< Kobima 16 >

1 Lisanga nyonso ya bana ya Isalaele balongwaki na Elimi mpe bakomaki na esobe ya Tsini, oyo ezali kati ya Elimi mpe ngomba Sinai, na mokolo ya zomi na mitano, na sanza ya mibale sima na kobima na bango na Ejipito.
Ọgbakọ ụmụ Izrel niile hapụrụ obodo Elim, jere ije bịarute nʼọzara Sin nke dị nʼetiti Saịnaị na Elim. Ha bịaruru nʼebe ahụ nʼabalị iri na ise nke ọnwa abụọ, site na mgbe ha hapụrụ Ijipt.
2 Lisanga nyonso ya bana ya Isalaele bayimaki-yimaki na tina na Moyize mpe Aron kati na esobe.
Nʼọzara ahụ, nzukọ ahụ niile tamuru ntamu megide Mosis na Erọn.
3 Bana ya Isalaele balobaki na bango: — Ah! Ebongaki kutu loboko na Yawe epamela biso kati na Ejipito, pamba te, kuna, tozalaki kovanda pembeni ya banzungu etonda na misuni; tozalaki kolia mpe kotonda biloko. Kasi bino bomemi biso kati na esobe oyo mpo na koboma lisanga oyo nyonso na nzala!
Ụmụ Izrel gwara ha sị, “Ọ gaara adị anyị mma ma a sị na Onyenwe anyị gburu anyị nʼala Ijipt. Nʼebe ahụ ite anụ dị iche iche na-adọ nʼihu anyị, anyị na-erikwa ụdị nri ọbụla anyị chọrọ. Ugbu a, i dubatala anyị nʼọzara ka anyị niile nwụọ nʼagụụ.”
4 Yawe alobaki na Moyize: — Tala, nakokitisela bino mapa wuta na likolo. Mokolo na mokolo, bato bakobanda kobima mpe kolokota mapa oyo ekoki mpo na kolia mokolo wana. Na nzela wana, nakomeka bango mpo na kotala soki bakobatela to te malako na Ngai.
Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị, “Lee anya, aga m esi nʼeluigwe zitere unu achịcha. Onye ọbụla ga-aga tụtụkọtara onwe ya ihe oriri ụbọchị ọbụla dịka ọ chọrọ. Aga m eji nke a lee ha ule ịmata ma ha ga-eme ihe m nyere ha nʼiwu.
5 Na mokolo ya motoba, bakolokota mbala mibale ndambo oyo bazalaki kolokota mpo na mokolo moko mpe bakolamba yango.
Gwa ha na nʼụbọchị nke isii, ha ga-ewere nri ha ga-ericha nʼụbọchị ahụ, ma nri ha ga-eri nʼụbọchị nke asaa, ka ha ga-achịkọta nʼụbọchị nke isii.”
6 Moyize mpe Aron balobaki na bana nyonso ya Isalaele: — Na pokwa ya lelo, bokoyeba solo ete ezali Yawe nde abimisaki bino na Ejipito.
Mosis na Erọn kpọkọtara ụmụ Izrel sị ha, “Nʼanyasị a ka unu ga-amata na ọ bụ Onyenwe anyị dupụtara unu site nʼala Ijipt.
7 Boye lobi na tongo, bokomona nkembo na Yawe; pamba te ayoki koyimayima na bino na tina na Ye. Mpo na yango, biso tozali banani mpo ete boyimayima epai na biso?
Unu ga-ahụkwa ebube Onyenwe anyị nʼụtụtụ echi, nʼihi na Onyenwe anyị anụla ntamu unu megide ya. Onye ka anyị bụ unu ga-eji na-atamu ntamu megide anyị?”
8 Moyize alobaki lisusu: — Bokoyeba ete ezali solo Yawe tango akopesa bino misuni ya kolia na pokwa mpe mapa ebele na tongo. Pamba te ayoki koyimayima na bino na tina na Ye. Biso tozali banani? Boyimaki-yimaki na tina na biso te, kasi na tina na Yawe.
