< Bilombe 9 >

1 Abimeleki, mwana mobali ya Yerubali, akendeki na Sishemi epai ya banoko na ye mpe na ndako mobimba ya tata ya mama na ye. Alobaki:
Otu ụbọchị, Abimelek nwa Jerub-Baal jekwuuru ụmụnne nne ya ndị ikom bi na Shekem, na ndị ikwu nne ya niile sị ha,
2 « Botuna nanu motuna oyo epai ya bakambi nyonso ya engumba Sishemi: ‹ Eloko nini eleki malamu mpo na bino? Bakamba bino na bana mibali tuku sambo ya Yerubali to na mwana mobali moko? › Boyeba ete ngai mpe bino tozali makila moko mpe nzoto moko. »
“Jekwurunụ ndị Shekem jụọ ha, ‘Kedụ nke kara unu mma: ọ bụ ka ụmụ iri ndị ikom asaa Jerub-Baal mụrụ chịa unu, ka ọ bụ ka otu onye chịa unu?’ Chetakwanụ na mụ na unu bụ otu anụ ahụ na ọbara.”
3 Tango banoko na ye balobaki maloba nyonso ya Abimeleki epai ya bakambi nyonso ya Sishemi, mitema na bango nyonso ekendeki epai ya Abimeleki, pamba te balobaki ete azali ndeko na bango ya mobali.
Mgbe ụmụnne nne ya ndị ikom gwara ndị Shekem ihe Abimelek kwuru, ha kwekọrịtara iso ya nʼihi na ha kwuru sị, “Nwanne anyị ka ọ bụ.”
4 Bapesaki ye mbongo ya bibende ya palata, tuku sambo oyo bazwaki na tempelo ya Bala-Beriti. Na mbongo yango, Abimeleki afutaki bato ya mobulu mpo na kolanda ye.
Ha sitere nʼụlọ arụsị Baal-Berit nye ya iri shekel ọlaedo asaa. Abimelek ji ego ndị a goo ndị efulefu jọgburu onwe ha, ndị na-akpọghị ndụ ha ihe ọbụla, ndị kwenyere ma gbasoro ya.
5 Akendeki na Ofira, na ndako ya tata na ye, mpe abomaki bandeko na ye ya mibali tuku sambo, bana ya Yerubali na likolo ya libanga moko ya monene. Kasi Yotami, mwana mobali ya suka ya Yerubali, abikaki mpo ete amibombaki.
Ọ gara nʼụlọ nna ya nʼobodo Ofra. Nʼebe ahụ, o gburu iri ndị ikom asaa ahụ bụ ụmụnna ya nʼelu otu nkume. Kama Jotam, bụ ọdụdụ nwa Jerub-Baal, zoro onwe ya gbapụ.
6 Bakambi nyonso ya Sishemi mpe ndako nyonso ya Milo basanganaki mpo na kokende kokomisa Abimeleki mokonzi, pembeni ya terebente, na likonzi ya mabanga kati na Sishemi.
Mgbe ahụ, ndị Shekem na ndị Bet Milo kpọrọ nzukọ nʼokpuru osisi ukwu dị nʼobodo ahụ nʼakụkụ ogidi e guzobere ọtọ na Shekem. Nʼebe ahụ ka ha nọ mee Abimelek eze Izrel.
7 Tango bayebisaki makambo yango epai ya Yotami, amataki likolo ya ngomba Garizimi mpe agangaki makasi: « Bino bakambi ya Sishemi, boyoka ngai, mpo ete Nzambe ayoka bino.
Mgbe Jotam nụrụ ya, o rigooro nʼugwu Gerizim guzo nʼebe ahụ tikuo ndị Shekem niile mkpu si ha, “Geenụ m ntị ka Chineke nwe ike gee unu ntị.
8 Mokolo moko, banzete ebimaki mpo na kokomisa moko kati na yango mokonzi. Elobaki na nzete ya Olive: ‹ Zala mokonzi na biso. ›
Otu mgbe, osisi niile pụrụ ije ịga tee otu onye mmanụ ka ọ bụrụ eze ga-achị ha. Ha sịrị osisi oliv, ‘Bụrụ eze anyị.’
