< Ebandeli 7 >

1 Yawe alobaki na Noa: « Kota na masuwa, yo mpe libota na yo mobimba, pamba te yo kaka nde omonani sembo na miso na Ngai kati na bato ya ekeke oyo.
Mgbe ụbọchị ahụ zuru, Onyenwe anyị kpọrọ Noa sị ya, “Baa nʼime ụgbọ mmiri, gị na ezinaụlọ gị niile, nʼihi na nʼime ndị niile bi nʼọgbọ a, ọ bụ naanị gị bụ onye ezi omume m hụrụ.
2 Kamata banyama sambo ya mibali mpe sambo ya basi kati na banyama ya lolenge nyonso oyo ezangi mbindo; mpe nyama moko ya mobali mpe moko ya mwasi kati na banyama oyo ezali mbindo.
Kpọrọ ụmụ anụmanụ ndị a a gụrụ dịka ndị dị ọcha, dịka ụdị ha si dị asaa asaa, oke na nwunye. Otu a kwa, kpọrọkwa ụmụ anụmanụ ndị a gụrụ dịka ndị na-adịghị ọcha, dịka ụdị ha si dị, abụọ abụọ, oke na nwunye,
3 Kamata lisusu bandeke sambo ya mibali mpe sambo ya basi kati na lolenge nyonso ya bandeke mpo ete esila te kati na mokili.
na ụmụ anụ ufe asaa asaa, dịka ụdị ha si dị, oke na nwunye, maka idebe ụdị ndị a niile ndụ nʼụwa.
4 Pamba te etikali mikolo sambo mpo ete nanokisa mvula oyo ekowumela mikolo tuku minei mpe babutu tuku minei mpe nakosilisa koboma bikelamu nyonso oyo nasala kati na mokili oyo. »
Nʼihi na ụbọchị asaa site taa, aga m ezidata mmiri ozuzo nʼụwa. Mmiri a ga-ezo iri ụbọchị anọ, ehihie na abalị. Aga m ekpochapụ site nʼelu ụwa ihe niile nwere ndụ nke m kere.”
5 Bongo, Noa asalaki makambo nyonso ndenge kaka Yawe atindaki ye.
Ya mere, Noa mere ihe niile Onyenwe anyị nyere ya nʼiwu.
6 Noa azalaki na mibu nkama motoba ya mbotama tango mpela eyaki na mokili.
Noa gbara narị afọ isii mgbe mmiri ukwu a bidoro izo nʼelu ụwa.
7 Noa mpe bana na ye ya mibali elongo na mwasi na ye mpe basi ya bana na ye bakotaki na masuwa mpo ete babika na mpela.
Noa banyere nʼụgbọ mmiri ahụ, ya na ụmụ ya ndị ikom na nwunye ya, na ndị nwunye ụmụ ya ndị ikom ịgbanarị uju mmiri ahụ.
8 Kati na banyama ya lolenge nyonso, moko ya mobali mpe moko ya mwasi, ezala oyo ezanga mbindo to oyo ezali mbindo, bandeke mpe banyama oyo etambolaka na libumu
Ụmụ anụmanụ ndị dị ọcha, na ndị na-adịghị ọcha, abụọ abụọ, tinyere anụ ufe na ihe niile e kere eke na-akpụgharị nʼala, abụọ abụọ kwa,
9 eyaki epai na Noa mpe ekotaki na masuwa, mwasi na mobali, ndenge Nzambe atindaki Noa.
oke na nwunye, bịakwutere Noa soro ya banye nʼụgbọ mmiri ahụ, dịka Chineke nyere Noa nʼiwu.
10 Bongo sima na mikolo sambo, mpela eyaki na mokili.
Mgbe abalị asaa gafere, uju mmiri ahụ bịakwasịrị ụwa.
11 Tango Noa akokisaki mibu nkama motoba ya mbotama, na sanza ya mibale, na mokolo ya zomi na sambo, bitima nyonso ya se mpe maninisa nyonso ya likolo efungwamaki.
Nʼafọ narị isii nke ndụ Noa, nʼọnwa nke abụọ, nʼụbọchị nke iri na asaa, bụ ụbọchị isi iyi niile dị nʼime ime ala nupụtara nʼelu ala, mmiri niile dị na mbara eluigwe ka a hapụrụ ka ha wụdata nʼụwa.
12 Mvula enokaki na mokili mikolo tuku minei mpe babutu tuku minei.
Mmiri zogịdere na-esepụghị aka iri ụbọchị anọ, ehihie na abalị.
13 Kaka na mokolo wana, Noa mpe bana na ye ya mibali: Semi, Cham mpe Jafeti, elongo na mwasi na ye mpe basi misato ya bana na ye, bakotaki na masuwa.