Mosis kwukwara sị, “Mgbe Onyenwe anyị nyere unu anụ unu ga-eri nʼanyasị a, nyekwa unu achịcha ga-eju unu nʼụtụtụ, unu ga-amata na ọ bụ Onyenwe anyị, nʼihi ọ nụla ntamu unu megide ya. Onye ka anyị bụ? Ọ bụghị anyị ka unu na-atamu megide kama ọ bụ Onyenwe anyị ka unu na-atamu megide.”
9 Boye Moyize alobaki na Aron: — Yebisa lisanga nyonso ya bana ya Isalaele ete bapusana pene ya Yawe mpo ete ayoki koyimayima na bango.
Mgbe ahụ, Mosis gwara Erọn okwu sị ya, “Gwa nzukọ Izrel niile okwu sị ha, ‘Pụtanụ bịa nʼihu Onyenwe anyị, nʼihi na ọ nụla ntamu unu.’”
10 Wana Aron azalaki koloba na lisanga nyonso ya bana ya Isalaele, babalolaki miso na bango na ngambo ya esobe, mpe bamonaki nkembo na Yawe kobima na mapata.
Mgbe Erọn nọ na-agwa nzukọ Izrel okwu, ha lepụrụ anya nʼọzara hụ ebube Onyenwe anyị ka ọ pụtara ihe nʼigwe ojii.
11 Yawe alobaki na Moyize:
Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya,
12 — Nayoki koyimayima ya bana ya Isalaele. Yebisa bango: « Na pokwa ya lelo, bokolia misuni; bongo na tongo, bokotonda mana. Boye, bokoyeba solo ete nazali Yawe, Nzambe na bino. »
“Anụla m ntamu nke ụmụ Izrel na-atamu. Gwa ha sị, ‘Nʼanyasị taa, unu ga-ata anụ, nʼụtụtụ echi unu ga-eri achịcha. Mgbe ahụ, unu ga-amata na abụ m Onyenwe anyị Chineke unu.’”
13 Kaka na pokwa wana, bakayi eyaki mpe etondisaki molako; mpe na tongo, mamwe ezalaki zingazinga ya molako.
Nʼoge uhuruchi ụbọchị ahụ, nnụnụ kweel bịara kpuchie ọmụma ụlọ ikwu ahụ. Nʼisi ụtụtụ echi ya, igirigi dakwara gburugburu ọmụma ụlọ ikwu ahụ.
14 Tango mamwe elimwaki, biloko ya mike-mike penza lokola bambuma ya mike-mike emonanaki na mabele ya esobe, pembe lokola mvula ya pembe.
Mgbe ala kọrọ mmiri igirigi ahụ, ihe dịka achịcha mbadamba nta jupụtara nʼala ọzara ahụ niile.
15 Tango bana ya Isalaele bamonaki yango, batunanaki bango na bango: — Oyo nini? Pamba te bayebaki te soki ezali nini. Moyize alobaki na bango: — Ezali mapa oyo Yawe apesi bino mpo ete bolia.
Mgbe ụmụ Izrel hụrụ ya, ha jụrịtara onwe ha ajụjụ sị, “Gịnị bụ nke a?” Mosis zaghachiri ha sị, “Ọ bụ achịcha Onyenwe anyị nyere unu ka unu rie.
16 Tala mibeko oyo Yawe apesi na tina na likambo oyo: « Tika ete moto na moto alokota oyo ekoki mpo na ye kolia, omeri moko mpo na moto moko. Moto na moto akolokota kolanda motango ya bato oyo bazali kati na ndako na ye ya kapo. »
Ihe ndị a bụ iwu Onyenwe anyị nyere, ‘Ka onye ọbụla chịkọta naanị nke ọ ga-ericha. Ihe ọtụtụ ọmaa maka otu onye dịka ọnụọgụgụ ha si dị nʼezinaụlọ.’”
17 Bato ya Isalaele basalaki bongo: bamoko balokotaki moke; mpe bamosusu, ebele.
Ụmụ Izrel mere dịka a gwara ha, ụfọdụ chịkọtara nke hiri nne, ụfọdụ nke dị nta.
18 Mpe bamekaki na omeri: moto oyo alokotaki ebele, alekelaki te; mpe oyo alokotaki moke, azangelaki te. Balokotaki moto na moto kolanda oyo ekokaki mpo na ye kolia.
