< Bilombe 18 >

1 Na mikolo wana, bana ya Isalaele bazalaki na mokonzi te, mpe bato ya libota ya Dani bazalaki koluka esika ya kovanda; pamba te kino na tango wana, bazwaki nanu ya bango libula te kati na mabota nyonso ya Isalaele.
Nʼoge ahụ kwa, ụmụ Izrel enweghị eze ọbụla na-achị ha. Ebo Dan na-achọkwara onwe ha ebe obibi nke ga-abụ ala nke aka ha, nʼihi na ruo ugbu a, ha enwebeghị ike chụpụ ndị bi nʼala ahụ e kenyere ha dịka ihe nketa nke ha.
2 Boye, bana ya libota ya Dani batindaki mibali mitano ya libota na bango, kowuta na Tsorea mpe na Eshitaoli, mpo na kokende kononga mpe koyeba mokili yango. Balobaki na bango: « Bokende koyeba mokili yango ndenge ezali. » Mibali mitano yango bakotaki na etuka ya bangomba ya Efrayimi kino na ndako ya Mika, epai wapi balekisaki butu.
Nʼihi nke a, ebo Dan sitere nʼikwu ise dị nʼebo ha họpụta mmadụ ise. Ndị a bụ dimkpa, na dike nʼagha, bụrụkwa ndị si nʼobodo Zora na Eshtaol. Ha zipụrụ mmadụ ise ndị a ka ha gaa nyochaa ala ahụ ha na-achọ ibi nʼime ya. Mgbe ndị ahụ jeruru obodo ugwu ugwu Ifrem, ha gara nọdụ ọdụ abalị nʼụlọ Maịka.
3 Tango bakomaki pembeni ya ndako ya Mika, bayokaki mongongo ya elenge mobali Molevi. Babalukaki epai ye azalaki mpe balobaki na ye: — Nani amemaki yo awa? Ozali kosala nini na esika oyo? Mpo na nini ozali awa?
Mgbe ha nọ nso ụlọ Maịka, ha nụrụ asụsụ nwokorobịa onye Livayị ahụ bụ onye nchụaja. Ha kpọpụtara ya nʼotu akụkụ jụọ ya ajụjụ sị, “Onye kpọtara gị ebe a? Gịnị ka ị na-eme nʼebe a? Gịnị mere i ji bịa nʼebe a?”
4 Elenge mobali ayebisaki bango: — Tala makambo oyo Mika asali mpo na ngai: Azwi ngai na mosala mpe akomisi ngai nganga-nzambe na ye.
Nwokorobịa ahụ kọwara ha ihe Maịka meere ya. Ọ gwara ha, “O nyere m ọrụ, abụkwa m onye nchụaja ya.”
5 Balobaki na ye: — Tunela biso epai ya Nzambe mpo ete toyeba soki mobembo na biso ekozala malamu.
Ha sịrị ya, “Ọ dị mma! Biko, jụta Chineke ase, chọpụta ma ije anyị a ọ ga-agakwa nke ọma.”
6 Nganga-nzambe azongiselaki bango: — Bokende na kimia, Yawe andimi mobembo na bino.
Onye nchụaja ahụ zara sị ha, “Gaa nʼudo. Ije unu nwere ngọzị Onyenwe anyị.”
7 Mibali mitano yango bakendeki mpe bakomaki na Laishi. Bamonaki ete, kuna, bazali na kimia mpe na kozanga nungunungu lokola bato ya Sidoni, oyo bazalaki na kimia mpe na kozanga bobangi. Mokonzi moko te ya mboka azalaki konyokola bango. Bazalaki mosika na bato ya Sidoni mpe basalaki boyokani ata na moto moko te.
Ya mere, ndị ikom ise ndị ahụ biliri ije bịaruo nʼobodo Laish, ebe ha hụrụ na ndị ahụ na-ebi nʼudo, na-enweghị nsogbu ọbụla. Ha dịka ndị obodo Saịdọn, ndị onwe ha juru afọ, ndị na-adịghị atụ anya ihe egwu ọbụla. Ha bụ ndị bara ụba, ebe ọ dịghị ihe ọbụla kọrọ ụkọ nʼala ahụ. Ọzọ, ha bi nʼebe dị anya site nʼobodo ndị Saịdọn. Ọ dịkwaghị ihe ha na mmadụ ọbụla nwekọrọ.
