< Ebandeli 30 >

1 Tango Rasheli amonaki ete azali kobotela Jakobi bana te, akomaki na zuwa mpo na ndeko na ye ya mwasi. Boye alobaki na Jakobi: — Pesa ngai bana, noki te nakokufa.
Rechel hụrụ na ya amụghị nwa ọbụla nye Jekọb, o kworo ekworo megide nwanne ya nwanyị. Ya mere, ọ sịrị Jekọb, “Nye m ụmụ. Ọ bụrụ na i meghị otu a, aga m anwụ.”
2 Jakobi asilikaki makasi mpo na Rasheli mpe alobaki: — Boni, ngai nakomi nde Nzambe oyo akangi yo mabota?
Jekọb were iwe megide Rechel, sị ya, “Abụ m Chineke onye gbochiri gị mkpụrụ nke afọ?”
3 Rasheli alobaki: — Tala Bila, mwasi mowumbu na ngai; sangisa na ye nzoto mpo ete abotela ngai bana, mpe na nzela na ye, ngai mpe nakoka kotonga libota.
Mgbe ahụ Rechel gwara Jekọb sị ya, “Lee odibo m nwanyị Bilha, bakwuru ya ka ọ mụọ nwa nʼikpere m abụọ, ka mụ onwe m site na ya bụrụkwa onye mụtara ụmụ.”
4 Rasheli apesaki ye Bila, mwasi mosali na ye, mpo ete akoma mwasi na ye. Jakobi asangisaki na ye nzoto,
Rechel nyere Jekọb Bilha, odibo nwanyị ya, Jekọb bakwuuru ya.
5 mpe Bila akomaki na zemi. Abotelaki Jakobi mwana mobali.
Bilha tụụrụ ime mụọra Jekọb nwa nwoke.
6 Rasheli alobaki: « Nzambe alongisi ngai, ayoki kolela na ngai mpe apesi ngai mwana mobali. » Boye apesaki ye kombo « Dani. »
Nke a mere ka Rechel kwuo sị, “Chineke ekpepụtala m. Ọ nụla arịrịọ m nye m nwa nwoke.” Nʼihi nke a, Rechel gụrụ nwa ahụ Dan.
7 Sima na yango, Bila, mwasi mosali ya Rasheli, azwaki lisusu zemi mpe abotelaki Jakobi mwana mobali ya mibale.
Bilha, odibo nwanyị Rechel, tụụrụ ime ọzọ mụtara Jekọb nwa nwoke nke abụọ.
8 Rasheli alobaki: « Nabundisi ndeko na ngai ya mwasi bitumba ya Nzambe mpe nalongi. » Boye apesaki ye kombo « Nefitali. »
Rechel kwuru sị, “Mgba dị ukwuu ka mụ na nwanne m nwanyị gbara, m merie.” Ọ kpọọ ya Naftalị.
9 Tango Lea amonaki ete azali kobota lisusu te, azwaki Zilipa, mwasi mosali na ye, mpe apesaki ye epai ya Jakobi mpo ete akoma mwasi na ye.
Lịa hụrụ na ya akwụsịla ịmụ nwa, ọ kpọọrọ Zilpa, odibo ya nwanyị kpọnye Jekọb ka ọ bụrụ nwunye ya.
10 Zilipa, mwasi mosali ya Lea, abotelaki Jakobi mwana mobali.
Zilpa, odibo nwanyị Lịa, mụtara Jekọb nwa nwoke.
11 Lea alobaki: « Oyo nde esengo! » Boye apesaki ye kombo « Gadi. »
Mgbe nke a mere, Lịa kwuru sị, “Nke a bụ ihuọma.” Ọ kpọrọ nwa ahụ Gad.
12 Sima na yango, Zilipa, mwasi mosali ya Lea, abotelaki Jakobi mwana mobali ya mibale.
Zilpa, odibo nwanyị Lịa mụtaara Jekọb nwa nwoke nke abụọ.
13 Lea alobaki: « Oyo esengo ya ndenge nini nakomi na yango! Pamba te basi bakobenga ngai moto ya esengo. » Boye apesaki ye kombo « Aseri. »
Mgbe ahụ Lịa kwuru sị, “Ọṅụ ejula m obi, nʼihi na ụmụ nwanyị ibe m ga-akpọ m onye ihe na-agara nke ọma.” Lịa kpọrọ nwantakịrị nwoke ahụ Asha.
14 Na eleko ya kokata ble, Ribeni akendeki na bilanga mpe amonaki bambuma ya mandragore; amemelaki yango Lea, mama na ye. Bongo Rasheli alobaki na Lea: — Nabondeli yo, pesa ngai ndambo ya bambuma ya mandragore oyo mwana na yo amemaki.