Mgbe ha ji ihe ọtụtụ ọmaa tụọ ya, ha chọpụtara na onye chịkọtara hie nne enweghị karịa nke zuru ya, onye chịkọtakwara nke nta, ọ dịghị ihe fọdụrụ ya inweta. Onye ọbụla chịkọtara dị ka ihe ga-ezuru ya si dị.
19 Moyize ayebisaki bango: — Moko te abomba ata moke kino na tongo.
Mosis gwara ha sị, “Ka onye ọbụla hụ na o nweghị nke ga-afọdụ ruo ụtụtụ echi ya.”
20 Kasi bamosusu kati na bango bayokelaki Moyize te mpe babombaki ndambo na yango kino na tongo. Boye bankusu etondaki na ndambo oyo babombaki, mpe ekomaki kolumba solo ya kopola. Mpo na yango, Moyize atombokelaki bango.
Ma ụfọdụ nʼime ha egeghị Mosis ntị. Ha rifọrọ nri ahụ debe ya. Ma mgbe chi echi ya bọrọ, ha chọpụtara na ha ereela ure jupụta nʼikpuru, ma na-esikwa isi dị njọ. Mosis were iwe dị ukwuu megide ụmụ Izrel nʼihi ya.
21 Tongo nyonso, moto na moto abandaki kolokota oyo ekokaki mpo na ye kolia.
Site nʼụbọchị ahụ, gaa nʼihu, ezinaụlọ ọbụla na-ewebata nri nʼụtụtụ ọbụla, dịka mkpa ha siri dị. Mgbe anwụ wara, nri ahụ niile fọdụrụ na-agbaze.
22 Na mokolo ya motoba, bana ya Isalaele bazalaki kolokota mbala mibale ndambo oyo bazalaki kolokota mpo na mokolo moko: omeri mibale mpo na moto moko. Bakambi nyonso ya lisanga bayaki koyebisa yango Moyize.
Nʼụbọchị nke isii, ha na-ewere nri okpukpu abụọ karịa ka ha na-ewe nʼụbọchị ndị ọzọ. Mgbe ndịisi nzukọ Izrel hụrụ mgbanwe dị otu a, ha bịara kọọrọ Mosis.
23 Moyize alobaki na bango: — Tala mibeko oyo Yawe apesi: « Lobi ezali mokolo ya kopema, mokolo ya Saba oyo ebulisami mpo na Yawe. Bokolamba oyo bolingi kolamba mpe bokotokisa oyo bolingi kotokisa; kasi oyo ekotikala, bobatela yango kino lobi. »
Mosis zara sị ha, “Nke a bụ iwu Onyenwe anyị nyere: ‘Ụbọchị echi bụ ụbọchị izuike, ụbọchị nke asaa dị nsọ nye Onyenwe anyị. Ya mere, sienụ ihe niile unu nwere isi taa, nʼihi na unu agaghị esi ihe ọbụla echi. Nri ọbụla unu rifọrọ, hapụnụ ya ka ọ bụrụ nri unu ga-eri echi.’”
24 Bato ya Isalaele babatelaki yango kino na tongo, ndenge kaka Moyize atindaki; mana elumbaki te solo ya kopola, mpe bankusu ezalaki te kati na yango.
Ha mere dịka Mosis gwara ha. Mgbe chi echi bọrọ, ha chọpụtara na nri ha dị mma dịkwa ụtọ, ikpuru adịghịkwa nʼime ya.
25 Moyize ayebisaki bango: — Mokolo ya lelo ezali mokolo ya Saba, mokolo ya Yawe. Bolia mana oyo bobombaki; pamba te lelo, bokotikala te komona mana na libanda.
Mosis gwara ha sị, “Nke a ga-abụ ihe oriri unu taa, nʼihi na ọ bụ ụbọchị izuike nye Onyenwe anyị. Ọ dịghị nri unu ga-ahụ nke unu ga-achịkọta taa.
26 Bokobanda kolokota yango mikolo motoba; kasi na mokolo ya sambo, mokolo ya Saba, mana ekobanda kozala te.
Abalị isii ka unu ga-achịkọta nri unu ga-eri. Ma nʼabalị nke asaa bụ ụbọchị izuike, unu agaghị ahụ nri unu ga-achịkọta.”
