yebisa bana ya Isalaele: ‹ Ngai nazali Yawe, Nzambe na bino.
“Gwa ụmụ Izrel okwu ndị a sị ha, ‘Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke unu.
3 Bokoki te kosala makambo ndenge esalemaka na Ejipito epai wapi bozalaki kovanda to na Kanana epai wapi nazali komema bino.
Ya mere, ọ bụ ezie na unu ebiela nʼetiti ndị Ijipt, ma unu ekwesighị ibi ndụ unu dịka ha si ebi. Unu ekwesịkwaghị ibi ndụ dịka ndị Kenan ebe m na-akpọbata unu. Unu agbasola omenaala ha.
4 Bosengeli kotosa bobele mibeko mpe bikateli na Ngai. Nazali Yawe, Nzambe na bino.
Unu ga-edebe iwu m niile, gbasookwa ụkpụrụ m niile nʼihi na abụ m Onyenwe anyị Chineke unu.
5 Bobatela mitindo mpe mibeko na Ngai, pamba te moto oyo akosalela yango akobika bomoi na ye na nzela na yango. Nazali Yawe.
Debenụ iwu m na ụkpụrụ m, nʼihi na onye na-edebe ha ga-adị ndụ site na ha. Abụ m Onyenwe anyị.
6 Mobali moko te akosangisa nzoto na mwasi ya libota na ye penza. Nazali Yawe.
“‘Onye ọbụla ya na mmadụ bụ nwanne e jekwurukwala ya ka ha nwe mmekọ edina, i ji kpughee ọtọ ya. Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.
7 Okosambwisa te tata na yo na kosangisa nzoto na mama na yo. Lokola azali mama na yo, kosambwisa ye te.
“‘Ị gaghị eleda nna gị anya site na i jekwuru nne gị ka gị na ya nwe mmekọ edina. Nne gị ka ọ bụ; gị na ya agaghị enwe ụdị mmekọ dị otu a.
8 Okosangisa nzoto te na mwasi mosusu ya tata na yo, soki te okosambwisa tata na yo.
“‘Ị gaghị e jekwuru nwunye nna gị ka gị na ya nwe mmekọ edina. Nke a bụ ileda nna gị anya.
9 Okosangisa nzoto te na ndeko na yo ya mwasi, ezala na mwana mwasi ya tata na yo to ya mama na yo, oyo abotami na ndako to na libanda ya ndako.
“‘Ị gaghị e jekwuru nwanne gị nwanyị ka gị na ya nwe mmekọ edina, maọbụ nwa nwanyị nke a mụụrụ nna gị, maọbụ nwa nwanyị nke nne gị mụrụ, ma a mụrụ ya nʼụlọ ma a mụrụ nʼama.
10 Okosangisa nzoto te na mwana mwasi ya mwana na yo ya mobali to ya mwasi; kosambwisa ye te.
“‘Ị gaghị e jekwuru nwa nwanyị nke nwa gị nwoke mụrụ, maọbụ nwa nwanyị nke nwa gị nwanyị mụrụ i nwe mmekọ edina; nʼihi na nke a ga-eweta nleda anya nye gị.
11 Okosangisa nzoto te na mwana mwasi ya mwasi ya tata na yo, azali ndeko na yo ya mwasi.
“‘Ị gaghị e jekwuru nwa nwanyị nwunye nna gị mụrụ, ka gị na ya nwe mmekọ edina, nʼihi na ọ bụ nwa nna gị mụrụ; nwanne gị nwanyị ka ọ bụ.
12 Okosangisa nzoto te na ndeko mwasi ya tata na yo, azali tata mwasi na yo.
“‘Ị gaghị e jekwuru nwanne nwanyị nna gị ka gị na ya nwe mmekọ edina, nʼihi na ọbara jịkọrọ ya na nna gị, ha bụ otu ahụ.
13 Okosangisa nzoto te na ndeko mwasi ya mama na yo, azali mama leki to mama kulutu na yo.
“‘Ị gaghị e jekwuru nwanne nne gị nke nwanyị, ka gị na ya nwe mmekọ edina, nʼihi na ọbara jịkọrọ ya na nne gị, ha bụ otu ahụ.
14 Okosambwisa te ndeko mobali ya tata na yo na kosangisa nzoto na mwasi na ye. Azali mama na yo.
“‘Ị gaghị eleda nwanne nna gị nke nwoke anya, site nʼijekwuru nwunye ya, ka gị na ya nwe mmekọ edina. Nʼihi na nwunye nwanna gị ka ọ bụ.
15 Okosangisa nzoto te na bokilo na yo. Azali mwasi ya mwana na yo, kosangisa na ye nzoto te.
“‘Ị gaghị e jekwuru nwunye nwa gị nwoke ka gị na ya nwe mmekọ edina; nwunye nwa gị nwoke ka ọ bụ; gị na ya agaghị enwe mmekọrịta ọbụla gosiri mkpughe ọtọ ya.
16 Okosambwisa te ndeko na yo ya mobali na kosangisa nzoto na mwasi na ye.
“‘Ị gaghị e jekwuru nwunye nwanne gị nwoke ka gị na ya nwe mmekọ edina, nʼihi na nke a bụ omume nleda anya nye nwanne gị nwoke.
17 Okosangisa nzoto te na mama mpe na mwana na ye ya mwasi to na mwana mwasi ya mwana na ye ya mobali mpe ya mwasi; pamba te bazali makila moko mpe ekozala likambo ya nkele penza na miso ya Nzambe.