Otu ụbọchị, nʼoge a na-aghọ ọka wiiti, Ruben nwa Lịa, gara nʼọhịa hụ ahịhịa a na-akpọ mandreki. Ọ kụtaara nne ya ụfọdụ nʼime ahịhịa a. Mgbe Rechel hụrụ ahịhịa a, ọ rịọrọ Lịa sị ya, “Biko nyetụ m ụfọdụ nʼime mandreki ndị a nwa gị nwoke kụtara.”
15 Kasi Lea azongiselaki ye: — Boni, ndenge ozwi mobali na ngai, ekoki te? Olingi lisusu kozwa bambuma ya mandragore ya mwana na ngai? Rasheli alobaki na ye: — Malamu! Soki opesi ngai bambuma ya mandragore ya mwana na yo, Jakobi akolala epai na yo na butu ya lelo.
Ma Lịa zara sị ya, “O zubeere gị na ị napụrụ m di m? Ị chọkwara ịnapụ m mandreki ndị a nwa m nwoke wetaara m?” Rechel zara Lịa sị, “Ọ dị mma, ka gị na ya dinaa nʼabalị a ka ọ bụrụ ihe mgbanwo maka mandreki nwa gị nwoke.”
16 Na pokwa, wana Jakobi awutaki bilanga, Lea akendeki kokutana na ye mpe alobaki na ye: « Okolala epai na ngai, pamba te napesi bambuma ya mandragore ya mwana na ngai mpo na yo. » Boye Jakobi asangisaki na ye nzoto na butu wana.
Ya mere, mgbe Jekọb si nʼọhịa na-alọbata nʼuhuruchi ụbọchị ahụ, Lịa pụrụ izute ya, sị ya, “Ị ga-abakwute m nʼihi na m ejirila m ahịhịa mandreki nwa m nwoke m zụta gị.” Ha dinara nʼabalị ahụ.
17 Nzambe ayokelaki Lea mawa, akomaki na zemi mpe abotelaki Jakobi mwana mobali ya mitano.
Chineke nụrụ olu Lịa, ọ tụụrụ ime mụtara Jekọb nwa nwoke nke ise.
18 Lea alobaki: « Nzambe apesi ngai lifuti na ngai lokola napesaki mosali na ngai ya mwasi epai ya mobali na ngai. » Boye apesaki ye kombo « Isakari. »
Lịa sịrị, “Chineke akwụọla m ụgwọ maka odibo m nwanyị m nyere di m.” Ya mere ọ kpọrọ aha ya Isaka.
19 Lea azwaki lisusu zemi mpe abotelaki Jakobi mwana mobali ya motoba.
Lịa tụkwaara ime ọzọ mụtara Jekọb nwa nwoke nke isii.
20 Lea alobaki: « Nzambe apesi ngai likabo ya motuya. Sik’oyo, mobali na ngai akopesa ngai lokumu mpo ete naboteli ye bana mibali motoba. » Boye apesaki ye kombo « Zabuloni. »
Ugbu a Lịa kwuru sị, “Chineke enyela m ezi onyinye dị oke ọnụ. Ugbu a, di m ga-eji nkwanye ugwu leta m nʼihi na amụọrala m ya ụmụ ndị ikom isii.” Ọ kpọrọ aha ya Zebụlọn.
21 Sima na mikolo, abotaki lisusu mwana mwasi mpe apesaki ye kombo « Dina. »
Emesịa, Lịa mụrụ nwa nwanyị, kpọọ ya Daịna.
22 Nzambe akaniselaki Rasheli, ayokaki kolela na ye mpe afungolaki ye mabota.
Chineke chetara Rechel. Ọ nụrụ olu ya, meghee akpanwa ya.
23 Akomaki na zemi, abotaki mwana mobali mpe alobaki: « Nzambe alongoli soni na ngai. »
Nʼihi ya, Rechel tụụrụ ime mụta nwa nwoke. Ọ sịrị, “Chineke ewepụla nkọcha dịịrị m.”
24 Apesaki ye kombo « Jozefi, » mpe alobaki: « Tika ete Yawe abakisela ngai mwana mosusu ya mobali! »
Rechel kpọrọ aha ya Josef, dị ka ọ sịrị, “Ka Onyenwe anyị nyekwa m nwa nwoke ọzọ.”
25 Sima na Rasheli kobota Jozefi, Jakobi alobaki na Labani: — Pesa ngai nzela mpo ete nazonga na mboka na ngai.
Mgbe Rechel mụsịrị Josef, Jekọb jekwuru Leban sị ya, “Zilaga m ka m laghachi nʼebe m na ala nke m.
26 Pesa ngai mpe basi mpe bana na ngai, ba-oyo mpo na bango nasaleli yo; bongo nakokende na ngai. Pamba te oyebi malamu mosala makasi oyo nasaleli yo.