9 Nzete ya Olive ezongiselaki yango: ‹ Natika penza mafuta na ngai, oyo bapesaka na yango Nzambe mpe bato lokumu, mpo ete nakende koningana-ningana na likolo ya banzete mosusu? ›
“Ma osisi oliv jụrụ ha ajụjụ sị, ‘O kwesiri ka m hapụ iwepụta mmanụ m a nke a na-esite na ya sọpụrụ Chineke na ụmụ mmadụ, nọọ ọnọdụ ifegharị alaka m nʼelu osisi ndị ọzọ?’
10 Banzete elobaki na nzete ya figi: ‹ Yaka mpe zala mokonzi na biso. ›
“Ọzọkwa, ha rịọrọ osisi fiig ka ọ bụrụ eze ha.
11 Nzete ya figi ezongiselaki yango: ‹ Natika penza elengi na ngai mpe mbuma na ngai ya kitoko mpo ete nakende koningana-ningana na likolo ya banzete mosusu? ›
“Ma osisi fiig sịrị, ‘Ọ bụrụ na m ekwere na m ga-abụ eze unu, ọ pụtara na m ga-akwụsị ịmịpụta mkpụrụ osisi na-atọ ụtọ, nọọ ọnọdụ ifegharị alaka m nʼelu osisi ndị ọzọ?’
12 Banzete elobaki na nzete ya vino: ‹ Yaka mpe zala mokonzi na biso. ›
“Ọzọkwa, ha rịọrọ osisi vaịnị ma ọ ga-ekwenye ịbụ eze ha.
13 Kasi nzete ya vino ezongiselaki yango: ‹ Natika penza vino na ngai, oyo esepelisaka banzambe mpe bato mpo ete nakende koningana-ningana na likolo ya banzete mosusu? ›
“Ma osisi vaịnị ahụ zara sị ha, ‘Ọ bụrụ na m ekwere ịbụ eze unu, ọ pụtara na m ga-akwụsị ịmịpụta mkpụrụ osisi e ji eme mmanya nke na-enye Chineke na ụmụ mmadụ obi ụtọ, nọọ ọnọdụ ifegharị alaka m nʼelu osisi ndị ọzọ?’
14 Sima, banzete nyonso elobaki na nzete ya nzube: ‹ Yaka mpe zala mokonzi na biso. ›
“Nʼikpeazụ, osisi niile jekwuuru ogwu ọhịa, ‘Bịa ka ị bụrụ eze anyị.’
15 Nzete ya nzube ezongiselaki yango: ‹ Soki bolingi penza kopakola ngai mafuta mpo ete nazala mokonzi na bino, boya kobombama na se ya pio na ngai. Soki bongo te, tika ete moto ebima na nzete ya nzube mpe ezikisa banzete ya sedele ya Libani! ›
“Ogwu ọhịa sịrị osisi niile, ‘Ọ bụrụ nʼezie na unu chọrọ ite m mmanụ ka m bụrụ eze unu, bịanụ zere ndụ nʼokpuru ndo m kpọkwanụ isiala nye m. Ọ bụrụ na unu ajụ ime nke a, ka ọkụ si nʼogwu ọhịa pụta rechapụ sida niile dị na Lebanọn!’
16 Soki penza bosaleli na bosembo mpe na bosolo, wana bokomisi Abimeleki mokonzi; soki bozalaki na motema malamu liboso ya Yerubali mpe libota na ye, soki bosalelaki ye kolanda misala malamu oyo ye asalelaki bino,
“Ugbu a, omume unu o ziri ezi ma sitekwa nʼezi obi na unu mere Abimelek eze? Mmeso unu mesoro Jerub-Baal na ezinaụlọ ya o ziri ezi? Unu omesoro ya dịka o kwesiri ya?
17 bobosana te ete tata na ngai abundelaki bino, andimaki ata kokufa mpo na kokangola bino wuta na loboko ya Madiani.
Chetakwanụ na nna m lụrụ ọgụ maka unu, kpọọ ndụ ya ihe efu, nʼihi ịnapụta unu site nʼaka ndị Midia.
18 Kasi na mokolo ya lelo, botombokeli libota ya tata na ngai, bobomi bana na ye ya mibali tuku sambo, na libanga moko, mpe botie Abimeleki, mwana mobali ya mwasi mowumbu na ye, mokonzi ya bato ya Sishemi, pamba te azali ndeko na bino ya mobali.
Ma taa, unu enupula isi megide nna m na ezinaụlọ ya, gbuo iri ụmụ ndị ikom asaa ya nʼelu otu nkume, meekwa Abimelek nwa ya nwoke nke ohu nwanyị ya mụtara eze ga-achị ndị Shekem niile, nʼihi na ọ bụ onye nke unu.