8 Tango mibali mitano yango bazongaki na Tsorea mpe na Eshitaoli, bandeko na bango batunaki bango: — Sango nini bomemeli biso?
Mgbe ndị nnyocha ahụ laghachiri nʼobodo Zora na Eshtaol, ndị ebo Dan ibe ha jụrụ ha, sị, “Unu si aṅaa jee? Gịnị ka unu chọpụtara?”
9 Bazongisaki: — Totelema, tokende kobotola mokili na bango! Tomoni ete mokili yango ezali malamu penza. Boni! Mpo na nini bovandi kimia boye? Bozala bagoyigoyi te mpo na kokende kokota mpe kobotola mokili yango.
Ha zara sị, “Bịanụ, ka anyị gaa buso ha agha. Anyị ahụla ala ahụ, ọ dịkwa mma nke ukwu. Gịnị ka unu na-agbara nkịtị? Unu egbula oge ịba nʼebe ahụ nweta ya.
10 Tango bokokota kuna, bokomona bato bazali na kimia, mpe bazali na mokili monene oyo Nzambe akabi na maboko na bino, mokili oyo ezangi ata eloko moko te kati na biloko nyonso oyo ezalaka na mabele.
Mgbe unu ruru ebe ahụ, unu ga-ahụ ndị na-adịghị atụ anya ihe egwu ọbụla, na ala sara mbara nke Chineke na-etinye unu nʼaka. Ala nke ihe ọbụla na-adịghị akọ nʼime ya.”
11 Mibali nkama motoba ya libota ya Dani, elongo na bibundeli na bango, balongwaki na Tsorea mpe na Eshitaoli.
Ya mere, narị ndị agha isii ndị si nʼebo Dan biliri gaa ibuso obodo ahụ agha. Ha sikwa Zora na Eshtaol pụọ.
12 Bakendeki kotonga molako na bango na Kiriati-Yearimi, kati na mokili ya Yuda. Yango wana, kino na mokolo ya lelo, babengaka esika yango Maane Dani; ezali na ngambo ya weste ya Kiriati-Yearimi.
Mgbe ha na-aga, ha rutere Kiriat Jearim, nke dị na Juda, maa ụlọ ikwu ha nʼebe ahụ. Ọ bụ ya mere e ji akpọ ebe ahụ dị nʼakụkụ ọdịda anyanwụ Kiriat Jearim Mahane Dan ruo taa.
13 Balongwaki wana mpe bakendeki na etuka ya bangomba ya Efrayimi kino na ndako ya Mika.
Emesịa, ha pụrụ nʼala ugwu ugwu Ifrem, bịarute nʼụlọ Maịka.
14 Bongo mibali mitano oyo banongaki mokili ya Laishi balobaki na bandeko na bango: « Boni, boyebi ete kati na ndako oyo tovandi, ezali na efode, bikeko mike-mike ya ndako mpe nzambe ya ekeko basala na ebende oyo banyangwisa na moto? Boyeba likambo nini bokosala. »
Mmadụ ise ndị ahụ gara nnyochapụta ala (ya bụ ala Laish) ahụ gwara ụmụnna ha sị, “Unu maara na nʼime otu ụlọ ndị a na e nwere efọọd, nʼụfọdụ arụsị ezinaụlọ ndị dị iche iche, na oyiyi a kpụrụ akpụ nke eji ọla wuo? Ugbu a, maranụ ihe unu ga-eme.”
15 Bongo babalukaki wana, na ndako epai wapi bazalaki mpe bakendeki na ndako ya elenge mobali Molevi, na ndako ya Mika, mpe bapesaki ye mbote.
Ya mere, ha gara nʼebe ahụ, banye nʼụlọ nwokorobịa Livayị ahụ, ebe o bi nʼụlọ Maịka, jụọ ya maka ọdịmma ya.
16 Mibali nkama motoba ya libota ya Dani, oyo bamilengelaki mpo na bitumba batelemaki na ekotelo ya ekuke.
Narị ndị ikom Dan, ndị jikere ibu agha, guzo nʼọnụ ụzọ ama.