Kpọnye m ndị nwunye m, ndị m ji nʼihi ha gbara gị odibo, ha na ụmụ m, ka m lakwaa. Ị maara otu m siri gbaara gị odibo. Kpọnye m ha ka m duru ha laghachi ebe m si bịa.”
27 Kasi Labani alobaki na ye: — Soki nazwi ngolu na miso na yo, nabondeli yo, kokende te; pamba te nasosoli na bosoloka ete Yawe apamboli ngai na nzela na yo.
Leban sịrị Jekọb, “Ọ bụrụ na m achọtala amara nʼihu gị biko nọdụ, nʼihi na esi m nʼịgba afa chọpụta na Onyenwe anyị agọziela m nʼihi gị.”
28 Abakisaki: — Katela ngai lifuti na yo mpe nakofuta yo yango.
Leban sịrị, “Kwuo ego ole ị chọrọ ka m kwụọ gị, aga m akwụ ya.”
29 Jakobi alobaki na ye: — Oyebi yo moko ndenge nini ngai nasaleli yo mpe ndenge nini, na nzela na ngai, bibwele na yo ekomi ebele.
Jekọb zara sị Leban, “Gị onwe gị maara otu m si gbara gị odibo na ihe mere igwe anụ ụlọ gị ndị m lekọtara.
30 Moke oyo ozalaki na yango, liboso ete ngai naya, ekomi ebele penza. Yawe apamboli yo na nzela na ngai. Kasi sik’oyo, nakosala tango nini mpo na libota na ngai moko?
Nʼihi na ole na ole ka i nwere mgbe m bịara, ma ugbu a, ha abaala ụba nke ukwuu. Onyenwe anyị esitela nʼụkwụ m gọzie gị. Ugbu a, kedụ mgbe m ga-arụkwanụ ọrụ nke mụ onwe m maka ezinaụlọ m?”
31 Labani atunaki ye: — Nasengeli kopesa yo nini? Jakobi azongisaki: — Okopesa ngai eloko te. Kasi soki olingi kosala likambo oyo mpo na ngai, nakokoba koleisa mpe kobatela bibwele na yo.
Leban jụrụ Jekọb sị, “Kedụ ihe m ga-enye gị?” Jekọb gwara ya sị, “Enyela m ihe ọbụla, kama o nwere otu ihe m chọrọ ka i mee. Ọ bụrụ na i mee ya, aga m alaghachi ilekọta igwe anụ ụlọ gị.
32 Lelo, nakoleka na kati-kati ya bibwele na yo, nakolongola kati na bana meme, bameme nyonso ya madodo-madodo mpe oyo ezali ya banzela-nzela ya mwindo; mpe lisusu kati na bantaba nyonso ya madodo-madodo mpe ya banzela-nzela ya pembe. Wana nde ezala lifuti na ngai.
Kwere ka m jegharịa nʼetiti igwe anụ ụlọ gị, ka m họpụta site nʼetiti igwe atụrụ gị ndị niile tụrụ agwa agwa, na ụmụ atụrụ niile dị oji, na ewu niile tụrụ agwa agwa. Atụrụ na ewu ndị a niile m ga-ahọpụta ga-abụ ụgwọ ọrụ m.
33 Boye bosembo na ngai ekomonana sima na mikolo tango okoya kotala lifuti na ngai. Soki omoni epai na ngai ntaba ezanga madodo to ezanga banzela ya pembe to mwana meme ezanga madodo to ezanga banzela ya mwindo, wana ekozala lokola nayibi yango.
Ezi omume m ga-azara nʼọdịnihu, mgbe ọbụla ị bịara nyochaa ụgwọ ọrụ ị kwụrụ m. Ewu ọbụla na-atụghị agwa agwa, maọbụ atụrụ ọbụla na-ejighị oji ị chọpụtara nʼetiti igwe ewu na atụrụ nke m ka a ga-agụ dị ka ihe e zuru nʼohi.”
34 Labani alobaki: — Iyo! Tika ete ezala ndenge olobi.
Leban zara sị ya, “Ọ dị mma. Ya dịrị dịka i kwuru.”
35 Kaka na mokolo wana, Labani alongolaki kati na bibwele, bantaba ya mibali ya madodo-madodo mpe ya banzela-nzela ya pembe, bantaba nyonso ya basi ya madodo-madodo mpe ya banzela-nzela ya pembe, mpe bibwele nyonso oyo ezalaki mwa pembe mpe mwa mwindo kati na bana meme. Apesaki yango na maboko ya bana na ye ya mibali.
Nʼotu ụbọchị ahụ, ọ họpụtachara mkpi niile tụrụ agwa maọbụ ntụpọ na nne ewu niile ndị nwere tụrụ agwa maọbụ ntụpọ na nke ọbụla nwere ajị ọcha nʼahụ ya. Ọ họpụtakwara atụrụ ojii niile, nyefee ha nʼaka ụmụ ya ka ha lekọtaa ha.