19 Soki bosaleli na bosembo mpe bosolo liboso ya Yerubali mpe libota na ye, na mokolo ya lelo, tika ete Abimeleki asepela na bino, mpe bino bosepela na ye!
Nke a o gosiri na omume unu ziri ezi, sitekwa nʼobi ọcha nʼebe Jerub-Baal na ezinaụlọ ya nọ taa? Ọ bụrụ na unu mere otu a, ka Abimelek bụrụ onye ga-ewetara unu ọṅụ ka unu bụkwara ndị ga-ewetara ya ọṅụ.
20 Kasi soki ezali bongo te, tika ete moto ebima wuta na Abimeleki mpe etumba bino bavandi ya Sishemi mpe ya Beti-Milo; mpe tika ete moto ebima wuta na bino bavandi ya Sishemi mpe ya Beti-Milo, mpe etumba Abimeleki! »
Ma ọ bụrụ na omume unu ezighị ezi, ka ọkụ si nʼAbimelek pụta repịa unu, ndị Shekem na Bet Milo, ka ọkụ sitekwa nʼebe unu bụ ndị Shekem na Bet Milo, pụta repịa Abimelek.”
21 Yotami abimaki, akendeki na Beri mpe avandaki kuna, pamba te azalaki kobanga Abimeleki, ndeko na ye ya mobali.
Emesịa, Jotam gbapụrụ, gbaga Bịa, biri nʼebe ahụ nʼihi egwu Abimelek bụ nwanna ya.
22 Sima, Abimeleki akambaki Isalaele mibu misato.
Mgbe ọ gasịrị afọ atọ Abimelek bidoro ịchị Izrel,
23 Nzambe atindaki molimo mabe kati na Abimeleki mpe bavandi ya Sishemi, mpe bavandi ya Sishemi basalelaki Abimeleki likita.
Chineke kpaliri iro dị ukwuu nʼetiti Abimelek na ndị nwe obodo Shekem, nke bụ na ha mere omume ihu abụọ megide Abimelek.
24 Nzambe asalaki bongo mpo na kozongisa mabe na mabe na oyo basalaki tango babomaki bana mibali tuku sambo ya Yerubali, mpo ete makila na bango etangama na moto ya ndeko na bango ya mobali, Abimeleki, mpe na mito ya bato ya Sishemi oyo basungaki ye mpo na koboma bandeko na ye ya mibali.
Chineke mere nke a nʼihi na ọ chọrọ ịbọta ọbọ ọbara iri ụmụ Jerub-Baal asaa ahụ nʼisi Abimelek, na ndị Shekem ahụ bụ ndị nyeere ya aka gbuo ụmụnne ya.
25 Bavandi ya Sishemi batielaki Abimeleki motambo na likolo ya bangomba: batiaki bato na esika ya kobombama mpo na kobotola biloko epai ya baleki nzela nyonso oyo bazalaki koleka pene na bango. Mpe bamemelaki Abimeleki sango yango.
Nʼọnọdụ imegide ya, ndị Shekem doro ndị ikom ụfọdụ nʼelu ugwu niile, ndị zoro nʼebe ahụ na-apụnara ndị ọbụla na-esite nʼebe ahụ agafe ihe ha nwere. E mere ka Abimelek mata na ihe dị otu a na-eme.
26 Nzokande Gali, mwana mobali ya Ebedi, akendeki na Sishemi, elongo na bandeko na ye ya mibali; mpe bato ya Sishemi batielaki ye motema.
Nʼoge ahụ, Gaal, nwa Ebed, chịkọtara ụmụnne ya ndị ikom gaa biri na Shekem, ndị Shekem nwere ntụkwasị obi nʼebe ọ nọ.
27 Na tango ya kobuka bambuma ya vino, bato ya Sishemi bakendeki na bilanga, bakamolaki vino mpe basalaki feti monene kati na tempelo ya nzambe na bango. Wana bazalaki kolia mpe komela, balakelaki Abimeleki mabe.
Mgbe ha pụrụ baa nʼubi, chịkọta mkpụrụ vaịnị, zọchaa ha, ha mere mmemme nʼụlọ chi ha. Mgbe ha nọ na-eri na-aṅụ, ha kọchara Abimelek.
