< Deteronomi 27 >

1 Moyize mpe bampaka ya Isalaele bapesaki mitindo oyo epai ya bato: « Bobatela mitindo nyonso oyo nalingi kopesa bino lelo.
Mosis na ndị okenye Izrel nyere ndị Izrel iwu sị, “Debenụ iwu ndị a niile m na-enye unu taa.
2 Tango bokokatisa Yordani mpo na kokota na mokili oyo Yawe, Nzambe na bino, akopesa bino, bokotelemisa ndambo ya mabanga minene mpe bokopakola yango pembe.
Mgbe ị gabigara osimiri Jọdan ruo nʼala ahụ Onyenwe anyị Chineke gị na-enye gị, bukọtaanụ nkume buru ibu nʼotu ebe, jirikwa ụrọ ọcha techie ha.
3 Bokokoma na likolo na yango, maloba nyonso ya mobeko tango bokosilisa kokatisa Yordani mpo na kokota na mokili oyo Nzambe na bino akopesa bino, mokili oyo ezali kobimisa miliki mpe mafuta ya nzoyi, ndenge kaka Yawe, Nzambe ya bakoko na bino, alakaki bino.
Depụta nʼelu nkume ndị ahụ iwu na ụkpụrụ ndị a mgbe ị batara nʼala ahụ mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru nʼime ya, nke Onyenwe anyị Chineke nna nna gị kwere nkwa inye gị.
4 Mpe tango bokosilisa kokatisa Yordani, bokotelemisa mabanga yango na ngomba Ebali ndenge natindi bino yango lelo, mpe bokopakola yango pembe.
Mgbe ị nọkwa nʼofe ọzọ nke osimiri Jọdan, doo nkume ukwu ndị a nʼugwu Ebal, dịka m na-enye gị nʼiwu taa. Jirikwa ụrọ ọcha techie ha.
5 Kuna, bokotonga etumbelo ya mabanga mpo na Yawe, Nzambe na bino. Bokosalela ata esalelo moko te ya ebende.
Wuokwara Onyenwe anyị Chineke gị ebe ịchụ aja ya nʼebe ahụ. Ebe ịchụ aja eji naanị nkume wuo, nke ejighị ihe ngwa ọrụ igwe rụọ ihe bụla na ya.
6 Bokotonga na mabanga balokota na bilanga etumbelo mpo na Yawe, Nzambe na bino, mpe bokobonza na likolo na yango bambeka ya kotumba.
Jiri nkume a na-awaghị awa wuore Onyenwe anyị Chineke gị ebe ịchụ aja ahụ, chụọkwa aja nʼelu ya nye Onyenwe anyị Chineke gị.
7 Na likolo ya etumbelo yango, bokobonza bambeka ya boyokani; bokolia yango kaka na esika wana mpe bokosepela na miso ya Yawe, Nzambe na bino.
Chụọ aja udo nʼebe ahụ, rie ha, ma ṅụrịakwa ọṅụ nʼihu Onyenwe anyị Chineke gị.
8 Bokokoma na konguluta maloba nyonso ya mobeko oyo na likolo ya mabanga oyo botelemisi. »
Depụta iwu ndị a nke ọma, nʼelu nkume ndị ahụ i guzobere.”
9 Sima na yango, Moyize mpe Banganga-Nzambe oyo bazali Balevi balobaki na lisanga mobimba ya Isalaele: « Oh Isalaele, bovanda kimia mpe boyoka! Bokomi lelo libota ya Yawe, Nzambe na bino.
Mgbe ahụ, Mosis na ndị nchụaja, bụ ndị Livayị, gwakwara ndị Izrel niile okwu sị, “Nọọnụ jii, gị Izrel, gekwaa ntị! Taa, ị ghọọla ndị nke Onyenwe anyị Chineke unu.
10 Botosa Yawe, Nzambe na bino, mpe bosalela mitindo mpe bikateli na Ye oyo nalingi kopesa bino lelo. »
Nʼihi ya debe iwu niile Onyenwe anyị Chineke gị na ụkpụrụ niile ndị m nyere gị taa.”
11 Kaka na mokolo wana, Moyize apesaki mitindo oyo epai na bato:
Nʼotu ụbọchị ahụ ka Mosis nyere ha iwu sị,
12 « Tala mabota oyo ekotelema na ngomba Garizimi mpo na kopambola bato tango bokokatisa Yordani: libota ya Simeoni, ya Levi, ya Yuda, ya Isakari, ya Jozefi, mpe ya Benjame.
Mgbe unu gafere Jọdan, ebo ndị a: Simiọn, na Livayị na Juda na Isaka na Josef na Benjamin, ga-eguzo nʼelu ugwu Gerizim gọzie ụmụ Izrel
13 Mpe tala mabota oyo ekotelema na ngomba Ebali mpo na kolakela bato mabe: libota ya Ribeni, ya Gadi, ya Aseri, ya Zabuloni, ya Dani mpe ya Nefitali. »
Agbụrụ Ruben, Gad, Asha, Zebụlọn, Dan na Naftalị ga-eguzo nʼelu ugwu Ebal kwupụta ọbụbụ ọnụ.