36 Sima, Labani atambolaki mikolo misato mpo na kokabwana na Jakobi, wana Jakobi akobaki kobatela ndambo ya bibwele ya Labani oyo etikalaki.
Leban jere ije abalị atọ nke kewapụrụ ha site nʼebe Jekọb nọ. Ma Jekọb nọgidere na-elekọta igwe anụ ụlọ Leban ndị ọzọ.
37 Jakobi azwaki bitape ya mobesu ya nzete ya pepiliye, ya amande mpe ya platane.
Mgbe ahụ Jekọb gara gbute ngalaba osisi pọpla, na osisi alụmọnd, na osisi plenụ, kpechapụ ahụ agbụgbọ osisi ndị a, si otu a mee ka ime ime ngalaba osisi ndị a dị ọcha pụta ìhè.
38 Bongo atiaki kati na basani mpe kati na bimelelo, liboso ya bibwele, bitape oyo apalolaki, na esika oyo bibwele ezalaki koya komela mayi. Wana bibwele ya basi ezalaki koyoka posa ya mayi, ezalaki mpe koyoka posa ya kosangisa nzoto na bibwele ya mibali.
Ọ tọgbọrọ osisi ndị a o kpechapụtara nʼebe ewu na atụrụ ndị a na-aṅụ mmiri, ka ha cherịta ịhụ ebe igwe anụ ụlọ ndị a nọ mgbe ọbụla ha na-aṅụ mmiri. Nke a mere mgbe igwe anụ ụlọ ndị a na-enwe ekpomọkụ nke ịgba ibe ha, nʼoge ha bịara ịṅụ mmiri,
39 Boye, bibwele ezalaki koya kosangisa nzoto liboso ya bitape wana; mpe tango ezalaki kobota, bana na yango ezalaki na banzela-nzela ya pembe, banzela-nzela ya mwindo mpe madodo-madodo.
ọ bụ nʼihu ngalaba osisi ndị a ka ha na-anọ na-agba onwe ha. Mgbe anụ ụlọ ndị a mụrụ ụmụ, ahụ ụmụ ha na-atụ agwa agwa maọbụ nwe ntụpọ.
40 Jakobi atiaki pembeni bana meme mpe atindaki yango na esika oyo bana meme ya nzela-nzela mpe ya mwa mwindo ezalaki; pamba te yango ezalaki kobotama mingi kati na bibwele ya Labani. Ezali boye nde akomaki na bibwele ya ye moko oyo asangisaki te na bibwele ya Labani.
Jekọb na-edo ụmụ igwe ewu na atụrụ ndị a nʼotu akụkụ, ma ọ na-eme ka anụ ụlọ ndị ọzọ chee ihu ha nʼanụ ụlọ Leban ndị tụrụ agwa agwa, maọbụ na-eji oji. Nʼụzọ dị otu a, ọ kewapụtaara onwe ya anụ ụlọ nke ya. O tinyekọtaghị ha nʼanụ ụlọ Leban.
41 Tango nyonso bibwele ya basi, oyo ezalaki na nzoto minene, ezalaki na posa ya kosangisa nzoto, Jakobi azalaki kotia liboso ya bibwele yango bitape ya nzete kati na basani oyo yango ezalaki komelela mayi mpo ete esangisa nzoto pembeni ya bitape wana.
Mgbe ọbụla nne anụ ụlọ ndị ahụ siri ike nọ nʼọnọdụ ịtụrụ ime, Jekọb na-edobe ngalaba osisi ndị ahụ nʼakụkụ ebe ha na-aṅụ mmiri nʼihu ha, ka ha nọrọ nʼebe ahụ gbaa onwe ha.
42 Kasi, na esika yango, azalaki kotia te bibwele oyo ekonda. Boye bibwele oyo ekonda ezalaki ya Labani, mpe oyo ya minene ezalaki ya Jakobi.
Ma ọ bụrụ na anụ ụlọ ndị ahụ adịghị ike, Jekọb anaghị edebe osisi ndị a nʼihu ha. Ya mere, igwe ewu na atụrụ ndị na-esighị ike gaara Leban. Ma ndị siri ike gaara Jekọb.
43 Na nzela wana nde moto oyo akomaki na bozwi mingi koleka. Azwaki bibwele ebele, basali ya basi mpe ya mibali, bashamo mpe ba-ane.
Site nʼụzọ dị otu a, Jekọb ghọrọ onye nwere akụ hie nne. O nwekwara ọtụtụ igwe anụ ụlọ na ọtụtụ ndị na-ejere ya ozi nwoke na nwanyị, na ọtụtụ ịnyịnya kamel, na ọtụtụ ịnyịnya ibu ndị ọzọ.

< Ebandeli 30 >