28 Bongo Gali, mwana mobali ya Ebedi, alobaki: « Abimeleki nde nani liboso ya Sishemi mpo ete biso bato ya Sishemi tosalela ye? Boni, azali mwana mobali ya Yerubali te? Zebuli azali molobeli na ye te? Bosalela bato ya Amori, tata ya Sishemi! Kasi mpo na nini tosalela Abimeleki?
Mgbe ahụ, Gaal nwa Ebed sịrị, “Onye bụ Abimelek? Gịnị mere na anyị bụ ndị Shekem ga-eji nọrọ nʼokpuru ya? Ọ bụghị nwa Jerub-Baal? Ọ bụkwaghị Zebul bụ onye na-esote ya? Ọ bụ ka anyị fee ezinaụlọ Hamọ, nna Shekem ofufe. Ọ bụ maka gịnị ka anyị ga-eji fee Abimelek ofufe?
29 Oh soki kaka nazalaki kokamba bato oyo, mbele nalingaki kobengana Abimeleki, mpe nalingaki koloba na ye: ‹ Bakisa lisusu makasi ya mampinga na yo, mpe yaka tobunda. › »
A sịkwarị na ndị a nọ nʼokpuru ọchịchị m, mgbe ahụ, m ga-ewezuga Abimelek. Aga m asị ya, ‘Kpọpụta ndị agha gị niile.’”
30 Tango Zebuli, moyangeli ya engumba, ayokaki makambo oyo Gali, mwana mobali ya Ebedi, alobaki, asilikaki makasi.
Mgbe Zebul onye na-achị obodo ahụ nụrụ ihe Gaal nwa Ebed kwuru, o were nnọọ oke iwe.
31 Atindaki bantoma na nkuku epai ya Abimeleki mpo na koloba na ye: « Gali, mwana mobali ya Ebedi, mpe bandeko na ye ya mibali bayaki na Sishemi, mpe bazali kotindika bato ya engumba mpo ete batombokela yo.
O zigara Abimelek ndị ozi na nzuzo ka ha sị ya, “Gaal nwa Ebed na ndị ikwu ya abịala obodo Shekem. Ha akpaliela obi ndị obodo a niile ka ha megide gị.
32 Sik’oyo telema, na butu, yo elongo na bato na yo; bokende kovanda kati na elanga, na esika ya kobombama.
Ugbu a, gị na ndị agha gị, bịanụ nʼabalị zoo onwe unu nʼọhịa.
33 Bongo, na tongo-tongo, wana moyi ezali kobima, okokende mpe okobundisa engumba. Tango Gali elongo na bato na ye nyonso bakobima mpo na kokutana na yo, sala nyonso oyo loboko na yo ekoki kosala. »
Nʼụtụtụ, mgbe anwụ wara, busonụ obodo a agha. Mgbe Gaal na ndị ya pụtara ịlụso gị agha, mee ha ihe dị gị mma.”
34 Na butu, Abimeleki elongo na mampinga na ye nyonso batelemaki, bakabwanaki na biteni minei mpe bakendeki kovanda kati na esika ya kobombama, pene ya Sishemi.
Ya mere, Abimelek na ndị agha ya dị nʼotu anọ, jiri abalị bilie jeruo Shekem zoo onwe ha na nso obodo ahụ.
35 Tango Gali, mwana mobali ya Ebedi, abimaki mpe atelemaki na ekuke ya engumba, Abimeleki elongo na basoda na ye babimaki na esika oyo babombamaki.
Gaal nwa Ebed pụrụ guzo nʼọnụ ama obodo ahụ mgbe Abimelek na ndị ya sitere nʼebe ha zoro onwe ha pụta.
36 Tango Gali amonaki bato, alobaki na Zebuli: — Tala, bato bazali kokita wuta na likolo na bangomba. Kasi Zebuli alobaki na ye: — Oyo ozali komona lokola bato, ezali nde bililingi ya bangomba.
Mgbe Gaal hụrụ ha, ọ kpọrọ Zebul si ya, “Lee ndị mmadụ sị nʼelu ugwu ndị a na-arịdata.” Zebul zara si ya, “Ọ bụghị mmadụ ka ị na-ahụ, kama ọ bụ onyinyo ugwu ka ị na-akpọ mmadụ.”
37 Kasi Gali alobaki lisusu: — Tala, bato bazali kokita elongo na basoda wuta na likolo ya ngomba ya kati-kati ya engumba, mpe bamosusu bazali koya na nzela ya terebente ya bamoni makambo.