17 Bato mitano oyo banongaki mokili bakotaki kati na ndako mpe bazwaki efode, bikeko mike-mike ya ndako mpe nzambe ya ekeko basala na ebende banyangwisa na moto. Nganga-nzambe atelemaki liboso ya ekuke elongo na mibali nkama motoba oyo bamilengelaki mpo na bitumba.
Mgbe ahụ, ndị nnyocha ise ahụ banyere nʼime ụlọ ahụ buru arụsị ọla ahụ, na efọọd ahụ, na arụsị ezinaụlọ ndị ahụ, ma onye nchụaja ahụ na narị ndị agha isii ndị ji ngwa agha guzo nʼọnụ ụzọ ama.
18 Tango mibali bakotaki na ndako ya Mika mpe bazwaki efode, bikeko mike-mike ya ndako mpe nzambe ya ekeko basala na ebende banyangwisa na moto, nganga-nzambe alobaki na bango: — Likambo nini bozali kosala?
Mgbe ndị ikom ahụ banyere nʼụlọ Maịka buru arụsị ọla ahụ, efọọd ahụ na arụsị ezinaụlọ ndị ọzọ ahụ, onye nchụaja ahụ sịrị ha, “Gịnị ka unu na-eme?”
19 Bazongisaki: — Kanga monoko! Tia loboko na monoko na yo, yaka elongo na biso mpe zala tata na biso mpe nganga-nzambe na biso. Boni, likambo nini eleki malamu: kozala nganga-nzambe ya moto to kozala nganga-nzambe ya libota mpe ya etuka moko ya Isalaele?
Ha zara sị ya, “Mechie ọnụ gị! Ekwukwala okwu ọbụla. Soro anyị bịa bụrụ nna anyị na onye nchụaja anyị. Ọ ga-abara gị uru karịa ịbụ onye nchụaja nye otu ebo na otu agbụrụ nʼIzrel, karịa ịbụ onye nchụaja nke naanị otu nwoke nʼime ezinaụlọ ya.”
20 Nganga-nzambe atondaki na esengo, akamataki efode, banzambe ya bikeko ya ndako mpe bikeko mosusu; akendeki elongo na bato ya libota ya Dani.
Mgbe ahụ, obi tọrọ nwokorobịa onye nchụaja ahụ ụtọ isoro ha gaa. O buuru efọọd ahụ, arụsị ezinaụlọ ndị ọzọ ahụ na oyiyi ahụ a pịrị apị soro ndị ahụ gawa.
21 Babalukaki mpe bazongelaki nzela na bango ya mobembo, batiaki liboso bana na bango ya mike, bibwele mpe bozwi na bango ya talo.
Ha malitekwara ije ha, ụmụntakịrị ha, na igwe anụ ụlọ ha, na ngwongwo ha ka ha tinyere nʼihu ha.
22 Tango bakomaki mwa mosika na ndako ya Mika, Mika mpe bato oyo bazalaki pene ya ndako na ye batelemaki na koganga mpe balandaki libota ya Dani.
Mgbe ha gamitụrụ nke nta site nʼụlọ Maịka, ndị ikom ndị bi nso ụlọ Maịka kpọkọtara onwe ha chụso ndị Dan, gafee ha.
23 Awa bazalaki kobelela sima na libota ya Dani, bana ya Dani babalukaki mpe batunaki Mika: — Likambo nini ezwi yo mpo ete omemela biso ebele ya bato boye?
Maịka na ndị so ya na-etikwa mkpu na-akpọku ha sị ha kwụsị ije ha. Ma ndị ebo Dan jụrụ Maịka ajụjụ sị ya, “Gịnị na-eme gị iji kpọpụta ndị gị ka ha bịa lụso anyị agha?”
24 Mika azongisaki: — Bozwi banzambe na ngai, oyo nasalaki, nganga-nzambe na ngai, mpe bokeyi na bino; eloko nini natikali na yango lisusu? Ndenge nini bokoki kotuna ngai: « Likambo nini ezwi yo? »
Ọ zaghachiri, “Unu chịịrị chi ndị m mere, kpọrọ onye nchụaja m pụọ. Gịnị ọzọ ka m nwekwara? Olee otu unu si ajụ, ‘Gịnị na-eme gị?’”
