< Jozue 5 >
1 Nzokande, tango bakonzi nyonso ya Amori, na ngambo ya weste ya Yordani, mpe bakonzi nyonso ya Kanana, pene ya ebale monene ya Barozo, bayokaki ndenge nini Yawe akawusaki ebale Yordani liboso ya bana ya Isalaele kino tango basilisaki kokatisa, mitema na bango ebukanaki mpe bazalaki lisusu na makasi te ya kotelemela bana ya Isalaele.
Mgbe ndị eze ndị Amọrait niile, ndị bi nʼofe ọzọ nke osimiri Jọdan, nʼakụkụ ọdịda anyanwụ, na ndị eze ndị Kenan niile bi nʼakụkụ oke osimiri Mediterenịa, nụrụ na Onyenwe anyị emeela ka osimiri Jọdan takpọọ nʼihu ụmụ Izrel, ruo mgbe anyị niile gafesịrị, obi lọrọ ha mmiri. Ọ dịkwaghị ike ọbụla fọdụụrụ ha iguzo nʼihu ụmụ Izrel.
2 Na tango wana, Yawe alobaki na Jozue: — Sala bambeli ya mabanga mpe kata lisusu bana mibali ya Isalaele ngenga.
Ma nʼoge ahụ, Onyenwe anyị gwara Joshua okwu sị ya, “Jiri nkume mee mma ị ga-eji bie ụmụ Izrel niile ugwu ọzọ.”
3 Jozue asalaki bambeli ya mabanga mpe akataki bana mibali ya Isalaele ngenga, pene ya ngomba moke ya Araloti.
Ya mere, Joshua ji nkume mee mma ntakịrị e ji bie ụmụ Izrel niile ugwu. Ebe a nọ bie ụmụ Izrel ugwu bụ ebe a na-akpọ Gibịat Haaralot.
4 Tala mpo na nini Jozue asengelaki kokata bango ngenga: Mibali nyonso oyo babimaki na Ejipito mpe bakokisaki mibu ya kobunda bitumba bakufaki na nzela, kati na esobe, sima na bango kobima na Ejipito.
Nke a bụ ihe mere o ji mee otu a: Ndị ikom niile si nʼIjipt pụta, ndị tozuru ije agha, nwụrụ nʼụzọ, nʼime ọzara, mgbe ha hapụchara Ijipt.
5 Mibali nyonso oyo babimaki na Ejipito bakatamaki ngenga; kasi bato nyonso oyo babotamaki na nzela, kati na esobe, bakatamaki ngenga te.
Mgbe ụmụ Izrel niile si Ijipt pụta, e biri ndị nwoke niile nọ nʼetiti ha ugwu. Ma nʼime iri afọ anọ ahụ ha na-awagharị nʼọzara, o nweghị ụmụ ha ndị nwoke a mụrụ nʼoge a e biri ugwu.
6 Bana ya Isalaele batambolaki kati na esobe mibu tuku minei, kino tango ekeke mobimba ya mibali oyo bakokisaki mibu ya kobunda bitumba tango babimaki na Ejipito basilaki kokufa. Mpo ete batosaki Yawe te, Yawe alapaki ndayi ete bakomona te mokili oyo alakaki kopesa epai ya batata na bango, mokili oyo ezali kobimisa miliki mpe mafuta ya nzoyi.
Ndị Izrel niile awagharịala nʼọzara iri afọ anọ tutu ruo mgbe ndị ikom niile toruru ije agha, bụ ndị hapụrụ Ijipt nwụchara, ebe ọ bụ na ha jụrụ irubere Onyenwe anyị isi. Nʼihi na Onyenwe anyị ṅụrụ iyi sị ha na ha agaghị ahụ ala ahụ anya, bụ ala ahụ o kwere nna nna ha na nkwa, inye anyị, ala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya.
7 Boye, atombolaki bana na esika ya batata na bango; yango wana Jozue akataki bango ngenga, pamba te bakatamaki ngenga te na nzela.
Onyenwe anyị mere ka ụmụ ndị nnupu isi a mụtara nọchie anya ha. Ọ bụkwa ndị a ka Joshua biri ugwu, nʼihi na tutu ruo ugbu a, e bibeghị ha ugwu.