Gaal kwukwara okwu sị, “Lee ndị mmadụ si nʼetiti ala ahụ na-arịdata, ndị ọzọ sikwa nʼakụkụ ụzọ ebe osisi iju ase dị.”
38 Zebuli alobaki na Gali: — Sik’oyo, tia lisusu monoko! Mpe loba lisusu: « Abimeleki nde nani mpo ete tosalela ye? » Ezali te bato oyo yo otiolaki? Kende sik’oyo kobunda!
Mgbe ahụ, Zebul sịrị ya, “Olee uru ọ bara na ị turu ọnụ, gị onye na-asị, ‘Onye bụ Abimelek na anyị ga-efe ya ofufe?’ Ọ bụ ndị a abụghị ndị ahụ ị kọchara? Pụkwuru ha gaa lụso ha ọgụ.”
39 Boye, Gali amemaki bavandi ya Sishemi mpe abundisaki Abimeleki.
Ya mere, Gaal duuru ndị nwe Shekem pụọ ịlụso Abimelek ọgụ.
40 Abimeleki alandaki Gali, mpe Gali akimaki liboso ya Abimeleki, mpe bato ebele penza bakufaki kino na ekotelo ya ekuke.
Ma Abimelek chụụrụ ya ọsọ ruo mbata ọnụ ụzọ ama, ọtụtụ bụkwa ndị egburu ka ha na-agba ọsọ.
41 Abimeleki avandaki na Aruma, mpe Zebuli abenganaki Gali elongo na bandeko na ye ya mibali mpo ete bavanda lisusu te na Sishemi.
Abimelek nọgidere nʼAruma nʼoge ahụ. Ma Zebul chụpụrụ Gaal na ndị ikwu ya site na Shekem.
42 Mokolo oyo elandaki, bato ya Sishemi babimaki mpe bakendeki na bilanga. Bato bamemaki sango epai ya Abimeleki.
Nʼechi ya, ndị Shekem pụtara baa nʼọhịa. E mere ka Abimelek mara nke a.
43 Abimeleki azwaki bato na ye mpe akabolaki bango na biteni misato ya basoda, mpe atiaki bango kati na bilanga, na esika ya kobombama. Tango amonaki bato kobima longwa na engumba, atelemaki mpo na kobundisa bango.
Nʼihi ya, Abimelek kere ndị agha ya ụzọ atọ. Ha niile zokwara onwe ha nʼọhịa. Mgbe ọ hụrụ ka ndị mmadụ si nʼime obodo ahụ na-apụta, o biliri buso ha agha.
44 Nzokande, tango Abimeleki mpe masanga ya mampinga oyo bazalaki elongo na ye bakendeki na lombangu mpe batelemaki na ekuke ya engumba, masanga mibale mosusu ya mampinga balandaki bato kino na bilanga mpe babomaki bango nyonso.
Abimelek na usuu ndị agha so ya mapụtara, gbara ọsọ were ọnọdụ nʼọnụ ụzọ ama obodo ahụ. Emesịa, ụzọ abụọ nʼime ụzọ atọ nke ndị agha na-eso ya chere ihu nʼọhịa gbuo ndị ahụ niile nọ nʼebe ahụ.
45 Abimeleki abundisaki engumba mokolo mobimba, abotolaki engumba yango mpe abomaki bato oyo bazalaki kuna. Bongo abebisaki engumba mpe asopelaki yango mungwa.
Ụbọchị ahụ niile, Abimelek busoro obodo ahụ agha tutu ruo mgbe o meriri ya, gbuo ndị niile bi nʼime ya. Emesịa, ọ lara obodo ahụ niile nʼiyi, fesaa nnu nʼala ya niile.
46 Tango bavandi nyonso ya ndako molayi ya Sishemi bayokaki makambo yango, bakendeki kobombama kati na libulu ya mabanga ya tempelo ya Beriti, nzambe na bango.
Mgbe ndị nwe ala nọ nʼụlọ elu Shekem nụrụ ihe mere, ha gbabanyere nʼebe e wusiri ike nke ụlọ arụsị El Berit.
