< Jozue 4 >

1 Tango ekolo mobimba esilisaki kokatisa Yordani, Yawe alobaki na Jozue:
Mgbe mba ahụ niile gafesịrị osimiri Jọdan, Onyenwe anyị gwara Joshua okwu sị ya,
2 « Pona mibali zomi na mibale kati na bato, mobali moko mpo na libota moko.
“Site nʼetiti ndị ụmụ Izrel họpụta ndị ikom iri na abụọ, otu onye site nʼebo ọbụla,
3 Pesa bango mitindo oyo: ‹ Bozwa kati na mayi ya Yordani, na esika oyo Banganga-Nzambe bapikamaki, mabanga zomi na mibale, bomema yango elongo na bino mpe botia yango na esika oyo bokolekisa butu ya lelo. › »
ka onye ọbụla nʼime ha site nʼebe ahụ ndị nchụaja guzoro nʼetiti osimiri Jọdan buputa otu nkume, otu nkume, gwa ha ka ha debe nkume ndị a ha buputara nʼebe unu ga-anọ ọnọdụ abalị taa.”
4 Boye, Jozue abengaki mibali zomi na mibale oyo aponaki kati na bana ya Isalaele, mobali moko mpo na libota moko.
Ya mere, Joshua kpọrọ ndị ikom iri na abụọ ndị ahụ, ndị ọ họpụtara, site nʼetiti ndị Izrel, otu onye site nʼebo ọbụla,
5 Jozue alobaki na bango: « Boleka liboso ya Sanduku ya Yawe, Nzambe na bino, kino na kati-kati ya Yordani. Moko na moko kati na bino amema libanga na lipeka na ye kolanda motango ya mabota ya Isalaele
Ọ gwara ha sị, “Sitenụ nʼetiti osimiri Jọdan, ebe ndị bu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị Chineke unu guzoro, buputa nkume. Onye ọbụla nʼime unu ga-ebuputa otu nkume, tụkwasị nʼubu ya, dịka ọnụọgụgụ ebo Izrel niile si dị,
6 mpo ete ezala lokola elembo kati na bino. Sima na tango, soki bana na bino batuni bino: ‹ Mabanga oyo elakisi nini? ›
ka ha bụrụ ihe ịrịbama nʼetiti unu. Nʼoge dị nʼihu, mgbe ụmụ unu ga-ajụ unu ajụjụ sị, ‘Gịnị bụ isi ogidi nkume a dị nʼebe a?’
7 Bokoyebisa bango ete mayi ya Yordani ekatanaki na biteni mibale liboso ya Sanduku ya Boyokani ya Yawe. Tango ekatisaki Yordani, mayi na yango mpe ekatanaki. Mabanga oyo ezali lokola ekaniseli ya seko na seko mpo na bana ya Isalaele. »
Unu ga-asịkwa ha, ‘Ọ bụ ihe na-echetara anyị otu osimiri Jọdan si kwụsị ịsọ, mgbe ndị bụ igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị zọnyere ụkwụ ha nʼosimiri ahụ.’ Nkume a ga-abụkwara ụmụ Izrel niile ihe ncheta ruo mgbe ebighị ebi.”
8 Boye, bana ya Isalaele basalaki ndenge Jozue atindaki bango. Bazwaki kati na Yordani, mabanga zomi na mibale kolanda motango ya mabota ya Isalaele, ndenge Yawe alobaki na Jozue. Bamemaki yango kino na molako na bango, epai wapi batiaki yango.
Ụmụ Izrel mere dịka Joshua gwara ha. Ha buputara nkume iri na abụọ site nʼetiti osimiri Jọdan, dịka Onyenwe anyị si nye Joshua nʼiwu sị na otu onye, nʼebo Izrel ọbụla, ga-ebuputa otu nkume. Ha buuru nkume iri na abụọ ndị ahụ gaa nʼebe ha nọrọ ọnọdụ abalị, debe ha nʼebe ahụ.
9 Jozue atelemisaki mabanga zomi na mibale mosusu na kati-kati ya Yordani, na esika oyo Banganga-Nzambe oyo bamemaki Sanduku ya Boyokani bapikamaki, mpe etikala wana kino na mokolo ya lelo.
Joshua nʼonwe ya kwa ji nkume iri na abụọ ahụ nke si nʼetiti osimiri Jọdan wuo ogidi ịrịbama, nʼebe ahụ ndị nchụaja bu igbe ọgbụgba ndụ ahụ guzoro. Ha dịkwa nʼebe ahụ ruo taa.
10 Nzokande, Banganga-Nzambe oyo bamemaki Sanduku bawumelaki na kati-kati ya Yordani kino tango bato bakokisaki makambo nyonso oyo Yawe atindaki Jozue, ndenge kaka Moyize ayebisaki ye. Ezalaki na lombangu nde bato bakatisaki Yordani.
Ndị nchụaja, ndị bụ igbe ọgbụgba ndụ ahụ, guzoro nʼetiti osimiri Jọdan, tutu ruo mgbe e mezuru iwu ahụ niile Onyenwe anyị nyere Joshua site nʼọnụ Mosis. Mgbe ahụ kwa, ndị Izrel mere ngwangwa gafee osimiri Jọdan.
11 Tango bango nyonso basilisaki kokatisa, Sanduku ya Yawe elongo na Banganga-Nzambe balekaki lisusu liboso ya bato.
Ngwangwa ha niile gafetasịrị, igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị na ndị nchụaja gafetakwara nʼakụkụ nke ọzọ, ka ndị mmadụ na-ele ha anya.