27 Atako bongo, na mokolo ya sambo, bato mosusu kati na bango babimaki mpo na kolokota yango, kasi bamonaki eloko te.
Ụfọdụ lefuru ọkwa ahụ Mosis maara ha anya. Ha pụrụ nʼụbọchị izuike ahụ ịchọ nri, ma o nweghị nke ha nwetara.
28 Boye Yawe alobaki na Moyize: — Kino tango nini bokoboya kobatela mibeko mpe malako na Ngai?
Nʼihi nke a, Onyenwe anyị jụrụ Mosis ajụjụ sị ya, “Ruo ole mgbe ka unu ga-anọgide na-enupu isi nʼiwu m na ịdọ aka na ntị m?
29 Botia na mito na bino ete Ngai Yawe, napesaki bino mokolo ya Saba. Yango wana, na mokolo ya motoba, napesaka bino mapa mpo na mikolo mibale. Boye tika ete, na mokolo ya sambo, moto na moto avanda epai na ye; moko te abima na libanda.
Lee, Onyenwe anyị enyela unu ụbọchị izuike. Ya mere, nʼụbọchị nke isii ọ na-enye unu nri ga-ezuru unu abalị abụọ. Onye ọbụla nʼime unu kwesiri ịnọgide nʼụlọ unu. Unu ekwesighị ịpụ apụ.”
30 Boye bato bapemaki na mokolo ya sambo.
Nʼihi nke a, ndị Izrel niile zuru ike nʼụbọchị nke asaa.
31 Bato ya Isalaele babengaki lipa yango mana. Ezalaki pembe lokola bambuma ya koriande mpe elengi lokola mikate balamba na mafuta ya nzoyi.
Ndị Izrel kpọkwara aha nri ahụ ha na-achịkọta mánà. Ọ dị ọcha dịka mkpụrụ kọrianda. Ọ na-atọkwa ụtọ dịka achịcha e ji mmanụ aṅụ mee.
32 Moyize alobaki: — Tala mibeko oyo Yawe apesi: « Bozwa omeri moko ya mana mpe bobomba yango mpo na milongo ya bakitani na bino oyo ekoya, mpo ete bamona mapa oyo naleisaki bino na esobe tango nabimisaki bino na Ejipito. »
Emesịa, Mosis gara nʼihu gwa ha okwu sị, “Onyenwe anyị enyela iwu sị, ‘Na unu ga-eji ihe ọtụtụ ọmaa tụpụta mánà nke unu ga-edebe. Ọ ga-abụ ihe ncheta ga-adịrị ọgbọ ndị Izrel niile na-abịa nʼihu. Nʼụzọ dị otu a, ụmụ unu ga-ahụ ụdị achịcha m jiri zụọ unu nʼime ọzara mgbe m gbapụtara unu site nʼala ndị Ijipt.’”
33 Boye Moyize alobi na Aron: — Kamata ekolo moko mpe tia omeri moko ya mana kati na yango; bongo tia yango liboso ya Yawe mpo ete ebombama mpo na milongo oyo ekoya.
Nʼihi nke a, Mosis nyere Erọn iwu sị ya, “Tụrụ ọtụtụ ọmaa mánà tinye ya nʼime ite nta. Bute ya debe ya nʼihu Onyenwe anyị, ka ọ bụrụ ihe ga-adịgide nye ọgbọ dị nʼihu.”
34 Ndenge kaka Yawe atindaki Moyize, Aron atiaki mana yango liboso ya Sanduku ya Boyokani mpo ete ebombama malamu.
Emesịa, Erọn dọnyere mánà a nʼihu Ihe Ama e debere nʼime ụlọ ikwu, dịka Onyenwe anyị nyere Mosis nʼiwu.
35 Bana ya Isalaele baliaki mana mibu tuku minei kino tango bakomaki na mondelo ya mokili ya Kanana.
Ndị Izrel niile riri mánà ndị a iri afọ anọ tutu ruo mgbe ha batara nʼala ebe ndị mmadụ bi, tutu ruo mgbe ha bịarutere nʼoke ala Kenan.
36 Omeri moko ekokani na eteni ya zomi ya efa.
(Ihe ọtụtụ ọmaa bụ otu ọtụtụ nʼime ọtụtụ iri nke ga-eju ihe ọtụtụ efaf.)

< Kobima 16 >