47 Bamemelaki Abimeleki sango ete bavandi ya ndako molayi ya Sishemi basangani wana.
Mgbe Abimelek nụrụ na ha ezukọtala nʼebe ahụ,
48 Abimeleki elongo na bato na ye nyonso bamataki na ngomba Tsalimoni. Abimeleki azwaki epasola mpe akataki mwa bitape ya nzete, amemaki yango na mapeka na ye mpe alobaki na bato nyonso oyo bazalaki elongo na ye: « Oyo bomoni ngai kosala, bino mpe bosala bongo na lombangu. »
ya na ndị agha ya rigoro ugwu Zalmon. O ji anyụike gbutuo ụfọdụ ngalaba osisi nke ọ tụkwasịrị nʼubu ya. O nyere ndị agha ya iwu si, “Ngwa, meenụ ihe unu hụrụ na m mere.”
49 Boye bato nyonso bakataki, moto na moto etape na ye ya nzete. Balandaki Abimeleki, batiaki bitape ya nzete na libulu ya mabanga mpe batumbaki libulu yango ya mabanga elongo na bato nyonso oyo bazalaki kati na yango. Boye bato nyonso ya ndako molayi ya Sishemi bakufaki: bato pene nkoto moko, mibali mpe basi.
Ya mere, ndị agha ya niile gbuturu alaka osisi buru ha soro Abimelek. Ha tụkọtara alaka osisi ndị a niile nʼakụkụ ebe ahụ e wusiri ike mụnye ha ọkụ ka o regbuo ndị mmadụ nọ nʼime ya. Ya mere, ndị mmadụ niile nọ nʼụlọ elu Shekem, nwoke na nwanyị, ndị ọnụọgụgụ ha ruru otu puku nwụrụ.
50 Sima na yango, Abimeleki akendeki na Tebesi, azingelaki mpe abotolaki yango.
Ọzọ, Abimelek gara obodo Tebez lụso ya agha, merie ya.
51 Nzokande, ezalaki na ndako moko ya molayi mpe ya makasi kati na engumba. Bavandi nyonso, mibali mpe basi, bakimelaki kuna; bakangaki ekuke sima na bango mpe bamataki na likolo ya ndako yango.
Ma e nwere nʼime obodo ahụ, otu ụlọ elu e wusiri ike, ebe ndị obodo ahụ niile, nwoke na nwanyị, gbabanyere. Ha kpọchidoro onwe ha ụzọ, rigoro nʼelu ụlọ ahụ.
52 Abimeleki ayaki kino na ndako molayi mpo na kobundisa yango, mpe apusanaki kino na ekuke ya ndako yango mpo na kotumba yango.
Abimelek gara nʼụlọ elu ahụ ibuso ya agha. Ma mgbe ọ na-abịaru ọnụ ụzọ ama ụlọ elu ahụ isunye ya ọkụ,
53 Na tango yango, mwasi moko abwakaki libanga oyo banikelaka ble na moto ya Abimeleki mpe epanzaki ye moto.
otu nwanyị tụdara nkume igwe nri nʼisi ya, nke tiwara okpokoro isi ya.
54 Abimeleki abengaki na lombangu elenge mobali oyo azalaki komema bibundeli na ye mpe alobaki na ye: « Bimisa mopanga na yo mpe boma ngai mpo baloba te na tina na ngai: ‹ Mwasi moko abomaki ye. › » Boye, elenge mobali atobolaki ye mopanga mpe akufaki.
Ngwangwa, Abimelek kpọrọ onye na-ebu ihe agha ya sị ya, “Sepụta mma agha gị jiri ya gbuo m, ka ndị mmadụ ghara ị sị banyere m, ‘Ọ bụ nwanyị gburu ya.’” Ya mere nwokorobịa ahụ were mma agha ya dụgbuo ya, ọ nwụkwara.
55 Tango bana ya Isalaele bamonaki ete Abimeleki akufi, bazongaki moto na moto epai na ye.
Mgbe ndị Izrel hụrụ na Abimelek anwụọla, ha niile lara nʼụlọ ha.
56 Boye, Nzambe azongiselaki Abimeleki mabe oyo asalaki tata na ye tango abomaki bandeko na ye ya mibali tuku sambo.
Otu a ka Chineke si kwụghachi Abimelek ihe ọjọọ o mere megide nna ya site nʼigbu iri ụmụnna ya asaa.
57 Nzambe azongiselaki bato ya Sishemi mabe nyonso oyo basalaki. Ezali ndenge wana nde elakeli mabe oyo Yotami, mwana mobali ya Yerubali, asakolaki ekokisamaki.
Chineke mekwara ka ndị Shekem nata ụgwọ ọrụ ihe ọjọọ ha. Ọbụbụ ọnụ Jotam nwa Jerub-Baal mezukwara nʼisi ha.

< Bilombe 9 >