Nʼụbọchị ahụ kpomkwem, Noa banyere nʼụgbọ mmiri ahụ, ya na Shem, Ham na Jafet, bụ ụmụ Noa, na nwunye Noa, na ndị nwunye atọ nke ụmụ ya.
14 Elongo na bango, ekotaki mpe banyama ya zamba ya lolenge nyonso, bibwele ya lolenge nyonso, bikelamu ya lolenge nyonso oyo etambolaka na libumu mpe bandeke ya lolenge nyonso mpe bikelamu nyonso oyo ezali na mapapu.
Ha onwe ha, na anụ ọhịa ọbụla, nʼụdị ya, na anụ ụlọ ọbụla, nʼụdị ya na ihe ọbụla e kere eke na-akpụgharị nʼala, nʼụdị ya, na anụ ufe ọbụla nʼụdị ya, na aha nnụnụ ọbụla na ihe ọbụla nwere nku.
15 Mwasi na mobali, kati na bikelamu nyonso oyo ezali na bomoi, eyaki epai ya Noa mpo na kokota na masuwa.
Ha bịakwutere Noa nʼime ụgbọ mmiri ahụ, abụọ abụọ site nʼihe niile ọbụla e kere eke, nke nwere ume ndụ nʼime ha.
16 Banyama nyonso oyo ekotaki kuna ezalaki mwasi na mobali kati na bikelamu nyonso oyo ezali na bomoi, ndenge Nzambe atindaki Noa. Sima, Yawe akangaki ekuke ya masuwa.
Ma ndị banyerenụ bụ oke na nwunye, site na ihe niile nwere ndụ dịka Chineke nyere ya nʼiwu. Mgbe ahụ, Onyenwe anyị mechiri ọnụ ụzọ dị nʼụgbọ mmiri ahụ.
17 Mpela ewumelaki na mokili mikolo tuku minei; mayi ekomaki ebele mpe etombolaki masuwa likolo na yango.
Uju mmiri nọgidere nʼụwa iri ụbọchị anọ. Mgbe mmiri ndị a na-aba ụba, ha buliri ụgbọ mmiri ahụ elu site nʼelu ala.
18 Mayi emataki mpe ekomaki ebele, bongo masuwa ekomaki kotepatepa likolo ya mayi.
Mmiri ndị a toro na-ala elu na-abawanyekwa ụba nʼelu ụwa. Ụgbọ mmiri ahụ segooro nʼelu mmiri.
19 Mayi emataki lisusu makasi mpe bangomba nyonso ya milayi oyo ezalaki na mokili ezindaki na se ya mayi.
Mmiri ndị ahụ toro laa elu kpuchie ugwu ukwu niile dị nʼokpuru mbara eluigwe.
20 Mayi emataki lisusu likolo ya bangomba na bosanda ya bametele pene sambo to mwambe.
Mmiri ndị a toro kpuchiri ugwu niile, ruo na ịla elu mmiri ndị a site nʼelu ugwu ukwu niile ruru mita asaa.
21 Bikelamu nyonso ya bomoi kati na mokili ekufaki, ezala bandeke, bibwele, banyama ya zamba to mpe banyama ya mike-mike oyo etambolaka na mabele to mpe bato nyonso.
Ihe niile nwere ndụ nke na-ejegharị nʼelu ụwa kubiri ume. Anụ ufe, na anụ ụlọ, na anụ ọhịa, na ihe niile e kere eke jupụtara nʼụwa, na ụmụ mmadụ niile.
22 Nyonso oyo ezalaki na pema ya bomoi ekufaki kati na mokili.
Ee, ihe niile na-eku ume nke bi nʼelu ala nwụrụ.
23 Boye, Yawe alongolaki kati na mokili bikelamu nyonso oyo ezalaki na bomoi, kobanda na moto kino na ebwele, ekelamu oyo etambolaka na libumu mpe ndeke ya likolo; alongolaki bango na mokili mpe etikalaki kaka Noa na ba-oyo bazalaki na ye elongo na masuwa.
Ihe niile nwere ume ndụ nʼelu ụwa ka e kpochapụrụ. Mmadụ na anụmanụ, na anụ na-akpụgharị nʼala na nnụnụ niile. A lara ha niile nʼiyi. Ma ọ bụ naanị Noa na ndị niile so ya nọdụ nʼụgbọ mmiri ahụ ka a hapụrụ ndụ.
24 Mayi etondaki na mokili mikolo nkama moko na tuku mitano.
Narị ụbọchị na iri ụbọchị ise ka mmiri dọọrọ nʼelu ụwa dum.

< Ebandeli 7 >

The Great Flood
The Great Flood