< Jozue 3 >

1 Na tongo-tongo, Jozue mpe bana nyonso ya Isalaele babimaki wuta na Shitimi mpe bakendeki kino na Yordani epai wapi batongaki molako na bango liboso ete bakatisa.
Nʼisi ụtụtụ, Joshua na ụmụ Izrel niile hapụrụ Shitim bịaruo nʼakụkụ osimiri Jọdan, maa ụlọ ikwu nʼebe ahụ. Nʼebe a ka ha nọ chere tutu ruo mgbe ha ga-agafe.
2 Sima na mikolo misato, bakambi bakomaki kotambola kati na molako
Mgbe ụbọchị atọ gasịrị, ndịisi ụmụ Izrel gabigara jegharịa nʼetiti ọmụma ụlọ ikwu ahụ,
3 mpo na kopesa bato mitindo oyo: — Soki bomoni Sanduku ya Boyokani ya Yawe, Nzambe na bino, mpe Banganga-Nzambe oyo bazali Balevi komema yango, bolongwa na bisika oyo bozali mpe bolanda yango.
nye ha iwu sị, “Mgbe unu hụrụ igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị Chineke unu, ka ndị nchụaja, ụmụ Livayị, bulitere ya, unu onwe unu ga-esi nʼebe unu nọ bilie soro ha nʼazụ.
4 Bongo bokoyeba nzela nini bokoki kolanda mpo ete nanu botambola na nzela yango te. Kasi bozala mosika na Sanduku ya Boyokani, na bametele pene nkoto moko, bopusana pene na yango te.
Ma a ga-enwe oke nʼetiti unu na ha, ihe dịka otu kilomita site nʼebe igbe ọgbụgba ndụ ahụ dị. Unu agaghị abịaru ya nso. Nke a bụ maka ị mara ụzọ unu ga-eso, nʼihi na unu esibeghị nʼụzọ a gaa ije mbụ.”
5 Jozue alobaki na bato: — Bomibulisa, pamba te lobi, Yawe akosala makambo ya kokamwa kati na bino.
Joshua gwara ndị Izrel sị, “Doonụ onwe unu nsọ, nʼihi na echi ka Onyenwe anyị ga-eme oke ihe ebube dị iche iche nʼetiti unu.”
6 Jozue alobaki na Banganga-Nzambe: — Bomema Sanduku ya Boyokani mpe botambola liboso ya bato. Batombolaki yango mpe batambolaki liboso ya bato.
Joshua gwara ndị nchụaja sị ha, “Bulienụ igbe ọgbụgba ndụ ahụ, gabiga nʼihu ndị Izrel.” Ha buliri igbe ọgbụgba ndụ ahụ, bido ịga nʼihu ụmụ Izrel.
7 Yawe alobaki na Jozue: — Lelo, nakobanda kotombola yo na miso ya bana nyonso ya Isalaele mpo ete bayeba ete nazali mpe elongo na yo ndenge nazalaki elongo na Moyize.
Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Joshua sị, “Taa, ka m ga-amalite ime ka ị dị ukwuu nʼanya ụmụ Izrel niile, ka ha niile mata na dịka m si nọnyere Mosis, otu a ka m ga-esi nọnyere gị.
8 Yebisa Banganga-Nzambe oyo bamemi Sanduku ya Boyokani: « Tango bokokoma pembeni ya mayi ya Yordani, botia makolo na bino kati na mayi mpe botelema wana. »
Ị ga-enye ndị nchụaja bụ ndị na-ebu igbe ọgbụgba ndụ iwu si, ‘Mgbe unu ruru nʼọnụ mmiri osimiri Jọdan, banyekwanụ gaa guzo nʼime osimiri ahụ.’”
9 Jozue alobaki na bana ya Isalaele: — Bopusana awa mpe boyoka maloba ya Yawe, Nzambe na bino.
Mgbe ahụ, Joshua gwara ụmụ Izrel niile sị, “Bịanụ nso, bịanụ nụrụ okwu niile nke Onyenwe anyị Chineke unu.
10 Bongo Jozue alobaki: — Ezali na nzela oyo nde bokoyeba solo ete Nzambe na bomoi azali elongo na bino mpe akobengana liboso na bino bato ya Kanana, ya Iti, ya Evi, ya Perizi, ya Girigazi, ya Amori mpe ya Yebusi.