25 Bato ya libota ya Dani bazongiselaki ye: — Tika ete mongongo na yo eyokana te kati na biso, noki te bato ya kanda bakokweyela yo mpe bakoboma yo elongo na libota na yo mobimba.
Ndị ikom Dan zara sị ya, “Lezie anya kpachara anya banyere ụdị okwu ị na-ekwu. Nʼihi na i kwuo ụdị okwu a gaa nʼihu, ụfọdụ ndị ikom isi na-anụ ọkụ ga-abịa lụso gị agha gbuo gị na ndị ezinaụlọ gị.”
26 Bana ya libota ya Dani balandaki nzela na bango. Tango Mika amonaki ete bana ya Dani baleki ye na makasi, abalukaki mpe azongaki na ndako na ye.
Ya mere, ndị ebo Dan gbara ya nkịtị na-aga ebe ha na-aga. Mgbe Maịka hụrụ na ha dị ọtụtụ karịa ya, ọ hapụrụ ha, tụgharịa laghachi nʼụlọ ya.
27 Bana ya libota ya Dani babotolaki biloko oyo Mika asalaki mpe nganga-nzambe na ye. Bongo bakendeki kobundisa engumba Laishi, mboka ya bato ya kimia mpe ya kozanga nungunungu; babomaki bato nyonso na mopanga mpe batumbaki engumba na bango na moto.
Ụmụ Dan chịịrị arụsị ahụ niile Maịka mere, durukwa onye nchụaja ya gawa nʼobodo Laish, obodo nọ nʼudo, nke na-adịghị atụ anya ihe egwu ọbụla. Ha busoro ndị obodo ahụ agha, suo obodo ahụ ọkụ.
28 Moto moko te ayaki kobikisa mboka wana, pamba te ezalaki mosika na Sidoni mpe esalaki boyokani te elongo na ekolo mosusu. Engumba yango ezalaki na lubwaku oyo ezali pembeni ya Beti-Reobi. Bana ya libota ya Dani batongaki wana engumba na bango mpe bavandaki kuna.
Ọ dịghị onye ọbụla nwere ike bịa inyere ndị obodo ahụ aka nʼihi ha bi nʼebe dị anya site nʼobodo Saịdọn. O nwekwaghị obodo ọbụla ha na ha na-emekọrịta. Obodo a dị na ndagwurugwu dị nso na Bet-Rehob. Emesịa, ndị ebo Dan wughachiri obodo ahụ ọzọ, biri nʼime ya.
29 Bapesaki engumba yango kombo « Dani. » Ezalaki kombo ya koko na bango, Dani, mwana mobali ya Isalaele. Na kala, bazalaki kobenga engumba yango Laishi.
Ọ bụ nke a mere e ji kpọọ aha obodo ahụ Dan, nke bụ aha nna ha ochie, onye bụ nwa Izrel. Ma tupu ebo Dan ebibie ya, aha obodo a nʼoge gara aga bụ Laish.
30 Bana ya libota ya Dani batelemisaki ekeko mpo na bango moko mpe batiaki Jonatan, mwana mobali ya Gerishomi, mwana mobali ya Manase mpe koko ya Moyize, mpo ete akoma Nganga-Nzambe ya bato ya libota ya Dani elongo na bana na ye. Basalaki mosala ya bonganga-Nzambe mpo na libota ya Dani kino tango bato ya mokili bakendeki na bowumbu.
Nʼebe ahụ ndị Dan guzobeere onwe ha arụsị, Jonatan, nwa Geshọm, nwa Mosis, na ụmụ ya ndị ikom niile ghọọrọ ndị nchụaja nye ebo Dan ruo nʼoge a dọtara ala ahụ nʼagha.
31 Bakobaki kosalela bikeko oyo Mika asalaki na tango nyonso oyo Ndako ya Nzambe ezalaki na Silo.
Ndị ebo Dan nọgidere na-efe arụsị ndị ahụ Maịka mere oge ahụ niile ụlọ nzute Chineke dị na Shaịlo.

< Bilombe 18 >