< Yobo 12 >

1 Yobo azongisaki:
Mgbe ahụ, Job zara:
2 « Solo, bozali penza bato; tango bokokufa, bwanya mpe ekokufa elongo na bino!
“Nʼezie, naanị unu bụ ndị maara ihe, unu na amamihe ga-anwụkọ nʼotu.
3 Kasi atako bongo, ngai mpe nazali mayele lokola bino, boleki ngai na eloko te. Nani ayebi te makambo wana nyonso?
Ma enwere m mmụọ iche uche dịka unu; abụghị m onye na-erughị eru nʼebe unu nọ. Onye bụ onye na-amaghị ihe ndị a unu na-ekwu?
4 Nakomi eloko ya kotiola na miso ya baninga na ngai, ngai oyo nazali kobelela Nzambe mpo ete ayanola ngai; moto ya sembo, moto ya alima, ye nde akomi eloko ya kotiola!
“Abụzi m ihe ọchị nʼebe ndị enyi m nọ, nʼagbanyeghị na m kpọkuru Chineke, ọ za, onye ezi omume, onye na-enweghị ịta ụta bụzikwa ihe eji akpa ọchị!
5 Bato ya esengo basekaka bato oyo bazali na pasi, babetaka bato oyo batepaka-tepaka kisambeti.
Ndị na-enweghị nsogbu na-eleda ndị ọdachi dakwasịrị anya dịka nsogbu si eche ndị ụkwụ ha na-amịchapụ amịchapụ.
6 Bandako ya bato ya mobulu ezalaka na kimia, mpe bato oyo batombokelaka Nzambe, oyo bamonaka makasi na bango lokola Nzambe, bango nde babatelamaka.
Ụlọ ikwu nke ndị na-apụnara mmadụ ihe na-adị jụụ; ndị na-akpasu Chineke iwe na-adị nʼudo, bụ ndị na-ebugharị chi ha nʼaka ha.
7 Kasi tuna nyama ya zamba, ekoteya yo; tuna ndeke ya likolo, ekolakisa yo;
“Ma jụọ ụmụ anụmanụ, ha ga-akụziri gị, maọbụ ụmụ nnụnụ, ha ga-agwa gị.
8 loba na mabele, ekoteya yo; to tika ete mbisi ya ebale monene epesa yo sango.
Ma ọ bụkwanụ gwa ala okwu, ọ ga-akụziri gị, maọbụ kwere ka azụ nọ na mmiri kọọrọ gị.
9 Kati na yango, ekelamu nini eyebi te ete loboko ya Yawe nde esalaki nyonso wana?
Olee otu nʼime ihe ndị a nke na-amaghị na ọ bụ aka Onyenwe anyị mere nke a?
10 Bomoi ya bikelamu nyonso mpe pema ya bato nyonso ezali kati na loboko na Ye.
Nʼaka ya ka ndụ ihe niile e kere eke dị, ya na ndụ ụmụ mmadụ
11 Boni, litoyi emekaka maloba te ndenge lolemo emekaka bilei?
Ọ bụ na ntị adịghị anwale okwu, otu ire si anwale ihe oriri?
12 Bwanya ezalaka kati na bampaka te? Bomoi ya molayi epesaka mayele te?
Ọ bụ na-adịghị ahụ amamihe nʼetiti ndị okenye? Ogologo ndụ, ọ dịghị eweta nghọta?
13 Bwanya mpe makasi ezali epai ya Nzambe, toli mpe mayele ezali ya Ye.
“Ọ bụ Chineke nwe amamihe na ike, ndụmọdụ na nghọta bụkwa nke ya.
14 Bakokoka te kotonga lisusu oyo Ye asili kobebisa, bakokoka kokangola te moto oyo Ye asili kokanga.
Ihe o tidara enweghị mwugharị ọzọ; mgbapụta adịghị nye onye o tụbara nʼụlọ mkpọrọ.
15 Soki akangi mayi, bokawuki ekotaka; kasi soki afungoli yango, mokili ezindaka.
Ọ bụrụ na o gbochie mmiri, ebe niile atakọrọchaa. Ọ bụrụ na o zipụ ha, ha erikpuo ala niile.
16 Makasi mpe elonga ezali ya Ye; moto oyo basili kokosa mpe moto oyo akosi, bango mibale bazali ya Ye.
Nʼaka ya ka ike na nzube ihe dị; ndị a ghọgburu na ndị na-aghọgbu bụkwa nke ya.
17 Amemaka bapesi toli na bowumbu mpe akomisaka basambisi bato ya maboma;
Ọ na-anapụ ndị ndụmọdụ ọkwa ha chụpụ ha, ma ndị ikpe ka ọ na-eme ka ha ghọọ ndị nzuzu.
18 afungolaka minyololo ya bakonzi mpe akangaka liputa na baloketo na bango;
Ọ na-atọpụ mkpọrọ igwe ndị eze kere, ma were akwa mgbochi kee ha nʼukwu.
19 amemaka Banganga-Nzambe na bowumbu mpe akweyisaka bato oyo bavanda kala na bokonzi;
Ọ na-agbawa ndị nchụaja ọtọ chụpụ ha, kwatuokwa ndị ọnọdụ ha sirila ike ogologo oge gara aga.
20 akangaka minoko ya bato oyo balobaka malamu, alongolaka mikolo bososoli;
Ọ na-emechi ọnụ ndị ndụmọdụ a tụkwasịrị obi, wepụkwa nghọta nke ndị okenye.
21 asopelaka bakonzi soni, abotolaka bibundeli ya bato ya makasi;
Ọ na-eji ndị ọgaranya eme ihe ọchị, napụkwa ngwa agha nke ndị dị ike.
22 abimisaka na pwasa, makambo ya sekele, makambo oyo ezali kati na molili, mpe abimisaka na pole bililingi oyo eleki mwindo;
Ọ na-ekpughe ihe omimi nke ọchịchịrị meekwa ka oke ọchịchịrị pụta ìhè.
23 atombolaka bikolo mpe abebisaka yango, akomisaka minene mindelo ya bikolo mpe apanzaka yango;
Ọ na-eme ka mba dị ukwuu, ọ na-emekwa ka ha laa nʼiyi; Ọ na-eme ka mba baa ụba, ma chụsakwaa ha.
24 alongolaka makanisi ya bakonzi ya bikolo mpe asalaka ete batambola kati na bisobe oyo ezanga nzela
Ọ na-anapụ ndị ndu nke ụwa amamihe ha, zipụkwa ha ka ha na-awagharị nʼọzara ebe ụzọ na-adịghị.
25 mpo ete batepatepa kati na molili, na kozanga pole; mpe asalaka ete batepatepa lokola moto alangwe masanga.
Ha na-asọgharị ìsì nʼọchịchịrị na-enweghị ìhè. Ọ na-eme ha ka ha na-adagharị dịka ndị mmanya na-egbu.

< Yobo 12 >