“‘Ị gaghị e jekwuru nwanyị na nwa ya nwanyị ka gị na ha nwe mmekọ edina. Ị gaghị akpọrọ nwa nwanyị nwa ya nwoke, maọbụ nwa nwanyị nke nwa ya nwanyị mụrụ dinaa ya; nʼihi na otu ọbara ka ha bụ. Ihe dị otu a bụ arụ.
18 Okosangisa nzoto te na ndeko mwasi ya mwasi na yo, wana mwasi na yo azali nanu na bomoi, noki te ekoyeisa bombanda.
“‘Ị gaghị alụ nwanne nwanyị nwunye gị, dịka nwunye ọzọ gị, nʼihi ịkpagbu ya, gị na ya a na-enwe mmekọrịta edina, ị na-ekpughe ọtọ nwunye gị mgbe ọ ka dị ndụ.
19 Okosangisa nzoto te na mwasi oyo azali komona makila na ye ya sanza, pamba te azali mbindo.
“‘E jekwurukwala nwanyị ka gị na ya nwe mmekọ edina, mgbe ọ nọ nʼọnọdụ adịghị ọcha nke (ịsọ ụba) nsọ nwanyị ya nʼoge a kara aka.
20 Okosangisa nzoto te na mwasi ya moninga na yo, noki te okokoma mbindo elongo na ye.
“‘A kpọrọkwala nwunye onye agbataobi gị idina ya, si otu a merụọ onwe gị nʼihi mmekọ dị otu a.
21 Okopesa moko kati na bana na yo te lokola mbeka epai ya nzambe Moloki, pamba te osengeli te kobebisa lokumu ya Kombo ya Nzambe na yo. Ngai nazali Yawe.
“‘Ị gaghị enye nwa gị ka e jiri ya chụọrọ Molek aja. Nʼihi na i kwesighị imerụ aha Chineke gị. Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.
22 Okosangisa nzoto te na mwana mobali ndenge basangisaka nzoto na mwana mwasi; ezali likambo ya nkele.
“‘Gị na nwoke edinala, dịka nwanyị na nwoke si edina. Ihe akpọrọ asị ka ọ bụ.
23 Okosangisa nzoto te na nyama, noki te okokoma mbindo elongo na yango. Ndenge moko mpe mwasi akosangisa nzoto te na nyama: ezali kotiola Nzambe.
“‘Gị na anụmanụ ọbụla edinakwala, site otu a merụọ onwe gị. Nwanyị agakwaghị ewere onwe ya nye ka ya na oke anụmanụ nwee mmekọrịta, arụ a na-adịghị eme eme ka ọ bụ.
24 Bomikomisa mbindo te na moko ya makambo oyo, pamba te ezali na nzela na yango nde bato ya bikolo oyo nazali kobengana liboso na bino bamikomisaki mbindo.
“‘Unu emerụkwala onwe unu site na-ime ihe ndị a, nʼihi na ihe ndị a bụ ihe mba ndị ahụ na-eme. Ọ bụkwa nʼihi ya ka m ga-eji chụpụ ha site nʼala ahụ m ga-enye unu.
25 Lokola mboka yango moko mpe ekomaki mbindo, napesaki yango mpe etumbu mpo na lisumu na yango; bongo esanzaki bavandi na yango.
Ọ bụladị ala ahụ niile ghọrọ ihe rụrụ arụ site nʼomume ndị a. Ọ bụ nke a mere m ji ata ndị bi nʼime ya ahụhụ nʼihi mmehie ha. Ala ahụ meghere ọnụ ya gbọpụta ndị bi nʼime ya.
26 Kasi, ezala mwana mboka to mopaya oyo bazali kati na bino, bosengeli kotosa malako mpe bikateli na Ngai; mpe bosengeli koboya kosala makambo nyonso oyo ya nkele na miso ya Nzambe.
Unu ga-edebe iwu m na ụkpụrụ m ndị a niile. Unu emekwala ihe arụ ndị a, ma ndị amụrụ nʼala ma ndị ọbịa niile bi nʼetiti unu.
27 Pamba te bato oyo bazalaki kovanda na mboka oyo liboso na bino babandaki kosala makambo oyo nyonso, bongo mboka ekomaki mbindo.
Ala m na-aga inye unu rụrụ arụ nʼihi na ndị bi nʼime ya na-eme omume ndị a rụrụ arụ.
28 Bino bokeba ete bokomisa mboka mbindo te, mpo ete yango esanza bino te ndenge esanzaki bato ya bikolo oyo bazalaki liboso na bino.
Unu emekwala ihe arụ ndị a, nʼihi na ọ bụrụ na unu emee ha, ọ ga-emeghe ọnụ ya gbọpụta unu, dịka o si mee mba niile bụ ndị buru unu ụzọ biri nʼime ya.
29 Moto nyonso oyo akosala moko ya makambo oyo ya nkele na miso ya Nzambe, esengeli balongola ye kati na bato na ye.
“‘Onye ọbụla nʼetiti unu mere ihe arụ ndị a, ka a ga-ekewapụ site nʼetiti ndị ya.
30 Boye, bobatela malako na Ngai mpe bolanda ata likambo moko te kati na makambo mabe oyo ezalaki kosalema liboso ete bino boya, mpo ete bomikomisa mbindo te na nzela na yango. Nazali Yawe, Nzambe na bino. › »
Nʼihi ya, lezienụ anya ka unu debe iwu m, ka unu ghara ime ihe arụ ndị a, nke ndị buru unu ụzọ biri nʼala ahụ mere. Ka unu gharakwa imerụ onwe unu site nʼomume arụ ndị a. Abụ m Onyenwe anyị Chineke unu.’”

< Levitike 18 >