8 Sima na ekolo mobimba kokatama ngenga, batikalaki esika moko kati na molako kino tango bapota na bango ekawukaki.
Mgbe e bizuru mba niile ahụ ugwu, ha nọdụrụ nʼebe ahụ ha mara ụlọ ikwu tutu ọnya obibi ugwu ha alaa.
9 Yawe alobaki na Jozue: — Lelo, natindiki soni ya Ejipito mosika na bino. Babengaki esika yango « Giligali » kino na mokolo ya lelo.
Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Joshua okwu sị, “Taa, ewezugala m site nʼebe unu nọ ihe nkọcha nke ya na Ijipt so.” Nʼihi nke a, ha kpọrọ ebe ahụ Gilgal. Ọ bụkwa aha ya ruo taa.
10 Na pokwa ya mokolo ya zomi na minei ya sanza wana, bana ya Isalaele basalaki feti ya Pasika, wana bazalaki nanu na molako ya Giligali, na etando ya Jeriko.
Mgbe ụmụ Izrel mara ụlọ ikwu ha na Gilgal nʼala ihe nʼadịghị nke Jeriko, ha mere Mmemme Ngabiga nʼuhuruchi nke ụbọchị iri na anọ nke ọnwa ahụ.
11 Mokolo oyo elandaki feti ya Pasika, baliaki biloko ya mokili ya Kanana: mapa ezanga levire mpe bambuma ya ble oyo bakalingaki kaka mokolo wana.
Nʼụbọchị sotere ụbọchị ngabiga, nʼotu ụbọchị ahụ, ha riri ụfọdụ ihe ubi nke ala Kenan. Ọ bụ achịcha a na-ejighị ihe na-eko achịcha mee, na ọka ahụrụ nʼọkụ ka ha tara.
12 Mokolo oyo elandaki mokolo oyo baliaki biloko ya mokili ya Kanana, mana etikaki kokweya; mana ezalaki lisusu te mpo na bana ya Isalaele. Boye, na mobu wana, baliaki biloko ya mokili ya Kanana.
Mánà kwụsịkwara nʼechi ya mgbe ha riri nri sitere nʼala ahụ. Ụmụ Izrel ahụkwaghị mánà anya ọzọ, ma nʼafọ ahụ ha riri ihe omume ubi si nʼala Kenan.
13 Nzokande, tango Jozue azalaki pene ya Jeriko, atombolaki miso mpe amonaki moto moko atelemi liboso na ye; moto yango asimbaki mopanga na loboko na ye. Jozue apusanaki pene na ye mpe atunaki ye: — Boni, ozali na ngambo na biso to na ngambo ya banguna na biso?
Mgbe Joshua nọ nso obodo Jeriko, o weliri anya ya elu hụ otu nwoke ka o guzo nʼihu ya. Nwoke a mịpụtara mma agha ya jide ya nʼaka ya. Joshua jekwuru ya jụọ ya sị ya, “Ị dịnyeere anyị ka ị dịnyeere ndị iro anyị?”
14 Azongiselaki Jozue: — Te, kasi nazali mokonzi ya mampinga ya Yawe; nayei kaka sik’oyo. Boye, Jozue akweyaki elongi kino na mabele mpe alobaki na ye: — Sango nini nkolo na ngai azali na yango mpo na mosali na ye?
Nwoke ahụ zaghachiri ya sị, “Ọ dịghị onye m dịnyeere, kama abịara m ugbu a dịka ọchịagha usuu ndị agha Onyenwe anyị.” Joshua dara nʼala kpuo ihu ya nʼala kpọọ isiala nye ya, sị ya, “Ejikerela m ime ihe ọbụla i nyere nʼiwu. Onyenwe m, gịnị ka ị chọrọ ka m mee?”
15 Mokonzi ya mampinga ya Yawe alobaki na ye: — Longola basapato na yo na makolo, pamba te esika oyo ozali ezali bule. Jozue asalaki se bongo.
Ọchịagha usuu ndị agha Onyenwe anyị zara sị Joshua, “Yipụ akpụkpọụkwụ gị, nʼihi na ebe ahụ i guzo bụ ala dị nsọ.” Joshua mere dịka ọ gwara ya.