Otu a ka unu ga-esi mata nʼezie na Chineke dị ndụ nọ nʼetiti unu, unu ga-amatakwa na ọ ghaghị ịnapụ ndị Kenan, na ndị Het, na ndị Hiv, na ndị Periz, na ndị Gigash, na ndị Amọrait, na ndị Jebus ala ha nʼihu unu.
11 Sanduku ya Boyokani ya Yawe ya mokili mobimba ekoleka liboso na bino kati na mayi ya Yordani.
Lee, igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị, Onyenwe ụwa niile ga-agabiga nʼihu unu banye nʼime Jọdan.
12 Sik’oyo, bopona bato zomi na mibale kati na mabota ya Isalaele, moto moko mpo na libota moko.
Ugbu a sitenụ nʼebo Izrel niile họpụta ndị ikom iri na abụọ, site nʼebo ọbụla otu onye.
13 Mpe tango kaka Banganga-Nzambe oyo bakomema Sanduku ya Yawe, Nkolo ya mokili mobimba, bakotia matambe ya makolo na bango kati na Yordani, mayi na yango ekokabwana na biteni mibale; mayi oyo ekowuta na ngambo ya likolo ekotelema lokola mir.
Ngwangwa ndị nchụaja bu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị, Onyenwe ụwa niile zọnyere ụkwụ na Jọdan, mmiri Jọdan nke si nʼebe elu ya na-arịdata ga-akwụsị ịsọ, guzoro dịka mgbidi.”
14 Boye tango bato bakobima na molako mpo na kokatisa Yordani, Banganga-Nzambe oyo bakomema Sanduku ya Boyokani bakotambola liboso na bango.
Ya mere, mgbe ndị Izrel sitere nʼụlọ ikwu ha bilie njem ịgabiga osimiri Jọdan, ndị nchụaja bụ igbe ọgbụgba ndụ buuru ha ụzọ na-aga ha nʼihu.
15 Nzokande, na tango ya kobuka milona, mayi ya Yordani etondaka makasi penza. Kasi tango kaka Banganga-Nzambe oyo bamemaki Sanduku bakomaki pembeni ya Yordani mpe batiaki matambe na bango kati na mayi,
Nʼoge owuwe ihe ubi ọbụla, osimiri Jọdan na-etoju etoju, sọjukwaa akụkụ ya niile. Ma ngwangwa ndị nchụaja bu igbe ọgbụgba ndụ a bịaruru nso zọnye ụkwụ ha nʼọnụ mmiri Jọdan,
16 mayi oyo ezalaki kowuta na ngambo ya likolo etikaki kotiola mpe esalaki lokola mir moko ya monene, mpe etikaki nzela moko ya monene wuta na engumba Adamu, oyo ezalaki pembeni ya Tsaritani; bongo na ngambo mosusu, mayi oyo ezalaki kokita kino na ebale monene ya Araba, ebale monene ya Barozo, ya lubwaku ya Yordani, esilaki nyonso. Bato bakatisaki kino na Jeriko oyo ezalaki liboso na bango.
mmiri si nʼelu elu osimiri ahụ kwụsịrị ịsọ, ọ gara elu tụkọta onwe ya dịka mgbidi nʼebe dị anya, nʼobodo a na-akpọ Adam, nke dị nso obodo Zaretan. Ebe mmiri nke na-eruda na-asọbanye osimiri Araba, ya bụ, osimiri Nnu kwụsịrị ịsọ kpamkpam. Ya mere, ndị Izrel gabigara na ncherita ihu Jeriko.
17 Banganga-Nzambe oyo bamemaki Sanduku ya Boyokani ya Yawe bapikamaki na mabele ya kokawuka, na kati-kati ya mayi ya Yordani, wana bana nyonso ya Isalaele bazalaki koleka kino tango ekolo mobimba esilisaki kokatisa na mabele ya kokawuka.
Ndị nchụaja bu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị guzoro nʼala akọrọ nʼetiti Jọdan, Izrel niile gabigakwara tutu ruo mgbe mba ahụ niile gafesịrị nʼala akọrọ.

< Jozue 3 >