12 Bato ya libota ya Ribeni, ya Gadi, mpe ya ndambo ya libota ya Manase bakatisaki, balataki bibundeli mpe batambolaki liboso ya bana ya Isalaele, ndenge Moyize atindaki bango.
Ndị agha ụmụ Ruben, na ụmụ Gad, na ọkara ebo Manase, buuru ụmụ Izrel niile ụzọ gafee, idu ha nʼagha, dịka Mosis nyere ha nʼiwu.
13 Bazalaki bato pene nkoto tuku minei, bato ya bitumba, oyo bakamataki bibundeli mpo na kobunda; balekaki liboso ya Yawe na nzela ya bitando ya Jeriko mpo na kobunda.
Ndị agha ọnụọgụgụ ha ruru iri puku anọ, ndị jikeere nke ọma ibu agha, duuru ebo ndị ọzọ, gafere nʼihu Onyenwe anyị bata nʼobosara ala Jeriko maka ibu agha.
14 Na mokolo wana, Yawe atombolaki Jozue na miso ya bana nyonso ya Isalaele; mpe bapesaki ye lokumu mikolo nyonso ya bomoi na ye, ndenge kaka bapesaki Moyize lokumu.
Ụbọchị ahụ bụ ụbọchị Onyenwe anyị buliri Joshua elu nke ukwuu nʼihi na o mere Joshua ka ọ dị ukwuu nʼanya ndị Izrel niile, si otu a mee ka ha tụọ ya egwu nke ukwuu dịka ha si tụọ Mosis egwu, ma sọpụkwara ya ụbọchị niile nke ndụ ya.
15 Yawe alobaki na Jozue:
Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Joshua okwu sị,
16 « Pesa Banganga-Nzambe oyo bamemi Sanduku ya Litatoli mitindo ete babima wuta na kati-kati ya ebale Yordani. »
“Nye ndị nchụaja, ndị bu igbe ọgbụgba ndụ ahụ iwu ka ha si nʼosimiri Jọdan pụta.”
17 Jozue apesaki mitindo epai ya Banganga-Nzambe: « Bobima wuta na kati-kati ya ebale Yordani. »
Ya mere Joshua nyere ndị nchụaja iwu sị ha, “Sitenụ nʼosimiri Jọdan pụta.”
18 Boye Banganga-Nzambe oyo bamemaki Sanduku ya Boyokani ya Yawe babimaki wuta na ebale. Tango kaka batiaki matambe na bango na mokili, mayi ya Yordani ezongaki na esika na yango, etondaki makasi mpe ekomaki kotiola ndenge ezalaki momesano na yango.
Mgbe ndị nchụaja bu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị ahụ si nʼosimiri Jọdan rịpụta, dịka ọbụ ụkwụ ha na-emetụ nʼala akọrọ, mmiri osimiri ahụ sọghachiri nʼọnọdụ ya ruchie akụkụ ya niile, ka ọ dị na mbụ.
19 Na mokolo ya zomi ya sanza ya liboso, bato bakendeki wuta na Yordani mpe batongaki molako na bango na Giligali, na mondelo ya este ya Jeriko.
Ihe ịrịbama a mere nʼụbọchị nke iri, nʼọnwa nke mbụ. Nʼụbọchị ahụ ka ndị Izrel niile gafere osimiri Jọdan, gaa maa ụlọ ikwu ha na Gilgal, ebe dị nʼọwụwa anyanwụ obodo Jeriko.
20 Jozue atelemisaki, na Giligali, mabanga zomi na mibale oyo babimisaki na Yordani.
Nkume iri na abụọ ahụ ha si nʼosimiri Jọdan buputa, ka Joshua guzobere na Gilgal.
21 Alobaki na bana ya Isalaele: « Tango bakitani na bino bakotuna batata na bango: ‹ Mabanga oyo elakisi nini? ›
Ọ sịrị ndị Izrel, “Nʼoge dị nʼihu, mgbe ụmụ unu ga-ajụ ndị bụ nna ha ajụjụ sị, ‘Gịnị ka nkume ndị a pụtara, Gịnịkwa ka ha na-egosi?’
22 Boyebisa bango: ‹ Bato ya Isalaele bakatisaki Yordani na mabele ya kokawuka. ›
Gwa ha, ‘Izrel gafere osimiri Jọdan nʼala akọrọ.’
23 Pamba te Yawe, Nzambe na bino, akawusaki liboso mayi ya Yordani kino tango bosilisaki kokatisa. Yawe asalaki na Yordani makambo oyo asalaki na ebale monene ya Barozo tango akawusaki yango liboso na biso, kino tango tosilisaki kokatisa yango.
Nʼihi na Onyenwe anyị bụ Chineke unu mere ka osimiri Jọdan takpọọ nʼihu unu tutu ruo mgbe unu gafesịrị nʼofe nke ọzọ. Onyenwe anyị Chineke unu mere osimiri Jọdan ihe o mere osimiri Uhie mgbe o mere ka osimiri Uhie takpọọ nʼihu anyị, tutu ruo mgbe anyị gafesịrị nʼofe ya nke ọzọ.
24 Asalaki bongo mpo ete bato nyonso ya mokili bayeba ete loboko ya Yawe ezalaka na nguya, mpe mpo ete bobangaka Yawe, Nzambe na bino, tango nyonso. »
O mere ihe ndị a niile ka ndị niile bi nʼelu ụwa mata na aka Onyenwe anyị dị ike. O mekwara ya ka unu onwe unu tụọ egwu Onyenwe anyị Chineke unu, mgbe niile.”

< Jozue 4 >