14 Balevi bakoloba epai ya bana nyonso ya Isalaele maloba oyo na mongongo makasi:
Ndị Livayị ga-eji olu dị elu gụpụta ya nye ụmụ Izrel niile,
15 « Alakelama mabe, moto nyonso oyo akosala nzambe ya ekeko na libanga, na nzete to na ebende banyangwisa na moto, mpo na kotia yango na esika ya sekele! Yawe amonaka lokola biloko ya nkele, banzambe ya bikeko oyo bato ya misala ya maboko basalaka! » Bato nyonso bakozongisa: « Amen! »
“Onye a bụrụ ọnụ ka mmadụ ahụ bụ nke na-apị arụsị maọbụ oyiyi ọbụla, akaọrụ onye ǹka, nke bụ ihe arụ nʼanya Onyenwe anyị, ma na-eguzobe ya na nzuzo.” Ndị mmadụ niile ga-aza sị, “Amen.”
16 « Alakelama mabe, moto nyonso oyo akosambwisa tata na ye to mama na ye! » Bato nyonso bakozongisa: « Amen! »
“Onye a bụrụ ọnụ ka onye ahụ bụ, nke na-elelị nna ya na nne ya.” Ụmụ Izrel niile ga-aza, “Amen.”
17 « Alakelama mabe, moto nyonso oyo akopusa libanga oyo batie lokola mondelo na mabele ya moninga na ye! » Bato nyonso bakozongisa: « Amen! »
“Onye a bụrụ ọnụ ka onye ahụ bụ nke na-ehigharị oke ala onye agbataobi ya.” Ụmụ Izrel niile ga-aza, “Amen.”
18 « Alakelama mabe, moto nyonso oyo akokamba mokufi miso na nzela ya mabe. » Bato nyonso bakozongisa: « Amen! »
“Onye a bụrụ ọnụ ka onye ahụ bụ nke na-eduhie onye ìsì ụzọ.” Ụmụ Izrel niile ga-aza, “Amen.”
19 « Alakelama mabe moto nyonso oyo akokata makambo na ndenge ya mabe mpo na mopaya, mpo na mwana etike mpe mpo na mwasi oyo akufisa mobali! » Bato nyonso bakozongisa: « Amen! »
“Onye a bụrụ ọnụ ka onye ahụ bụ nke na-adịghị ekpe ikpe ziri ezi nye ndị ọbịa, na ụmụ mgbei, na ndị inyom di ha nwụrụ.” Ụmụ Izrel niile ga-aza, “Amen.”
20 « Alakelama mabe moto nyonso oyo akosangisa nzoto na mwasi ya tata na ye, pamba te asambwisi mbeto ya tata na ye! » Bato nyonso bakozongisa: « Amen! »
“Onye a bụrụ ọnụ ka onye ahụ bụ nke na-abakwuru nwunye nna ya soro ya dinaa, nʼihi na o merụọla ihe ndina nna ya.” Ụmụ Izrel niile ga-aza, “Amen.”
21 « Alakelama mabe, moto nyonso oyo akosangisa nzoto na nyama! » Bato nyonso bakozongisa: « Amen! »
“Onye a bụrụ ọnụ ka onye ahụ bụ nke ya na anụmanụ ọbụla na-edina.” Ụmụ Izrel niile ga-aza, “Amen.”
22 « Alakelama mabe, moto nyonso oyo akosangisa nzoto na ndeko na ye ya mwasi, mwana ya tata na ye to mwana ya mama na ye! » Bato nyonso bakozongisa: « Amen! »
“Onye a bụrụ ọnụ ka onye ahụ bụ, nke ya na nwanne ya nwanyị na-akwa iko, bụ nwanne ya nke nne ya mụrụ, maọbụ nke nwunye nna ya mụrụ.” Ụmụ Izrel niile ga-aza, “Amen.”
23 « Alakelama mabe moto nyonso oyo akosangisa nzoto na mama ya mwasi na ye! » Bato nyonso bakozongisa: « Amen! »
“Onye a bụrụ ọnụ ka onye ahụ bụ, nke ya na nne nwunye ya na-edina.” Ụmụ Izrel niile ga-aza, “Amen.”
24 « Alakelama mabe, moto nyonso oyo akoboma moninga na ye na nkuku! » Bato nyonso bakozongisa: « Amen! »
“Onye a bụrụ ọnụ ka onye ahụ bụ, nke na-etigbu mmadụ ibe ya na nzuzo.” Ụmụ Izrel niile ga-aza, “Amen.”
25 « Alakelama mabe, moto nyonso oyo akozwa kanyaka mpo na koboma moto oyo ayebi likambo te! » Bato nyonso bakozongisa: « Amen! »
“Onye a bụrụ ọnụ ka onye ahụ bụ, nke na-anara ngarị maka itigbu onye na-emeghị ihe ọjọọ ọbụla.” Ụmụ Izrel niile ga-aza, “Amen.”
26 « Alakelama mabe, moto nyonso oyo akokokisa te mpe akotia te na misala, maloba ya mibeko oyo! » Bato nyonso bakozongisa: « Amen! »
“Onye a bụrụ ọnụ ka onye ahụ bụ, nke na-adịghị eme ka iwu ndị a guzosie ike site na-edebeghị ha.” Ụmụ Izrel niile ga-aza, “Amen.”

< Deteronomi 27 >